Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Nwayọọ—Olee Uru Ọ Na-abara Anyị?

Ịdị Nwayọọ—Olee Uru Ọ Na-abara Anyị?

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sara * kwuru, sị: “Abụ m onye ihere. Obi anaghịkwa aka m. N’ihi ya, obi anaghị eru m ala ma mụ na ndị iwe ọkụ na ndị na-anaghị ekwe ekwe nọrọ. Ma, obi na-eru m ala ma mụ na onye dị umeala n’obi na onye dị nwayọọ nọrọ. M nwere ike ịkọrọ ụdị onye ahụ otú obi dị m na nsogbu ndị m nwere. Ọ bụ ụdị àgwà a ka ndị mụ na ha bụ ezigbo enyi na-akpa.”

Ihe Sara kwuru gosiri na anyị dịrị nwayọọ, ọ ga-eme ka ndị ọzọ chọọ ka anyị na ha bụrụ enyi. Obi na-atọkwa Jehova ụtọ ma anyị dịrị nwayọọ. Okwu ya gwara anyị, sị: ‘Yirinụ ịdị nwayọọ dị ka uwe.’ (Kọl. 3:12) Gịnị bụ ịdị nwayọọ? Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị nwayọọ? Olee otú ịdị nwayọọ ga-esi mee ka anyị na-enwekwu obi ụtọ?

GỊNỊ BỤ ỊDỊ NWAYỌỌ?

Ịdị nwayọọ bụ àgwà na-egosi na mmadụ bụ onye udo. Onye dị nwayọọ na-emeda obi ma ya na ndị ọzọ mekọwa ihe, na-eji obiọma emeso ha ihe, na-ejidekwa onwe ya ma a kpasuo ya iwe.

Mmadụ ịdị nwayọọ apụtaghị na ọ dịghị ike. E ji okwu Grik a sụgharịrị “ịdị nwayọọ” akọwa ịnyịnya ọhịa a zụrụ azụ. Ịnyịnya ahụ ka siri ike, ma a zụọla ya ijide onwe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa, ọ bụrụ na anyị adị nwayọọ, anyị ga na-ejide onwe anyị, na-emekwa ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo.

Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Kemgbe ụwa, adịghị m nwayọọ.’ Anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị bụ ndị iwe ọkụ na ndị na-anaghị enwe ndidi. N’ihi ya, o nwere ike isiri anyị ezigbo ike ịdị nwayọọ. (Rom 7:19) O doro anya na anyị kwesịrị ịgba ezigbo mbọ iji dịrị nwayọọ. Ma, mmụọ nsọ Jehova ga-enyere anyị aka ịna-agbalị ịdị nwayọọ. (Gal. 5:22, 23) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agbalị ịdị nwayọọ?

Ndị mmadụ ga-achọ ịbụ enyi anyị ma anyị dịrị nwayọọ. Obi na-eru anyị ala ma anyị na ndị dị nwayọọ nọrọ otú ahụ ọ na-adị Sara anyị kwuburu okwu ya. Jizọs bụ onye e ji ama atụ ma a bịa n’ịdị nwayọọ na ịdị obiọma. (2 Kọr. 10:1) Ọ bụ ya mere ụmụaka ji na-achọ ịbịa ya nso, ma ndị nke na-amachaghị ya.—Mak 10:13-16.

Anyị dịrị nwayọọ, ọ ga-abara ma anyị ma ndị ọzọ uru. Anyị dịrị nwayọọ, anyị agaghị na-ewe iwe ọsọ ọsọ ma ọ bụ jiri iwe na-emeso ndị ọzọ ihe. (Ilu 16:32) Ọ ga-eme ka anyị ghara ịkwa mmakwaara n’ihi ihe ọjọọ anyị mere mmadụ, karịchaa, onye anyị hụrụ n’anya. Ọ ga-abakwara ndị ọzọ uru n’ihi na ọ ga-eme ka anyị jide onwe anyị ma ghara ime ihe ga-ewute ha.

