Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ

Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ

“N’oge ikpeazụ, [eze ugwu] na eze ndịda ga-asọrịta mpi.”—DAN. 11:40.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka amụma Baịbụl mere ka anyị mata?

GỊNỊ ga-eme ndị ohu Chineke n’oge na-adịghị anya? Anyị ga-amatali azịza ya. Amụma Baịbụl na-eme ka anyị mata ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-agbasa anyị niile. E nwere otu amụma Baịbụl mere ka anyị mata ihe ọchịchị ụfọdụ na-akpa ike n’ụwa ga-eme. Daniel isi nke iri na otu kwuru gbasara ọchịchị abụọ ga na-emegide ibe ha. Ọ kpọrọ ha eze ugwu na eze ndịda. Ọtụtụ n’ime ihe e buru n’amụma ahụ emezuola. N’ihi ya, obi siri anyị ike na ndị nke fọrọ afọ ga-emezukwa.

2. Dị ka e kwuru na Jenesis 3:15 na Mkpughe 11:7 na 12:17, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-eleba anya n’amụma Daniel?

2 Iji ghọta amụma e buru na Daniel isi nke iri na otu nke ọma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ndị amụma ahụ na-ekwu gbasara ha bụ ndị ọchịchị na ọchịchị ndị ahụ na-emegide ndị ohu Chineke. Ndị ohu Chineke dị ezigbo obere ma e jiri ha tụnyere ndị bi n’ụwa. Ma, gịnị mere ndị ọchịchị ji achọkarị imegide ha? Ọ bụ n’ihi na ihe Ekwensu na ụwa ya chọrọ bụ ikpochapụ ndị na-ejere Jehova na Jizọs ozi. (Gụọ Jenesis 3:15 na Mkpughe 11:7; 12:17.) Ihe ọzọ bụkwa na ihe e kwuru n’amụma Daniel na ihe e kwuru n’amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl kwesịrị ịdaba. N’ihi ya, anyị kwesịrị ileba anya n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl ka anyị nwee ike ịghọta amụma Daniel nke ọma.

3. Olee ihe ndị anyị ga-ekwu gbasara ha n’isiokwu a na nke na-eso ya?

3 N’ihi ihe ndị a anyị kwuru, anyị ga-eleba anya na Daniel 11:25-39. Anyị ga-amata ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 1870 ruo 1991. Anyị ga-ahụkwa ihe mere anyị ji kwesị ịgbanwe otú anyị sibu ghọta ihe ụfọdụ e kwuru n’amụma ahụ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe e kwuru na Daniel 11:40–12:1. Anyị ga-ekwukwa ihe ọhụrụ anyị ghọtara gbasara ihe amụma ahụ kwuru banyere ihe ga-emenụ malite n’afọ 1991 ruo n’agha Amagedọn. Ka ị na-amụ isiokwu abụọ a, ọ ga-adị mkpa ka ị gụọ ihe e dere na chaatị isiokwu ya bụ “Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ.” Ma, ka anyị burugodị ụzọ mata ndị eze abụọ e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MATA EZE UGWU NA EZE NDỊDA

4. Olee ihe atọ ga-enyere anyị aka ịmata ndị bụ eze ugwu na eze ndịda?

4 “Eze ugwu” na “eze ndịda” bụ aha a kpọrọ ndị eze chịrị mba ndị nọ n’ebe ugwu na n’ebe ndịda mba Izrel oge ochie. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Lee ihe mmụọ ozi ziri Daniel ozi ahụ kwuru: “Abịawokwa m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị n’oge ikpeazụ.” (Dan. 10:14) Tupu Pentikọst afọ 33, ọ bụ mba Izrel bụ mba Chineke họọrọ. Malite mgbe ahụ gawa, Jehova mere ka o doo anya na ọ bụzi ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ ndị ya. N’ihi ya, ndị amụma ahụ dị na Daniel isi iri na otu kacha gbasa bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụghị mba Izrel. (Ọrụ 2:1-4; Rom 9:6-8; Gal. 6:15, 16) Ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda nọkwa na-agbanwe kemgbe ahụ. Ma, e nwere ihe ha niile mere. Nke mbụ, ndị eze ndị ahụ megidere ndị na-efe Chineke. Nke abụọ, otú ha si mesoo ndị na-efe Chineke gosiri na ha kpọrọ ezi Chineke bụ́ Jehova asị. Nke atọ, ndị eze abụọ ahụ na-amarịta aka onye ga-aka ibe ya.

5. Ànyị nwere ike ịmata ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 100 ruo afọ 1870? Kọwaa.

