Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?

Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?

“Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị ahụ ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ebe m nọ.”—MAT. 11:6.

ABỤ NKE 54 “Lekwa Ụzọ”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya tụrụ gị n’anya mgbe mbụ ị gwara ndị mmadụ ihe ị mụtara na Baịbụl?

Ì CHETARA otú obi dị gị mgbe mbụ ị matara eziokwu dị na Baịbụl? Ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl doro gị anya. I chere na mmadụ niile ga-anabata ihe ahụ i kweere. Obi sikwara gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi ga-eme ka ndụ ha nwee isi, meekwa ka ha nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu. (Ọma 119:105) N’ihi ya, i ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ihe ị mụtara na Baịbụl. Ma, gịnị mechara mee? Ọ tụrụ gị n’anya na ọtụtụ n’ime ha ekwetaghị ihe ị gwara ha.

2-3. Mgbe Jizọs nọ ndụ n’ụwa, gịnị ka ọtụtụ ndị chere gbasara ya na ihe ọ na-akụzi?

2 Ọ bụrụ na ndị ọzọ ajụ ozi ọma anyị, o kwesịghị ịtụ anyị n’anya. Mgbe Jizọs dị ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị jụrụ ya n’agbanyeghị na ọ rụrụ ọrụ ebube nke gosiri na ọ bụ Chineke zitere ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs rụrụ ọrụ ebube kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Ndị na-emegide ya enwekwaghị ike ịsị na o meghị ya. N’agbanyeghị ya, ndị ndú ndị Juu ekwetaghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ha chọdịrị igbu ma yanwa ma Lazarọs.—Jọn 11:47, 48, 53; 12:9-11.

3 Jizọs ma na ọtụtụ ndị agaghị ekweta na ọ bụ Mesaya ahụ. (Jọn 5:39-44) Ọ gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị ahụ ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ebe m nọ.” (Mat. 11:2, 3, 6) Gịnị mere ọtụtụ ndị ekweghị na Jizọs?

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a nakwa n’isiokwu nke na-eso ya, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị mere ọtụtụ ndị n’oge Jizọs ekweghị na ya. Anyị ga-ahụkwa ihe mere ọtụtụ ndị taa anaghị ege ntị n’ozi ọma anyị. Karịchaa, anyị ga-amụta ihe mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike n’ebe Jizọs nọ ka anyị ghara ịsụ ngọngọ.

(1) EBE JIZỌS SI

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi ebe Jizọs si. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ ndị ji chee na Jizọs abụghị Mesaya ahụ e buru n’amụma?

5 Ebe Jizọs si mere ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ. Ha kwetara na Jizọs na-akụzi ihe nke ọma, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ ebube. Ma n’anya ha, Jizọs bụ naanị nwa ọkwá nkà. Ọ bụkwa onye Nazaret bụ́ obodo a na-ejighị kpọrọ ihe. Nataniel bụ́ onye mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs jụdịrị, sị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:46) Ọ ga-abụ na Nataniel na-elelị obodo ahụ Jizọs si anya. O nwekwara ike ịbụ na o bu amụma ahụ e buru na Maịka 5:2 n’obi, ebe kwuru na ọ bụ na Betlehem ka Mesaya ga-esi pụta, ọ bụghị Nazaret.

6. Gịnị gaara enyere ọtụtụ ndị aka n’oge Jizọs ịmata na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ?

6 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya onye amụma buru amụma na ndị iro Jizọs agaghị echegbu onwe ha “banyere ihe niile mere n’ọgbọ” Mesaya ahụ. (Aịza. 53:8) E buru amụma gbasara ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ha gaara ahụ na e buru amụma na a ga-amụ Jizọs na Betlehem nakwa na ọ ga-esi n’agbụrụ Eze Devid. (Luk 2:4-7) N’ihi ya, a mụrụ Jizọs n’ebe ahụ e buru amụma ya na Maịka 5:2. Oleezi ihe bụ́ nsogbu? Ọ na-adịkarị ndị mmadụ ngwa ngwa ikwubi ihe. Ha aghọtaghị ihe niile merenụ. Ọ bụ ya mere ha ji sụọ ngọngọ.