ONYE KACHA DỊRỊ NWAYỌỌ

N’agbanyeghị na Jizọs nwere ọtụtụ ihe ọ na-eme, ọ na-emeda obi ma o mesowe mmadụ niile ihe. Ọtụtụ ndị n’oge ahụ nọ n’ahụhụ, na-adọgbukwa onwe ha n’ọrụ. Ha chọkwara inweta ume. Obi ruru ha ala mgbe Jizọs sịrị ha: “Bịakwutenụ m, . . . n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.”—Mat. 11:28, 29.

Olee otú anyị ga-esi mụta ịna-adị nwayọọ ka Jizọs? Anyị ga-amụ Okwu Chineke ka anyị mụta otú Jizọs si meso ndị mmadụ ihe nakwa ihe o mere mgbe ihe siiri ya ike. Ọ bụrụzie na ihe esiere anyị ike, anyị ga-agbalịsi ike dịrị nwayọọ ka Jizọs. (1 Pita 2:21) Ka anyị lee ihe atọ nyeere Jizọs aka ịdị nwayọọ.

Jizọs dị umeala n’obi. Jizọs kwuru na ya “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:29) Baịbụl na-ekwukarị banyere ịdị nwayọọ na ịdị umeala n’obi otu mgbe n’ihi na e nwere ihe jikọrọ ha abụọ.—Efe. 4:1-3.

Ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ ma mmadụ kwuo ihe na-adịghị mma gbasara anyị. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị mmadụ boro ya ebubo na “ọ bụ onye oké nri, nke na-aṅụkwa oké mmanya”? O si n’omume ya gosi na ihe ha kwuru abụghị eziokwu. O medara obi gwa ha, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.”—Mat. 11:19.

Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo okwu ọjọọ gbasara gị n’ihi agbụrụ gị, obodo gị ma ọ bụkwanụ n’ihi na ị bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, gbalịa dịrị nwayọọ. Otu okenye bi na Saụt Afrịka kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo ihe were m iwe, m na-ajụ onwe m, sị, ‘Ọ bụrụ Jizọs, gịnị ka ọ ga-eme?’” O kwukwara, sị: “Amụtala m otú m ga-esi na-ejide onwe m ma mmadụ kpasuo m iwe.”

Jizọs ghọtara na ụmụ mmadụ ezughị okè. Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-achọ ime ihe dị mma. Ma mgbe ụfọdụ, ezughị okè na-eme ka ha ghara ime ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, n’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, Pita, Jems, na Jọn ekweghị amụ anya otú Jizọs gwara ha ka ha mee. Jizọs kwuru ihe gosiri na ya ghọtara ihe mere ụra ji buru ha. Ọ sịrị: “Mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” (Mat. 26:40, 41) Ọ bụ ihe a mere ka Jizọs ghara iwere ndịozi ya iwe.

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mandy na-akatọkarị ndị ọzọ na mbụ. Ma ugbu a, ọ na-agbalịsi ike ịna-adị nwayọọ ka Jizọs. Ọ sịrị: “M na-agbalị icheta na mmadụ niile ezughị okè. M na-elekwasịkwa anya n’ebe ndị mmadụ na-eme nke ọma otú ahụ Jehova na-eme.” Ọ̀ bụ na otú Jizọs si eji ọmịiko emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè ekwesịghị ime ka ị na-emeda obi ma gị na ndị ọzọ mekọwa ihe?

Jizọs tụkwasịrị Chineke obi. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị mmadụ mejọrọ ya. Ha ghọtahiere ya, kpọọ ya asị, mekpaakwa ya ahụ́. N’agbanyeghị ya, ọ kwụsịghị ịdị nwayọọ n’ihi na “ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Jizọs ma na Nna ya nke eluigwe ga-enyere ya aka idi ihe ndị ahụ ma taa ndị ahụ mejọrọ ya ahụhụ mgbe oge ya ruru.

Ọ bụrụ na e mejọọ anyị, anyị ejiri iwe megwara, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji gwa anyị, sị: “Iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.” (Jems 1:20) Ọ bụrụgodị na e mejọrọ anyị, iwe nwere ike ime ka anyị mejọọ ihe n’ihi na anyị ezughị okè.

