Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị A Na-anaghị Ahụ Anya

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Ndị A Na-anaghị Ahụ Anya

“[Na-elekwasị] anya . . . n’ihe a na-adịghị ahụ anya. N’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge, ma ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.”—2 KỌR. 4:18.

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere akụ̀ a kpakọbara n’eluigwe?

Ọ BỤGHỊ ihe niile Chineke nyere anyị ka anyị nwere ike ịhụ anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na a naghị ahụ onyinye ndị kachanụ Chineke nyere anyị anya. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru gbasara onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa karịa akụnụba. O kwuziri, sị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Mat. 6:19-21) Anyị na-agbalị inweta ihe ndị anyị weere ka ihe ndị bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị ná mma, ‘anyị na-akpakọbara onwe anyị akụ̀ n’eluigwe.’ Jizọs kwuru na o nweghị ihe nwere ike imebi ụdị akụ́ a, a gaghịkwanụ ezuruli ya n’ohi.

2. (a) Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 4:17, 18, olee ihe Pọl gwara anyị ka anyị na-elekwasị anya na ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị na-elekwasị anya “n’ihe a na-adịghị ahụ anya.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:17, 18.) Ihe ndị so n’ihe ndị a na-adịghị ahụ anya bụ ihe ọma ndị Chineke ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle akụ̀ anọ a na-anaghị ahụ anya ndị na-abara anyị uru ugbu a. Ha bụ: Enyi anyị na Chineke bụ, ekpere, mmụọ nsọ Chineke, na aka Jehova, Jizọs, na ndị mmụọ ozi na-enyere anyị n’ozi anyị. Anyị ga-atụlekwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a a na-anaghị ahụ anya.

ENYI ANYỊ NA JEHOVA BỤ

3. Gịnị bụ onyinye kachanụ a na-anaghị ahụ anya, gịnịkwa mere o ji kwe omume?

3 Onyinye kachanụ a na-anaghị ahụ anya bụ enyi anyị na Chineke bụ. (Ọma 25:14) Olee otú o si kwe omume na Chineke na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ịbụ enyi, ya aka dịrịkwa nsọ? Ihe mere ya bụ na àjà ahụ Jizọs chụrụ “na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Tupu Jizọs anwụọ, Jehova ma na ọ ga-erubere ya isi ruo ọnwụ, nke ga-eme ka a napụta ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Chineke na ụmụ mmadụ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs anwụọ nwere ike iji bụrụ enyi.—Rom 3:25.

4. Olee ụfọdụ ndị ha na Chineke bụ enyi tupu Jizọs abịa n’ụwa?

4 Chegodị gbasara ụfọdụ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa ndị ha na Chineke bụ enyi. Ebreham nwere okwukwe siri ezigbo ike. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ ọ nwụrụ gachara, Jehova kpọrọ ya “enyi m.” (Aịza. 41:8) Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ nwụgodị, Jehova ka na-ewere ya ka ezigbo enyi ya. Ebreham ka dị ndụ n’anya Chineke. (Luk 20:37, 38) Onye ọzọ bụ Job. Jehova nọ n’ihu ndị mmụọ ozi ya n’eluigwe kwuo okwu ọma banyere Job. Jehova kwuru na Job bụ ‘nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye ezi omume, onye na-atụ egwu Chineke, na onye na-anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.’ (Job 1:6-8) Olee otú Jehova si were Daniel bụ́ onye fere ya ruo ihe dị ka iri afọ asatọ n’obodo ndị na-ekpere arụsị? Ndị mmụọ ozi gwara ya ugboro atọ na ọ bụ “onye [Chineke] hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 9:23; 10:11, 19) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị enyi ya ndị ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.—Job 14:15.

Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a na-anaghị ahụ anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi?

5 Mmadụ ole na-ezughị okè ka ha na Chineke bụ enyi taa? Ha dị ọtụtụ nde. Ihe mere anyị ji mara bụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, nakwa ụmụaka nọ n’ụwa taa àgwà ha na-egosi na ha chọrọ ịbụ enyi Chineke. Jehova na “ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Ilu 3:32) Ha na ya nwere ike ịbụ enyi n’ihi na ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs chụrụ. N’ihi àjà ahụ, anyị nwere ike inyefe Chineke onwe anyị, meekwa baptizim. Anyị mee ihe ndị a, anyị ga-esoro ndị ọzọ nyefere Chineke onwe ha e mere baptizim bụrụ ezi ndị enyi Onye kachanụ n’eluigwe na n’ụwa.

6. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji enyi anyị na Chineke bụ kpọrọ ihe?

6 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji enyi anyị na Chineke bụ kpọrọ ihe? Anyị kwesịrị ịna-erubere Jehova isi n’agbanyeghị afọ ole anyị ferela ya n’ụwa ochie a otú ahụ Ebreham na Job fere ya ruo ihe karịrị otu narị afọ. Anyị ga-ejikwa enyi anyị na Chineke bụ kpọrọ ihe karịa ndụ anyị otú ahụ Daniel mere. (Dan. 6:7, 10, 16, 22) Jehova ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị ka anyị na ya nọgide bụrụ ezigbo enyi.—Fil. 4:13.

EKPERE

7. (a) Dị ka e kwuru n’Ilu 15:8, olee otú obi na-adị Jehova ịnụ ekpere anyị? (b) Olee otú Jehova si aza ekpere anyị?

7 Onyinye ọzọ a na-anaghị ahụ anya bụ ekpere. Ndị bụ́ ezigbo enyi na-agwa ibe ha ihe dị ha n’obi. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị anyị na Chineke? Ee. Jehova na-eji Okwu ya agwa anyị okwu. Ọ na-eji ya eme ka anyị mata ihe dị ya n’obi. Anyị nwere ike ịgwa ya ihe dị anyị n’obi n’ekpere. Obi na-adị Jehova ụtọ ige ntị n’ekpere anyị. (Gụọ Ilu 15:8.) Ebe Jehova bụ ezigbo enyi anyị, ihe ọ na-eme abụghị naanị ige ntị n’ekpere anyị, ọ na-azakwa ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-aza anyị ya ozugbo. Mgbe ụfọdụkwa, anyị nwere ike ikpe ekpere ọtụtụ ugboro maka otu ihe. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-aza anyị ekpere anyị n’oge kwesịrị ekwesị nakwa n’ụzọ kacha mma. N’eziokwu, Chineke nwere ike isi otú anyị na-atụghị anya ya za anyị ekpere. Dị ka ihe atụ, kama iwepụrụ anyị ọnwụnwa, o nwere ike inye anyị amamihe na ike ka anyị “nwee ike idi ya.”—1 Kọr. 10:13.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikpe ekpere?

8 Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a magburu onwe ya bụ́ ikpe ekpere? Otu ụzọ bụ ime ihe Jehova gwara anyị nke bụ́ “na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Tesa. 5:17) Jehova anaghị amanye anyị ikpe ekpere. Kama, ọ chọrọ ka anyị jiri aka anyị kpebie ikpe ekpere. Ọ gwara anyị ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere.’ (Rom 12:12) N’ihi ya, otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a bụ ịna-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị. Anyị kwesịkwara ịna-ekele Jehova ma na-eto ya ma anyị kpewe ekpere.—Ọma 145:2, 3.

9. Olee ihe otu nwanna kwuru gbasara ekpere? Oleekwanụ ihe gịnwa chere gbasara ekpere?

9 Ka anyị na-efe Chineke na-aga, na-ahụkwa otú o si na-aza anyị ekpere, ka anyị na-enwekwu obi ụtọ maka onyinye ikpe ekpere o nyere anyị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Chris nọ n’ozi oge niile kemgbe iri afọ anọ na asaa. O kwuru, sị: “Obi na-atọgbu m atọgbu ibili n’isi ụtụtụ meda obi kpee ekpere. Ọ na-eme m obi ụtọ ịgwa Jehova okwu mgbe ahụ anyanwụ na-awa, ebe niile mara mma. Ihe a na-eme ka m na-ekele ya maka onyinye ndị o nyere m, ma ekpere. M kpechaa ekpere ma m lakpuwe, obi na-adị m ụtọ iji akọnuche dị ọcha laba.”

MMỤỌ NSỌ

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jiri mmụọ nsọ Chineke kpọrọ ihe?

10 Mmụọ nsọ Chineke bụ onyinye ọzọ a na-anaghị ahụ anya anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe. Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ. (Luk 11:9, 13) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7; Ọrụ 1:8) Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Olee ụzọ mmụọ nsọ nwere ike isi nyere anyị aka?

11 Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka ịrụ ọrụ ndị e nyere anyị n’ozi Jehova. Mmụọ nsọ nwekwara ike ime ka anyị na-emekwu nke ọma n’ọrụ anyị. Anyị ma na ihe mere anyị ji enwe ike ime ihe ndị anyị na-eme n’ozi Jehova bụ na mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka.

12. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 139:23, 24, gịnị ka anyị nwere ike ikpe n’ekpere ka mmụọ nsọ nyere anyị aka ime?

12 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị ji mmụọ nsọ kpọrọ ihe bụ ịna-ekpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ịchọpụta echiche ma ọ bụ ọchịchọ na-ezighị ezi dị anyị n’obi. (Gụọ Abụ Ọma 139:23, 24.) Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova maka ya, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya mee ka anyị chọpụta echiche ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị nwere echiche ma ọ bụ ọchịchọ na-ezighị ezi, anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o jiri mmụọ nsọ nye anyị ike iwepụ ya n’obi anyị. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-ahụ na anyị achọghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka ọ kwụsị iji mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka.—Efe. 4:30.

13. Olee otú anyị nwere ike isi gosikwuo na obi dị anyị ụtọ maka mmụọ nsọ?

13 Anyị nwekwara ike igosikwu na obi dị anyị ụtọ maka mmụọ nsọ ma anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị o nyeerela anyị aka ime n’oge anyị a. Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ihe a e kwuru na-eme taa. Mmụọ nsọ enyela aka mee ka e nwee ihe dị ka nde mmadụ asatọ na ọkara si ebe dị iche iche n’ụwa na-efe Jehova. Ihe ọzọkwa bụ na anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dị n’udo n’ihi na mmụọ nsọ enyerela anyị aka inwe ọmarịcha àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. Àgwà ndị a so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) N’eziokwu, mmụọ nsọ bụ onyinye na-enweghị atụ.

OTÚ JEHOVA, JIZỌS, NA NDỊ MMỤỌ OZI SI ENYERE ANYỊ AKA N’OZI ANYỊ

14. Olee ndị a na-anaghị ahụ anya na-enyere anyị aka n’ozi ọma?

14 Anyị na Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi ‘ịrụkọ ọrụ’ bụ onyinye ọzọ a na-anaghị ahụ anya. (2 Kọr. 6:1) Anyị na ha na-arụkọ ọrụ mgbe ọ bụla anyị na-ekwusa ozi ọma. Pọl kwuru na yanwa na ndị ya na ha so na-ekwusa ozi ọma bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Anyị kwusawa ozi ọma, anyị na Jizọs na-arụkọkwa ọrụ. Cheta na mgbe Jizọs nyechara ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,” ọ sịrị ha: “M nọnyeere unu.” (Mat. 28:19, 20) Oleekwanụ otú anyị na ndị mmụọ ozi si arụkọ ọrụ? Obi dị anyị ụtọ na ndị mmụọ ozi na-eduzi anyị ma anyị na-ezisara “ndị bi n’ụwa” “ozi ọma ebighị ebi.”—Mkpu. 14:6.

15. Mee ihe atụ si na Baịbụl gosiri otú Jehova si enyere anyị aka n’ozi ọma.

15 Olee uru enyemaka Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi baarala anyị? Ka anyị na-agha mkpụrụ nke Alaeze, ụfọdụ n’ime ha ga-ada n’obi ndị chọrọ ige ntị ma too. (Mat. 13:18, 23) Ònye na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu too n’obi mmadụ ma mịa mkpụrụ? Jizọs kwuru na e nweghị onye ga-abụli onye na-eso ụzọ ya ma ọ bụrụ na ‘Nna ya adọtaghị ya.’ (Jọn 6:44) Baịbụl mekwara ihe atụ ya. Ì chetara mgbe Pọl ziri ụmụ nwaanyị ụfọdụ ozi ọma ná mpụga obodo Filipaị? Legodị ihe Baịbụl kwuru gbasara otu onye n’ime ha aha ya bụ Lidia. Ọ sịrị: “Jehova wee meghee nnọọ obi ya ịnabata ihe Pọl nọ na-ekwu.” (Ọrụ 16:13-15) Jehova adọtakwala ọtụtụ ndị ọzọ otú ahụ ọ dọtara Lidia.

16. Ònye ka anyị kwesịrị ikele maka ihe ọ bụla anyị rụzuru n’ozi ọma?

16 Ònye ka anyị kwesịrị ikele maka ihe ọ bụla anyị rụzuru n’ozi ọma? Pọl zara ajụjụ ahụ n’ihe o dere gbasara ọgbakọ dị na Kọrịnt. Ọ sịrị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too; nke mere na onye na-akụ mkpụrụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-agba ya mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla, kama ọ bụ Chineke onye na-eme ka o too bụ ihe niile.” (1 Kọr. 3:6, 7) Anyị kwesịrị ime ka Pọl, na-ekele Jehova maka ihe ọ bụla anyị rụzuru n’ozi ọma.

17. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị na Chineke, Jizọs, na ndị mmụọ ozi ‘na-arụkọ ọrụ’?

17 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị na Chineke, Jizọs, na ndị mmụọ ozi ‘na-arụkọ ọrụ’? Ọ bụ ma anyị na-eme ike anyị niile ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. E nwere ọtụtụ ụzọ anyị si eme ya, dị ka ikwusa ozi ọma “n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” (Ọrụ 20:20) Ọ na-atọkwa ọtụtụ ndị ụtọ ikwusa ozi ọma n’oge ha na-anọghị n’ozi. Ha hụ onye ha na-amaghị, ha na-emesapụ ihu kelee ya ma gbalịa ka ha na ya kparịta ụka. Ọ bụrụ na onye ahụ enwee mmasị, ha na-eji akọ zie ya ozi ọma Alaeze.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 18) *

18-19. (a) Olee otú anyị si agba mkpụrụ nke eziokwu mmiri? (b) Kọọ otú Jehova si nyere otu nwoke a na-amụrụ Baịbụl aka.

18 Ebe “anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ, anyị kwesịkwara ịna-agba ya mmiri. Ọ bụrụ na mmadụ enwee mmasị, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na anyị ma ọ bụkwanụ onye ọzọ gara mụwara ya Baịbụl. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ahụ ana-aga nke ọma, obi ga-adị anyị ụtọ ịhụ otú Jehova si enyere ya aka ịgbanwe otú o si eche echiche.

19 Chegodị gbasara otu dibịa afa bi na Saụt Afrịka aha ya bụ Raphalalani. Ihe ọ mụtara na Baịbụl masịrị ya. Ma, o siiri ya ike ikweta ihe ọ gụtara na Baịbụl gbasara ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase. (Diut. 18:10-12) Ma nke nta nke nta, o kwere ka Chineke kpụgharịa echiche ya. Ka oge na-aga, ọ kwụsịrị ịbụ dibịa afa n’agbanyeghị na ọ bụ ihe o ji akpa afọ ya. Ugbu a, Raphalalani dị afọ iri isii. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ maka otú Ndịàmà Jehova si si n’ụzọ dị iche iche nyere m aka. Dị ka ihe atụ, ha nyeere m aka inweta ọrụ. Onye m kacha ekele bụ Jehova, n’ihi na o nyeere m aka ịgbanwe ndụ m. Ugbu a, m so na-ekwusa ozi ọma n’ihi na abụzi m Onyeàmà Jehova mere baptizim.”

20. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

20 N’isiokwu a, anyị ekwuola gbasara onyinye anọ a na-anaghị ahụ anya. Nke kachanụ n’ime ha bụ enyi anyị na Jehova bụ. Anyị bụrụ enyi Jehova, anyị ga-erite uru n’onyinye ndị nke ọzọ, ya bụ, ịgakwuru ya n’ekpere, inweta enyemaka mmụọ nsọ ya, nakwa iso ya, Jizọs, na ndị mmụọ ozi na-arụkọ ọrụ. Ka anyị kpebisie ike ịna-egosikwu na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a a na-anaghị ahụ anya. Ka anyị gharakwa ịkwụsị ikele Jehova maka ịbụ ezigbo enyi anyị.

ABỤ NKE 145 Chineke Kwere Anyị Nkwa Paradaịs

^ par. 5 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru gbasara ụfọdụ onyinye ndị anyị na-ahụ anya Chineke nyere anyị. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara onyinye ndị anyị na-enweghị ike ịhụ anya Chineke nyere anyị nakwa ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ha. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-egosikwu Jehova Chineke na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ọma ndị a o nyere anyị.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: (1) Ebe otu nwanna nwaanyị na-ele ihe ndị Jehova kere ma na-atụgharị uche n’enyi ya na Jehova bụ.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: (2) Ebe ọ na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka izi ozi ọma.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: (3) Mmụọ nsọ nyeere ya aka ịkata obi zie ozi ọma mgbe ọ na-anọghị n’ozi.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: (4) Ebe ọ na-amụrụ onye ahụ o ziri ozi ọma mgbe ọ na-anọghị n’ozi ihe. Ọ bụ ndị mmụọ ozi nyeere ya aka ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ.