Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mara Onye Iro Gị

Mara Onye Iro Gị

‘Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ Setan.’—2 KỌR. 2:11.

ABỤ: 150, 32

1. N’Iden, olee ihe Jehova mere ka a mata banyere onye iro anyị?

ADAM ma na agwọ enweghị ike ikwu okwu. Ọ ga-abụ na ọ ghọtara na ọ bụ otu mmụọ mere ka agwọ ahụ gwa Iv okwu. (Jen. 3:1-6) Adam na Iv amachaghị onye mmụọ a bụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Adam kpachaara anya hapụ Nna ya nke eluigwe ma sonyere mmụọ a nupụrụ Chineke isi. (1 Tim. 2:14) Ozugbo ahụ, Jehova mere ka a matawa banyere onye iro a mere ka Adam na Iv nupụrụ ya isi, kwekwa nkwa na ọ ga-emecha bibie ya. Ma, Jehova kwuru na ka ọ dị ugbu a, mmụọ ahụ mere ka agwọ kwuo okwu ga-emegide ndị hụrụ Chineke n’anya.—Jen. 3:15.

2, 3. Gịnị ka ọ ga abụ ya mere e ji kwuo ihe ole na ole gbasara Setan tupu Mesaya abịa?

2 Jehova agwaghị anyị aha mmụọ ozi ahụ nupụụrụ ya isi. * Ọ bụ mgbe puku afọ abụọ na narị ise gachara e nupụụrụ ya isi ka o mere ka a mata onye ọ bụ. (Job 1:6) Utu aha e ji mara ya bụ “Setan,” nke pụtara “Onye mmegide.” Ọ bụ naanị akwụkwọ atọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka a kpọrọ ya Setan. Ha bụ 1 Ihe E Mere, Job, na Zekaraya. Gịnị mere e ji kwuo obere ihe banyere onye iro a tupu Mesaya abịa?

3 Jehova ekwughị ọtụtụ ihe gbasara Setan na ihe ndị ọ na-eme n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe mere o ji mee ka e dee Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ ka e jiri ya mata Mesaya ma duru ndị Chineke gakwuru ya. (Luk 24:44; Gal. 3:24) Mgbe Mesaya bịara, Jehova ji ya na ndị na-eso ụzọ ya mee ka a mata ọtụtụ ihe anyị ma taa banyere Setan na ndị mmụọ ozi so ya nupụrụ ya isi. * Ihe a Chineke mere dabara adaba ebe ọ bụ na Jehova ga-eji Jizọs na ndị ga-eso ya achị bibie Setan na ndị na-akwado ya.—Rom 16:20; Mkpu. 17:14; 20:10.

4. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-atụ Ekwensu ụjọ?

4 Pita onyeozi kọwara Setan bụ́ Ekwensu dị ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” Jọn akpọọ ya “agwọ” na “dragọn.” (1 Pita 5:8; Mkpu. 12:9) Ma anyị ekwesịghị ịna-atụ Ekwensu ụjọ n’ihi na e nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli. (Gụọ Jems 4:7.) Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi kwụ anyị n’azụ. Ha ga-enyere anyị aka imeri onye iro anyị. Ma, anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ atọ a dị ezigbo mkpa. Ha bụ: Olee otú Setan siruru n’ike? Olee otú Setan si agbalị iduhie ndị mmadụ? Olee ihe ndị ọ na-agaghị emeli? Ka anyị na-atụle ajụjụ ndị a, anyị ga-atụlekwa ihe ndị anyị ga-amụta na ha.

OLEE OTÚ SETAN SIRURU N’IKE?

5, 6. Olee ihe mere ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike igboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile?

5 Ụfọdụ ndị mmụọ ozi sonyeere Setan nupụrụ Chineke isi. Tupu Iju Mmiri ahụ, o mere ka ụfọdụ n’ime ha na ụmụ nwaanyị nwee mmekọahụ. Baịbụl mere ka anyị mata banyere ya mgbe o kwuru n’ụzọ ihe atụ na Setan dọkpụụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando ndị dị n’eluigwe. (Jen. 6:1-4; Jud 6; Mkpu. 12:3, 4) Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ezinụlọ Chineke, ọ bụzi Setan na-achị ha. Anyị ekwesịghị iche na a hazighị ndị mmụọ ozi ndị ahụ nupụrụ isi ahazi. Setan hiwere alaeze ya a na-anaghị ahụ anya ka o yie nke Chineke. O mere onwe ya eze, hazie ndị mmụọ ọjọọ ndị ahụ, nye ha ikike, ma mee ka ha na-achị ụwa.—Efe. 6:12.