7. Gịnị mere ọtụtụ ndị taa anaghị ege ndị Jehova ntị?

7 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Ọtụtụ ndị Jehova abaghị ọgaranya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ewere ha ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Ụfọdụ ndị na-eche na ndị Chineke agaghị akụziliri ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ha agaghị ụlọ akwụkwọ ndị okpukpe a ma ama. Ndị ọzọ na-ekwu na Àmà Jehova bụ “okpukpe ndị Amerịka” n’agbanyeghị na ọ bụ naanị ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ asaa bụ́ Ndịàmà Jehova bi n’Amerịka. O nwekwara ndị ọzọ na-ekwu na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs. Kemgbe ọtụtụ afọ, a na-akpọ ha “ndị obi ọjọọ,” “ndị na-etisa ezinụlọ,” nakwa “ndị na-ekpu Baịbụl ihu n’ala.” Ihe ndị a na-eme ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ, ebe ọ bụ na ha amaghị nke bụ́ eziokwu.

8. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 17:11, gịnị ka ndị mmadụ kwesịrị ime iji chọpụta ndị na-efe Chineke taa?

8 Gịnị ka mmadụ ga-eme ka ọ ghara ịsụ ngọngọ? Ndị mmadụ kwesịrị ịgbalị na-achọpụta nke bụ́ eziokwu. Ọ bụ ihe Luk so dee Baịbụl mere. Luk gbalịrị isi “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” Ọ chọrọ ka ndị ga-agụ akwụkwọ ya “mara n’ụzọ zuru ezu” ma ihe ha nụrụ gbasara Jizọs ọ̀ bụ eziokwu. (Luk 1:1-4) Ndị Juu bi na Beria n’oge ochie mere ka Luk. Mgbe mbụ ha nụrụ ozi ọma gbasara Jizọs, ha nyochara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma iji mata ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:11.) Ndị mmadụ kwesịkwara ịna-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ha kwesịrị inyocha Akwụkwọ Nsọ iji mara ma ihe ndị ohu Chineke na-akụziri ha ọ̀ bụ eziokwu. Ha kwesịkwara ịgụ gbasara ihe ndị ohu Chineke mere n’oge anyị a. Ọ bụrụ na ha achọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ ga-eme ka ịkpọasị ma ọ bụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu ghara imegharị ha anya.

(2) JIZỌS EKWEGHỊ ARỤ ỌRỤ EBUBE IJI GOSI ONWE YA

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji gosi onwe ya. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10) *

9. Gịnị mere mgbe Jizọs jụrụ imere ndị mmadụ ihe ịrịba ama si n’eluigwe?

9 N’oge Jizọs, ihe ọ kụziri ejughị ụfọdụ ndị afọ. Ha chọkwuru ihe ndị ọzọ. Ha gwara Jizọs ka o mee ihe “ịrịba ama si n’eluigwe” iji gosi na ọ bụ Mesaya. (Mat. 16:1) O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na ha ghọtahiere ihe e kwuru na Daniel 7:13, 14. Ma, oge Jehova kara aka erubeghị ka amụma ahụ mezuo. Ihe Jizọs na-akụziri ha n’oge ahụ ezuola iji mee ka ha kweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Ma mgbe ọ jụrụ imere ha ihe ịrịba ama ndị ahụ ha chọrọ, ha sụrụ ngọngọ.—Mat. 16:4.

10. Olee otú Jizọs si mezuo amụma Aịzaya onye amụma buru gbasara Mesaya?

10 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya buru amụma gbasara Mesaya, sị: “Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ekwu okwu n’olu dara ụda, ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.” (Aịza. 42:1, 2) Jizọs ejighị ozi o jere n’ụwa gosi onwe ya. Ọ rụghị ụlọ nsọ ndị buru ezigbo ibu. O yighị uwe e ji ama ndị isi okpukpe ma ọ bụkwanụ kwuo ka e tuo ya aha a na-etu ndị isi okpukpe. Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ọ jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji mee Herọd obi ụtọ n’agbanyeghị na e nwere ike iji maka ya gbuo ya. (Luk 23:8-11) Jizọs rụrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ma, ihe bụ́ mkpa ya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.”—Mak 1:38.

11. Olee ihe ndị na-adịghị mma ụfọdụ ndị na-atụ anya ka anyị na-eme taa?

11 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Taa, ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ịhụ ụlọ okpukpe ndị buru ibu e sere ọtụtụ ihe mara mma na ya, ndị isi okpukpe a na-etu okpookpo aha, nakwa ime ememme ọtụtụ ndị na-amaghịzi ebe ndị ha si ma ọ bụkwanụ ihe ha pụtara. Ma, gịnịkwanụ ka ndị na-aga okpukpe ndị ahụ na-amụta gbasara Chineke na nzube ya? Ndị na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na-amụta ihe Jehova chọrọ n’aka ha nakwa otú ha nwere ike isi na-ebi ndụ otú ọ chọrọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-adị ọcha, e jighịkwa ihe ndị dara oké ọnụ chọọ ha mma. Ndị na-edu ndú anaghị eyi uwe ndị pụrụ iche ma ọ bụ na-achọ ka a na-etu ha okpookpo aha. Ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ ka ihe ndị anyị na-akụzi na ihe ndị anyị kweere si. Ma n’agbanyeghị ya, ọtụtụ ndị taa anaghị ekweta n’ihe ndị anyị na-ekwu n’ihi na anyị anaghị eme oké ememme, anyị anaghịkwa akụzi ihe ndị ha chọrọ ịnụ.

12. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 11:1, 6, olee ihe ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike?

12 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bi na Rom, sị: “A na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe. Ma ihe a nụrụ si n’okwu banyere Kraịst.” (Rom 10:17) N’ihi ya, ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike bụ ịna-amụ Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị ịna-eso na-eme ememme ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị n’agbanyeghị otú ha si dị anyị mma n’anya. Anyị kwesịrị ịgbalị jiri Akwụkwọ Nsọ mee ka okwukwe anyị sie ezigbo ike n’ihi na ‘ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Gụọ Ndị Hibru 11:1, 6.) Ọ dịghị mkpa ka anyị buru ụzọ hụ ihe àmà si n’eluigwe tupu anyị amara na anyị achọtala eziokwu ahụ. Ọ bụrụ na anyị amụọ Akwụkwọ Nsọ nke ọma mụta ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, ọ ga-enyere anyị aka ịmata na anyị amatala eziokwu ahụ, meekwa ka anyị ghara ịna-enwe obi abụọ.

(3) JIZỌS EMEGHỊ ỌTỤTỤ OMENALA NDỊ JUU

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs jụrụ iso na-eme omenala ha. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) *

13. Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji katọọ Jizọs?

13 N’oge Jizọs, ọ gbagwojuru ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim anya na ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị ebu ọnụ. Jizọs kọwaara ha na ọ dịghị mkpa ka ha na-ebu ọnụ ebe ọ bụ na ya ka dị ndụ. (Mat. 9:14-17) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ndị Farisii na ọtụtụ ndị na-emegide Jizọs katọrọ ya n’ihi na ọ naghị eso ọtụtụ omenala ha. Iwe were ha mgbe ọ gwọrọ ndị ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. (Mak 3:1-6; Jọn 9:16) Ha kwuru na ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ma o nweghị nsogbu ha hụrụ n’ịzụ ahịa n’ụlọ nsọ. O were ha ezigbo iwe mgbe Jizọs katọrọ ihe ahụ ha na-eme. (Mat. 21:12, 13, 15) Iwe were ndị Jizọs ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret mgbe Jizọs kọọrọ ha ihe ụfọdụ mere n’Izrel iji gosi na ha bụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe ha na ndị na-enweghị okwukwe. (Luk 4:16, 25-30) Ihe ndị a Jizọs mere ndị mmadụ na-atụghị anya ha mere ka ha sụọ ngọngọ.—Mat. 11:16-19.

14. Gịnị mere Jizọs ji katọọ omenala ndị mmadụ na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ?

14 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto, ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ, egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha.” (Aịza. 29:13) Nkatọ Jizọs katọrọ omenala ndị mmadụ na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ ziri ezi. Ndị ji iwu na omenala ndị mmadụ wepụtara kpọrọ ihe karịa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ajụla Jehova na Mesaya o zitere.

15. Olee ihe na-ewe ọtụtụ ndị iwe taa gbasara Ndịàmà Jehova?

15 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Iwe na-ewe ọtụtụ ndị ma ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova anaghị eso ha eme omenala ndị na-adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, dị ka, ememme ụbọchị ọmụmụ na Krismas. O nwekwara ndị ọzọ ọ na-ewe iwe na Ndịàmà Jehova anaghị eso ha eme ememme ndị e ji eto mba ma ọ bụ omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị a na-eme mgbe a na-eli ozu. Ndị ihe ndị a na-eme ka ha sụọ ngọngọ nwere ike ịna-eche na ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ma, ha agaghị eme ihe dị Chineke mma ma ọ bụrụ na ihe na-amasị ha ime bụ omenala ndị o doro anya na ha adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.—Mak 7:7-9.

16. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:97, 113, 163-165, olee ihe ndị anyị kwesịrị ime, olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime?

16 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Anyị kwesịrị ịhụ iwu Jehova n’anya nke ukwuu. (Gụọ Abụ Ọma 119:97, 113, 163-165.) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị agaghị etinye aka n’omenala ọ bụla ọ na-akwadoghị. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị ghara ịhụ ya n’anya.

