Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21

Jehova Ga-enye Gị Ike

Jehova Ga-enye Gị Ike

“Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” —2 KỌR. 12:10.

ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee nsogbu na-abịara ọtụtụ ụmụnna anyị taa?

PỌL onyeozi gbara Timoti ume ka o jezuo ozi ya. Ihe ahụ ọ gwara Timoti gbasakwara Ndị Kraịst niile. (2 Tim. 4:5) Anyị niile kwesịrị ime ihe a Pọl kwuru. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike. Ụjọ na-atụ ọtụtụ ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma. (2 Tim. 4:2) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna anyị bi n’obodo a machiri anyị ime ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ machie anyị iwu kpamkpam. Ma, ha na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a tụọ ha mkpọrọ.

Ndị ohu Jehova taa na-enwe ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ime ka ha daa mbà n’obi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ogologo oge n’ụbọchị iji gboo mkpa ezinụlọ ha. Ha ga-achọ ijekwuru Jehova ozi. Ma, ná ngwụcha izu, ike na-agwụcha ha. Ụfọdụ ndị enweghị ike ime ihe niile ha chọrọ ime n’ozi ọma n’ihi ọrịa ma ọ bụ nká. Ụfọdụ ndị anaghịdị apụta apụta. E nwekwara ndị nke na-eche na e nweghị ihe ha dị mma ya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mary * sịrị: “M na-agbalịsi ike ka obi ghara ịna-ajọ m njọ mgbe ọ bụla m dara mbà. Obi m na-amakwa m ikpe n’ihi na ọ na-eme ka m ghara inwe oge na ike buru ibu m ga-eji na-ekwusa ozi ọma.”

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 N’agbanyeghị ihe bụ́ nsogbu anyị, Jehova nwere ike inyere anyị aka ịna-efe ya otú anyị nwere ike. Tupu anyị atụlee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka, ka anyị buru ụzọ tụlee otú o si nye Pọl na Timoti ike ha ji jezuo ozi ha n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere.

JEHOVA NA-ENYE ANYỊ IKE ANYỊ JI EKWUSA OZI ỌMA

4. Olee nsogbu ndị bịaara Pọl?

4 Ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl. Enyemaka Jehova dị ya mkpa mgbe e tiri ya ihe, tụọ ya nkume, tụọkwa ya mkpọrọ. (2 Kọr. 11:23-25) Pọl kwudịrị na e nwere mgbe ya na ịda mbà n’obi na-alụ. (Rom 7:18, 19, 24) E nwere mgbe o nwere “ogwu n’anụ ahụ́” ya ọ chọsiri ike ka Jehova wepụrụ ya.— 2 Kọr. 12:7, 8.

Gịnị nyeere Pọl aka n’ozi ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5. Olee ihe ndị Pọl rụzuru n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya?

5 Jehova nyere Pọl ike o ji zie ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya. Chegodị ihe ndị Pọl rụzuru. Dị ka ihe atụ, mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’otu ụlọ na Rom, o ji ịnụ ọkụ n’obi zie ndị isi ndị Juu ozi ọma. O nwekwara ike ịbụ na o ziri ndị nọ n’ọchịchị ozi ọma. (Ọrụ 28:17; Fil. 4:21, 22) O zikwara ọtụtụ Ndị Nche Eze ozi ọma, ziekwa ndị niile bịara ileta ya ozi ọma. (Ọrụ 28:30, 31; Fil. 1:13) N’oge ahụkwa, Jehova nyere Pọl mmụọ nsọ ya edee akwụkwọ ozi ndị na-abara Ndị Kraịst uru ruo taa. Ihe Pọl mere gbakwara ọgbakọ dị na Rom ume nke mere ka “ha na-egosi obi ike karị n’ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.” (Fil. 1:14) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe niile ka Pọl nwere ike ime mgbe ụfọdụ, ma, o mere ike ya niile nke mere ka “ozi ọma na-aga n’ihu.”—Fil. 1:12.

6. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10, gịnị mere Pọl ji jezuo ozi ya?

6 Pọl matara na ihe niile o mere n’ozi Jehova bụ n’ihi ike Jehova nyere ya, ọ bụghị n’ike nke onwe ya. O kwuru na “a na-eme ka ike [Chineke] zuo okè n’adịghị ike.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10.) Jehova ji mmụọ nsọ ya nye Pọl ike ijezu ozi ya n’agbanyeghị mmegide, ịtụ mkpọrọ, na nsogbu ndị ọzọ o nwere.

