Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

À na-eji papaịrọs arụ ụgbọ mmiri n’oge Baịbụl?

Ahịhịa papaịrọs

ỌTỤTỤ ndị maara na ọ bụ papaịrọs ka ọtụtụ ndị ji ede ihe n’Ijipt oge ochie. Ndị Grik na ndị Rom jikwa ya dee ihe. * Ma, ọtụtụ ndị amaghị na ọ bụghị naanị ide ihe ka e ji papaịrọs mee. E jikwa ya rụọ ụgbọ mmiri.

Ihe abụọ a kpụrụ akpụ na-egosi ụgbọ mmiri ndị e ji ahịhịa papaịrọs rụọ a hụrụ n’otu ili dị n’Ijipt

Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, Aịzaya onye amụma dere na ndị bi “n’ógbè osimiri ndị dị n’Itiopia” zigara “ndị ozi ka ha si n’oké osimiri gaa, ka ha jiri ụgbọ mmiri ndị na-ese n’elu mmiri, bụ́ ndị e ji ahịhịa papaịrọs rụọ.” Mgbe e mechara, Jeremaya onye amụma bukwara amụma na mgbe ndị Midia na ndị Peshia ga-awakpo Babịlọn, ha ga-agba “ụgbọ mmiri ya niile e ji ahịhịa papaịrọs rụọ ọkụ” ka ha ghara ịgbapụ.—Aịza. 18:1, 2; Jere. 51:32.

Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. N’ihi ya, o jughị ndị na-amụ Baịbụl anya mgbe ihe ndị e gwupụtara n’ala gosiri na a na-eji papaịrọs arụ ụgbọ mmiri n’oge Baịbụl. (2 Tim. 3:16) Gịnị ka ha chọpụtara? Ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie kwuru na a na-eji papaịrọs arụ ụgbọ mmiri n’Ijipt.

OTÚ E SI EJI PAPAỊRỌS ARỤ ỤGBỌ MMIRI

Ihe ndị e sere n’ili ndị dị n’Ijipt na-egosi otú e si egbute ahịhịa papaịrọs na otú e si eji ya arụ ụgbọ. Ụmụ nwoke na-aga gbute ahịhịa papaịrọs, kee ha n’ùkwù n’ùkwù, kekọtazie ùkwù ndị ahụ. Ahịhịa papaịrọs na-enwe akụkụ atọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na e kekọta ha, ha na-esi ezigbo ike. Otu akwụkwọ na-ekwu gbasara Ijipt oge ochie kwuru na ụgbọ mmiri ndị a e ji papaịrọs rụọ nwere ike ịdị mita iri na asaa n’ogologo. N’ihi ya, ihe dị ka mmadụ iri ma ọ bụ iri na abụọ nwere ike ịnọ n’akụkụ nke ọ bụla na-akwọ ụgbọ ahụ.

Ihe e sere n’ahụ́ ájá dị n’Ijipt na-egosi otú e si eji ahịhịa papaịrọs arụ ụgbọ mmiri

GỊNỊ MERE NDỊ NA-ARỤ ỤGBỌ MMIRI JI EJI PAPAỊRỌS ARỤ YA?

Ahịhịa papaịrọs na-etokarị na ndagwurugwu Osimiri Naịl na-asọ. Ihe ọzọkwa bụ na ụgbọ mmiri papaịrọs na-adị mfe ọrụrụ. Ma mgbe ndị mmadụ maliteziri iji osisi na-arụ ụgbọ mmiri ndị buru ibu, o yiri ka ndị na-akụ azụ̀ na ndị na-agba nta hà nọgidere na-eji ụgbọ mmiri ndị e ji papaịrọs rụọ na-aga ọrụ.

Ruo ọtụtụ afọ, ndị mmadụ nọgidere na-eji ụgbọ mmiri e ji papaịrọs rụọ na-eme njem. Otu onye Gris na-ede akwụkwọ n’oge ndịozi aha ya bụ Plutarch kwuru na ụfọdụ ndị ka na-eji ụgbọ mmiri e ji papaịrọs rụọ eme njem n’oge ahụ.

^ par. 3 Ahịhịa papaịrọs na-eto nke ọma n’ala ụrọ nakwa n’iyi na-anaghị asọsi ike. Ahịhịa papaịrọs na-adị ihe dị ka mita ise n’ogologo, nakwa ihe dị ka sentimita iri na ise n’ibu n’úkwù ya.