AKỤKỌ NDỤ
“Amụtara M Ọtụtụ Ihe n’Aka Ndị Ọzọ”
M KA na-eto eto mgbe m banyere amị na Frans. Ndị agha anyị nọ n’ugwu dị n’Ọljirịa. A na-alụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe ahụ. N’otu abalị, m ji égbè nọrọ naanị m n’azụ akpa a gbajuru ájá. Na mberede, m nụrụ ụda ụkwụ na-abịa ebe m nọ. Ezigbo ụjọ jidere m. Achọghị m igbu mmadụ, achọghịkwanụ m ịnwụ. N’ihi ya, m rịọrọ Chineke ka o nyere m aka.
Ihe ahụ merenụ gbanwere ndụ m n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m bidoro chọwa ịmata gbasara Onye kere ihe niile. Ma tupu mụ akọọ ihe mechara mee n’abalị ahụ, ka m kọọrọ unu ihe mere mgbe m ka bụ nwata mere m ji chọwa ịmata gbasara Chineke.
IHE M MỤTARA N’AKA NNA M
A mụrụ m n’afọ 1937 na Gesnen bụ́ obodo a na-egwupụta ihe n’ala dị n’ebe ugwu Frans. Papa m so na-egwupụta kol. M mụtara ịrụsi ọrụ ike n’aka ya. M sikwa n’aka ya mụta ịkpọ ikpe na-ezighị ezi asị. Ọ hụrụ na a na-emegbu ọtụtụ ndị na-egwu kol na-arụ ọrụ ike emegbu, ọ chọkwara inyere ha aka. Papa m banyekwara n’òtù na-agba mbọ ịhụ na ihe dịịrị ndị na-egwu kol mma. Omume ihu abụọ ndị isi chọọchị na-eme na-ewekwa ya iwe. Ọtụtụ n’ime ha nwere ego. Ma, ha na-agwa ndị na-egwu kol na-agbasi mbọ ike ka ha nweta ihe ha ga-eri ka ha nye ha ego na nri. Otú papa m si kpọọ omume ndị isi chọọchị asị mere ka ọ ghara ịkụziri m ihe ọ bụla gbasara okpukpe. Anyị anaghịdị ekwu ihe ọ bụla gbasara Chineke.
Ka m na-etolite, m malitere ịkpọ ikpe na-ezighị ezi asị. Otu n’ime ihe ndị m chere na o zighị ezi bụ otú ndị nọ m gburugburu si akpọ ndị mbịarambịa bi na Frans asị. Mụ na ụmụaka ndị mbịarambịa na Frans na-agba bọl, iso ha nọrọ na-atọkwa m ụtọ. E wezụgakwa nke ahụ, mama m abụghị onye Frans, ọ bụ onye Poland. M chọrọ ka ndị si n’ebe dị iche iche bikọta ọnụ n’udo nakwa ka a ghara ịna-emegbu ndị mmadụ n’ihi ebe ha si.
M MALITERE NA-ECHESI ECHICHE IKE GBASARA NDỤ
Ndị ọchịchị mere ka m banye amị n’afọ 1957. Ọ bụ otú a ka m si hụ onwe m n’ugwu Ọljirịa ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite. Mgbe m rịọchara Chineke ka o nyere m aka, ihe m hụrụ abụghị onye agha, kama, ọ bụ ịnyịnya ibu ọhịa. M kudara ume. Ma, ihe ahụ merenụ na agha ahụ a na-alụ mere ka m chesie echiche ike gbasara ndụ. Ajụjụ ụfọdụ m nọ na-ajụ bụ, Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị? È nwere mgbe a ga-enwe udo ga-adịru ebighị ebi?
Mgbe m gara ileta nne na nna m n’ụlọ, mụ na otu Onyeàmà Jehova hụrụ. O nyere m otu Baịbụl a na-akpọ La Sainte Bible, bụ́ Baịbụl ndị Katọlik sụgharịrị n’asụsụ French. M malitere ịgụ ya mgbe m laghachiri Ọljirịa. Ebe kacha mee ka m chekwuo echiche bụ́ Mkpughe 21:3, 4. Ebe ahụ sịrị: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” * Anụtụbeghị m ụdị ihe a mbụ. M nọ na-eche ma ihe a ọ̀ bụ eziokwu. N’oge ahụ, o nweghị ihe ọ bụla m ma gbasara Chineke na Baịbụl.
Mgbe m pụtara n’amị n’afọ 1959, m matara otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ François. Ọ kụziiri m ọtụtụ ihe na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o gosiri m na Baịbụl na aha Chineke bụ Jehova. (Ọma 83:18) François kọwakwaara m na Jehova ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi kwụsị n’ụwa, mee ka ụwa ghọọ paradaịs, mezuokwa ihe ahụ e kwuru ná Mkpughe 21:3, 4.
Ihe ndị ahụ ọ kụziiri m doro m anya. Ha rukwara m n’obi. Ma, m wesoro ndị isi chọọchị iwe, chọọkwa ime ka ndị mmadụ mata na ihe ha na-akụzi adịghị na Baịbụl. Ma, m ka na-eche echiche ka papa m, chọọkwa ime ka a kwụsị ikpe na-ezighị ezi. Ọ na-enu m enu n’obi, m chọkwara ime ihe ozugbo.
