Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya

“Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”​—MAT. 22:37.

ABỤ NKE 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị mere anyị nwere ike iji jiri amaokwu Baịbụl ụfọdụ kpọrọkwuo ihe ma ihe gbanwee ná ndụ anyị?

 N’ỤBỌCHỊ nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, ha na-ege ntị nke ọma ka a na-agwa ha okwu agbamakwụkwọ. Amaokwu Baịbụl ndị a na-akọwa n’okwu ahụ abụrụghị ha ihe ọhụrụ. Ma, malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha na-eji amaokwu ndị ahụ akpọrọkwu ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ga na-emezi ihe ndị o kwuru eme ugbu a ha lụrụla di na nwunye.

2 Ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adịkwa mgbe di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst mụtara nwa. O nwere ike ịbụ na kemgbe ọtụtụ afọ, ha anụla ọtụtụ okwu e kwuru gbasara ịzụ ụmụ. Ma, ha na-eji ndụmọdụ ndị ahụ akpọrọkwu ihe ugbu a ha mụtara nwa. Ha nweziri nwa ha ga-azụlite. Ihe a bụ nnukwu ọrụ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ihe gbanwere ná ndụ anyị, anyị na-eji amaokwu Baịbụl ụfọdụ anyị mabu nke ọma akpọrọkwu ihe. Ọ bụ ya bụ otu ihe mere ndị na-efe Jehova ji agụ Baịbụl “n’oge niile” ha dị ndụ otú ahụ a gwara ndị eze Izrel ka ha na-eme. Ha na-echebakwara ihe ha gụrụ echiche.​—Diut. 17:19.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Ndị nne na nna, unu nwere otu n’ime ọrụ kachanụ Onye Kraịst nwere ike inwe, ya bụ, ịkụziri ụmụ unu gbasara Jehova. Ma, ihe unu kwesịrị ime abụghị naanị ịkụziri ụmụ unu ihe gbasara Chineke anyị. Unu kwesịrị inyere ha aka iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Gịnị ka unu nwere ike ime iji kụziere ụmụ unu ka ha hụ Jehova n’anya? N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara ihe anọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere unu bụ́ ndị nne na nna aka. (2 Tim. 3:16) Anyị ga-ahụkwa uru ime ihe Baịbụl kwuru baara ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst.

IHE ANỌ BAỊBỤL KWURU NWERE IKE INYERE NDỊ NNE NA NNA AKA

Olee uru ọ ga-abara nwa gị ma ọ bụrụ na ị na-arịọ Jehova mgbe niile ka ọ na-eduzi gị, na-emekwa ihe ị chọrọ ka ụmụ gị na-eme? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 8)

4. Olee otu ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya? (Jems 1:5)

4 Nke Mbụ: Na-arịọ Jehova ka o duzie gị. Na-arịọ Jehova ka o nye gị amamihe ị ga-eji na-enyere ụmụ gị aka ka ha hụ ya n’anya. (Gụọ Jems 1:5.) Ọ bụ ya kacha ruo eruo inye ndụmọdụ. E nwere ihe ụfọdụ kpatara ya. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ na Jehova abụrụla Nna ruo ọtụtụ afọ karịa onye ọ bụla ọzọ. (Ọma 36:9) Nke abụọ bụ na ezigbo ndụmọdụ ọ na-enye na-aba uru mgbe niile.​—Aịza. 48:17.

5. (a) Olee ihe nzukọ Jehova wepụtara ga-enyere ndị nne na nna aka? (b) Dị ka e gosiri na vidio, gịnị ka ị mụtara n’otú Nwanna Amorim na nwunye ya si zụọ ụmụ ha?

5 Jehova na-esi n’Okwu ya nakwa ná nzukọ ya enye ndị nne na nna ndụmọdụ ndị bara ezigbo uru ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha ka ha hụ ya n’anya. (Mat. 24:45) Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịhụ ndụmọdụ ndị ga-abara gị uru n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka,” gbara na Teta! ruo afọ ụfọdụ. Ọ na-agba ugbu a na jw.org. Ị gaa ebe ahụ, ị ga-ahụkwa ọtụtụ vidio, ma ndị bụ́ ihe nkiri ma ndị bụ́ ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ. Vidio ndị ahụ nwere ike inyere ndị nne na nna aka iji ndụmọdụ Jehova na-azụ ụmụ ha. *​—Ilu 2:​4-6.

