Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ

Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ

Ụfọdụ amụma ndị e kwuru gbasara ha na chaatị a mezuru n’otu oge. Ha niile na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”—Dan. 12:4.

  • Amaokwu Baịbụl Mkpu. 11:7; 12:13, 17; 13:1-8, 12

    Amụma “Anụ ọhịa ahụ” achịala ụwa ruo ọtụtụ puku afọ. N’oge ikpeazụ, e merụrụ isi ya nke asaa ahụ́. Ahụ́ ahụ e merụrụ ya mechara laa, “ụwa niile” esorokwa anụ ọhịa ahụ. Setan na-eji anụ ọhịa ahụ ebuso “ndị fọdụrụ” agha.

    Mmezu ya Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ndị ọchịchị bụ́ ndị iro Jehova malitere ịchị. Mgbe ihe karịrị puku afọ atọ gara, n’Agha Ụwa nke Mbụ, e mere ka ọchịchị Briten ghara ịdịkwa ike. Ọ dịghachiri ike mgbe ya na Amerịka jikọrọ aka. Ekwensu na-eji ọchịchị niile dị n’ụwa emegide ndị ohu Chineke, karịchaa n’oge ikpeazụ a.

  • Amaokwu Baịbụl Dan. 11:25-45

    Amụma Eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka n’oge ikpeazụ.

    Mmezu ya Jamanị busoro Briten na Amerịka agha. N’afọ 1945, Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu. N’afọ 1991, Sọviet Yuniọn dara. Mgbe e mechara, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu.

  • Amaokwu Baịbụl Aịza. 61:1; Mal. 3:1; Luk 4:18

    Amụma Jehova zigara “onye ozi” ya ka ‘o dozie ụzọ’ tupu e hiwe Alaeze Mesaya. Onye ozi ahụ malitere “izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.”

    Mmezu ya Malite n’afọ 1870, Nwanna C. T. Russell na ndị enyi ya ji ịnụ ọkụ n’obi mụọ Baịbụl iji mata eziokwu Baịbụl na-akụzi. N’afọ 1881, ha chọpụtara na ọ dị ezigbo mkpa ka ndị ohu Chineke na-ekwusa ozi ọma. Ha wepụtara isiokwu ndị dị ka, “A Chọrọ Otu Puku Ndị Nkwusa” na “Ndị E Tere Mmanụ Ikwusa Ozi Ọma.”

  • Amaokwu Baịbụl Mat. 13:24-30, 36-43

    Amụma Onye iro kụrụ ata n’ubi a kụrụ ọka wit. Ata ahụ toro ma mee ka a ghara ịmata ọka wit ahụ. N’oge owuwe ihe ubi, a chịkọtara ọka wit ma chịpụ ata iche.

    Mmezu ya Malite n’afọ 1870, a matara ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst na Ndị Kraịst ụgha. N’oge ikpeazụ, e kewapụrụ ezigbo Ndị Kraịst n’ebe Ndị Kraịst ụgha nọ.

  • Amaokwu Baịbụl Dan. 2:31-33, 41-43

    Amụma E nwere ụkwụ ígwè na ụrọ n’ihe oyiyi ahụ e ji ihe dị iche iche kpụọ.

    Mmezu ya Ụrọ nọchiri anya ndị nkịtị Briten na Amerịka na-achị na-enupụrụ ha isi. Ndị ahụ mere ka ọchịchị ha ghara isi ike ka ígwè.

  • Amaokwu Baịbụl Mat. 13:30; 24:14, 45; 28:19, 20

    Amụma A chịbara “ọka wit” ahụ “n’ụlọ nkwakọba ihe,” họpụtakwa “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” ka ọ na-elekọta “ezinụlọ” ahụ. “Ozi ọma nke a nke alaeze” malitekwara ịgbasa “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”

    Mmezu ya N’afọ 1919, a họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ na-elekọta ndị Chineke. Kemgbe ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Taakwa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ihe karịrị narị ala abụọ, na-ewepụtakwa ihe ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku asụsụ.

