Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21

Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Gbasara Ọdịnihu Gị

Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Gbasara Ọdịnihu Gị

“Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”​—MKPU. 22:20.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe dị ezigbo mkpa mmadụ niile kwesịrị ikpebi?

 E NWERE ihe dị ezigbo mkpa ndị mmadụ kwesịrị ikpebi taa. Hà ga na-akwado Jehova Chineke na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa, ka hà ga na-akwado onye iro Jehova kachanụ, bụ́ Ekwensu? Onye ọ bụla ga-ahọrọrịrị otu. A ga-eji ihe ọ bụla ha họọrọ ime kpebie ma hà ga-adị ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ na ha agaghị adị. (Mat. 25:​31-33, 46) N’oge “oké mkpagbu,” a ga-aka ha akara ga-egosi ma à ga-echebe ha ma ọ bụkwanụ bibie ha.​—Mkpu. 7:14; 14:​9-11; Ezik. 9:​4, 6.

2. (a) Gịnị ka ihe e kwuru ná Ndị Hibru 10:​35-39 na-agba anyị ume ime? (b) Olee otú akwụkwọ Mkpughe nwere ike isi nyere anyị aka?

2 Gụọ Ndị Hibru 10:​35-39. Ọ bụrụ na i kpebiri ịkwado Jehova, ihe i kpebiri dị mma. Ugbu a, ị chọkwara inyere ndị ọzọ aka ka ha kpebie ime ihe dị mma. I nwere ike iji ihe e dere n’akwụkwọ Mkpughe nyere ha aka. Akwụkwọ ahụ magburu onwe ya gosiri ihe ga-eme ndị na-emegide Jehova, gosikwa ngọzi ndị ga-abịara ndị ji obi ha niile na-akwado ọchịchị ya. Anyị kwesịrị ịmụ gbasara eziokwu ndị a dị ezigbo mkpa. Ịmụ ha ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịna-efe Jehova. Anyị nwekwara ike iji ihe anyị mụtara nyere ndị ọzọ aka ka ha kpebie ife Jehova ma ghara ịkwụsị ife ya.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee ihe ọma ga-emere ndị na-akwado ọchịchị Chineke? Oleekwa ihe ga-eme ndị kpebiri ịkwado anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe?

IHE ỌMA NDỊ GA-EMERE NDỊ NA-ERUBERE JEHOVA ISI

4. Olee ndị Jọn onyeozi hụrụ ha na Jizọs n’eluigwe?

4 N’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi, ọ hụrụ ìgwè abụọ na-akwado ọchịchị Jehova, hụkwa na ha nwetara ndụ ebighị ebi. Ìgwè nke mbụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). (Mkpu. 7:4) E si n’ụwa họta ha ka ha gaa soro Jizọs chịa n’eluigwe. Ha na Jizọs ga-achị ụwa. (Mkpu. 5:​9, 10; 14:​3, 4) N’ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ ka ha na Jizọs guzo n’Ugwu Zayọn n’eluigwe.​—Mkpu. 14:1.

5. Olee ihe ga-eme ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa n’oge na-adịghị anya?

5 Kemgbe oge ndịozi Jizọs, a họtala ọtụtụ ndị ga-eso n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ (144,000). (Luk 12:32; Rom 8:17) Ma, a gwara Jọn na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-afọ n’ụwa n’oge ikpeazụ a. A ga-aka ‘ndị ahụ fọdụrụ’ akara ikpeazụ gosiri na ihe ha masịrị Jehova tupu oké mkpagbu ahụ amalite. (Mkpu. 7:​2, 3; 12:17) N’ime oké mkpagbu ahụ, a ga-akpọrọ ndị ahụ fọdụrụ gaa eluigwe, ka ha sonyere ndị ibe ha rubeere Jehova isi ruo ọnwụ. Ha niile ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze Chineke.​—Mat. 24:31; Mkpu. 5:​9, 10.

6-7. (a) Olee ndị ọzọ Jọn hụrụ? Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ha? (b) Olee ihe mere ihe e kwuru ná Mkpughe isi 7 kwesịrị iji masị ma ndị e tere mmanụ ma ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’?

