Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22

Ezigbo Ndụmọdụ Ga-abara Anyị Uru ná Ndụ

Ezigbo Ndụmọdụ Ga-abara Anyị Uru ná Ndụ

“Ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe.”​ILU 2:6.

ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere anyị niile ji kwesị inwe amamihe si n’aka Chineke? (Ilu 4:7)

 Ọ BỤRỤ na e nwetụla ihe dị ezigbo mkpa ị chọrọ ikpebi ime, ọ ga-abụ na i kpere ekpere ka Jehova nye gị amamihe n’ihi na ọ dị gị mkpa. (Jems 1:5) Eze Solomọn sịrị: “Amamihe bụ ihe kacha mkpa.” (Gụọ Ilu 4:7.) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe Solomọn na-ekwu okwu ya ebe a abụghị amamihe ọ bụla. Ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ amamihe nke si n’aka Jehova Chineke. (Ilu 2:6) Ma, amamihe si n’aka Chineke ọ̀ ga-enyeliri anyị aka imeri ụdị nsogbu ndị anyị na-enwe taa? Ee. Ọ ga-enyere anyị aka. Anyị ga-ahụ otú o nwere ike isi nyere anyị aka n’isiokwu a.

2. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi nwee ezigbo amamihe?

2 Otu ụzọ anyị nwere ike isi nwee ezigbo amamihe bụ ịna-amụ gbasara ihe ụmụ nwoke abụọ nwere ezigbo amamihe kụziri na ịna-eme ya eme. Onye nke mbụ anyị ga-ekwu gbasara ya bụ Solomọn. Baịbụl kwuru na “Chineke nyere Solomọn amamihe pụrụ iche. O mekwara ka ọ na-aghọta ihe otú na-enweghị atụ.” (1 Eze 4:29) Onye nke abụọ anyị ga-ekwu gbasara ya bụ Jizọs. Jizọs bụ onye bitụrụla n’ụwa a kacha nwee amamihe. (Mat. 12:42) E buru amụma gbasara Jizọs, sị: “Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya. Ọ bụ ya mere ọ ga-eji mara ihe, na-aghọtakwa ihe nke ọma.”​—Aịza. 11:2.

3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Chineke nyere Solomọn na Jizọs ezigbo amamihe. Ọ bụ ya mere ha ji nwee ike inye anyị ezigbo ndụmọdụ gbasara ihe ndị dị anyị niile ezigbo mkpa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’atọ n’ime ihe ndị ahụ. Ha bụ, ihe mere anyị ji kwesị ịna-ele ego, ọrụ anyị, na onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị.

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE EGO ANYA

4. Olee ihe dị iche na Solomọn na Jizọs?

4 Solomọn bara ezigbo ọgaranya, birikwa n’ụlọ mara ezigbo mma. (1 Eze 10:​7, 14, 15) Ma, Jizọs enweghị ọtụtụ ihe. O nweghịkwa ụlọ nke ya. (Mat. 8:20) Ma, ha abụọ lere ego anya otú kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke nyere ha amamihe.

5. Olee otú Solomọn si lee ego anya?

5 Solomọn kwuru na ‘ego na-echebe mmadụ.’ (Ekli. 7:12) Anyị jiri ego, anyị nwere ike ịzụta ihe ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ na ihe ụfọdụ anyị chọrọ na-adịghị ezigbo mkpa. Ma, n’agbanyeghị na Solomọn bara ezigbo ọgaranya, ọ ma na e nwere ihe ndị dị mkpa karịa ego. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.” (Ilu 22:1) Solomọn kwukwara na ihe ndị hụrụ ego n’anya nwere anaghị eme ka ha nwee obi ụtọ. (Ekli. 5:​10, 12) O kwukwara na anyị ekwesịghị iche na ọ bụ ego bụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ n’ihi na ego mmadụ nwere nwere ike ifu n’otu ntabi anya.​—Ilu 23:​4, 5.

Otú anyị si ele ihe ndị anyị nwere anya ọ̀ na-eme ka o siere anyị ike ime ka ihe gbasara Alaeze Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7) *

6. Olee otú Jizọs si lee ihe ndị o nwere anya? (Matiu 6:​31-33)

6 Jizọs lere ihe ndị o nwere anya otú kwesịrị ekwesị. O riri nri, ṅụọkwa mmanya. (Luk 19:​2, 6, 7) E nwere otu oge o mere ka mmiri ghọọ mmanya kacha mmanya niile mma. Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ. (Jọn 2:​10, 11) Uwe o yi n’ụbọchị ọ nwụrụ dịkwa ezigbo ọnụ. (Jọn 19:​23, 24) Ma, Jizọs ekweghị ka ihe ndị a o nwere bụrụ ihe ndị kacha ya mkpa ná ndụ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ . . . Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Jizọs kụziiri anyị na ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, Jehova ga-eme ka anyị nweta ihe ndị dị anyị mkpa.​—Gụọ Matiu 6:​31-33.