Otu nwanna nwaanyị bi na Jamanị aha ya bụ Cathy na-echebu, sị: ‘Ọ bụrụ na ị lụrụghị onwe gị ọgụ, o nweghị onye ga-alụrụ gị ya.’ Ma, mgbe ọ mụtara ịtụkwasị Jehova obi, ọ kwụsịrị iche otú ahụ. Ọ sịrị: “Anaghịzi m achọkarị ịna-alụrụ onwe m ọgụ. M na-adịzi nwayọọ n’ihi na m ma na Jehova ga-emezi ihe ọ bụla mebirinụ.” Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe e mejọrọ gị, ịtụkwasị Chineke obi otú ahụ Jizọs mere ga-enyere gị aka ịna-adị nwayọọ.

“OBI ỤTỌ NA-ADỊRỊ NDỊ DỊ NWAYỌỌ N’OBI”

Olee otú ịdị nwayọọ ga-esi nyere anyị aka mgbe ihe siri ike?

Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịdị nwayọọ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi.” (Mat. 5:5) Ka anyị tụlee otú ịdị nwayọọ ga-esi enyere anyị aka n’ihe ndị na-esonụ.

Ịdị nwayọọ na-eme ka esemokwu di na nwunye belata. Otu nwanna bi n’Ọstrelia aha ya bụ Robert kwuru, sị: “Agwala m nwunye m ọtụtụ okwu ọjọọ na-esikwanụghị m n’obi. Ma mmadụ jiri iwe kwuo okwu ọjọọ, o nweghịzi ihe ọ ga-emeli gbasara ya. Obi jọrọ m ezigbo njọ mgbe m hụrụ otú o si wute ya.”

“Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro” n’okwu ọnụ. Okwu a na-echeghị echiche kwuo nwere ike ime ka di na nwunye see okwu. (Jems 3:2) Ụdị ihe ahụ mee, ịdị nwayọọ ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị.—Ilu 17:27.

Robert gbalịsiri ike mụta ịdị nwayọọ na ịna-ejide onwe ya. Olee uru ọ baara ya? Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla mụ na nwunye m nwere nghọtahie, m na-agbalị gee ya ntị nke ọma ma jiri nwayọọ na-agwa ya okwu. Anaghịkwa m ekwe ka iwe wee m. O meela ka mụ na ya dịkwuo ná mma.”

Ịdị nwayọọ na-eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma. Ọ na-esiri ndị na-ewe iwe ọsọ ọsọ ike imeta ọtụtụ ndị enyi. Ịdị nwayọọ ga-enyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo. (Efe. 4:2, 3) Cathy anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ịdị nwayọọ emeela ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo n’agbanyeghị na o nwere ndị àgwà ha na-eme ka o sie ike ha na mmadụ ịdị n’udo.”

Ịdị nwayọọ na-eme ka obi ruo mmadụ ala. Baịbụl kwuru na o nwere ihe jikọrọ “amamihe nke si n’elu” na ịdị nwayọọ na udo. (Jems 3:13, 17) Onye dị nwayọọ na-enwe “obi dị jụụ.” (Ilu 14:30) E nwere otu nwoke aha ya bụ Martin. Ọ gbalịsiela ike mụta ịna-adị nwayọọ. Ọ sịrị: “Ugbu a, anaghịzi m esi ọnwụ na a ga na-eme ihe m chọrọ. Obi na-eruzi m ala, mụ ana-enwekwa obi ụtọ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịna-esiri anyị ike ịna-adị nwayọọ. Otu nwanna sịrị: “Ịgwa gị eziokwu, ruokwa taa, e nwere mgbe ụfọdụ iwe na-eju m obi.” Ma, Jehova onye na-agwa anyị ka anyị na-adị nwayọọ ga-enyere anyị aka ịdị nwayọọ. (Aịza. 41:10; 1 Tim. 6:11) Ọ ‘ga-enyesịli anyị ọzụzụ anyị n’onwe ya, meekwa ka anyị sie ike.’ (1 Pita 5:10) Ka oge na-aga, anyị ga na-adị “nwayọọ,” na-enwekwa “obiọma nke Kraịst” otú ahụ Pọl mere.—2 Kọr. 10:1.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.