  • Amaokwu Baịbụl Dan. 12:11; Mkpu. 13:11, 14, 15

    Amụma Anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ gwara ndị mmadụ ka ha mee “onyinyo nke dị ka anụ ọhịa ahụ.” O kunyekwara “onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ume.”

    Mmezu ya Ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka malitere Njikọ Mba Niile. Mba ndị ọzọ mechara sonyere ha. Eze ugwu mechara soro ná Njikọ Mba Niile n’afọ 1926 ma pụọ n’afọ 1933. E kwuru na Njikọ Mba Niile ga-emeli ihe ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme, otú ahụ e kwukwara na Òtù Mba Ụwa ga-eme.

  • Amaokwu Baịbụl Dan. 8:23, 24

    Amụma Otu eze nke ihu ya na-emenye ụjọ ‘ga-eweta mbibi n’ụzọ dị ịtụnanya.’

    Mmezu ya Ọchịchị Briten na Amerịka egbuola ọtụtụ ndị, bibiekwa ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, n’Agha Ụwa nke Abụọ, Amerịka bibiri ọtụtụ ihe mgbe ha tụrụ ngwá agha ọgwụrụ mba abụọ n’obodo ndị iro ha.

  • Amaokwu Baịbụl Dan. 11:31; Mkpu. 17:3, 7-11

    Amụma “Anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie” nwere mpi iri si n’ime abis pụta. Ọ bụkwa eze nke asatọ. Akwụkwọ Daniel kpọrọ eze ahụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.”

    Mmezu ya Njikọ Mba Niile dara mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe agha ahụ biri, e hiwere Òtù Mba Ụwa. E kwuru na Òtù Mba Ụwa ga-emeli ihe Alaeze Chineke ga-eme, otú ahụkwa e kwuru na Njikọ Mba Niile bu ya ụzọ ga-eme. Òtù Mba Ụwa ga-alụso okpukpe ọgụ.

  • Amaokwu Baịbụl 1 Tesa. 5:3; Mkpu. 17:16

    Amụma Mba niile ga-ekwu na e nweela “udo na obi iru ala.” “Mpi iri ahụ” na “anụ ọhịa ahụ” ga-ebibi “nwaanyị akwụna ahụ.” E mechaa, a ga-ebibi mba niile.

    Mmezu ya Mba dị iche iche nwere ike ikwu na ha emeela ka e nwee udo na obi iru ala. Mba ndị na-akwado Òtù Mba Ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha. Ihe a ga-abụ mmalite nke oké mkpagbu. Oké mkpagbu ahụ ga-akwụsị mgbe a ga-ebibi ụwa Setan niile n’agha Amagedọn.

  • Amaokwu Baịbụl Ezik. 38:11, 14-17; Mat. 24:31

    Amụma Gọg ga-abata n’ala ndị Chineke. E mechaa, ndị mmụọ ozi akpọrọ ‘ndị a họọrọ.’

    Mmezu ya Eze ugwu na ndị ọchịchị ụwa ndị ọzọ ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Obere oge ha bidoro ịlụso ndị Chineke ọgụ, a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ gaa eluigwe.

  • Amaokwu Baịbụl Ezik. 38:18-23; Dan. 2:34, 35, 44, 45; Mkpu. 6:2; 16:14, 16; 17:14; 19:20

    Amụma “Onye nọ n’elu” “ịnyịnya ọcha” ahụ ga-enwezu “mmeri ya” mgbe ọ ga-ebibi Gọg na ndị agha ya. A tụbara “anụ ọhịa ahụ” “n’ime ọdọ ọkụ ahụ,” e bibiekwa nnukwu ihe oyiyi ahụ.

    Mmezu ya Eze nke Alaeze Chineke bụ́ Jizọs ga-abịa ịnapụta ndị Chineke. Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso ya chịa na ndị mmụọ ozi ga-ebibi mba dị iche iche jikọrọ aka. Otú ahụ ka a ga-esi ala ụwa Ekwensu n’iyi.