Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Chineke Ga-eme Ndị Iro Ya

Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Chineke Ga-eme Ndị Iro Ya

“Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn n’asụsụ Hibru.”​—MKPU. 16:16.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka akwụkwọ Mkpughe kwuru gbasara ndị Chineke?

 AKWỤKWỌ Mkpughe gosiri na e hiwela Alaeze Chineke n’eluigwe nakwa na a chụpụla Setan n’eluigwe. (Mkpu. 12:​1-9) Nchụpụ a a chụpụrụ Ekwensu n’eluigwe mere ka ihe dịrị ndị nọ n’eluigwe mma. Ma, o mere ka ihe siere anyịnwa ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu na-ewesa ndị nọ n’ụwa taa ji obi ha niile na-efe Chineke iwe, na-alụsokwa ha ọgụ.​—Mkpu. 12:​12, 15, 17.

2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọsi ike na-efe Jehova?

2 Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọsi ike na-efe Jehova ma Ekwensu na-emegide anyị? (Mkpu. 13:10) Otu ihe ga-enyere anyị aka bụ ịmata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Mkpughe, Jọn onyeozi kọwara ụfọdụ ihe ọma Chineke ga-emere anyị n’oge na-adịghị anya. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ na Chineke ga-ebibi ndị iro ya. Ugbu a, ka anyị tụlee otú akwụkwọ Mkpughe si kọwaa ndị iro Chineke ndị a nakwa ihe ga-eme ha.

E JI “IHE NDỊ NWERE IHE HA NỌCHIRI ANYA HA” KỌWAA NDỊ IRO CHINEKE

3. Olee ihe ụfọdụ nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe?

3 Amaokwu mbụ n’akwụkwọ Mkpughe kwuru na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha. (Mkpu. 1:1) E ji ihe ụfọdụ nọchie anya ndị iro Chineke. O kwuru gbasara anụ ọhịa dị iche iche. Dị ka ihe atụ, e nwere “otu anụ ọhịa nke si n’oké osimiri na-apụta. O nwere mpi iri na isi asaa.” (Mkpu. 13:1) Anụ ọhịa na-eso ya bụ “anụ ọhịa ọzọ nke si n’ala na-apụta.” Anụ ọhịa a malitere ikwu okwu ka dragọn, na-emekwa ka “ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.” (Mkpu. 13:​11-13) E nwekwara anụ ọhịa ọzọ dị iche. Ọ bụ “anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie” nke nwaanyị akwụna nọ n’elu ya. Anụ ọhịa atọ ndị a nọchiri anya ndị iro Jehova Chineke na Alaeze ya kemgbe ụwa. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata ndị a bụ́ ndị iro Chineke.​—Mkpu. 17:​1, 3.

NNUKWU ANỤ ỌHỊA ANỌ

Ha si “n’oké osimiri ahụ pụta.” (Dan. 7:​1-8, 15-17) Ha nọchiri anya alaeze ụwa ndị chịrị ebe ndị Chineke bi ma ọ bụkwanụ ndị megidere ndị Chineke malite n’oge Daniel (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4, 7)

4-5. Olee otú ihe e kwuru na Daniel 7:​15-17 si enyere anyị aka ịghọta ụfọdụ n’ime ihe ndị nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe?

4 Tupu anyị achọpụta ndị bụ́ ndị iro Chineke ndị a, anyị kwesịrị ịghọta ihe anụ ọhịa ndị a na nwaanyị ahụ nọchiri anya ha. Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ya bụ ikwe ka Baịbụl kọwaara anyị ya. E nwere ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji mee ihe atụ n’akwụkwọ Mkpughe a kọwara n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Daniel onye amụma rọrọ nrọ ebe ọ hụrụ ‘nnukwu anụ ọhịa anọ si n’oké osimiri ahụ pụta.’ (Dan. 7:​1-3) Daniel gwara anyị ihe ha nọchiri anya ya. Nnukwu anụ ọhịa ndị a nọchiri anya “ndị eze” anọ ma ọ bụ ọchịchị anọ. (Gụọ Daniel 7:​15-17.) Otú a e si kọwaa ya nke ọma nyeere anyị aka ịmata na anụ ọhia ndị a e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe bụ ọchịchị.