7. Olee uru ile ego anya otú kwesịrị ekwesị baara otu nwanna?

7 Irube isi na ndụmọdụ a Jehova nyere gbasara ego abaarala ọtụtụ ụmụnna anyị uru. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otu nwanna na-alụbeghị nwaanyị aha ya bụ Daniel. Ọ sịrị: “Mgbe m ka na-eto eto, m kpebiri na m ga-ewere ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ m.” Daniel anaghị ebi ndụ okomoko. N’ihi ya, o ji oge ya na nkà ndị o nwere na-enye aka n’ọrụ Jehova. Ọ sịrị: “N’eziokwu, anaghị m akwa mmakwaara maka ihe a m na-eme. Ọ bụ eziokwu na a sị na m weere ịchụ ego ka ihe kacha mkpa ná ndụ m, m nwere ike ịbụ ọgaranya ugbu a. Ma, agaraghị m enwe ndị ezigbo enyi ndị a m nwere ugbu a. Ọ bụrụkwa na m ji oge m niile na-achụ ego, agaghị m na-enwe ụdị obi ụtọ m na-enwe ugbu a n’ihi na m ji ndụ m na-eme ihe gbasara ofufe Jehova. O nweghị ụdị ego m ga-eji tụnyere ụzọ ndị a Jehova sirila gọzie m.” N’eziokwu, ihe ga-akacha baara anyị uru abụghị ego, kama ọ bụ ime ihe ndị gbasara ofufe Chineke.

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE ỌRỤ ANYA

8. Olee otú anyị si mara na Solomọn lere ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị? (Ekliziastis 5:​18, 19)

8 Solomọn kwuru na ịrụsi ọrụ ike nwere ike ime ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ọ kpọrọ ya “onyinye Chineke.” (Gụọ Ekliziastis 5:​18, 19.) Solomọn dere, sị: “Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike.” (Ilu 14:23) Solomọn ma na ihe ndị a o kwuru bụ eziokwu. Ọ rụsiri ọrụ ike. Ọ rụrụ ọtụtụ ụlọ, kọọ ọtụtụ ubi vaịn, rụọkwa ọmarịcha ogige dị iche iche na ọdọ mmiri dị iche iche. (1 Eze 9:19; Ekli. 2:​4-6) Ihe ndị a o mere bụ ịrụsi ọrụ ike. O doro anya na ha mere ya obi ụtọ. Ma, Solomọn ma na ọ bụghị naanị ihe ndị a ga-eme ka o nwee ezigbo obi ụtọ. Ọ rụkwaara Jehova ọtụtụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ gbara mbọ hụ na a rụụrụ Jehova ụlọ nsọ mara ezigbo mma nke were afọ asaa iji rụchaa ya. (1 Eze 6:38; 9:1) Mgbe Solomọn rụchara ọrụ dị iche iche, ma nke ya ma nke ọ rụụrụ Jehova, ọ bịara chọpụta na ọ bụ ịrụrụ Jehova ọrụ kacha mkpa. O dere, sị: “Ihe bụ́ isi n’ihe niile e kwuru bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa iwu ya.”​—Ekli. 12:13.

9. Olee otú Jizọs si mee ka ọrụ ego ghara ịbụ ihe kacha ya mkpa?

9 Jizọs rụsiri ọrụ ike. Mgbe ọ bụ nwata, ọ rụrụ ọrụ ịkwa nkà. (Mak 6:3) O doro anya na obi dị nne na nna ya ụtọ n’otú o si na-arụsi ọrụ ike iji nyere ha aka igboro ezinụlọ ha buru ibu mkpa ha. Ebe ọ bụ na Jizọs zuru okè, ọ ga na-arụta ọrụ ahụ karịa onye ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ga na-achọ ihe ndị ọ rụpụtara ka à na-anwụ anwụ. O doro anya na ọrụ ndị Jizọs rụrụ tọrọ ya ụtọ. Ọ bụ eziokwu na ọ na-arụsi ọrụ ike, o wepụtakwara oge na-ejere Jehova ozi. (Jọn 7:15) Mgbe o mechakwara jiri oge ya niile na-ekwusa ozi ọma, ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Unu arụla ọrụ maka nri nke na-ala n’iyi, kama rụọnụ ọrụ maka nri nke ga-adịru ebighị ebi.” (Jọn 6:27) Mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị: “Na-akpakọtaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.”​—Mat. 6:20.