6 Setan na-eji ndị mmụọ ọjọọ ndị a ọ haziri eduzi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ mgbe o gosiri Jizọs “alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi” ma gwa ya, sị: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya.” (Luk 4:5, 6) Ọtụtụ gọọmenti na-agbalị imere ndị ha na-achị ihe ọma n’agbanyeghị otú Setan si agbalị iduhie ha. Ụfọdụ ndị ọchịchị na-achọkwa inyere ndị mmadụ aka. Ma, o nweghị ọchịchị ma ọ bụ onye ọchịchị nwere ike igboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile.—Ọma 146:3, 4; Mkpu. 12:12.

7. Olee otú Setan si eji okpukpe ụgha na achụmnta ego ụwa eduhie ndị mmadụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ejikwa okpukpe ụgha na achụmnta ego ụwa “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Setan na-eji okpukpe ụgha na-agwa ndị mmadụ ihe na-abụghị eziokwu banyere Jehova. O yiri ka Ekwensu ò fooro ntụtụ taa na ya ga-eme ka ọtụtụ mmadụ chefuo aha Chineke. (Jere. 23:26, 27) Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị ji na-efe ndị mmụọ ọjọọ na-eche na ọ bụ Chineke ka ha na-efe. (1 Kọr. 10:20; 2 Kọr. 11:13-15) Setan na-ejikwa achụmnta ego ụwa na-eduhie ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, ihe a na-akụzi n’ụwa taa bụ na ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ ịchụ ego na inweta ọtụtụ ihe. (Ilu 18:11) Ndị kwetara n’ụgha ahụ na-eji ndụ ha niile na-agbara “Akụnụba” ohu kama ife Chineke. (Mat. 6:24) N’ikpeazụ, otú ha si hụ akụnụba n’anya ga-eme ka ha gharazie ịhụ Chineke n’anya.—Mat. 13:22; 1 Jọn 2:15, 16.

8, 9. (a) Olee ihe abụọ anyị na-amụta n’akụkọ Adam, Iv na ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi? (b) Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị mata otú Setan siruru n’ike?

8 Akụkọ Adam, Iv na ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi na-akụziri anyị ma ọ dịghị ihe ọzọ, ihe abụọ dị ezigbo mkpa. Nke mbụ, e nwere naanị ụzọ abụọ dịnụ, anyị ga-ahọrọrịrị otu. Ma ọ̀ bụghị Jehova ka anyị họọrọ irubere isi, ya abụrụ Setan. (Mat. 7:13) Nke abụọ, ndị họọrọ irubere Setan isi anaghị erite ezigbo uru. Adam na Iv jizi aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ndị mmụọ ọjọọ ahụ enwetatụ ikike ịgwa ndị ọchịchị ihe ha ga-eme. (Jen. 3:22) Ma, ime ihe Setan kwuru na-akpatakarị nsogbu. E nweghị mgbe ọ na-aba ezigbo uru.—Job 21:7-17; Gal. 6:7, 8.

9 Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị mata otú Setan siruru n’ike? Ọ na-enyere anyị aka ile ndị ọchịchị anya otú kwesịrị ekwesị, ma mee ka anyị na-ekwusa ozi ọma. Anyị ma na Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. (1 Pita 2:17) Ọ chọkwara ka anyị na-erubere iwu ha isi ọ bụrụhaala na iwu ndị ahụ emegideghị nke ya. (Rom 13:1-4) Ma, anyị ghọtara na anyị ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ekwesịtụdịghị ịdụnyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ onye ọchịchị ọ bụla úkwù. (Jọn 17:15, 16; 18:36) Ebe anyị ma na Setan chọrọ ime ka ndị mmadụ ghara ịma aha Jehova ma mee ka a na-ekwujọ ya, anyị na-agbalị ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-aza aha Chineke, na-akpọkwa aha ya. Ịhụ Chineke n’anya na-aba ezigbo uru karịa ego na ihe onwunwe.—Aịza. 43:10; 1 Tim. 6:6-10.

OLEE OTÚ SETAN SI AGBALỊ IDUHIE NDỊ MMADỤ?

10-12. (a) Olee otú Setan si mee ka ụfọdụ ndị mmụọ ozi nupụrụ Chineke isi? (b) Gịnị ka anyị na-amụta n’otú ọtụtụ ndị mmụọ ozi si nupụ isi?