Gịnị nyeere Timoti aka n’ozi ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee nsogbu ndị Timoti meriri iji jezuo ozi ya?

7 Ọ dịkwa mkpa ka Timoti bụ́ onye ya na Pọl so jee ozi tụkwasị Jehova obi iji jee ozi ya. Timoti sooro Pọl gaa ozi ala ọzọ n’ebe ndị dị anya. Pọl zigakwara ya ka ọ gaa gbaa ọgbakọ dị iche iche ume. (1 Kọr. 4:17) O nwere ike ịbụ na Timoti chere na ya erughị eru ime ihe ndị a. O nwere ike ịbụ ya mere Pọl ji dụọ ya ọdụ, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya n’ihi na ị bụ okorobịa.” (1 Tim. 4:12) N’oge ahụkwa, Timoti nwekwara ogwu n’anụ ahụ́ ya nke bụ́ ‘ọrịa ọ na-arịakarị.’ (1 Tim. 5:23) Ma, Timoti ma na mmụọ nsọ Jehova ga-enye ya ike dị ya mkpa iji kwusaa ozi ọma ma jeere ụmụnna ya ozi.—2 Tim. 1:7.

JEHOVA NA-ENYE ANYỊ IKE ANYỊ NA-EJI ERUBERE YA ISI MA NSOGBU BỊARA ANYỊ

8. Olee otú Jehova si eme ka ndị ya dị ike taa?

8 Taa Jehova na-enye ndị ya “ike karịrị ike nkịtị” ka ha nwee ike ịnọgide na-ejere ya ozi. (2 Kọr. 4:7) Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe anọ Jehova nyere anyị iji mee ka anyị sie ike nakwa iji nyere anyị aka ịnọgide na-erubere ya isi. Ha bụ: ekpere, Baịbụl, ụmụnna anyị, na ozi anyị.

Jehova na-eji ekpere enyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka?

9 Ekpere na-eme ka anyị nweta ike. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 6:18, Pọl gbara anyị ume ka anyị ‘nọgide n’ekpere.’ Chineke ga-aza ekpere anyị ma nye anyị ike. Otu nwanna aha ya bụ Jonnie bi na Bolivia hụrụ na Jehova nyere ya ike mgbe ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya. Nwunye ya na nne na nna ya dara ọrịa otu mgbe. Ọ dịrịghị Jonnie mfe ilekọta ha atọ. Mama ya mechara nwụọ. O wekwara oge tupu nwunye ya na papa ya agbakee. Jonnie na-echeta ihe mere n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Mgbe nsogbu siri ike bịaara m, ihe nyeere m aka bụ ịkpọ okwu aha n’ekpere m.” Jehova nyere Jonnie ike o ji die nsogbu bịaara ya. Otu okenye bi na Bolivia aha ya bụ Ronald nụrụ na mama ya na-arịa kansa. Mama ya ahụ mechaakwara nwụọ mgbe otu ọnwa gachara. Gịnị nyeere ya aka idi ya? Ọ sịrị: “M kpewe ekpere, m na-agwa Jehova otú ọ dị m n’obi. M ma na ọ na-aghọta otú obi dị m karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ na-aghọtadị ya karịa m.” Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike izu anyị ahụ́ ma ọ bụkwanụ anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekpe n’ekpere. Ma, Jehova chọrọ ka anyị kpee ekpere ọ bụrụgodị na anyị amaghị otú anyị ga-esi agwa ya otú o si dịrị anyị n’obi.—Rom 8:26, 27.

Jehova na-eji Baịbụl enyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 4:12, gịnị mere ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya ji dị ezigbo mkpa?

10 Baịbụl na-eme ka anyị dị ike. Pọl gụrụ Okwu Chineke iji nweta ike na nkasi obi. Anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. (Rom 15:4) Ka anyị na-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya, Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya mee ka anyị ghọta otú ihe anyị gụrụ nwere ike isi nyere anyị aka ná nsogbu anyị. (Gụọ Ndị Hibru 4:12.) Ronald anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-agụ Baịbụl n’abalị ọ bụla. M na-ewepụta oge buru ibu chebara àgwà ndị Chineke nwere echiche nakwa ụzọ magburu onwe ya o si meso ndị ya. Ihe a na-enyere m aka inwetaghachi ike.”

