Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ndị Ezi Omume Sụọ Ngọngọ

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ndị Ezi Omume Sụọ Ngọngọ

“Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.”—ỌMA 119:165.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe otu onye na-ede akwụkwọ kwuru? Oleekwa ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

ỌTỤTỤ nde mmadụ taa na-ekwu na ha kweere na Jizọs, ma ha anaghị eme ihe ndị o kwuru. (2 Tim. 4:3, 4) E nwedịrị otu onye na-ede akwụkwọ sịrị: “Ọ bụrụ na Jizọs ọzọ abịa taa, na-ekwu ihe ndị Jizọs nke mbụ kwuru . . . , ànyị ga-ajụkwa ikwere na ya otú ahụ anyị mere puku afọ abụọ gara aga? . . . Azịza ya bụ Ee. Anyị agaghị ekwere na ya.”

2 Ọtụtụ ndị n’oge Jizọs nụrụ ihe ndị ọ kụziri, hụkwa ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, ma ha enweghị okwukwe na ya. N’ihi gịnị? N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ụzọ ihe anọ mere ndị mmadụ ji sụọ ngọngọ n’ihi ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ ihe anọ ndị ọzọ. Ka anyị na-eleba anya na ha, anyị ga-ahụ ihe mere ndị mmadụ n’oge a anaghị ege ndị na-eso ụzọ Jizọs ntị nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ.

(1) JIZỌS AKPAGHỊ ÓKÈ

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi ndị ha na Jizọs na-anọ. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3) *

3. Olee ihe Jizọs mere nke mere ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ?

3 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ya na ụdị mmadụ niile na-akpakọrịta. Ya na ndị bara ọgaranya na ndị nwere ikike riri nri. O wepụtakwara nnukwu oge ya na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu ji nọrịa. Ọ na-emetakwara ndị a na-ele anya ka “ndị mmehie” ebere. Ụfọdụ ndị oké ezi omume sụrụ ngọngọ n’ihi ihe Jizọs mere. Ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ?” Jizọs zara ha, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie, ka ha wee chegharịa.”—Luk 5:29-32.

4. Dị ka Aịzaya onye amụma buru n’amụma, gịnị ka ndị Juu gaara atụ anya ya banyere Mesaya ahụ?

4 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Ogologo oge tupu Mesaya abịa, Aịzaya onye amụma kwuru na ụwa ga-ajụ ya mgbe ọ ga-abịa. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya . . . Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ. E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.” (Aịza. 53:3) “Ndị mmadụ” ga-ezere Mesaya ahụ. N’ihi ya, ndị Juu n’oge Jizọs kwesịkwara ịtụ anya na ndị mmadụ agaghị ekwere na Jizọs.

5. Olee otú ọtụtụ ndị taa si ele ndị na-eso ụzọ Jizọs anya?

5 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Ọtụtụ ndị isi okpukpe taa na-anabata ndị a ma ama, ndị ji ego, nakwa ndị ndị mmadụ na-ele anya ka ndị ma ihe na chọọchị ha. Ha na-anabata ụdị ndị a n’agbanyeghị na otú ha si ebi ndụ adịghị Chineke mma. Ndị isi okpukpe ndị ahụ na-eledakwa ndị Jehova anya bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi nakwa ndị na-eme ihe Chineke kwuru n’ihi na ha abụghị ndị a ma ama n’ụwa. Dị ka Pọl kwuru, ndị Chineke họọrọ bụ ndị “a na-elelị.” (1 Kọr. 1:26-29) Ma, ndị niile na-efe Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.

6. Olee otú anyị nwere ike isi eme ka Jizọs dị ka e kwuru na Matiu 11:25, 26?

6 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? (Gụọ Matiu 11:25, 26.) Elekwala ndị ohu Chineke anya otú ụwa si ele ha. Mata na naanị ndị Chineke ji emezu uche ya bụ ndị dị umeala n’obi. (Ọma 138:6) Cheekwa gbasara ọtụtụ ihe Jehova jirila ndị ụwa na-ele anya ka ndị na-amaghị ihe rụzuo.

(2) JIZỌS GBARA ỤGHA HA NA-AKỤZI N’ANWỤ

7. Gịnị mere Jizọs ji kpọọ ndị Farisii ndị ihu abụọ? Gịnịkwa ka ha mere?

7 Jizọs ji obi ike katọọ ndị isi okpukpe n’oge ya n’ihi na ha anaghị akụziri ndị mmadụ ife Chineke otú ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na ndị Farisii bụ ndị ihu abụọ n’ihi na ịkwọ aka dị ha mkpa karịa ilekọta ndị mụrụ ha. (Mat. 15:1-11) O nwere ike ịbụ na ihe Jizọs kwuru gbagwojuru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ha jụdịrị ya, sị: “Ị̀ maara na ndị Farisii sụrụ ngọngọ mgbe ha nụrụ ihe i kwuru?” Jizọs zara ha, sị: “A ga-efopụ ihe ọkụkụ ọ bụla nke Nna m nke eluigwe na-akụghị. Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.” (Mat. 15:12-14) Jizọs ekweghị ka ihe ndị ndú okpukpe na-eme gbochie ya ikwu eziokwu.

8. Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụghị ihe niile ndị okpukpe kweere ka Chineke na-anabata?

8 Jizọs gbakwara ozizi ụgha ndị okpukpe na-akụzi n’anwụ. O kwughị na Chineke na-anabata ihe niile ha kweere. Kama, o kwuru na ọtụtụ ndị ga na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduga ná mbibi, naanị ole na ole ana-aga ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ. (Mat. 7:13, 14) O mere ka o doo anya na ụfọdụ ndị ga na-ekwu na ha na-efe Chineke, ma ọ bụghị ya ka ha na-efe n’eziokwu. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha ndị na-abịakwute unu n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji. Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.”—Mat. 7:15-20.

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi otú Jizọs si gbaa ozizi ụgha na ihe na-adịghị mma ha na-eme n’anwụ. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) *

9. Olee ụfọdụ n’ime ozizi ụgha ndị Jizọs gbara n’anwụ?

9 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-anụrụ ụlọ Jehova ọkụ n’obi. (Ọma 69:9; Jọn 2:14-17) Ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi ahụ mere Jizọs ji gbaa ozizi ụgha ndị okpukpe na ihe ndị na-adịghị mma ha na-eme n’anwụ. Dị ka ihe atụ, ndị Farisii kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Jizọs kụziri na ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra. (Jọn 11:11) Ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:43, 44; Ọrụ 23:8) Ndị Farisii kweere n’akara aka. Ha na-akụzi na Chineke ekpebiela ihe niile ga-eme ná ndụ mmadụ, nakwa na mmadụ enweghị ike ikpebiri onwe ya ihe ọ bụla. Ma, Jizọs kwuru na mmadụ nwere ike ikpebiri onwe ya ihe, nweekwa ike ikpebi ma ọ̀ ga-efe Chineke ma ọ bụ na ọ gaghị efe ya.—Mat. 11:28.

10. Gịnị mere ọtụtụ ndị taa anaghị ege ntị n’ihe ndị anyị na-akụzi?

10 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị n’ihi na eziokwu si na Baịbụl anyị na-akụzi na-agba ụgha ndị okpukpe na-akụzi n’anwụ. Ndị isi okpukpe na-akụziri ndị chọọchị ha na Chineke na-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ha na-eji nkụzi ụgha ahụ eyi ndị mmadụ egwu. Dị ka ndị ohu Jehova, ndị na-efe Chineke nke ịhụnanya, anyị na-agba ụgha ahụ ha na-akụzi n’anwụ. Ndị isi okpukpe na-akụzikwa na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ma, anyị na-agba ozizi ụgha ahụ n’anwụ n’ihi na a sị na ozizi ahụ bụ eziokwu, ọ gaghị adịzi mkpa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọtụtụ ndị na-akụzi na ihe na-eme ná ndụ ndị mmadụ si n’akara aka. Ma anyị na-akụziri ndị mmadụ na onye ọ bụla nwere ikike ịhọrọ ma ọ̀ ga-efe Chineke ma ọ bụ na ọ gaghị efe ya. Gịnị ka ndị ndú okpukpe na-eme n’ihi ihe ndị a anyị na-akụzi? Ọtụtụ mgbe, ha na-ewe iwe.

11. Dị ka Jizọs kwuru na Jọn 8:45-47, gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị ya na-eme?

11 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Ọ bụrụ na anyị ji eziokwu kpọrọ ihe, anyị ga-ekwere Okwu Chineke. (Gụọ Jọn 8:45-47.) Anyị adịghị ka Setan bụ́ Ekwensu. Anyị na-eguzosi ike n’eziokwu. Anyị anaghị eme ihe ọ bụla na-adabaghị n’ihe anyị kweere. (Jọn 8:44) Chineke chọrọ ka ndị ya ‘kpọọ ihe ọjọọ asị,’ nakwa ka ha ‘jidesie ezi ihe ike’ otú ahụ Jizọs mere.—Rom 12:9; Hib. 1:9.

(3) A KPAGBURU JIZỌS

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi otú Jizọs si nwụọ n’osisi ịta ahụhụ. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Gịnị mere otú Jizọs si nwụọ ji mee ka ọtụtụ ndị Juu sụọ ngọngọ?