10 Setan na-eji ihe ndị o jirila duhie ọtụtụ mmadụ, na-eduhie ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji ihe na-amasị ndị mmadụ na-arata ha ịna-eme ihe ọ chọrọ. Ọ na-eyikwa ha egwu ka ha rubere ya isi.

11 Setan ji ihe nwere ike ịmasị ọtụtụ ndị mmụọ ozi nwaa ha ọnwụnwa. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-ele ha anya kemgbe iji mata ihe o nwere ike iji nwata ha. Ụfọdụ n’ime ndị mmụọ ozi kwere ka Setan nwata ha, ha na ụmụ nwaanyị enwee mmekọahụ. Ụmụ ha mụtara gbara ajọ dimkpa ma na-emesi ndị mmadụ ike. (Jen. 6:1-4) O nwere ike ịbụ na ihe Setan ji nwaa ndị mmụọ ozi ahụ abụghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ ga-abụkwa na o kwere ha nkwa na ha ga-achị ụmụ mmadụ. Ọ ga-abụ na ihe o bu n’obi bụ ime ka nkwa Chineke kwere banyere ọbịbịa nke ‘mkpụrụ nke nwaanyị ahụ’ kụọ afọ n’ala. (Jen. 3:15) Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, Jehova ji Iju Mmiri ahụ kụghasịa nkata ahụ niile Setan na ndị mmụọ ọjọọ ahụ kpara.

Setan na-agba mbọ iji omume rụrụ arụ, mpako, na anwansi rata anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12 Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a merenụ? Echekwala na Setan enweghị ike iji mmekọahụ na mpako rata gị. Ndị mmụọ ozi ahụ sonyeere Setan fere Chineke ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị mmụọ ozi kwere ka ọchịchọ ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi ha ma too. O nwekwara ike ịbụ na anyịnwa efeela Chineke ruo ọtụtụ afọ. Ma, n’agbanyeghị na anyị nọ n’ọgbakọ Chineke dị ọcha, ihe ọjọọ nwere ike gbaa mgbọrọgwụ n’obi anyị. (1 Kọr. 10:12) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị na-enyocha obi anyị, ghara ịna-eche ihe rụrụ arụ, gharakwa ịchọ ịdị mpako.— Gal. 5:26; gụọ Ndị Kọlọsi 3:5.

13. Olee ihe ọzọ Setan na-eji arata ndị mmadụ? Olee otu anyị nwere ike isi agbara ya ọsọ?

13 Ihe ọzọ Setan na-eji anwa ndị mmadụ bụ anwansi. Taa, ọ na-eji okpukpe ụgha na ihe ndị e ji atụrụ ndụ eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ndị mmụọ ọjọọ nọ. Ihe ndị a na-egosi na fim, egwuregwu kọmputa nakwa ihe ndị ọzọ e ji atụrụ ndụ na-eme ka ime anwansi yie ihe dị mma. Olee otú anyị ga-esi zere ịdaba n’ọnyà a? Anyị ekwesịghị ịtụ anya ka nzukọ Jehova depụtara anyị ihe niile dị mma e ji atụrụ ndụ na ndị nke na-adịghị mma. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịzụ akọnuche ya azụ ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma otú Chineke chọrọ. (Hib. 5:14) Ma, anyị ga-eme mkpebi dị mma ma anyị mee ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị ka anyị mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ “ghara ịbụ nke ihu abụọ.” (Rom 12:9) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe m ji atụrụ ndụ ọ̀ ga-eme ka m yie onye ihu abụọ? Ọ bụrụ na ndị m na-amụrụ Baịbụl ma ọ bụ na-agara nletaghachi ahụ ihe m ji atụrụ ndụ, hà nwere ike ịna-eche na m na-eme ihe m na-akụziri ha?’ Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị na-akụziri ndị mmadụ, ọ ga-esi ike Setan ịrata anyị.—1 Jọn 3:18.

Setan na-eji ndị ọchịchị ịmachibido anyị iwu, nsogbu ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-enye anyị na ndị ezinụlọ anyị imegide anyị, emenye anyị egwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee otú Setan nwere ike isi eyi anyị egwu? Olee ihe anyị ga-eme ka Setan ghara inweta anyị?

