Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Adara M Ogbenye ná Mmalite, ma Baa Ọgaranya n’Ikpeazụ

Adara M Ogbenye ná Mmalite, ma Baa Ọgaranya n’Ikpeazụ

A mụrụ m n’otu ọnụ ụlọ e ji osisi rụọ, n’obere obodo a na-akpọ Libati, dị n’Indiana, n’Amerịka. Papa m na mama m amụọla otu nwoke na ụmụ nwaanyị abụọ tupu ha amụọ m. Mgbe a mụchara m, mama m mụkwara ụmụ nwoke abụọ na otu nwaanyị.

Ihe a bụ ụlọ anyị e ji osisi rụọ, bụ́ ebe a nọ mụọ m

O NWEGHỊ ihe gbanwerenụ n’afọ niile m gara akwụkwọ. N’ụlọ akwụkwọ anyị, ndị gị na ha so gụọ klas mbụ ka gị na ha ga-esokwa agụcha. Ihe ọzọ bụ na ị ma aha ọtụtụ ndị n’obodo ahụ, hanwa amarakwa nke gị.

Abụ m otu n’ime ụmụ asaa nne na nna m mụrụ. Amụtakwara m ọtụtụ ihe gbasara ọrụ ubi mgbe m ka na-eto eto

Ihe juru n’obodo Libati bụ obere ugbo. Ihe ha na-akụkarị bụ ọka. Mgbe a mụrụ m, papa m na-arụrụ otu onye ọrụ ugbo n’obodo ahụ ọrụ. Ebe m ka na-eto eto n’oge ahụ, m mụrụ otú e si anya traktọ, mụọkwa ụzọ ndị ọzọ e si arụ ọrụ ugbo.

Papa m abụghịzi nwa okorobịa mgbe a mụrụ m. Ọ dị afọ iri ise na isii mgbe ahụ, mama m adịrị afọ iri atọ na ise. Papa m enwechaghị ahụ́. Ma, ahụ́ gbasiri ya ike, ọ na-arụsikwa ọrụ ike. Ọ kụzikwaara anyị niile ime otú ahụ. O nwechaghị ego, ma ọ gbalịrị hụ na anyị nwere ebe anyị bi, uwe anyị na-eyi, nakwa nri na-ezuru anyị. Ọ na-ewepụtakwa ohere anyị na ya anọrịa. Ọ dị afọ iri itoolu na atọ mgbe ọ nwụrụ. Mama m nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri asatọ na isii. O nweghị onye n’ime ha fere Jehova. Ma, e nwere otu nwanne m bụ́ okenye kemgbe afọ 1972.

MGBE M KA NA-ETOLITE

Mama m ejighị chọọchị egwu egwu. Ọ na-akpọ anyị aga chọọchị Baptist n’ụbọchị Sọnde ọ bụla. Mgbe mbụ m nụrụ banyere ozizi Atọ n’Ime Otu bụ mgbe m dị afọ iri na abụọ. M chọrọ ịmatakwu gbasara ya, n’ihi ya, m jụrụ mama m, sị: “Olee otú Jizọs si bụrụ Ọkpara, bụrụkwa Nna?” M chetara na ọ zara m, sị: “Nwa m, ọ bụ ihe omimi. Anyị agaghị aghọtali ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụụrụ m ihe omimi. Ma, mgbe m dị afọ iri na anọ, e mere m baptizim n’otu iyi dị n’obodo anyị. E mikpuru m n’ime ya ugboro atọ, n’aha nke Nna, na nke Ọkpara nakwa na nke mmụọ nsọ.