11. Olee otú Baịbụl si nyere otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aka?

11 Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke nwere ike inyere anyị aka ịna-ele nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Legodị otú Baịbụl si nyere otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aka. Otu okenye gwara ya na ịgụ akwụkwọ Job nwere ike ịbara ya uru. Mgbe ọ na-agụ ya, ihe mbụ o mere bụ ịkatọ Job n’ihi otú na-adịghị mma o si chee echiche. O yiri ka ọ na-agwa Job, sị: “Job, echekwala naanị gbasara nsogbu gị.” Ma, o mechara chọpụta na ihe yanwa mere yikwara ihe ahụ Job mere. Ihe a nyeere ya aka ịgbanwe otú o si eche echiche ma nyere ya aka idi ọnwụ di ya.

Jehova na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú Jehova si eji ụmụnna anyị eme ka anyị dị ike?

12 Ụmụnna anyị na-eme ka anyị dị ike. Jehova na-esikwa n’aka ụmụnna anyị eme ka anyị dị ike. Pọl kwuru na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka ya na ụmụnna ya ‘gbarịta ibe ha ume.’ (Rom 1:11, 12) Ọ na-atọgbu Mary anyị kwuburu okwu ya atọgbu ma ya na ụmụnna ya nọrọ. Ọ sịrị: “Jehova ji ụmụnna ndị na-amaghịdị ihe mụ na ya na-alụ na-enyere m aka. Ha na-ekwu ihe na-agba m ume ma ọ bụkwanụ zitere m ozi dị m mkpa. Ihe ọzọ na-enyekwara m aka bụ ịkọrọ ụmụnna nwaanyị ndị ụdị ihe ahụ metụrụla otú ọ dị m, nakwa ịmụta ihe n’aka ha. Ndị okenye na-emekwa ka m mata na ụmụnna nọ n’ọgbakọ hụrụ m n’anya.”

13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna anyị dị ike n’ọmụmụ ihe?

13 Otu n’ime ebe kacha mma ịnọ gbaa ụmụnna anyị ume bụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị gaa ọmụmụ ihe, i nwere ike ịgwa ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya nakwa na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ha na-eme, si otú ahụ mee ka ha dị ike. Dị ka ihe atụ, tupu ọmụmụ ihe amalite, otu okenye aha ya bụ Peter gwara otu nwanna nwaanyị di ya na-abụghị nwanna, sị: “Ị maghị otú o si agba m ume ịhụ gị ebe a. Ị na-ejikere ụmụ gị isii, na-akwadebekwa ajụjụ ndị unu ga-aza.” Anya mmiri juru nwanna nwaanyị ahụ anya, ya azaghachi ya, sị: “Ihe a i kwuru agbaala m ezigbo ume.”

Jehova na-eji ozi ọma enyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee otú ikwusa ozi ọma si enyere anyị aka?

14 Ozi ọma na-eme ka anyị dị ike. Anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara eziokwu dị na Baịbụl, obi na-adị anyị mma, ma hà gere anyị ntị ma ha egeghị anyị ntị. (Ilu 11:25) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Stacy chọpụtara na ozi ọma na-eme ka ọ dị ike. Mgbe a chụrụ otu onye ezinụlọ ha n’ọgbakọ, o wutere ya, ya ana-ajụ onwe ya mgbe niile, sị: ‘O nwere ihe m gaara eme iji nyere ya aka?’ Ihe a ka ọ na-eche mgbe niile. Gịnị nyeere ya aka idi nsogbu a? Ọ bụ ozi ọma. Ka ọ na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma ka ọ na-eche gbasara ndị nọ n’ókèala ha chọrọ ka e nyere ha aka. Ọ sịrị: “N’oge ahụ, Jehova mere ka m nweta otu onye m na-amụrụ Baịbụl na-egbughị oge ime ihe ọ mụtara. Ihe a gbara m ezigbo ume. Ihe kacha nyere m aka bụ ikwusa ozi ọma.”

15. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Mary kwuru?