5 Ugbu a, ka anyị hụ ụfọdụ ihe ndị nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe. Ka anyị na-eleba anya na ha, anyị ga-ahụ otú Baịbụl si nyere anyị aka ịghọta ihe ndị ha pụtara. Anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’anụ ọhịa ndị o kwuru okwu ha. Nke mbụ, anyị ga-achọpụta ndị ha nọchiri anya ha, nke abụọ abụrụ ihe ga-eme anụ ọhịa ndị ahụ, nke atọ abụrụzie otú ha si gbasa anyị.

OTÚ E SI MEE KA ANYỊ MATA NDỊ BỤ́ NDỊ IRO CHINEKE

ANỤ ỌHỊA NKE NWERE ISI ASAA

O “si n’oké osimiri na-apụta,” nwee isi asaa, mpi iri, nakwa okpueze iri. (Mkpu. 13:​1-4) Ọ nọchiri anya ọchịchị niile chịrịla ụmụ mmadụ kemgbe ụwa. Isi asaa ahụ nọchiri anya ọchịchị asaa ndị chịrị ebe ndị Chineke bi ma ọ bụkwanụ ndị megidere ndị Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6-8)

6. Gịnị ka anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:​1-4 nọchiri anya ya?

6 Gịnị ka anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa nọchiri anya ya? (Gụọ Mkpughe 13:​1-4.) Anyị hụrụ na anụ ọhịa a yiri agụ owuru, ma, ụkwụ ya yiri ụkwụ anụ ọhịa bea, ọnụ ya eyie nke ọdụm, ya enweekwa mpi iri. Ọ bụ otú a ka e si kọwaa anụ ọhịa anọ ndị e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Daniel isi 7. Ma, n’akwụkwọ Mkpughe ebe a, e kwuru na ọ bụ otu anụ ọhịa yiri agụ owuru, nwee ụkwụ anụ ọhịa bea na ọnụ abụọ, nweekwa mpi iri, ọ bụghị anụ ọhịa anọ. Anụ ọhịa a anọchighị anya naanị otu ọchịchị ma ọ bụkwanụ alaeze ụwa. E kwuru na ọ na-achị “ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile na mba niile.” N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ọ karịrị otu ọchịchị. (Mkpu. 13:7) Ọ ga-abụrịrị na anụ ọhịa a nọchiri anya ọchịchị niile chịrịla ụmụ mmadụ kemgbe ụwa. *​—Ekli. 8:9.

7. Gịnị ka nke ọ bụla n’ime isi asaa nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ya?

7 Gịnị ka nke ọ bụla n’ime isi asaa ahụ nọchiri anya ya? Mkpughe isi 17 ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya n’ihi na ọ kọwara anụ ọhịa e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13. Mkpughe 17:10 sịrị: “Ha pụtara ndị eze asaa: Ise adaala. Otu nọ ugbu a. Nke ọzọ abịabeghị. Ma mgbe ọ ga-abịa, ọ ga-anọ obere oge.” N’ime ọchịchị niile Setan jirila chịa ụwa a, asaa n’ime ha siri ezigbo ike nke na e ji ha tụnyere “isi.” Ha bụ alaeze ụwa ndị chịrị ebe ndị Chineke bi ma ọ bụkwanụ ndị megidere ndị Chineke. N’oge Jọn onyeozi, ise n’ime ha achịchaala. Ha bụ Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, na Gris. Nke isii bụ Rom. Ọ bụ ya ka na-achị n’oge e kpugheere Jọn ọhụụ a. Olee nke ga-abụ nke asaa na nke ikpeazụ, ma ọ bụkwanụ isi nke asaa?

8. Olee ọchịchị isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ya?

8 Anyị ga-ahụ na amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel ga-enyere anyị aka ịchọpụta ọchịchị bụ́ isi nke asaa, bụ́kwanụ isi nke ikpeazụ nke anụ ọhịa ahụ. Olee ọchịchị nke na-achị ụwa kemgbe “ụbọchị Onyenwe anyị,” ya bụ, oge ikpeazụ a? (Mkpu. 1:10) Ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka gbakọrọ aka na-achị. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na ọ bụ ha bụ isi nke asaa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:​1-4.