1952—Mgbe m dị afọ iri na asaa, tupu a kpọọ m ka m banye amị

Mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, enwere m otu enyi na-akụ ọkpọ. Ọ gwara m ka m mụọ ịkụ ọkpọ. N’ihi ya, m malitere ịmụ ya, mechaa banye n’òtù ọkpọ a na-akpọ Golden Gloves. Emechaghị m nke ọma, n’ihi ya, m kụrụ ọkpọ ugboro ole na ole, kwụsị. Ka oge na-aga, a kpọrọ m ka m banye n’amị ndị Amerịka, ma mechaa ziga m Jamanị. Mgbe m nọ ebe ahụ, ndị isi anyị zigara m n’ụlọ akwụkwọ ndị amị, n’ihi na ha chere na m ga-abụ ezigbo onye ndú. Ha chọrọ ka m jiri ọrụ amị mere aka ọrụ. Ma, obi m adịghị na ya. N’ihi ya, mgbe m rụchara ọrụ afọ abụọ, m hapụrụ ọrụ amị n’afọ 1956. Mgbe obere oge gachara, m banyere n’òtù amị ọzọ.

M nọrọ afọ abụọ n’Amị ndị Amerịka malite n’afọ 1954 ruo 1956

OTÚ M SI MỤTA EZIOKWU

Tupu mụ amụta eziokwu, m chere na nwoke bụ́ dimkpa kwesịrị ịdị ka ndị akpụ obi. Ihe ndị a na-egosi na fim nakwa ndị nọ n’ebe m bi megharịrị m anya. N’ihi ya, m chere na ụmụ nwoke ndị na-ezi ozi ọma abụghị ndị dimkpa. Ma, m malitere ịmụ ihe ndị gbanwere ndụ m. Otu ụbọchị m bu ụgbọala m na-acha uhie uhie na-agbagharị, ụmụ agbọghọ abụọ feere m aka. Ama m ha. Ha bụ ụmụnne di nwanne m nwaanyị nke tọrọ m. Ha bụ Ndịàmà Jehova. E nweela mgbe ha nyere m Ụlọ Nche na Teta! Ma, m chere na Ụlọ Nche sitụụrụ m ike nghọta. Ma na nke ugbu a, ha kpọrọ m ka m bịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, ya bụ, obere nnọkọ a na-enwe n’ụlọ ha maka ọmụmụ Baịbụl. M gwara ha na m ga-echebara ya echiche. Ha mụmụrụ ọnụ ọchị, jụọ m, sị: “Ị̀ na-ekwe anyị nkwa na ị ga-abịa?” Mụ azaa ha, sị: “Ee.”

M kwara mmakwara na m kwere ha nkwa ahụ. Ma, m sịrị na m ga-eme ihe m gwara ha. N’ihi ya, n’abalị ahụ, m gara. Ihe ụmụaka nọ ebe ahụ mere kacha tọọ m ụtọ. Amaghịdị m na ha ma Baịbụl nke ọma. N’agbanyeghị ọtụtụ afọ m so mama m gaa chọọchị, e nweghị ezigbo ihe m ma na Baịbụl. Ma ugbu a, ekpebiela m ịmụkwu Baịbụl. M kwetara ka a mụwara m Baịbụl. Otu n’ime ihe ndị m bu ụzọ mụta bụ na aha Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ Jehova. Mgbe m jụrụ mama m banyere Ndịàmà Jehova n’afọ ndị gara aga, ọ sịrị m: “Ha na-efe otu agadi nwoke a na-akpọ Jehova.” Ma ugbu a, ọ dị m ka anya emepeela m.

Amalitere m ime nke ọma ozugbo, n’ihi na m ma na achọtala m eziokwu. Mgbe ihe dị ka ọnwa itoolu gachara m gara ọmụmụ ihe mbụ m, e mere m baptizim, ya bụ, n’ọnwa Mach, afọ 1957. Otú m si ele ihe anya gbanwere. M cheta otú m chere nwoke kwesịrị ịdị, obi na-atọ m ụtọ na m mụtala ihe Baịbụl na-akụzi maka ya. Jizọs bụ nwoke zuru okè. O siri ezigbo ike karịa ‘onye akpụ obi’ ọ bụla. Ma, o nweghị mgbe ọ lụrụ ọgụ, kama ‘o kwere ka e mekpaa ya ahụ́.’ (Aịza. 53:2, 7) M mụtara na ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs “kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ.”—2 Tim. 2:24.

M malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1958, mgbe otu afọ e mere m baptizim gachara. Ma, m mechara kwụsịtụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na m chọrọ ịlụ Gloria, otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ kpọrọ m ka m bịa ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ. Akwatụbeghị m mmakwaara na m lụrụ ya. Gloria bụ asampete, ma mgbe ahụ ma ugbu a. M weere ya na ọ dị oké ọnụ ahịa karịa dayamọnd kacha ọnụ n’ụwa. Obi dịkwa m ezigbo ụtọ na m lụrụ ya. Ka ọ kọtụrụ unu gbasara onwe ya:

“Anyị dị ụmụ iri na asaa papa m na mama m mụrụ. Mama m bụ Onyeàmà Jehova ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ nwụrụ mgbe m dị afọ iri na anọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka papa m bidoro ịmụ Baịbụl. Ebe ọ bụ na mama m anwụọla, papa m gakwuuru onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị ka ọ jụọ ya ma ọ̀ ga-ekwe ka mụ na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m na-agbanwe ụbọchị anyị ga-eji na-abịa akwụkwọ. Nwanne m nwaanyị a nọ na klas ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ihe ọ pụtara bụ na m gaa taa, ya agaa echi, ka anyị nwee ike ịna-elekọta ụmụnne anyị ndị obere, nakwa isi nri tupu papa m alọta ọrụ. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị kwetara. Anyị megidere ihe a ruo mgbe nwanne m nwaanyị gụchara akwụkwọ. Ezinụlọ abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova mụụrụ anyị Baịbụl, mmadụ iri na otu n’ime anyị aghọọ Ndịàmà Jehova. Ịga ozi ọma na-atọ m ụtọ n’agbanyeghị na m bụ onye ihere. Ma, kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, di m enyerela m aka ịkwụsị ya.”

Mụ na Gloria lụrụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1959. Anyị abụọ sụkọrọ ụzọ. N’ọnwa Julaị afọ ahụ, anyị tinyere akwụkwọ ije ozi na Betel, n’ihi na anyị abụọ chọsiri ike ije ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị. Nwanna Simon Kraker gbara anyị ajụjụ ọnụ. Ọ gwara anyị na a naghịzi akpọ ndị lụrụ di na nwunye ka ha bịa jewe ozi na Betel n’oge ahụ. Uche anyị ka dịkwa n’ije ozi na Betel. Ma, o were ọtụtụ afọ tupu a kpọọ anyị.

Anyị degaara isi ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ka e ziga anyị n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ha gwara anyị ka anyị gaa Paịn Blọf dị n’Akansas. N’oge ahụ, e nwere ọgbakọ abụọ n’ebe ahụ. Otu bụ nke ndị ọcha, nke ọzọ abụrụ nke ndị isi ojii. E zigara anyị na nke ndị isi ojii, ebe e nwere naanị ndị nkwusa iri na anọ.

OTÚ ANYỊ SI DIE ỊKPA ÓKÈ AGBỤRỤ

I nwere ike ịna-eche ihe mere ndị ọcha na ndị isi ojii anaghị anọ n’otu ọgbakọ. Ihe kpatara ya bụ na n’oge ahụ, e nweghị ihe ha ga-emeli gbasara ya. E nwere iwu ndị kwuru ka ndị ọcha na ndị isi ojii ghara ịna-emekọ ihe, a na-emesikwa ndị dara iwu ndị ahụ ike. N’ọtụtụ ebe, ụmụnna anyị na-atụ ụjọ na e nwere ike imebisi Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ndị ọcha na ndị isi ojii nọrọ na ya na-amụkọ ihe. E nwekwara mgbe ụdị ihe a mere. Ọ bụrụ na ụmụnna ndị isi ojii agaa ozi ụlọ n’ụlọ n’ebe ndị ọcha bi, a ga-anwụchi ha, e nwekwara ike ịkụ ha isi aba okpu. N’ihi ya, ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma n’enweghị nsogbu, anyị rubere isi n’iwu ahụ, nwee olileanya na ihe ga-emecha gbanwee.