6. Olee otú obi dị otu nwanna maka otú Jehova si jiri nzukọ ya na-eduzi ya na nwunye ya?

6 Ọtụtụ ndị nne na nna ekwuola na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si jiri nzukọ ya na-enyere ha aka. Otu nwanna aha ya bụ Joe sịrị: “Ịzụ ụmụ atọ ka ha nọrọ n’ọgbakọ adịghị mfe. Mụ na nwunye m na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova nyere anyị aka. Ọtụtụ mgbe, anyị na-achọpụta na otu isiokwu ma ọ bụ otu vidio e wepụtara bịara nnọọ n’oge ya inyere anyị aka ná nsogbu anyị. Ihe na-enyere anyị aka mgbe niile bụ ịrịọ Jehova ka o duzie anyị.” Nwanna Joe na nwunye ya achọpụtala na isiokwu ndị a na vidio ndị a na-enyere ụmụ ha aka ịbịaru Jehova nso.

7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị nne na nna na-agbalịsi ike ime ihe ha chọrọ ka ụmụ ha na-eme? (Ndị Rom 2:21)

7 Ihe nke abụọ: Jiri omume gị na-akụziri ụmụ gị ihe. Ụmụaka na-eleru ihe nne na nna ha na-eme anya, na-agbalịkwa ime ka ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị nne na nna zuru okè. (Rom 3:23) Ma, ndị nne na nna kwesịrị ịgbalịsi ike na-akpa àgwà ọma ha chọrọ ka ụmụ ha mụta. (Gụọ Ndị Rom 2:21.) Otu nna kwuru gbasara ụmụaka, sị: “Ha na-achọ ime ihe ọ bụla ha hụrụ anyị na-eme.” Ọ sịkwara: “Ha ga-ekwuli mgbe ọ bụla ihe anyị na-eme dị iche n’ihe anyị na-akụziri ha.” N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụmụ anyị hụ Jehova n’anya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, omume anyị ana-egosikwa ya.

8-9. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Andrew na Nwanna Nwaanyị Emma kwuru?

8 E nwere ọtụtụ ụzọ ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya. Legodị ihe otu nwanna dị afọ iri na asaa aha ya bụ Andrew kwuru. Ọ sịrị: “Papa m na mama m na-akụziri m mgbe niile na ikpe ekpere dị ezigbo mkpa. Kwa abalị, mụ na papa m na-ekpe ekpere, ọ bụrụgodị na mụ ekpeela ekpere nke m. Mama anyị na papa anyị na-agwa anyị mgbe niile na anyị nwere ike ịgwa Jehova okwu ugboro ole ọ bụla anyị chọrọ. Otú a ha si agwa anyị mgbe niile gbasara ikpe ekpere mere ka ekpere dị m ezigbo mkpa. Ọ na-adịrị m mfe mgbe niile ikpe ekpere nakwa iwere Jehova ka Nna m hụrụ m n’anya.” Ndị nne na nna, na-echetanụ mgbe niile na otú unu si hụ Jehova n’anya nwere ike inyere ụmụ unu aka ịhụkwa ya n’anya.

9 Ka anyị kwuokwa gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Emma. Papa ya hapụrụ ezinụlọ ha, hapụziere mama ha nnukwu ụgwọ o ji ndị mmadụ ka ọ kwụwa. Nwanna Nwaanyị Emma sịrị: “E nwere ọtụtụ mgbe ego na-akọ mama m. Ma, ọ na-ekwu mgbe niile otú Jehova si elekọta ndị ohu ya. Otú mama m si ebi ndụ na-egosi m ihe o kwetara n’eziokwu. Mama m na-eme ihe niile ọ na-akụziri m.” Gịnị ka ndị nne na nna ga-amụta na ya? Ha ga-amụta na ha nwere ike isi n’àgwà ha na-akụziri ụmụ ha ihe, ọ bụrụgodị na ihe esie ezigbo ike.​—Gal. 6:9.

10. Olee ohere ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel nwere ha na ụmụ ha ga-eji na-ekwurịta gbasara Jehova? (Diuterọnọmi 6:​6, 7)

10 Ihe nke atọ: Wepụta oge ka gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu mgbe niile. Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-akụziri ụmụ ha gbasara ya mgbe niile. (Gụọ Diuterọnọmi 6:​6, 7.) Ndị nne na nna n’oge ahụ nwere ọtụtụ oge n’ụbọchị ha na ụmụ ha ga-eji na-ekwurịta okwu, ha ana-akụzikwara ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya. Dị ka ihe atụ, nwata nwoke onye Izrel nwere ike iji ọtụtụ awa na-enyere papa ya aka na-akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ mkpụrụ ndị ha kụrụ. Nwanne ya nwaanyị nwere ike iji ọtụtụ awa n’ụbọchị na-enyere mama ya aka n’ịkwa ákwà, n’ịkpa ákwà, ma ọ bụ n’ịrụ ọrụ ndị ọzọ dị n’ụlọ. Ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-arụkọ ọrụ, ha nwere ike iji ohere ndị ahụ na-ekwurịta ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ikwurịta gbasara àgwà Jehova, dị ka ịdị mma. Ha nwekwara ike iji oge ahụ kwurịta otú Jehova si na-enyere ezinụlọ ha aka.