ANỤ ỌHỊA NWERE MPI ABỤỌ NDỊ DỊ KA NKE OBERE EBULE

O ‘si n’ala pụta,’ na-ekwukwa “okwu dị ka dragọn.” Ọ na-eme ka “ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa,” bụrụkwa “onye amụma ụgha” na-eme ihe ndị dị ịtụnanya. (Mkpu. 13:​11-15; 16:13; 19:20) Ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka bụ anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ, bụrụkwa onye amụma ụgha. Ọ na-eduhie ndị bi n’ụwa, na-agwa ha ka ha kpụọ ‘ihe yiri anụ ọhịa ahụ’ nwere isi asaa na mpi iri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee ndị anụ ọhịa ahụ “nwere mpi abụọ ndị dị ka nke obere ebule” nọchiri anya ha?

9 Mkpughe isi 13 gwara anyị na isi nke asaa, ya bụ, ọchịchị Briten na Amerịka, na-emekwa ka anụ ọhịa “nwere mpi abụọ ndị dị ka nke obere ebule, ma ọ malitere ikwu okwu dị ka dragọn.” Anụ ọhịa a “na-emekwa ihe dị ịtụnanya n’ihu ụmụ mmadụ. Ọ na-emedị ka ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.” (Mkpu. 13:​11-15) Mkpughe isi 16 na nke 19 kpọrọ anụ ọhịa a “onye amụma ụgha.” (Mkpu. 16:13; 19:20) Daniel kwukwara ihe yiri ya, ya bụ, na ọchịchị Briten na Amerịka “ga-ala ọtụtụ ihe n’iyi.” (Dan. 8:​19, 23, 24) Ọ bụ ihe a mere n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ bụ ndị sayensị bụ́ ndị Briten na Amerịka rụpụtara bọmbụ mere ka agha ahụ kwụsị. Ọ bụ otú ahụ ka ọchịchị Briten na Amerịka si mee ka “ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.”

ANỤ ỌHỊA NA-ACHA UHIE UHIE

Onye nọ n’elu ya bụ nwaanyị akwụna, ya bụ, Babịlọn Ukwu. A kpọrọ anụ ọhịa ahụ eze nke asatọ. (Mkpu. 17:​3-6, 8, 11) Na mbụ, nwaanyị akwụna ahụ na-agwa anụ ọhịa ahụ ihe ọ na-eme, ma anụ ọhịa ahụ mechara bibie ya. Nwaanyị akwụna ahụ bụ okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. Taa, anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Òtù Mba Ụwa. Ọ bụ ya na-akwado ọchịchị niile dị n’ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10, 14-17)

10. Gịnị ka “ihe ahụ yiri anụ ọhịa ahụ” nọchiri anya ya? (Mkpughe 13:​14, 15; 17:​3, 8, 11)

10 E nwere anụ ọhịa ọzọ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe. Anụ ọhịa a yiri nnọọ anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa. Naanị ihe dị iche bụ na ọ “na-acha uhie uhie.” Baịbụl kpọrọ ya “ihe yiri anụ ọhịa ahụ,” kwuokwa na ọ bụ “eze nke asatọ.” * (Gụọ Mkpughe 13:​14, 15; 17:​3, 8, 11.) E kwuru na e nwere mgbe “eze” a dịbu, mechaa ọ dịghịzi, ya emechaakwa pụta. E si otú a kọwaa Òtù Mba Ụwa nke ọma. Ọ bụ ya na-akwado ihe a na-eme n’ọchịchị gburugburu ụwa. Na mbụ, a kpọrọ ya Njikọ Mba Niile. Ma, ọ dịghịzi n’oge a lụrụ Agha Ụwa nke Abụọ. O mechara pụta ọzọ, ghọzie Òtù Mba Ụwa.

11. Gịnị ka ndị ọchịchị na-eme, gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ?

11 Anụ ọhịa ndị a ma ọ bụ ndị ọchịchị ndị a na-eji ihe ndị ha na-ekwu eme ka ndị mmadụ na-emegide Jehova na ndị ya. E nwere ike ikwu na ha na-akpọkọta “ndị eze niile nọ n’ụwa” ka ha bịa lụọ agha Amagedọn, nke bụ́ “oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpu. 16:​13, 14, 16) Ma, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Chineke anyị bụ́ Jehova agaghị egbu oge ịnapụta ndị niile na-akwado ọchịchị ya.​—Ezik. 38:​21-23.

12. Gịnị ga-eme anụ ọhịa ndị ahụ niile?

12 Gịnị ga-eme anụ ọhịa ndị a niile? Mkpughe 19:20 zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “E jidekwara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ nọ n’ihu ya mee ihe ndị dị ịtụnanya, ndị o ji duhie ndị a kara akara anụ ọhịa ahụ na ndị na-efe ihe yiri ya a kpụrụ akpụ. A tụbara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ ná ndụ n’ọdọ ọkụ nke sọlfọ mere ka ọ na-enwusi ike.” N’ihi ya, mgbe ndị ọchịchị a ka na-achị, Jehova ga-ebibi ha kpamkpam.

