ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mee 2020

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Julaị 6 ruo Ọgọst 2, 2020.

Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ

Isiokwu a na-amụ amụ nke 19: Julaị 6-12, 2020. Anyị na-ahụ ihe gosiri na amụma Daniel gbasara “eze ugwu” na “eze ndịda” na-emezu. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ọ na-emezu? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta amụma ahụ nke ọma?

Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ

Amụma ndị e buru banyere “eze ugwu” na “eze ndịda” mezuru n’oge amụma ndị ọzọ e buru mezuru. Olee otú amụma ndị a si egosi na ụwa ochie ga-abịa ná njedebe n’oge na-adịghị anya?

Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?

Isiokwu a na-amụ amụ nke 20: Julaị 13-19, 2020. Ònye bụ “eze ugwu” taa, oleekwa otú a ga-esi bibie ya? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, nyekwara anyị aka ijikere maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị Chineke Nyere Gị?

Isiokwu a na-amụ amụ nke 21: Julaị 20-26, 2020. Isiokwu a ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka anyị na-ekele ya maka onyinye ụfọdụ o nyere anyị. Ọ ga-emekwa ka anyị mara otú anyị ga-esi enyere ndị na-ekweghị na Chineke dị aka.

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị A Na-anaghị Ahụ Anya

Isiokwu a na-amụ amụ nke 22: Julaị 27 ruo Ọgọst 2, 2020. N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru gbasara ụfọdụ onyinye ndị anyị na-ahụ anya Chineke nyere anyị. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara onyinye ndị anyị na-enweghị ike ịhụ anya Chineke nyere anyị nakwa ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ha. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-egosikwu Jehova Chineke na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ọma ndị a o nyere anyị.