E nwere nsogbu ndị anyị na-enwe ma anyị gaa ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, anyị ziwe ozi ọma n’ebe ndị isi ojii bi, anyị na-akụ aka n’ụlọ ndị ọcha n’amaghị ama. Anyị ga-ekpebi ozugbo ma ànyị ga-ezitụ ha ozi ọma, ma ọ bụ rịọ ha na anyị amaghị ama kụọ aka, ma gawa n’ụlọ ọzọ. Ọ bụ otú ahụ ka ihe si kwụrụ n’ebe ụfọdụ n’oge ahụ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịna-arụ ọrụ ka anyị nwee ike inweta ego anyị ga-eji egbo mkpa anyị, na-asụkwa ụzọ. Ihe a na-akwụ anyị n’ụbọchị n’ọtụtụ ọrụ anyị rụụrụ ndị mmadụ bụ dọla atọ. Gloria nwere ebe ụfọdụ ọ na-edoziri ndị mmadụ ụlọ. Ha na-ekwe ka m nyere ya aka n’ebe ụfọdụ ka o nwee ike ịrụcha n’oge. Ha na-enye anyị nri ehihie. E nwere otu ezinụlọ Gloria na-edere ákwà kwa izu. M na-edoziri ndị mmadụ gburugburu ebe ha bi, na-asa windo, na-arụkwa ụmụ obere ọrụ ndị ọzọ. E nwere otu ezinụlọ ndị ọcha mụ na Gloria gara saara windo. Gloria si n’ime na-asa, mụnwa esi n’èzí na-asa. Anyị sagidere ya, chi ejie, n’ihi ya, ha nyere anyị nri ehihie. Gloria nọ n’ime ụlọ rie nke ya, ma ọ nọghị n’ebe ndị nwe ụlọ nọ. Mụnwa anọrọkwanụ n’ebe ha na-adọwa ụgbọala n’èzí rie nke m. Ma, o nweghị ihe m ji ya kpọrọ. Nri ahụ tọrọ ezigbo ụtọ. Ndị ezinụlọ ahụ bụ ndị ezigbo mmadụ. Ma, ihe ndị nọ ha gburugburu na-eme mere ka ha na-akpa àgwà otú ha si akpa. M chetara otu ụbọchị anyị banyere n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala ka anyị gbara mmanụ. Mgbe anyị gbanyechara mmanụ n’ụgbọala anyị, mụ ajụọ onye ọcha na-ere mmanụ ụgbọala ma nwunye m ò nwere ike ịga n’ebe a na-aga mposi, ya elee m anya ọjọọ, ma zaa m, sị, “Ọ gbachiri agbachi.”

IHE ỌMA NDỊ E MEERE ANYỊ, ANYỊ NA-AGAGHỊ ECHEFU ECHEFU

Oge anyị na ụmụnna anyị ji nọrịa tọrọ anyị ezigbo ụtọ, ozi ọma tọkwara anyị ụtọ. Mgbe anyị bịara Paịn Blọf ọhụrụ, anyị biri na nke otu nwanna bụ́ ohu ọgbakọ n’oge ahụ. Nwunye ya abụghị Onyeàmà Jehova mgbe ahụ, nwunye m malitere ịmụrụ ya Baịbụl. Mụnwa amụwakwara nwa ha nwaanyị na di ya. Nwunye nwanna ahụ na nwa ha nwaanyị kpebiri ife Jehova, e meekwa ha baptizim.