14 Setan na-emenyekwa anyị egwu ka anyị kwụsị ife Jehova. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ndị ọchịchị machie anyị ikwusa ozi ọma. O nwekwara ike ime ka ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-akwa anyị emo n’ihi na anyị na-achọ ime ihe Baịbụl kwuru. (1 Pita 4:4) O nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndị Kraịst, ndị buuru anyị ihe ọma n’obi, na-agwa anyị ka anyị kwụsị ịga ọmụmụ ihe. (Mat. 10:36) Olee ihe anyị ga-eme ka Setan ghara inweta anyị? Nke mbụ bụ na o kwesịghị iju anyị anya n’ihi na anyị ma na Setan na-alụso anyị ọgụ. (Mkpu. 2:10; 12:17) Anyị kwesịkwara icheta otu ihe dị ezigbo mkpa. Ihe ahụ bụ na Setan na-ekwu na anyị na-efe Chineke naanị mgbe ihe dịịrị anyị mma, ma ihe siere anyị ike, anyị akwụsị ife ya. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Nke ikpeazụ abụrụ na anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nye anyị ike anyị ga-eji merie Setan. Ka anyị buru n’obi na o nweghị ihe ga-eme ka Jehova hapụ anyị.—Hib. 13:5.

OLEE IHE NDỊ SETAN NA-AGAGHỊ EMELI?

15. Setan ò nwere ike ime ka anyị mee ihe anyị na-achọghị ime? Kọwaa.

15 Setan enweghị ike ịmanye ndị mmadụ ka ha mee ihe ha na-achọghị ime. (Jems 1:14) Ma, ụfọdụ ndị na-eme ihe Setan chọrọ n’amaghị ama. Ma ọ bụrụ na ha amụta eziokwu Baịbụl, ha ga-ejizi aka ha kpebie ma hà ga-efe Jehova ka ọ bụ Ekwensu. (Ọrụ 3:17; 17:30) Ọ bụrụ na anyị ekpebie ife Chineke, o nweghị ihe Setan ga-eme ka anyị kwụsị ife Chineke.—Job 2:3; 27:5.

16, 17. (a) Olee ihe ndị ọzọ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agaghị emeli? (b) Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ikpe ekpere n’olu dara ụda?

16 E nwere ihe ndị ọzọ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, e nweghị ebe Baịbụl kwuru na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwere ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi. Ọ bụ naanị Jehova na Jizọs ka Baịbụl kwuru nwere ike ime otú ahụ. (1 Sam. 16:7; Mak 2:8) Oleekwanụ maka ikwu okwu ma ọ bụ ikpe ekpere n’olu dara ụda? Ànyị kwesịrị ịtụ ụjọ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwere ike ịnụ ihe anyị na-ekpe n’ekpere ma mebiere anyị ihe? Mbanụ. Maka gịnị? Anyị anaghị atụ ụjọ ime ihe ọma n’ozi Jehova n’ihi na Setan nwere ike ịhụ anyị. Otú ahụkwa ka anyị na-ekwesịghị ịtụ ụjọ ikpe ekpere n’olu dara ụda n’ihi na Ekwensu nwere ike ịnụ ihe anyị na-ekpe n’ekpere. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na e nwere ọtụtụ ndị ohu Chineke kpere ekpere n’olu dara ụda, ma e nweghị ebe o kwuru na ha tụrụ ụjọ na Ekwensu ga-anụ ihe ha na-ekpe n’ekpere. (1 Eze 8:22, 23; Jọn 11:41, 42; Ọrụ 4:23, 24) Ọ bụrụ na anyị ana-ekwu ma na-eme ihe bụ́ uche Chineke, obi ga-esi anyị ike na Jehova agaghị ekwe ka Ekwensu mee anyị ihe Jehova na-agaghị emezili.—Gụọ Abụ Ọma 34:7.

17 Anyị kwesịrị ịmara onye iro anyị, ma anyị ekwesịghị ịtụ ya egwu. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova ga-enyere anyị aka imeri Setan. (1 Jọn 2:14) Ọ bụrụ na anyị eguzogide ya, ọ ga-agbapụ n’ebe anyị nọ. (Jems 4:7; 1 Pita 5:9) O yiri ka ọ̀ bụ ndị na-eto eto ka Setan lekwasịrị anya karịchaa. Olee ihe ndị ha kwesịrị ime ka ha guzogide Ekwensu? Anyị ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 2 Baịbụl gwara anyị aha ndị mmụọ ozi ụfọdụ. (Ikpe 13:18; Dan. 8:16; Luk 1:19; Mkpu. 12:7) Jehova gụrụ kpakpando nke ọ bụla aha. (Ọma 147:4) N’ihi ya, ọ dịghị njọ iche na ndị mmụọ ozi niile, ma onye nke mechara ghọọ Setan, nwere aha.

^ para. 3 A kpọrọ Setan aha ugboro iri na asatọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma kpọọ ya ihe karịrị ugboro iri atọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.