12 Olee ihe ọzọ mere ndị Juu n’oge Jizọs ji sụọ ngọngọ? Pọl sịrị: “Anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, ọ bụụrụ ndị Juu ihe ịsụ ngọngọ.” (1 Kọr. 1:23) Gịnị mere ndị Juu ji ghara ikwere na Jizọs n’ihi otú o si nwụọ? N’anya ha, ọnwụ ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ mere ka o yie onye omekome na onye mmehie, ọ bụghị Mesaya.—Diut. 21:22, 23.

13. Olee ihe ndị ahụ sụrụ ngọngọ n’ihi Jizọs na-aghọtaghị?

13 Ndị Juu ahụ sụrụ ngọngọ n’ihi Jizọs aghọtaghị na aka ya dị ọcha, na e boro ya ebubo, nakwa na ihe e mere ya adịghị mma. Ihe bụ́ mkpa ndị kpere Jizọs ikpe abụghị ikpe ikpe ziri ezi. Ụlọikpe kachanụ ndị Juu nwere gbakọtara ọsọ ọsọ ikpe Jizọs ikpe. Ha esokwaghị otú iwu kwuru ka e si kpee ikpe kpee Jizọs ikpe. (Luk 22:54; Jọn 18:24) Kama ige ntị nke ọma n’ebubo a na-ebo Jizọs nakwa ihe akaebe ndị ha nwere, hanwa nọdị na-achọ “ihe ha ga-eji gbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha wee gbuo ya.” Mgbe ha na-ahụghị, ha chọrọ ime ka Jizọs kwuo ihe a ga-eji ma ya ikpe. Ihe a ha mere abụghị ihe iwu kwuru. (Mat. 26:59; Mak 14:55-64) Mgbe a kpọlitechakwara Jizọs n’ọnwụ, ndị ikpe arụrụala ndị ahụ kwụrụ ndị agha Rom “mkpụrụ ego ọlaọcha hiri nne” ka ha kwuo ihe na-abụghị eziokwu mere na o nweghị ihe nọ n’ili ahụ.—Mat. 28:11-15.

14. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ọnwụ Mesaya?

14 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Juu n’oge Jizọs atụghị anya na Mesaya ahụ ga-anwụ, lee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya. Ọ sịrị: “Ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya, a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu; ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ ndị, ọ gbachiteere ndị na-emebi iwu.” (Aịza. 53:12) N’ihi ya, e nweghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka ndị Juu ahụ sụọ ngọngọ mgbe ha hụrụ na e gburu Jizọs ka onye mmehie.

15. Olee ebubo ndị a na-ebo Ndịàmà Jehova nke na-eme ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ?

15 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. E boro Jizọs ebubo ụgha ma ma ya ikpe. A na-emekwa Ndịàmà Jehova otu ihe ahụ taa. Ka anyị legodị ihe atụ ụfọdụ. N’agbata afọ 1930 na afọ 1950 n’Amerịka, anyị gara ụlọikpe ọtụtụ ugboro n’ihi na a chọrọ ịmachi anyị ife Chineke. Otú ndị ikpe n’oge ahụ si kpee ikpe gosiri n’eziokwu na ha kpọrọ anyị asị. Na Kwebek dị na Kanada, ndị chọọchị na ndị ọchịchị gbakọrọ aka megide ọrụ anyị. A tụrụ ọtụtụ ndị nkwusa mkpọrọ n’ihi ịgwa ndị agbata obi ha gbasara Alaeze Chineke. Na Nazi Jamanị, e gburu ọtụtụ ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova. N’oge a kwa, a mala ọtụtụ ụmụnna anyị ikpe na Rọshịa n’ihi na ha na-ekwu gbasara Baịbụl. Ha kwuru na ime otú ahụ bụ ịda iwu. Ha machikwara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke dị n’asụsụ Rọshịa iwu, na-ekwu na o megidere iwu n’ihi na aha ahụ bụ́ Jehova dị na ya.

16. Dị ka e kwuru na 1 Jọn 4:1, gịnị mere anyị ekwesịghị ikwe ka e jiri ihe ndị na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara ndị Chineke duhie anyị?

16 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Mata ihe bụ́ eziokwu banyere ihe merenụ. Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’elu ugwu, ọ dọrọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị na a ga-enwe ndị ‘ga-aghagide ha ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide ha.’ (Mat. 5:11) Ọ bụ Setan ka ụgha ndị a si n’aka. Ọ na-eme ka ndị iro anyị na-agbasa ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị. (Mkpu. 12:9, 10) Anyị kwesịrị ịjụ ụgha ndị a ndị iro anyị na-agha. Anyị ekwesịghị ikwe ka ụgha ndị ahụ mee ka okwukwe anyị ghara isi ike.—Gụọ 1 Jọn 4:1.