Anyị nwekwara ọtụtụ ndị enyi n’ọgbakọ ndị ọcha. Ha na-akpọ anyị ka anyị na ha rie nri abalị, ma ọ na-abụ mgbe chi jiri ka anyị na-aga, ka ndị mmadụ ghara ịhụ anyị. N’oge ahụ, òtù a na-akpọ Ku Klux Klan ma ọ bụ KKK na-akpa ike. Òtù a na-akwado ịkpa okè agbụrụ, na-emekwa ihe ike. Echetara m mgbe m hụrụ otu nwoke nọ n’ihu ụlọ ya n’abalị a na-eme ememme Halowin. Nwoke a yi ákwà ọcha ka ndị KKK. Ụdị ihe a emeghị ka ụmụnna kwụsị imere ibe ha ihe ọma. N’otu oge ọkọchị, anyị chọrọ ego anyị ga-eji aga mgbakọ, otu nwanna bịara zụrụ ụgbọala anyị ka anyị nwee ike inweta ego anyị ga-eji aga. Otu ụbọchị, mgbe otu ọnwa gachara, anyị gara ozi ọma ma mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl, ezigbo ike agwụ anyị n’ihi oké okpomọkụ. Mgbe anyị lọtara, ị̀ ma ihe anyị hụrụ? Anyị hụziri ka ụgbọala anyị dọ n’ihu ụlọ anyị. Ihe e dere n’akwụkwọ a fanyere n’ihu ya bụ: “M bughachiirị unu ụgbọala unu ka ọ bụrụ onyinye m nyere unu. Abụ m nwanna unu.”

E nwere ihe ọma ọzọ e meere m nke m na-agaghị echefu echefu. N’afọ 1962, a kpọrọ m ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na Saụt Lansịn dị na Niu Yọk. A ga-eji otu ọnwa zuru ezu zụọ ndị okenye, ndị nlekọta sekit na distrikti. Mgbe a kpọrọ m maka ịga ụlọ akwụkwọ a, enweghị m ọrụ, e nwekwanụghị ezigbo ego dị m n’aka. Ma, otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka telefon na Paịn Blọf, gbara m ajụjụ ọnụ n’oge na-adịbeghị anya maka iwere m n’ọrụ. Ọ bụrụ na ha ewere m n’ọrụ, m ga-abụ onyeisi ojii mbụ rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ. Ha mechara gwa m na ha ga-ewe m n’ọrụ. Gịnị ka m ga-eme ugbu a? Enweghị m ego m ga-eji aga Niu Yọk. M chebaara ọrụ ahụ echiche ma kwuo na m ga-anara ya kama ịgawa ụlọ akwụkwọ ahụ. M chọdịrị ide akwụkwọ ozi gwa ha na mụ agaghị abịazi ụlọ akwụkwọ ahụ mgbe otu ihe m na-agaghị echefu echefu mere.

Otu nwanna nwaanyị n’ọgbakọ anyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova, kụrụ aka n’ụzọ anyị n’otu isi ụtụtụ ma nye m envelopu. Ihe juru na ya bụ ego. Ya na ụmụ ya na-ebili n’isi ụtụtụ na-aga abọ ahịhịa n’ubi a kụrụ ogho ka ha nweta ego m ga-eji aga Niu Yọk. Ọ gwara m, sị: “Gaa ụlọ akwụkwọ ka ị mụta ọtụtụ ihe, ị lọta, gị akụziere anyị.” M mechara jụọ ụlọ ọrụ ahụ ma m̀ nwere ike ịmalite ọrụ ma izu ise gafee ụbọchị ha gwara m malite ọrụ. Ihe ha zara m hoo haa bụ “Mba.” Ma, ihe a ha zara m ewuteghị m n’ihi na ekpebiela m ihe m ga-eme. Obi dị m ezigbo ụtọ na anaraghị m ọrụ ahụ.

Gloria chetara ihe ndị mere mgbe anyị nọ na Paịn Blọf. Ọ sịrị: “Ókèala ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ. M na-amụrụ ihe dị ka mmadụ iri abụọ Baịbụl. N’ihi ya, anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ n’ụtụtụ, jirizie oge ndị ọzọ mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, anyị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ruo elekere iri na otu nke abalị. Ozi ọma na-atọ anyị ụtọ. Ọ gaara na-atọ m ụtọ ịnọgide na-asụ ụzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na achọghị m ịhapụ ozi m na-eje n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma banye n’ọrụ sekit. Ma, e nwere ihe ọzọ Jehova bu n’obi.” Ọ bụ eziokwu, o nwere ihe ọzọ o bu n’obi.