5 Mgbe afọ 100 gachara, Ndị Kraịst adịgboroja batara n’ọgbakọ ezigbo Ndị Kraịst. Ha kụziwere ozizi ụgha ma mee ka ndị mmadụ ghara ịma eziokwu dị n’Okwu Chineke. Si mgbe ahụ ruo n’ihe dị ka afọ 1870, Chineke enweghị nzukọ ya n’elu ụwa. Ndị Kraịst adigboroja toro n’ike n’ike ka ata a ghara n’ubi a kụrụ ezi mkpụrụ ma mee ka a ghara ịmata ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. (Mat. 13:36-43) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata ihe a? Ọ bụ n’ihi na o gosiri na amụma ahụ e buru gbasara eze ugwu na eze ndịda agbasaghị ndị eze ma ọ bụ ọchịchị ndị chịrị n’agbata afọ 100 na afọ 1870. E nweghị ndị bụ́ ndị ohu Chineke ha ga-akpagbu n’oge ahụ. * Ma, obere oge afọ 1870 gachara, a matara ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda. Olee otú anyị si mara?

6. Olee mgbe a malitere ịmata ndị bụ́ ndị ohu Chineke? Kọwaa.

6 Malite n’afọ 1870 gawa, ndị ohu Chineke malitere ịhazi onwe ha ka ha bụrụ otu ìgwè. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Charles T. Russell na ndị enyi ya malitere ịnọkọ na-amụ Baịbụl. Nwanna Russell na ndị enyi ya jere ozi ka onye ozi ahụ e kwuru na ọ ‘ga-edozi ụzọ’ tupu e hiwe Alaeze Mesaya. (Mal. 3:1) Ihe a mere ka e nwee ndị bụ́ ndị ohu Chineke n’ụwa ọzọ. È nwere ọchịchị ndị nọ n’oge ahụ kpagburu ndị ohu Chineke? Ka anyị leba anya n’ihe ndị na-esonụ.

ÒNYE BỤ EZE NDỊDA?

7. Ònye bụ eze ndịda ruo mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ?

7 N’afọ 1870, Briten ghọrọ alaeze ukwu kachanụ n’ụwa. Ọ bụkwa ndị agha ya kacha ike n’ụwa. Amụma Daniel kwuru banyere otu obere mpi nke meriri mpi atọ ndị ọzọ. Obere mpi ahụ nọchiri anya Briten, ebe mpi ndị nke ọzọ nọchiri anya Frans, Spen, na Nedalandz. (Dan. 7:7, 8) Ọ bụkwa Briten bụ eze ndịda ruo mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ. N’otu oge ahụ, Amerịka ghọrọ mba kacha baa ọgaranya. Ha na Briten malitekwara imekọ ihe ọnụ.

8. Kemgbe oge ikpeazụ a, ònye bụ eze ndịda?

8 N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, Amerịka na Briten jikọrọ aka lụọ agha ma kpaa ezigbo ike. Ha mechara ghọọ mba abụọ kacha ike n’ụwa. Dị ka Daniel buru n’amụma, eze ahụ nwetara “ụsụụ ndị agha buru ibu.” (Dan. 11:25) Kemgbe oge ikpeazụ a, ọ bụ Briten na Amerịka jikọrọ aka bụrụ eze ndịda. * Ma, ònye bụ eze ugwu?

ÒNYE BỤ EZE UGWU?

9. Olee mgbe eze ugwu pụtaghachiri, oleekwa otú amụma Daniel 11:25 si mezuo?

9 N’afọ 1871, bụ́ afọ sochiri afọ Russell na ndị enyi ya malitechara ịna-amụkọ Baịbụl ọnụ, eze ugwu ọzọ pụtara. N’afọ ahụ, otu nwoke aha ya bụ Otto von Bismarck nyere aka mee ka e nwee Alaeze Ukwu Jamanị. Eze Prushịa aha ya bụ Wilhelm ghọrọ eze ukwu mbụ ya. Ọ họpụtakwara Bismarck ka ọ bụrụ onyeisi ala mbụ ya. * Ruokwa ọtụtụ afọ ndị sochiri ya, Jamanị ghọrọ mba dị ike. Ha chịkwara ọtụtụ mba dị n’Afrịka nakwa n’Oké Osimiri Pasifik. Jamanị malitekwara ịma Briten aka. (Gụọ Daniel 11:25.) Alaeze Ukwu Jamanị bịara nwee ndị agha fọrọ obere ka ha hara ka nke Briten. Jamanị ji ha lụsoo ndị iro ya ọgụ n’Agha Ụwa nke Mbụ.

