Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ distrikti e nwere n’obodo Niznya Apsha, dị na Yukren n’afọ 2012

Ihe Ubi Hiri Nne

Ihe Ubi Hiri Nne

JIZỌS kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ewe ihe ubi hiri nne n’oge ikpeazụ a. (Mat. 9:37; 24:14) Ka anyị lee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ụzọ pụrụ iche n’obodo Transkapatịa dị na Yukren. Naanị n’obodo atọ ndị dị obodo a nso, e nwere ọgbakọ iri ise, na ndị nkwusa karịrị puku ise na narị anọ. * Ihe magburu onwe ya n’ebe a bụ na e kee ndị nọ n’obodo ndị ahụ ụzọ anọ, otu ụzọ bụ Ndịàmà Jehova.

Olee otú ndị obodo a dị? Otu nwanna aha ya bụ Vasile kwuru, sị: “Ndị obodo a ji Baịbụl kpọrọ ihe, ha anaghị achọ iji anya ahụ ebe a na-emegbu mmadụ, ha hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya ma jiri obi ha niile na-enyere ndị ọzọ aka. Nwanna a kwukwara, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka ha na-ekweta n’ihe ndị anyị kweere. Ma i gosi ha ihe Baịbụl kwuru, ha na-ege ntị nke ọma.”

Ma, izi ozi ọma n’obodo ndị ahụ Ndịàmà Jehova buru ibu na ha anaghị adịrị ụmụnna anyị mfe. Dị ka ihe atụ, otu ọgbakọ nwere otu narị ndị nkwusa na iri atọ na anọ, ma ọ bụ naanị ụlọ iri ise dị n’ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Olee ihe na-enyere ndị nkwusa ndị ahụ aka?

Ọtụtụ ụmụnna na-agbalị aga ekwusa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Otu nwanna dị afọ iri itoolu aha ya bụ Ionash kwuru, sị: “Otu onye nkwusa ketara ụlọ abụọ izi ozi ọma. Ma, mgbe ahụ́ dị m, m na-ezi ozi ọma n’obodo anyị, na-agakwa ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii n’ebe a na-enweghị ọgbakọ e kenyere ikwusa ozi ọma. N’ebe ahụ, m na-eji asụsụ Họngerian ezi ndị mmadụ ozi ọma.” Ndị nkwusa kwesịrị ịgba mbọ gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị ọzọ. Nwanna Ionash kwukwara, sị: “M na-ebili n’elekere anọ nke ụtụtụ, ka m nwee ike iso ụgbọ okporo ígwè. M na-ezi ozi ọma ruo elekere isii nke anyasị mgbe ụgbọ okporo ígwè ahụ ga-alaghachi. M na-eme otú ahụ ugboro abụọ ma ọ bụ atọ n’izu.” Ọ̀ dị ya ka mbọ ndị ọ gbara furu ọhịa? Ọ sịrị: “Ụdị ozi ọma a tọrọ m ezigbo ụtọ. Obi dị m ụtọ na m nyeere otu ezinụlọ bi n’ebe ọgbakọ na-adịghị aka ịbata n’ọgbakọ.”

O doro anya na ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ndị dị n’ebe a ga-agali ebe dị anya izi ozi ọma. Ma mmadụ niile, ma ndị agadi, na-agbalị ịhụ na ha ziri mmadụ niile ozi ọma n’obodo ha. Ọ bụ ya mere na n’afọ 2017, a gụkọta ndị niile bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’obodo atọ ndị a, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpu abụọ nke ndị nkwusa e nwere n’obodo ndị ahụ, ya bụ, ọkara ndị niile bi n’obodo atọ ndị ahụ. O doro anya na ebe ọ bụla anyị nwere ike ịnọ na-eje ozi, a ka nwere ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.

^ para. 2 Aha obodo atọ ndị ahụ bụ Hilibọki Potik, Seredni Vodịani, na Niznya Apsha.