Gịnị ka anyị ga-eme ka ọrụ anyị ghara ime ka anyị leghara ihe gbasara ofufe Chineke anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11) *

10. Olee nsogbu ụfọdụ ndị nwere ike inwe n’ọrụ ha?

10 Ezigbo ndụmọdụ Chineke na-enye anyị na-enyere anyị aka ile ọrụ anyị anya otú kwesịrị ekwesị. A na-akụziri anyị bụ́ Ndị Kraịst ‘ka anyị na-arụsi ọrụ ike, na-arụkwa ọrụ dị mma.’ (Efe. 4:28) Ndị were anyị n’ọrụ na-achọpụtakarị na anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-arụsi ọrụ ike. Ha nwere ike gwa anyị na otú anyị si arụsi ọrụ ike dị ha mma. N’ihi ya, anyị nwere ike iji oge buru ibu na-arụ ọrụ anyị, chee na ọ ga-eme ka onye were anyị n’ọrụ na-elekwu Ndịàmà Jehova anya ọma. Ma, n’oge na-adịghị anya, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị ejighịzi ofufe Jehova kpọrọ ihe nakwa na anyị na-eleghara ezinụlọ anyị anya. Anyị kwesịrị ịgbanwe ka anyị nwee ike iwepụtakwu oge iji na-eme ihe ndị kacha mkpa.

11. Gịnị ka otu nwanna mụtara gbasara ịna-ele ọrụ ego anya otú kwesịrị ekwesị?

11 Otu nwanna bụ́ nwa okorobịa aha ya bụ William si n’aka nwanna bụ́ okenye ọ rụbuuru ọrụ mata na ọ dị ezigbo mkpa mmadụ ịna-ele ọrụ ego anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “[Nwanna ahụ] m na-arụburu ọrụ bụ onye e ji ama atụ ma a bịa n’ịrụsi ọrụ ike na iwepụta oge eme ihe ndị ọzọ dị mkpa. Obi na-abụ ndị na-ewetara ya ọrụ sọ aṅụrị maka otú o si arụrụ ha ọrụ nke ọma. Ma, a gbasahaala ọrụ, ọ na-etinyezi uche n’ihe gbasara ndị ezinụlọ ya na ihe gbasara ofufe ọ na-efe Chineke. Ịgwa gị eziokwu, o so ná ndị m ma kacha enwe obi ụtọ.” *

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE ONWE ANYỊ ANYA

12. Olee otú Solomọn si gosi na ọ na-ele onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị? Ma, olee otú o si kwụsị ime ya?

12 Solomọn lere onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị mgbe o ji obi ya niile na-efe Jehova. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa ma ghọọ eze, o kwuru na e nwere ihe ndị ọ na-amaghị, rịọkwa Jehova ka o duzie ya. (1 Eze 3:​7-9) Ọ makwa na mpako nwere ike ịkpatara mmadụ ezigbo nsogbu. O dere, sị: “Nganga na-ala mmadụ n’iyi, mpako na-emekwa ka mmadụ daa.” (Ilu 16:18) Ma, ọ dị mwute na ka oge na-aga, Solomọn emeghị ihe a o kwuru. O mechara dịwa mpako ma malite inupụrụ Chineke isi. Dị ka ihe atụ, e nwere iwu Chineke kwuru ka eze Izrel ghara ịlụ ‘ọtụtụ ụmụ nwaanyị, ka obi ya ghara ịpụ n’ebe Chineke nọ.’ (Diut. 17:17) Solomọn erubeghị isi n’iwu ahụ. Ọ lụrụ ‘narị ụmụ nwaanyị asaa (700), nweekwa narị ndị iko atọ (300).’ Ọtụtụ n’ime ha na-ekpere arụsị. (1 Eze 11:​1-3) Ọ ga-abụ na Solomọn chere na e nweghị nsogbu ọ ga-akpatara ya. N’agbanyeghị ihe Solomọn chere, ka oge na-aga, ọ tara ahụhụ inupụrụ Jehova isi na-akpata.​—1 Eze 11:​9-13.

13. Gịnị ka anyị ga-amụta ma ọ bụrụ na anyị echebara otú Jizọs si dị umeala n’obi echiche?

13 Jizọs lekwara onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Tupu ya abịa n’ụwa, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ magburu onwe ha n’ozi Jehova. Ọ bụ n’aka ya ka e si “kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa.” (Kọl. 1:16) Mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ ga-abụ na o chetara ihe ndị o mere mgbe ya na Nna ya nọ n’eluigwe. (Mat. 3:16; Jọn 17:5) Ma, ihe ndị ahụ o chetara emeghị ka ọ dịwa mpako. O nweghị mgbe o chere na ọ ka onye ọ bụla mma. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ihe mere o ji bịa n’ụwa abụghị ka “e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi ma nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) O kwukwara na ya “enweghị ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche ya.” (Jọn 5:19) Jizọs dị ezigbo umeala n’obi. O mere ihe magburu onwe ya anyị kwesịrị ịna-eme.

14. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs gbasara ịna-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

14 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ele onwe ha anya otú kwesịrị ekwesị. E nwere otu oge Jizọs gwara ha na ‘Chineke madị ole ntutu niile dị n’isi ha dị.’ (Mat. 10:30) Ihe ahụ ọ gwara ha na-emesi anyị obi ike, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị chere na o nweghị uru anyị bara. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ihe gbasara anyị na-emetụ Nna anyị nke eluigwe n’obi. O ji anyị kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na Jehova kwere ka anyị na-efe ya, marakwa na anyị ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya, anyị ekwesịghị ịna-eche na e nweghị ihe anyị dị mma ya.

Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị anaghị ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) *

15. (a) Olee ihe otu Ụlọ Nche kwuru gbasara otú anyị kwesịrị isi na-ele onwe anyị anya? (b) Dị ka anyị hụrụ na foto dị na peeji nke 24, ọ bụrụ na ọ bụ onwe anyị na-aka anyị mkpa mgbe niile, olee ihe o nwere ike ịkpatara anyị?

15 N’ihe dị ka afọ iri na ise gara aga, otu Ụlọ Nche kwuru na anyị kwesịrị ịna-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “N’ezie, anyị ekwesịghị ile onwe anyị anya dị ka ndị dị oké mkpa nke na onwe anyị na-ebu anyị isi; anyị ekwesịghịkwa ileda onwe anyị anya gabiga ókè ma chee na anyị abaghị uru. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị, marakwa ihe ndị anyị ga-emeli na ndị anyị na-agaghị emeli. Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst si otú a kwuo ya: ‘Abụghị m ekwensu; abụghịkwanụ m mmụọ ozi. E nwere ebe ndị m na-emezi, nweekwa ebe ndị m na-emejọ, otú ahụkwa ka ọ dị ndị ọzọ.’” * Ị̀ hụla ihe mere o ji dị ezigbo mma ka anyị na-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

16. Gịnị mere Jehova ji na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ?

16 Jehova si n’Okwu ya na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ. Ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Aịza. 48:​17, 18) Ihe kacha mma anyị ga-eji ndụ anyị mee, nke ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ, bụ ịna-eme ihe ndị ga-eme Jehova obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-ezere ọtụtụ nsogbu ndị na-anaghị ele ego, ọrụ ha, na onwe ha anya otú kwesịrị ekwesị na-enwe. Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike ịmara ihe ma na-eme Jehova obi ụtọ.​—Ilu 23:15.

ABỤ NKE 94 Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya

^ Solomọn na Jizọs nwere ezigbo amamihe. Ọ bụ Jehova nyere ha amamihe ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe anyị nwere ike ịmụta na ndụmọdụ Solomọn na Jizọs si n’ike mmụọ nsọ nye gbasara otú anyị kwesịrị isi na-ele ego, ọrụ anyị, na onwe anyị anya. Anyị ga-ahụkwa otú ime ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị a si baara ụfọdụ ụmụnna anyị uru.

^ Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2015.

^ Gụọ isiokwu bụ́ “Bible Pụrụ Inyere Gị Aka Inwe Ọṅụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2005.

^ NKỌWA FOTO: Ụmụ okorobịa abụọ a aha ha bụ John na Tom nọ n’otu ọgbakọ. Ihe na-eri oge John bụ ilekọta ụgbọala ya. Tom na-eji ụgbọala ya na-enyere ndị ọzọ aka n’ozi ọma, na-ebutekwa ha ọmụmụ ihe.

^ NKỌWA FOTO: Ebe John na-arụ ọrụ mgbe ọrụ gbasara. Ọ chọghị ime ka iwe wee onye ọ na-arụrụ ọrụ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla onye ọ na-arụrụ ọrụ gwara ya ka ọ rụọ ọrụ ma ọrụ gbasaa, ọ na-ekweta. Ná mgbede ahụkwa, Tom bụ́ ohu na-eje ozi so otu okenye gaara mmadụ nleta ọzụzụ atụrụ. N’oge gara aga, Tom kọwaara onye ọ na-arụrụ ọrụ na ọ na-eji ụfọdụ mgbede ya n’izu eme ihe gbasara ofufe Jehova.

^ NKỌWA FOTO: Ihe kacha John mkpa bụ ihe gbasara onwe ya. Ma, ihe kacha Tom mkpa bụ ihe gbasara ofufe Chineke. Ọ na-emeta ọtụtụ ndị enyi n’ebe o so na-arụzigharị Ụlọ Mgbakọ.