(4) JIZỌS AGBANWEGHỊ ỌCHỊCHỊ E NWERE MGBE AHỤ

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs enweghị mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Gịnị ka ọtụtụ ndị tụrụ anya ya n’oge Jizọs nke mere ka ha sụọ ngọngọ?

17 Ọtụtụ ndị n’oge Jizọs chọrọ ka a gbanwee ọchịchị ha ozugbo. Ha tụrụ anya na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom na-achị ha ọchịchị nchịgbu. Ma, mgbe ha gbalịrị ime Jizọs eze, ọ jụrụ. (Jọn 6:14, 15) Ndị ọzọ, ma ndị isi nchụàjà, nọ na-atụ ụjọ na Jizọs ga-eweta ọchịchị ga-emegide ọchịchị ndị Rom nke ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ ma ọ bụ napụ ha ikike ndị ha nwere. Ihe ndị a mere ka ọtụtụ ndị Juu sụọ ngọngọ.

18. Olee amụma ndị e buru gbasara Mesaya ahụ ọtụtụ ndị leghaara anya?

18 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? N’agbanyeghị na ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara Mesaya ahụ kwuru na ọ ga-abụ Dike ga-enwe mmeri, amụma ndị ọzọ kwukwara na ọ ga-ebu ụzọ nwụọ maka mmehie ụmụ mmadụ. (Aịza. 53:9, 12) Ma, gịnị mere ndị Juu ji na-eche ihe na-ekwesịghị ekwesị gbasara Mesaya ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị leghaara amụma ndị ahụ na-ekwughị na a ga-egboro ha mkpa ha ozugbo anya.—Jọn 6:26, 27.

19. Olee ihe ọtụtụ ndị na-atụ anya ya n’aka anyị taa nke na-eme ka ha ghara ịna-ege anyị ntị?

19 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị n’ihi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-atụ anya ka anyị soro na-eme ntụliaka ọchịchị. Mana, o doro anyị anya na ọ bụrụ na anyị ahọrọ ka mmadụ ibe anyị chịwa anyị, ọ pụtara na anyị na-ajụ Chineke. (1 Sam. 8:4-7) Ụfọdụ ndị nwekwara ike na-eche na anyị kwesịrị ịrụ ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọgwụ, na-emekwa ihe ndị ọzọ iji nyere obodo aka. Ha anaghị ege anyị ntị n’ihi na ihe bụ́ mkpa anyị bụ ikwusa ozi ọma, ọ bụghị igboro ụwa mkpa ha ozugbo.

20. Dị ka Jizọs kwuru na Matiu 7:21-23, gịnị kwesịrị ịbụ ihe kacha anyị mkpa?

20 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? (Gụọ Matiu 7:21-23.) Ihe bụ́ isi anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ ọrụ ahụ Jizọs Kraịst nyere anyị iwu ka anyị rụọ. (Mat. 28:19, 20) Anyị ekwesịghị ikwe ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịchọ ka e nyere ndị mmadụ aka dọpụ uche anyị na ya. Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa ka e nyere ha aka. Ma, anyị ma na ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere ndị agbata obi anyị aka bụ ịkụziri ha gbasara Alaeze Chineke nakwa inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma.

21. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

21 N’isiokwu a, anyị lebara anya n’ihe anọ mere ndị mmadụ ji sụọ ngọngọ nke mere ha ji jụ Jizọs nakwa otú ha nwere ike isi mee ka ndị mmadụ jụ ndị na-eso ụzọ Jizọs taa. Ma, ọ̀ bụ naanị ihe ndị a ka anyị ga na-ezere? Mba. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ sụọ ngọngọ. Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ndị a mee ka anyị sụọ ngọngọ nakwa na anyị ga na-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike.

ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi

^ par. 5 N’agbanyeghị na Jizọs bụ Onye Ozizi kacha ukwuu dịtụrụla ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị ege ya ntị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ kpatara ya. Anyị ga-ahụkwa ihe mere ọtụtụ ndị taa ekweghị ege ndị na-eso ụzọ Jizọs ntị n’ihi ihe ndị ha na-eme na ihe ndị ha na-ekwu. Nke kacha nke, anyị ga-amụta ihe mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike n’ebe Jizọs nọ ka anyị ghara ịsụ ngọngọ.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe Filip na-agba Nataniel ume ka ọ gakwuru Jizọs.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-ezi ozi ọma.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ebe ndị na-emegide ya nọ.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs gara n’elu ugwu nọrọ naanị ya.