10. Olee otú Daniel 11:25b, 26 si mezuo?

10 Daniel kwukwara ihe ga-eme Alaeze Ukwu Jamanị na ndị agha ya. O kwuru na eze ugwu ‘agaghị eguzoli.’ N’ihi gịnị? “N’ihi na ha ga-akpara ya nkata. Ọ bụ ndị na-eri nri ya pụrụ iche ga-eme ka ọ daa.” (Dan. 11:25b, 26a) N’oge Daniel, ndị ‘na-eje ozi n’ihu eze’ so ná ndị na-eri ihe “oriri pụrụ iche nke eze.” (Dan. 1:5) Ole ndị ka amụma a na-ekwu gbasara ha? Ọ bụ ndị isi n’Alaeze Ukwu Jamanị, ya bụ, ndị ọchịagha na ndị na-enye eze ndụmọdụ n’okwu gbasara agha. Ọ bụ ha mere e ji wepụ eze ha n’ọchịchị. * Amụma ahụ ekwughị naanị na alaeze ukwu ahụ ga-ada, kama o kwukwara ihe ga-eme n’agha ahụ o busoro eze ndịda. O kwuru gbasara eze ugwu, sị: “A ga-ekpochapụkwa ndị agha ya, a ga-egbukwa ọtụtụ ndị.” (Dan. 11:26b) N’Agha Ụwa nke Mbụ, e ‘kpochapụrụ’ ndị agha Jamanị, ‘gbuokwa ọtụtụ ndị,’ dị ka amụma ahụ kwuru. Ihe ahụ bụ agha a kacha gbuo ndị mmadụ na ya tupu oge ahụ.

11. Gịnị ka eze ugwu na eze ndịda mere?

11 Daniel 11:27, 28 kwuru ihe ga-eme tupu Agha Ụwa nke Mbụ ebido. Ọ sịrị na eze ugwu na eze ndịda “ga-anọ n’otu tebụl na-agha ụgha.” O kwukwara na eze ugwu ga-enweta “ọtụtụ ngwongwo.” Otú a o kwuru ya ka o sikwa mee. Jamanị na Briten gwara ibe ha na ha chọrọ udo. Ma, mgbe ha bidoro ịlụso ibe ha agha n’afọ 1914, a matara na ọ bụ ụgha ka ha ghara. Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, Jamanị ghọrọ mba nke abụọ kacha baa ọgaranya n’ụwa. Iji mezuo amụma dị na Daniel 11:29 na mbido amaokwu nke 30, Jamanị busoro eze ndịda agha, e merie ya.

EZE ABỤỌ AHỤ LUSORO NDỊ CHINEKE ỌGỤ

12. N’Agha Ụwa nke Mbụ, gịnị ka eze ugwu na eze ndịda mere?

12 Malite n’afọ 1914 gawa, otú ndị eze abụọ ahụ si alụso ibe ha ọgụ na otú ha si alụso ndị Chineke ọgụ bịara ka njọ. Dị ka ihe atụ, n’Agha Ụwa nke Mbụ, ma ọchịchị Jamanị ma nke Briten kpagburu ndị Chineke jụrụ ịlụ agha. Ọchịchị Amerịka tụkwara ndị na-edu ndú n’ikwusa ozi ọma mkpọrọ. Mmegide a mezuru amụma dị na Mkpughe 11:7-10.

13. Mgbe afọ 1930 gachara nakwa n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, gịnị ka eze ugwu mere?

13 Mgbe afọ 1930 gachara, eze ugwu ji obi ịta mmiri megide ndị Chineke, karịchaa, n’Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ọchịchị Nazi malitere ịchị Jamanị, Hitler na ndị òtù ya machiri ọrụ ndị Chineke. Ha gburu ọtụtụ narị ndị Jehova, tụbakwa ọtụtụ puku n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ. Daniel buru amụma na ihe ndị a ga-eme. Eze ugwu machiri ozi ọma anyị si otú ahụ ‘merụọ ebe nsọ,’ “wepụkwa àjà ahụ a na-achụ mgbe niile.” (Dan. 11:30b, 31a) Onye ndú ha bụ́ Hitler ṅụdịrị iyi na ya ga-ekpochapụ ndị Chineke na Jamanị.

EZE UGWU ỌHỤRỤ APỤTA

14. Ònye ghọrọ eze ugwu mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ? Kọwaa.

14 Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gachara, ọchịchị Kọmunist nke Sọviet Yuniọn ghọrọ eze ugwu. Ọ naara Jamanị ọtụtụ ebe ha na-achịbu. Ndị Sọviet Yuniọn kpagburu ndị niile kpebiri na ha ga na-erubere Chineke isi karịa ha otú ahụ ndị Nazi mere.