6 Mgbe Jọn hụchara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ (144,000), ọ hụkwara “oké ìgwè mmadụ.” Ndị nke a adịghị ka ndị nke mbụ ahụ ọ hụrụ. Baịbụl ekwughị mmadụ ole ha ga-adị. (Mkpu. 7:​9, 10) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ha? A gwara Jọn, sị: “Ndị a si n’oké mkpagbu ahụ pụta. Ha ejirila ọbara Nwa Atụrụ ahụ saa uwe mwụda ha, uwe mwụda ha ana-achazi ọcha.” (Mkpu. 7:14) Oké mkpagbu ahụ gachaa, “oké ìgwè mmadụ” a ga-ebi n’ụwa, nwetakwa ngọzi ndị magburu onwe ha.​—Ọma 37:​9-11, 27-29; Ilu 2:​21, 22; Mkpu. 7:​16, 17.

7 Ma à họọrọ anyị ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-ahụ mgbe ihe e kwuru ná Mkpughe isi 7 ga-emezu. Oge ahụ ga-abụrụ ma ndị e tere mmanụ ma oké ìgwè mmadụ ga-ebi n’ụwa oge magburu onwe ya. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị họọrọ ịkwado ọchịchị Chineke. Olee ihe ọzọ akwụkwọ Mkpughe gwara anyị gbasara oké mkpagbu?​—Mat. 24:21.

IHE GA-EME NDỊ IRO CHINEKE

8. Gịnị bụ ihe mbụ ga-eme n’oké mkpagbu? Gịnịkwa ka ọtụtụ ndị nọ n’ụwa ga-eme?

8 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, n’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị ụwa ga-alụso Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, agha. (Mkpu. 17:​16, 17) Ọ bụ ya bụ ihe mbụ ga-eme n’oké mkpagbu. Ma, ọ̀ ga-eme ka ọtụtụ ndị malite ife Jehova n’oge ahụ? Mba. Kama nke ahụ, Mkpughe isi 6 kwuru na ndị na-anaghị efe Jehova n’oge ahụ ga-agbakwuru ndị ọchịchị na ndị ahịa nke ụwa, ndị e ji tụnyere ugwu, ka ha chebe ha. Ebe ọ bụ na ha agaghị akwado Alaeze Chineke, Jehova ga-ewere ha ka ndị iro ya.​—Luk 11:23; Mkpu. 6:​15-17.

9. Gịnị ga-eme ka ndị Jehova dịrị iche n’oge oké mkpagbu? Gịnịkwa ka ọ ga-akpata?

9 O doro anya na ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ga-adị iche n’oge oké mkpagbu ahụ ga-ata akpụ. Ọ ka ga-abụ naanị ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ha agaghịkwa ekwe akwado “anụ ọhịa” ahụ. (Mkpu. 13:​14-17) Otú ahụ ha si erubere Jehova isi ga-akpasu ndị iro Jehova ezigbo iwe. Ọ bụ ya ga-eme ka mba ndị gbakọrọ aka ọnụ bịa ịlụso ndị Jehova n’ụwa niile agha. Ọ bụ ya bụ agha ahụ Baịbụl buru amụma na Gọg nke Megọg ga-alụso ndị Chineke.​—Ezik. 38:​14-16.

10. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 19:​19-21, gịnị ka Jehova ga-eme gbasara ọgụ a a ga-alụso ndị ya?

10 Gịnị ka Jehova ga-eme gbasara ọgụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-alụso ndị ya? Ọ gwara anyị, sị: “M ga-ewe ezigbo iwe.” (Ezik. 38:​18, 21-23) Mkpughe isi 19 kwukwara ihe ọzọ ga-eme. Jehova ga-ezipụ Ọkpara ya ka ọ gaa chebe ndị ya ma merie ndị iro ha. “Ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe” ga-eso Jizọs lụso Gọg nke Megọg agha. Ụsụụ ndị agha ahụ bụ ndị mmụọ ozi na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpu. 17:14; 19:​11-15) Gịnị ka agha a ga-eme? Ọ ga-ebibi mmadụ niile na òtù niile na-emegide Jehova.​—Gụọ Mkpughe 19:​19-21.

A LỤCHAA AGHA AHỤ, NWA ATỤRỤ AHỤ AGBAA AKWỤKWỌ

11. Olee ihe dị ezigbo mkpa e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe?

11 Chegodị otú obi ga-adị ndị na-efe Jehova fọrọ n’ụwa mgbe e bibichara ndị iro Chineke. Onye ọ bụla ga na-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ. Ọ bụ eziokwu na a ga na-eti mkpu ọṅụ n’eluigwe ma e bibichaa Babịlọn Ukwu, e nwekwara ihe ọzọ ga-aka eme ka ha nwee ọṅụ. (Mkpu. 19:​1-3) Ihe ahụ bụ otu ihe dị ezigbo mkpa e kwuru gbasara ya n’akwụkwọ Mkpughe, ya bụ, “agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ.”​—Mkpu. 19:​6-9.

12. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 21:​1, 2, olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ?

12 Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ? Ndị niile so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-anọ n’eluigwe tupu a malite ịlụ agha Amagedọn. Ma ọ bụghị n’oge ahụ ka Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ. (Gụọ Mkpughe 21:​1, 2.) Ọ ga-agba akwụkwọ ma a lụchaa agha Amagedọn ma bibie ndị iro Chineke niile.​—Ọma 45:​3, 4, 13-17.

13. Olee ihe ga-eme mgbe Nwa Atụrụ ahụ na-agba akwụkwọ?

13 Olee ihe ga-eme mgbe Nwa Atụrụ ahụ na-agba akwụkwọ? Nwoke na nwaanyị gbachaa akwụkwọ, ha na-abụzi otu. Otú ahụ ka agbamakwụkwọ Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na ‘nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ,’ bụ́ ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ga-eme ka ha bụrụ otu. Agbamakwụkwọ ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ ga-egosi na Jizọs na ndị ahụ ga-eso ya chịa ga-ebido ịchị ụwa ruo otu puku (1,000) afọ.​—Mkpu. 20:6.

OTÚ OBODO DỊ EBUBE SI GBASA ỌDỊNIHU GỊ

Mkpughe isi 21 kwuru gbasara Jeruselem Ọhụrụ nke “si n’eluigwe, ebe Chineke nọ, na-agbadata.” N’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ọ ga-ewetara ụmụ mmadụ rubeere Chineke isi ọtụtụ ngọzi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 16)

14-15. Gịnị ka Mkpughe isi 21 ji ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ tụnyere? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

14 Mkpughe isi 21 jikwa otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ tụnyere obodo mara ezigbo mma a kpọrọ “Jeruselem Ọhụrụ.” (Mkpu. 21:​2, 9) Obodo ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Ihe e dere n’elu nkume ndị ahụ bụ “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” Gịnị mere ihe a ji masị Jọn? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ aha ya e dere n’otu n’ime nkume ndị ahụ. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere ya.​—Mkpu. 21:​10-14; Efe. 2:20.

15 E nweghị obodo ọ bụla ọzọ dị ka ya. Okporo ámá ya bụ ezigbo ọlaedo. E ji nkume pel rụọ ọnụ ụzọ ámá ya iri na abụọ. E ji nkume dị oké ọnụ tọọ ntọala mgbidi ya. O nwekwara akụkụ anọ há nhata. (Mkpu. 21:​15-21) Ma, Jọn chọpụtara na e nwere ihe na-adịghị na ya. Legodị ihe o kwuru. Ọ sịrị: “Ahụghị m ụlọ nsọ n’obodo ahụ, n’ihi na Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya. Ìhè anyanwụ na ọnwa abaghị uru n’obodo ahụ, n’ihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè. Ọkụ ya bụkwa Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 21:​22, 23) Jehova na ndị so na Jeruselem Ọhụrụ ahụ ga-anọ. N’ihi ya, ụlọ nsọ agaghịzi adị ha mkpa. (Mkpu. 22:​3, 4) N’ozi dị nsọ ha na-ejere Chineke, Jizọs ga na-edu ha. Ọ bụ ya bụ Nnukwu Onye Nchụàjà n’eluigwe. (Hib. 7:27) Ọ bụ ya mere e ji kwuo na Jehova na Jizọs bụ ụlọ nsọ e nwere n’obodo ahụ.

Olee ndị ga-erite uru n’ihe ndị ahụ e ji “osimiri” na “osisi” nọchie anya ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Olee ihe ọma ga-emere ụmụ mmadụ n’ime otu puku afọ ahụ Alaeze Chineke ga-achị?

16 Ọ na-atọgbu ndị e tere mmanụ atọgbu iche banyere obodo a. Ma, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa kwesịkwara ịna-eche gbasara ya. N’ime otu puku afọ ahụ Alaeze Chineke ga na-achị, Jeruselem Ọhụrụ ga-eme ka ngọzi zooro ndị mmadụ ka mmiri. Jọn hụrụ ka ngọzi ndị ahụ na-asọ ka “osimiri nke mmiri nke ndụ.” N’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ, e nwere “osisi nke ndụ” ndị akwụkwọ ha bụ “maka ịgwọ mba niile.” (Mkpu. 22:​1, 2) Ihe ọma ndị ahụ ga-abara mmadụ niile dị ndụ n’oge ahụ uru. Nwayọọ nwayọọ ndị na-erubere Jehova isi ga-ezu okè. Ọrịa, ihe mgbu, na ibe ákwá agaghịzi adị.​—Mkpu. 21:​3-5.

17. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 20:​11-13, olee ndị ga-ebi n’ụwa n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị?

17 Olee ndị ga-enweta ihe ọma ndị a? Ndị mbụ bụ oké ìgwè mmadụ ga-afọ ndụ ma a lụchaa Amagedọn, ha na ụmụ ọ bụla ha nwere ike ịmụ n’ụwa ọhụrụ. Ma, Mkpughe isi 20 kwukwara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Gụọ Mkpughe 20:​11-13.) “Ndị ezi omume” bụ́ ndị nwụrụ n’oge gara aga nakwa “ndị ajọ omume” na-enweghị ohere ịmụta gbasara Jehova ga-adịghachi ndụ n’ụwa. (Ọrụ 24:15; Jọn 5:​28, 29) Ihe a ọ̀ pụtara na ọ bụ mmadụ niile nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị? Mba. A gaghị akpọlite ndị kpọrọ ekwo nkụ jụ ohere ha nwere ife Jehova tupu ha anwụọ. Ha nwere ohere ife Jehova. Mana, ha emeghị otú ahụ. Ha si otú ahụ gosi na ha erughị eru ibi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.​—Mat. 25:46; 2 Tesa. 1:9; Mkpu. 17:8; 20:15.

ULE IKPEAZỤ

18. Olee otú ụwa ga-adị ma Jizọs chịchaa otu puku afọ?

18 Jizọs chịchaa otu puku afọ, ndị niile nọ n’ụwa n’oge ahụ ga-ezu okè. O nweghịzi onye mmehie anyị ketara n’aka Adam ga na-akpa aka ọjọọ. (Rom 5:12) A ga-ewepụ ọbụbụ ọnụ mmehie Adam kpatara kpamkpam. N’ihi ya, Jizọs chịchaa otu puku afọ, ndị niile nọ n’ụwa n’oge ahụ ‘ga-adị ndụ.’ Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-ezu okè.​—Mkpu. 20:5.

19. Gịnị mere ule ikpeazụ ahụ ji dị mkpa?

19 Anyị ma na Jizọs rubeere Jehova isi, ma mgbe Ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ma, mmadụ niile hà ga-erubere Jehova isi mgbe a ga-enye Ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa? Onye ọ bụla ga-azara onwe ya ajụjụ a mgbe a ga-atọhapụ Ekwensu n’abis ma Jizọs chịchaa otu puku afọ. (Mkpu. 20:7) Ndị rubeere Jehova isi n’oge ule ikpeazụ ahụ ga-enweta ndụ ebighị ebi, nwerekwa onwe ha kpamkpam. (Rom 8:21) A ga-ebibi ndị nupụụrụ Chineke isi mgbe ahụ ruo mgbe ebighị ebi, bibiekwa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.​—Mkpu. 20:​8-10.

20. Olee otú obi dị gị gbasara amụma ndị na-eme obi ụtọ e buru n’akwụkwọ Mkpughe?

20 Olee otú obi dị gị ugbu a anyị lebachara anya n’ihe ụfọdụ n’akwụkwọ Mkpughe? Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na ị ga-eso hụ mgbe amụma ndị a ga-emezu? Ọ̀ bụ na ọ naghị eme ka ị chọsie ike ịkpọ ndị ọzọ ka ha soro anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ? (Mkpu. 22:17) Ugbu a anyị tụlechara ọmarịcha ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu, obi dị anyị ezigbo ụtọ. Anyị chọkwara ikwu ihe Jọn onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”​—Mkpu. 22:20.

ABỤ NKE 27 A Ga-ekpughe Ụmụ Chineke

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ Nke a bụ isiokwu ikpeazụ n’ime isiokwu ndị ahụ kwuru gbasara akwụkwọ Mkpughe n’Ụlọ Nche a. N’isiokwu a, anyị ga-amụta na ndị rubeere Jehova isi ga-enwe obi ụtọ n’ọdịnihu, ma ndị nupụụrụ ya isi ga-anwụ ọnwụ ihere.