13. Olee nsogbu ọchịchị ụfọdụ na-akpatara Ndị Kraịst?

13 Olee otú ihe a si gbasa anyị? Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado Chineke na Alaeze ya. (Jọn 18:36) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime otú ahụ, anyị ekwesịghị itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa. O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ya n’ihi na ndị ọchịchị chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-akwado ha, ma n’okwu ọnụ anyị ma n’omume anyị. Ndị kwere kwadowe anụ ọhịa ahụ ga-enweta akara ya. (Mkpu. 13:​16, 17) Mmadụ nweta akara ahụ, ya na Jehova agaghịzi adị ná mma. Ọ gaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 14:​9, 10; 20:4) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gbalịsie ike ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’agbanyeghị otú ọ bụla e nwere ike isi na-enye anyị nsogbu ka anyị kwado ọchịchị ụwa.

OKÉ NWAANYỊ AKWỤNA AHỤ GA-ANWỤ ỌNWỤ IHERE

14. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 17:​3-5, olee ihe ọzọ na-eju anya Jọn onyeozi hụrụ?

14 Jọn onyeozi kwuru na e nwere ihe ọzọ ọ hụrụ ‘juru ya nnọọ anya.’ Gịnị ka ọ hụrụ? Ọ hụrụ otu nwaanyị nọ n’elu otu n’ime anụ ọhịa ndị a. (Mkpu. 17:​1, 2, 6) E kwuru na ọ bụ “oké nwaanyị akwụna.” A kpọkwara ya “Babịlọn Ukwu.” Ya na “ndị eze ụwa” ‘na-akwa iko.’​—Gụọ Mkpughe 17:​3-5.

15-16. Gịnị bụ “Babịlọn Ukwu,” oleekwa otú anyị si mara?

15 Ònye bụ “Babịlọn Ukwu”? A gaghị asịli na nwaanyị a nọchiri anya ndị ọchịchị n’ihi na e kwuru na ya na ndị ọchịchị ụwa na-akwa iko. (Mkpu. 18:9) Ebe ọ bụ na ọ nọ n’elu anụ ọhịa a ma na-agba ya, o gosiri na ọ na-achọ ịna-atụrụ ndị ọchịchị ihe ha ga-eme. Ihe ọzọkwa bụ na a gaghị asị na ọ nọchiri anya ndị ahịa ụwa Setan a bụ́ ndị anyaukwu. E kwuru gbasara ndị a n’ebe ọzọ n’akwụkwọ Mkpughe. A kpọrọ ha “ndị ahịa ụwa.”​—Mkpu. 18:​11, 15, 16.

16 Na Baịbụl, e kwuo gbasara “ndị akwụna,” o nwere ike ịpụta ndị na-asị na ha na-efe Chineke ma na-efe arụsị ma ọ bụkwanụ si n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ bụrụ enyi ụwa. (1 Ihe 5:25; Jems 4:4) E kwuwe gbasara ndị na-efe Chineke, a na-asị na ha “dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.” (2 Kọr. 11:2; Mkpu. 14:4) Ihe e ji mara Babịlọn oge ochie bụ okpukpe ụgha. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na “Babịlọn Ukwu” nọchiri anya okpukpe ụgha niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na Babịlọn Ukwu bụ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa.​—Mkpu. 17:​5, 18; gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?” nke gbara na jw.org.

17. Gịnị ga-eme Babịlọn Ukwu?

17 Gịnị ga-eme Babịlọn Ukwu? Mkpughe 17:​16, 17 zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, nara ya ihe niile o nwere ma gbaa ya ọtọ. Ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam. N’ihi na Chineke mere ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi, ya bụ, ka ha jiri otu obi nye anụ ọhịa ahụ alaeze ha, ruo mgbe a ga-emezu ihe Chineke kwuru.” N’eziokwu, Jehova ga-eme ka mba dị iche iche jiri anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, ya bụ, Òtù Mba Ụwa, lụso okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa ọgụ ma bibie ha kpamkpam.​—Mkpu. 18:​21-24.

18. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na e nweghị ihe ọ bụla jikọrọ anyị na Babịlọn Ukwu?