(4) A RAARA JIZỌS NYE N’AKA NDỊ IRO YA, GBAHAPỤKWA YA

Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi otú Judas si rara Jizọs nye n’aka ndị iro ya. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18) *

17. Olee otú ihe ndị mere tupu Jizọs anwụọ nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ?

17 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ya raara ya nye n’aka ndị iro ya, onyeozi ya ọzọ agọnahụ ya ugboro atọ, ndịozi ndị ọzọ agbahapụkwa ya n’abalị ahụ bọtara ụbọchị e gburu ya. (Mat. 26:14-16, 47, 56, 75) Ihe a ejughị Jizọs anya. O kwudịrị na ihe a ga-eme. (Jọn 6:64; 13:21, 26, 38; 16:32) Mgbe ụfọdụ hụrụ ihe a, o nwere ike ịbụ na ha sụrụ ngọngọ, na-ekwu, sị: ‘Ọ̀ bụ otú a ka ndịozi Jizọs ọ bụ si eme? Achọghị m ihe ọ bụla ga-ejikọta mụ na ha.’

18. Olee amụma ndị ihe ndị merenụ tupu e gbuo Jizọs mezuru?

18 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Jehova esila n’Okwu ya mee ka a mata na a ga-arara Mesaya ahụ nye n’aka ndị iro ya nakwa na ihe a ga-akwụ onye ga-arara ya nye bụ mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. (Zek. 11:12, 13) E bukwara amụma na onye ga-arara ya nye bụ otu n’ime ndị ya na ha kacha dịrị ná mma. (Ọma 41:9) Zekaraya dekwara, sị: “Gbuo onye ọzụzụ atụrụ, ka ìgwè atụrụ ya wee gbasasịa.” (Zek. 13:7) Amụma ndị a mezurunụ n’isi Jizọs kwesịrị ime ka okwukwe ndị na-efe Chineke sie ike, ọ bụghị ime ka ha sụọ ngọngọ.

19. Olee ihe doro ndị chọrọ ife Chineke anya?

19 Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. N’oge anyị a, ụfọdụ Ndịàmà Jehova a ma ama apụọla n’ọgbakọ, ghọọ ndị si n’ezi ofufe dapụ, na-agbalịkwa iduhie ndị ọzọ. Ha na-esi n’Ịntanet, redio, tiivi, na akwụkwọ akụkọ na-akọsa akụkọ ọjọọ, akụkọ ndị e tinyere nnu na ose, nakwa ụgha gbasara Ndịàmà Jehova. Ma, ihe a ha na-akọsa anaghị eme ka ndị chọrọ ife Chineke sụọ ngọngọ. Kama nke ahụ, ha ma na Baịbụl ebuola amụma na ụdị ihe ahụ ga-eme.—Mat. 24:24; 2 Pita 2:18-22.

20. Olee ihe anyị ga-eme ka ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akọsa ghara iduhie anyị? (2 Timoti 4:4, 5)

20 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Anyị kwesịrị ịna-amụ ihe mgbe niile, na-ekpe ekpere mgbe niile, jirikwa ọrụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe ka o mee ka okwukwe anyị sie ike. (Gụọ 2 Timoti 4:4, 5.) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe, ụjọ agaghị atụ anyị ma anyị nụ akụkọ ọjọọ gbasara Ndịàmà Jehova. (Aịza. 28:16) Otú anyị si hụ Jehova, Okwu ya, na ụmụnna anyị n’anya ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ n’ihi ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu.

21. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị ege ntị n’ozi ọma anyị taa, olee ihe obi nwere ike isi anyị ike na ya?

21 N’oge Jizọs, ọtụtụ ndị ekweghị na ya. Ma, e nwekwara ọtụtụ ndị kwere na ya. E nwere, ma ó nweghị ihe ọzọ, otu onye so ná ndị Sanhedrin nakwa “oké ìgwè ndị nchụàjà” kweere n’ihe ọ na-akụzi. (Ọrụ 6:7; Mat. 27:57-60; Mak 15:43) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọtụtụ nde mmadụ asụbeghị ngọngọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ma eziokwu ndị dị na Baịbụl, jirikwa ha kpọrọ ihe. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.”—Ọma 119:165.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

^ par. 5 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ụzọ ihe anọ mere ndị mmadụ n’oge Jizọs ji ghara ikwere na ya nakwa ihe mere ha anaghị ege ndị na-eso ụzọ ya ntị taa. Ma n’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ ihe anọ ọzọ. Anyị ga-ahụkwa ihe mere ndị hụrụ Jehova n’anya anaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka ha sụọ ngọngọ.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na Matiu na ndị ọnaụtụ ndị ọzọ na-erikọ nri.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-achụpụ ndị na-azụ ahịa n’ụlọ nsọ.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs bu osisi ịta ahụhụ.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: Ebe Judas ji nsusu ọnụ na-arara Jizọs nye n’aka ndị iro ya.