15. Gịnị ka eze ugwu mere mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ?

15 Obere oge a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, eze ugwu ọhụrụ ahụ bụ́ Sọviet Yuniọn kpagburu ndị ohu Chineke. Mkpughe 12:15-17 ji mkpagbu ahụ ha kpagburu ndị ohu Chineke tụnyere “osimiri.” Dị ka amụma ahụ kwuru, eze ugwu machiri ozi ọma anyị ma chụga ọtụtụ puku ụmụnna anyị Saịberịa. Kemgbe oge ikpeazụ a malitere, eze ugwu ahụ na-akpagbu ndị Jehova n’ike n’ike, ma o nwebeghị ike ịkwụsị ọrụ anyị. *

16. Olee otú ọchịchị Sọviet Yuniọn si mezuo amụma e buru na Daniel 11:37-39?

16 Gụọ Daniel 11:37-39. Gịnị ka eze ugwu ahụ mere nke gosiri na o jighị “Chi ndị nna nna ya kpọrọ ihe”? Ọchịchị Sọviet Yuniọn kpebiri ikpochapụ okpukpe niile. N’ihi ya, ọ gbalịrị ime ka okpukpe ndị dị kemgbe ụwa ghara inwe ọnụ. Iji mezuo ihe a, kemgbe afọ 1918, ọchịchị Sọviet Yuniọn nyere iwu mere e ji bido ịkụziri ụmụ akwụkwọ na Chineke adịghị. Olee otú eze ugwu si “nye chi nke ebe dị iche iche e wusiri ike otuto”? O mefuru ego buru ibu n’ịzụ ndị agha ya, n’ime ka ndị agha ya bukwuo ibu, nakwa n’imepụta ngwá agha ọgwụrụ mba iji mee ka ọchịchị ya sikwuo ike. Ma eze ugwu ma eze ndịda mechara nweta ngwá agha ga-enwe ike igbu ọtụtụ ijeri mmadụ.

NDỊ IRO ABỤỌ EJIKỌỌ AKA

17. Gịnị bụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”?

17 E nwere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ eze ugwu na eze ndịda jikọrọ aka mee. Ha hiwere “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Dan. 11:31) “Ihe arụ” ahụ bụ Òtù Mba Ụwa.

18. Gịnị mere e ji kpọọ Òtù Mba Ụwa “ihe arụ”?

18 Ihe mere e ji kpọọ Òtù Mba Ụwa “ihe arụ” bụ na ha sịrị na ha ga-eme ihe ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli, ya bụ, ime ka udo dị n’ụwa niile. Amụma ahụ kwukwara na ihe arụ ahụ, bụ́ Òtù Mba Ụwa, “na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,” n’ihi na ọ bụ ya ga-ebibi okpukpe ụgha niile.—Lee chaatị isiokwu ya bụ “Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ.”

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA GBASARA EZE UGWU NA EZE NDỊDA?

19-20. (a) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịmata gbasara eze ugwu na eze ndịda? (b) Olee ajụjụ a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

19 Anyị kwesịrị ịmata gbasara eze ugwu na eze ndịda n’ihi na ọ na-egosi na amụma Daniel buru gbasara ha mezuru n’agbata afọ 1870 na afọ 1991. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ndị nke na-emezubeghị ga-emezukwa.

20 N’afọ 1991, ọchịchị Sọviet Yuniọn dara. Ònye bụzi eze ugwu n’oge anyị a? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

^ par. 5 Anyị na-ahụ ihe gosiri na amụma Daniel gbasara “eze ugwu” na “eze ndịda” na-emezu. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ọ na-emezu? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta amụma ahụ nke ọma?

^ par. 5 N’ihi ihe e kwuru ebe a, o yiri ka o kwesịghị ka a gụnye Eze Ukwu Rom bụ́ Aurelian (afọ 270 ruo afọ 275) ná ndị bụ́ “eze ugwu” ma ọ bụkwanụ gụnye Eze Nwaanyị Zenobia (afọ 267 ruo afọ 272) ná ndị bụ́ “eze ndịda.” A ga-eji ihe a dochie ihe e kwuru n’isi nke 13 na nke 14 n’akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!

^ par. 9 N’afọ 1890, Kaiser Wilhelm nke Abụọ chụpụrụ Bismarck n’ọchịchị.

^ par. 10 E nwere ọtụtụ ihe ha mere nke mere ka ọchịchị ha daa ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, ha kwụsịrị ịkwado eze ha, kọọkwara ndị ọzọ ihe nzuzo ha gbasara agha ahụ, manyekwa eze ahụ ka ọ gbaa arụkwaghịm.

^ par. 15 Dị ka e kwuru na Daniel 11:34, e nwere mgbe eze ugwu ahụ kwụsịtụrụ ịkpagbu Ndị Kraịst, dị ka mgbe ọchịchị Sọviet Yuniọn dara n’afọ 1991.