François na ndị enyi m ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova nyeere m aka iwetu obi. Ha kọwaara m na ọrụ anyị bụ́ Ndị Kraịst abụghị ikpe ikpe, kama, ọ bụ inyere ndị mmadụ aka ka ha nụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ọrụ ahụ ka Jizọs rụrụ, gwakwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arụ. (Mat. 24:14; Luk 4:43) M mụtakwara otú m ga-esi na-emeda obi ma jiri akọ na-agwa ndị mmadụ okwu n’agbanyeghị ihe ha kweere. Baịbụl sịrị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ.”—2 Tim. 2:24.
M gbanwere ihe ndị m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m ma mee baptizim n’afọ 1959 n’otu mgbakọ sekit. M hụrụ otu nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ Angèle ná mgbakọ ahụ, ihe ya masịkwara m. M malitere ịna-aga n’ọgbakọ ha mgbe ụfọdụ. Mụ na ya lụrụ n’afọ 1960. O nwere ezigbo àgwà, bụrụ ezigbo nwunye nakwa onyinye magburu onwe ya Jehova nyere m.—M MỤTARA ỌTỤTỤ IHE N’AKA ỤMỤNNA NWOKE MA NKE A NA-AKỌ
Kemgbe ọtụtụ afọ, amụtala m ọtụtụ ihe baara m uru n’aka ụmụnna nwoke ma nke a na-akọ. Otu n’ime ihe ndị kacha mkpa m mụtara bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụ ọrụ tara akpụ e nyere anyị nke ọma, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-eme ihe e kwuru n’Ilu 15:22, ebe sịrị: “A na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”
N’afọ 1964, m malitere ịhụ otú ihe e kwuru n’amaokwu ahụ si bụrụ eziokwu. N’afọ ahụ, m bidoro ọrụ nlekọta sekit, na-aga ọgbakọ dị iche iche ịgba ụmụnna anyị ume na ime ka okwukwe ha sie ike. Ma, m dị afọ iri abụọ na asaa n’oge ahụ. O nwekwaghị oké ihe m ma. N’ihi ya, m mejọrọ ọtụtụ ihe. Ma, m si na ha mụta ihe. Karịchaa, m mụtara ọtụtụ ihe n’aka “ndị ndụmọdụ” ma nke a na-akọ, bụrụkwa aka ochie.
M na-echeta otu ihe mere mgbe m ka malitere ọrụ sekit ọhụrụ. Mgbe m letachara otu ọgbakọ dị na Paris, otu nwanna nwoke ma nke a na-akọ jụrụ m ma mụ na ya ò nwere ike ikwutụ okwu. M sịrị ya ee.
Ọ jụrụ m, sị: “Louis, ọ̀ bụrụ na dọkịta agaa n’ụlọ ndị mmadụ, ònye ka ọ na-aga ịhụ?”
M sịrị ya: “Ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị.”
Ọ sịrị m: “Nke ahụ bụ eziokwu. Ma, m chọpụtara na ndị gị na ha kacha anọ bụ ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ, dị ka ndị okenye. N’ọgbakọ anyị, e nwere ọtụtụ ụmụnna dara mbà n’obi, ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ ndị ihere na-eme. Obi ga-atọgbu ha atọgbu ma ọ bụrụ na gị na ha anọrịa ma ọ bụdị ma ị gaa n’ụlọ ha ka gị na ha rie nri.”
Obi tọgburu m atọgbu na nwanna a nyere m ndụmọdụ a baara m ezigbo uru. Otú o si hụ atụrụ Jehova n’anya metụrụ m n’obi. N’ihi ya, n’agbanyeghị na o siiri m ike ikweta na m mejọrọ ihe, m bidoro ime ihe o kwuru ozugbo. M na-ekele Jehova na e nwere ụmụnna dị otú a.
Ilu 15:22 kwuru baakwara m uru. M gara ka ụmụnna ihe gbasara nri doro anya nyere m aka. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-egbu anụ, ndị na-akọ ugbo, ndị na-esi nri, nakwa ndị na-azụta ihe. Anyị niile gbakọrọ aka rụọ ọrụ a yiri ihe na-agaghị ekweli omume.
N’afọ 1969 na n’afọ 1973, a họpụtara m ka m na-ahụ maka ihe oriri ná mgbakọ mba niile abụọ e nwere na Kolombes dị na Paris. Ná mgbakọ nke 1973, e nwere ihe dị ka iri puku mmadụ isii a ga-enye nri ruo abalị ise. Amaghị m otú m ga-esi emeli ihe a. Ma, iheN’afọ 1973, a gwara mụ na nwunye m ka anyị jewe ozi na Betel dị na Frans. Ọrụ mbụ e nyere m sikwara ezigbo ike. M na-achọ ụzọ ezigara ụmụnna nọ na Kameruun bụ́ obodo nọ n’Afrịka akwụkwọ anyị. A machiri ọrụ anyị n’obodo ahụ malite n’afọ 1970 ruo n’afọ 1993. Amaghịkwa m ma m̀ ga-arụli ọrụ a. Ọ ga-abụ na nwanna na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Frans chọpụtara ihe a ma gbaa m ume, sị: “Akwụkwọ ndị a dị ụmụnna anyị nọ na Kameruun mkpa. Ka anyị gbalịa mee ka ha nweta ha.” Anyị gbalịkwara mee otú ahụ.