OTÚ ANYỊ SI RỤỌ ỌRỤ SEKIT

Mgbe anyị na-asụ ụzọ na Paịn Blọf, anyị tinyere akwụkwọ maka ịbụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị tụsiri anya ike ka a họpụta anyị, n’ihi na onye nlekọta distrikti chọrọ ka anyị gaa nyere ọgbakọ dị na Teksas aka. Ọ chọkwara ka anyị jee ozi ebe ahụ ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ihe a masịrị anyị. N’ihi ya, anyị chegidere, chegide, na-atụ anya ka a zaghachi anyị, ma o nweghị ihe anyị hụrụ. N’ikpeazụ, anyị natara akwụkwọ ozi na a họpụtala anyị ka anyị na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche. Ihe a mere na Jenụwarị afọ 1965. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka a họpụtara Nwanna Leon Weaver, onye bụzi onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ n’Amerịka, ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit.

Ụjọ tụrụ m ịbụ onye nlekọta sekit. N’ihe dị ka otu afọ tupu mgbe ahụ, Nwanna James A. Thompson, Jr., bụ́ onye nlekọta distrikti, tụlere ma m̀ ruru eru. O medara obi gwa m ebe ndị m ga-emekwu nke ọma, gwakwa m ihe ezigbo onye nlekọta sekit kwesịrị ịna-eme. Ọ dịghị anya m banyere n’ọrụ sekit, mụ achọpụta na ihe ndị ahụ ọ gwara m baara m ezigbo uru. Mgbe a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit, Nwanna Thompson bụ onye nlekọta distrikti mbụ mụ na ya rụkọrọ ọrụ. Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka nwanna a ji ofufe Chineke kpọrọ ihe.

M ji ihe ndị m mụtara n’aka ụmụnna ndị kwesịrị ntụkwasị obi kpọrọ ihe

N’oge ahụ, a na-enye onye nlekọta sekit obere ọzụzụ. M ji otu izu soro onye nlekọta sekit gaa leta ọgbakọ iji mụta otú e si eleta ọgbakọ. N’izu ya nke ọzọ, yanwa esoro m gaa leta ọgbakọ ka ọ hụ otú m ga-esi eme ya. Ọ gwaziri m ihe ndị ga-enyere m aka imekwu nke ọma. Ma mgbe nke ahụ gachara, ya ahapụ anyị. M chetara na m jụrụ nwunye m, sị, “Ò kwesịla ịhapụ anyị ugbu a?” Ma, m mechara mụta ihe dị ezigbo mkpa. M mụtara na e nwere ezigbo ụmụnna ndị ga-enyere gị aka ma i kwe. Obi ka na-atọ m ụtọ ma m cheta ihe m mụtara n’aka ụmụnna ndị ma nke a na-akọ, dị ka Nwanna J. R. Brown, onye bụ́ onye nlekọta sekit mgbe ahụ, na Nwanna Fred Rusk, na-eje ozi na Betel.

N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-akpa ókè agbụrụ. E nwere oge ndị KKK zọọrọ ije bịa n’obodo anyị na-eleta na Tenesii. M chetara ihe mere ụbọchị ọzọ mgbe anyị na ụmụnna ndị ọzọ kwụsịtụrụ n’ebe a na-ere nri ka anyị zurutụ ike mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Mgbe m gawara n’ebe ụmụ nwoke na-aga mposi, otu nwoke iwe juru obi, gburu egbugbu e ji mara ndị na-akpa okè agbụrụ n’ahụ́ ya, sochiri m azụ. Ma, otu nwanna bụ́ onye ọcha, onye gbara agba karịa ma mụ ma nwoke ahụ, sochiri anyị azụ. Mgbe o rutere ya ajụọ m, sị, “Nwanna Herd, ọ̀ dịkwa mma?” Nwoke ahụ pụrụ ozugbo. Kemgbe ọtụtụ afọ, achọpụtala m na ihe mere e ji akpa ókè agbụrụ abụghị otú akpụkpọ ahụ́ mmadụ na-acha, kama ọ bụ mmehie Adam bufere anyị niile. Amụtala m na nwanna bụ nwanna n’agbanyeghị otú akpụkpọ ahụ́ ya na-acha, ọ dịkwa njikere ịnwụ maka gị ma ọ dị mkpa.