18 Olee otú ihe a si gbasa anyị? Anyị kwesịrị ịna-efe Chineke “ofufe dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị.” (Jems 1:27) Anyị ekwesịghị ikwe ka okpukpe ụgha jiri ihe ọ bụla megharịa anyị anya, ma ihe ndị ha na-akụzi, ma omume rụrụ arụ, ma ememme ndị ọgọ mmụọ, ma mgbaasị. Anyị ga na-akpọkwa ndị mmadụ ka ha ‘si n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na ha achọghị ka a taa ha ahụhụ a ga-ata ya.’​—Mkpu. 18:4.

AMAMIKPE DỊỊRỊ ONYE IRO CHINEKE KACHANỤ

NNUKWU DRAGỌN NA-ACHA UHIE UHIE

Ọ bụ Setan nyere anụ ọhịa ahụ ikike. (Mkpu. 12:​3, 9, 13; 13:4; 20:​2, 10) A ga-atụba Setan, bụ́ onye iro Jehova kachanụ, n’abis ruo otu puku (1,000) afọ. N’ikpeazụ, a ga-atụba Setan “n’ọdọ ọkụ ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19-20)

19. Ònye bụ “nnukwu dragọn na-acha uhie uhie”?

19 Akwụkwọ Mkpughe kwukwara gbasara “nnukwu dragọn na-acha uhie uhie.” (Mkpu. 12:3) Dragọn a lụsoro Jizọs na ndị mmụọ ozi ya ọgụ. (Mkpu. 12:​7-9) Ọ na-emegide ndị Chineke, na-enyekwa anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ ike. (Mkpu. 12:17; 13:4) Ònye bụ dragọn a? Ọ bụ “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” (Mkpu. 12:9; 20:2) Ọ bụ ya bụ onye na-akwado ndị iro Jehova ndị ọzọ.

20. Gịnị ga-eme dragọn ahụ?

20 Gịnị ga-eme dragọn ahụ? Mkpughe 20:​1-3 kwuru na otu mmụọ ozi ga-atụba Setan n’abis, nke nọchiri anya ịtụ ya mkpọrọ. N’oge ahụ ọ nọ na mkpọrọ, ọ gaghị enwe ike “iduhie mba niile ọzọ ruo mgbe otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara.” N’ikpeazụ, a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya “n’ọdọ ọkụ ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike.” Ọ pụtara na a ga-ebibi ha. (Mkpu. 20:10) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agaghịzi adị. Oge ahụ ga-amagbu nnọọ onwe ya.

21. Gịnị mere obi kwesịrị iji adị anyị ụtọ maka ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Mkpughe?

21 Obi dị anyị ụtọ na anyị aghọtala ihe ihe ndị ahụ nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe pụtara. Ọ bụghị naanị na anyị achọpụtala ndị bụ́ ndị iro Jehova, anyị ahụkwala ihe ga-eme ha. N’eziokwu, “onye na-agụpụta okwu amụma a, na onye na-anụ ya ma na-eme ihe ndị e dere na ya, na-enwe obi ụtọ.” (Mkpu. 1:3) Ma, e bibichaa ndị iro Chineke, olee ihe ọma ga-emere ụmụ mmadụ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 23 Jehova Amalitela Ọchịchị Ya

^ Akwụkwọ Mkpughe ji ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha mee ka a mata ndị bụ́ ndị iro Chineke. Akwụkwọ Daniel nyeere anyị aka ịmata ihe ihe ndị ahụ pụtara. N’isiokwu a, anyị ga-eji ụfọdụ amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel tụnyere ndị dị n’akwụkwọ Mkpughe. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ndị iro Chineke. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ga-eme ha.

^ Ihe ọzọ gosiri na anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa nọchiri anya ọchịchị niile bụ na o nwere “mpi iri.” Na Baịbụl, a na-ejikarị iri anọchi anya ihe zuru ezu.

^ Okpueze dị n’isi anụ ọhịa nke mbụ ahụ. Ma, okpueze adịghị na mpi ihe ahụ yiri anụ ọhịa ahụ. (Mkpu. 13:1) Ihe kpatara ya bụ na o si ná ndị eze asaa ndị ọzọ pụta. Ọ bụkwa ha na-enye ya ike.​—Gụọ isiokwu dị na jw.org bụ́ “Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Na-acha Uhie Uhie E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 17?