M mere njem ọtụtụ ugboro gaa obodo ndị ha na Kameruun gbara agbata obi ka mụ na ndị okenye nọ na Kameruun nwee nnọkọ. Ụmụnna ndị a nwere obi ike na amamihe. Ha nyeere m aka ịhazi otú a ga-esi na-ebuga akwụkwọ anyị Kameruun. Jehova gọziri mbọ ndị anyị gbara. N’ime afọ iri abụọ ahụ, e nweghị mgbe Ụlọ Nche na akwụkwọ a na-amụ n’ọmụmụ ihe etiti izu n’oge ahụ a na-akpọ Our Kingdom Service kọrọ ụmụnna ndị ahụ.
M MỤTARA ỌTỤTỤ IHE N’AKA NWUNYE ỌMA M
Malite mgbe mụ na Angèle kpawara, m chọpụtara na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Mgbe anyị lụkwara, àgwà ọma ndị o nwere bịara pụtakwuo ìhè. Dị ka ihe atụ, ná mgbede ụbọchị anyị gbara akwụkwọ,
ọ gwara m ka m kpee ekpere gbasara ọchịchọ anyị nwere iji oge anyị niile fee Jehova. Jehova zakwara ekpere ahụ.Nwunye m enyekwarala m aka ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọrọ anyị ka anyị bịa Betel n’afọ 1973, o siiri m ike n’ihi na ọrụ nlekọta sekit na-amasị m. Ma, nwunye m chetaara m na ọ bụ Jehova ka anyị nyefere ndụ anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị njikere ime ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị mee. (Hib. 13:17) M kwetara ihe ahụ o kwuru. N’ihi ya, anyị gawara Betel. Kemgbe anyị lụrụ, amamihe ya, otú o si eche echiche nke ọma, na otú o si hụ Jehova n’anya mere ka alụmdi na nwunye anyị sikwuo ike, nyekwara anyị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma.
Ugbu a anyị merela agadi, nwunye m ka bụkwa nwaanyị e ji ama atụ. Ọ na-akwadokwa m. Dị ka ihe atụ, ka anyị nwee ike ịga ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova, anyị gbalịkwuru n’ịmụ asụsụ Bekee n’ihi na ọ bụ ya ka e ji akụzi ihe n’ọtụtụ n’ime ha. Ihe ọzọ anyị mere bụ ịba n’ọgbakọ na-eji asụsụ Bekee amụ ihe n’agbanyeghị na anyị agafeela afọ iri asaa n’oge ahụ. Ebe m so na Kọmitii Alaka dị na Frans, o siiri m ike n’ihi ọtụtụ ọrụ m ji n’aka. Ma, mụ na nwunye m nyeere ibe anyị aka. Ugbu a anyị karịrị afọ iri asatọ, anyị ka na-akwadebe ọmụmụ ihe ma n’asụsụ Bekee ma n’asụsụ French. Anyị na-agbalịkwa otú anyị nwere ike ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-esokwa ọgbakọ anyị na-aga ozi ọma. Jehova agọziela mbọ anyị na-agba ịmụta asụsụ Bekee.
E nwere ihe ọma ọzọ meere anyị n’afọ 2017. A kpọrọ mụ na nwunye m ka anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha nke e mere na Patasịn dị na Niu Yọk.
N’eziokwu, Jehova bụ Onye Ozizi Ụkwụ anyị. (Aịza. 30:20) N’ihi ya, o jughị anyị anya na ihe Jehova na-akụziri onye ọ bụla n’ọgbakọ ya enweghị atụ, ma nwata ma okenye. (Diut. 4:5-8) N’eziokwu, achọpụtala m na ọ bụrụ na ndị na-eto eto na-ege ma Jehova ma ụmụnna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ntị, ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ, na-emekwa ezigbo mkpebi ná ndụ ha. Ihe e kwuru n’Ilu 9:9 bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Kụziere onye maara ihe ihe, ọ ga-amakwa ihe karị. Nye onye ezi omume ihe ọmụma, ọ ga-atụkwasị ihe n’ihe ọ mụtara.”
Mgbe ụfọdụ, m na-echeta ihe ahụ tụrụ m ezigbo ụjọ mgbe m nọ n’elu ugwu n’Ọljirịa ihe dị ka afọ iri isii gara aga. Amaghị m na ndụ ga-emecha tọọ m ụtọ otú a. M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ndị ọzọ. Jehova emeela ka ndụ tọọ mụ na nwunye m ụtọ n’ozi anyị na-ejere ya. N’ihi ya, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị akwụsị ịmụta ihe n’aka Jehova nakwa n’aka ụmụnna anyị ndị ma nke a na-akọ hụkwara Jehova n’anya.
^ par. 11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