ABARA M ỌGARANYA N’EBE CHINEKE NỌ N’IKPEAZỤ

Anyị rụrụ ọrụ sekit afọ iri na abụọ, rụọ ọrụ distrikti afọ iri abụọ na otu. Afọ ndị ahụ tọrọ anyị ezigbo ụtọ ma baara anyị uru. Anyị mụtakwara ọtụtụ ihe gbara anyị ume. Ma, e nwere ngọzi ọzọ anyị nwetara. N’ọnwa Ọgọst, afọ 1997, ihe anyị na-atụ anya ya kemgbe mezuru. A kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị n’Amerịka. Ihe a bụ afọ iri atọ na asatọ kemgbe anyị tinyere akwụkwọ ịga Betel nke mbụ ya. N’ọnwa na-eso ya, anyị malitere ije ozi na Betel. M chere na ihe ụmụnna ndị na-ahazi ọrụ ebe ahụ chọrọ bụ ka anyị nye aka obere oge, ma ọ bụghị ihe mechara mee.

Gloria bụ asampete, ma mgbe ahụ anyị lụrụ, ma ugbu a

Ebe mbụ m rụrụ ọrụ bụ na Ngalaba Ije Ozi. Amụtara m ọtụtụ ihe n’ọrụ ahụ. Ụmụnna na-arụ na ngalaba a na-aza ajụjụ dị iche iche gbara ọkpụrụkpụ ma taa akpụ ndị okenye na ndị nlekọta sekit nọ n’obodo ahụ na-ajụ. Obi dị m ụtọ na ụmụnna ndị nyere m ọzụzụ na Ngalaba Ije Ozi nweere m ndidi ma nyere m aka. E ziga m ebe ahụ ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe m ka ga-amụta.

Ije ozi na Betel na-atọ mụ na nwunye m ezigbo ụtọ. Anyị na-ebilikarị n’oge. O nyekwaara anyị aka n’ozi anyị na-eje na Betel. Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, m malitere inyere Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova aka. N’afọ 1999, a họpụtara m ka m soro n’Òtù Na-achị Isi. Amụtala m ọtụtụ ihe n’ọrụ a. Ma, ihe kachanụ m mụtara bụ otú o si doo anya na ọ bụ Jizọs, ọ bụghị mmadụ ọ bụla, bụ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst.

Kemgbe afọ 1999, enwere m ihe ùgwù iso n’Òtù Na-achị Isi

M chee banyere ndụ m, ya adị m otú ahụ ọ dị Emọs onye amụma. Jehova nwere mmasị n’ebe onye ọzụzụ atụrụ ahụ dị umeala n’obi nọ, onye ọrụ ya bụ ịrụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ, bụ́ nri e weere ka nri ndị ogbenye. Jehova họọrọ Emọs ka ọ bụrụ onye amụma ya ma gọzie ya nke ukwuu n’ọrụ ahụ. (Emọs 7:14, 15) Jehova nwekwara mmasị n’ebe mụnwa nọ, bụ́ nwa onye ọrụ ugbo na-enweghị ego na Libati, dị n’Indiana, ma gọzie m mmaji kwuru mmaji. (Ilu 10:22) Ná mmalite, adara m ogbenye, ma n’ikpeazụ, abara m ọgaranya n’ebe Chineke nọ karịa otú m tụrụ anya ya.