15 Ụfọdụ ndị nwere ike iche na o nweghị oké ihe ha nwere ike ime n’ozi ọma n’ihi otú ihe si dịrị ha. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, cheta na obi na-adị Jehova ụtọ ma i mee ike gị niile. Chegodị gbasara nwanna nwaanyị Mary anyị kwuburu okwu ya. Mgbe ọ gafere n’ọgbakọ na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe, o chere na o nweghị ezigbo uru ọ na-aba. Ọ sịrị: “Ruo oge ụfọdụ, naanị ihe m nwere ike ime bụ ịza ajụjụ dị nkenke ma ọ bụ ịgụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ inye mmadụ traktị n’ozi ọma.” Ihe a na-eme ka o chee na o nweghị ezigbo ihe ọ na-eme ma o jiri onwe ya tụnyere ndị asụsụ ahụ na-aga were were n’ọnụ. Ma, o mechara gbanwee otú o si eche echiche. Ọ matara na Jehova nwere ike iji ya rụọ ọrụ n’agbanyeghị na asụsụ ahụ anaghị aga ya were were n’ọnụ. Ọ sịrị: “Ihe Baịbụl kwuru dị nnọọ mfe. O nwekwara ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ.”

16. Gịnị nwere ike inyere ndị na-anaghị apụ apụ aka inweta ike?

16 Jehova na-ahụ otú o si agụ anyị agụụ ikwusa ozi ọma, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ike ịpụ apụ. O jikwa ya kpọrọ ihe. O nwere ike ime ka anyị nwee ohere izi ndị na-elekọta anyị ma ọ bụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị anyị na-eme ugbu a tụnyere ihe ndị anyị mere n’oge gara aga, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. Ma, ọ bụrụ na anyị amata na Jehova na-enyere anyị aka ugbu a, anyị ga-enweta ike ma jiri ọṅụ die ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị.

17. Dị ka e kwuru n’Ekliziastis 11:6, gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na o yiri ka ọ rụpụtaghị ihe mgbe ahụ?

17 Anyị amaghị mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ nke nwere ike ịgbanye mgbọrọgwụ ma malite ito. (Gụọ Ekliziastis 11:6.) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ na ụma aha ya bụ Barbara na-eji ekwentị na akwụkwọ ozi ezi ozi ọma. N’otu n’ime akwụkwọ ozi ndị o dere, o tinyere Ụlọ Nche Mach 1, 2014 isiokwu ya bụ “Ihe Chineke Meere Anyị.” Ọ maghị na ndị o zigaara akwụkwọ ozi ahụ bụ di na nwunye na-abụghịzi Ndịàmà Jehova. Ha gụrụ Ụlọ Nche ahụ ọtụtụ ugboro. Ọ dị nwoke ahụ ka Jehova ọ̀ na-agwa ya okwu. Ha malitere ịbịa ọmụmụ ihe, mechaakwa ghọọ Ndịàmà Jehova ha kwụsịrị ịbụ kemgbe afọ iri abụọ na asaa. Chegodịnụ ụdị obi ụtọ Barbara nwere mgbe ọ hụrụ otú akwụkwọ ozi ahụ o dere si baa ezigbo uru.

Jehova na-eji (1) ekpere, (2) Baịbụl, (3) ụmụnna anyị, na (4) ozi ọma enyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9, nke 10, nke 12, na nke 14)

18. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka ike Chineke baara anyị uru?

18 E nwere ọtụtụ ụzọ Jehova si eme ka anyị dị ike. Ha bụ ekpere, Baịbụl, ụmụnna anyị, nakwa ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ha na-abara anyị uru, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ chọrọ inyere anyị aka nakwa na ọ ga-enyere anyị aka. Ka anyị na-atụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi mgbe niile n’ihi na ọ na-atọ ya ụtọ igosi “ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe 16:9.

ABỤ NKE 61 Ndịàmà Jehova, Gaanụ n’Ihu

^ par. 5 Anyị bi n’oge siri ezigbo ike. Ma, Jehova na-enyere anyị aka idi ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jehova si nyere Pọl na Timoti aka ịnọgide na-efe ya n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere. Anyị ga-atụlekwa ụzọ ihe anọ Jehova nyere anyị iji nyere anyị aka ịnọgide na-efe ya taa.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe Pọl nọ n’ụlọ a tụrụ ya mkpọrọ na Rom na-edegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi, na-ezikwa ndị bịara ileta ya ozi ọma.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe Timoti na-agba ụmụnna ume mgbe ọ gara ileta ọgbakọ dị iche iche.