11. Olee otu n’ime oge ndị nne na nna na ụmụ ha nwere ike iji akparịta n’oge anyị a?

11 Ihe agbanweela ugbu a. N’ọtụtụ obodo, ndị nne na nna na ụmụ ha agaghị anọli si n’ụtụtụ ruo n’abalị. Nne na nna nwere ike ịnọ n’ụlọ, ụmụ ha anọrọ n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, nne na nna kwesịrị ịgbalị wepụta oge ka ha na ụmụ ha na-akparịta. (Efe. 5:​15, 16; Fil. 1:10) Oge ofufe ezinụlọ so n’ụdị oge ahụ. Otu nwanna aha ya bụ Alexander sịrị: “Papa m na-ewepụta oge kwa izu ka anyị nwee ofufe ezinụlọ anyị. Ọ naghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ya. Anyị mụchaa ihe, anyị na-ekwuwezi gbasara ihe ndị ọzọ.”

12. Gịnị ka onyeisi ezinụlọ kwesịrị iburu n’obi ma ha na-enwe ofufe ezinụlọ ha?

12 Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, gịnị ka i nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ unu na-atọ ụmụ gị ụtọ? Ọ ga-adị mma ka gị na ha mụwa ọmarịcha akwụkwọ ọhụrụ ahụ aha ya bụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Akwụkwọ ahụ ga-eme ka gị na ha na-ekwurịta okwu nke ọma. Ị chọrọ ka ụmụ gị na-agwa gị otú obi dị ha. N’ihi ya, ejila oge ofufe ezinụlọ unu na-akatọ ha ma ọ bụ na-abara ha mba. Gbalịakwa ka iwe ghara iwe gị ma ọ bụrụ na ha ekwuo ihe na-adịghị mma mgbe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi. Kama ime otú ahụ, ka obi dị gị ụtọ ma ọ bụrụ na ha agwa gị otú ọ dị ha n’obi. Meekwa ka ọ dịrị ha mfe ime otú ahụ mgbe ọzọ. Mgbe ị ga-akacha enwe ike inyere ụmụ gị aka bụ ma ị mata otú obi dị ha n’eziokwu.

Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi jiri ihe ndị Jehova kere na-akụziri ụmụ ha gbasara àgwà Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee oge ndị ọzọ ndị nne na nna nwere ike iji nyere ụmụ ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma?

13 Ndị nne na nna, na-achọnụ ohere n’oge ọ bụla n’ụbọchị unu ga-eji enyere ụmụ unu aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Unu ekwesịghị ichere ruo mgbe unu ga-amụwa Baịbụl tupu unu akụziere ha gbasara Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova. Legodị ihe otu nne aha ya bụ Lisa kwuru. Ọ sịrị: “Anyị na-eji ihe ọ bụla anyị hụrụ Jehova kere akụziri ụmụ anyị gbasara Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nkịta anyị emee ihe tọrọ ụmụ anyị ọchị, anyị na-eji ya akụziri ha na Jehova bụ onye obi ụtọ, nakwa na o kere ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.”

Ndị nne na nna, ùnu ma ndị enyi ụmụ unu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) *

14. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị nne na nna nyere ụmụ ha aka imeta ndị ezigbo mmadụ enyi? (Ilu 13:20)

14 Ihe nke anọ: Nyere ụmụ gị aka ka ha meta ndị ezigbo mmadụ enyi. Okwu Chineke mere ka o doo anya na ndị anyị na ha bụ enyi nwere ike ime ka anyị na-eme ihe ọma ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ. (Gụọ Ilu 13:20.) Ndị nne na nna, ùnu ma ndị enyi ụmụ unu? Ùnu ahụtụla ha, unu na ha anọrịakwa? Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka ka ha meta ndị hụrụ Jehova n’anya enyi? (1 Kọr. 15:33) I nwere ike inyere ha aka. Otú i nwere ike isi eme ya bụ ịna-akpọ ndị ha na Jehova dị ná mma ka ha bịa n’ụlọ unu soro unu mee ihe ụfọdụ.​—Ọma 119:63.

15. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ka ha na ndị ezigbo mmadụ bụrụ enyi?

15 Otu nwanna aha ya bụ Tony kọwara ihe ya na nwunye ya na-eme iji nyere ụmụ ha aka imeta ezigbo ndị enyi. Ọ sịrị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na nwunye m na-akpọ ụmụnna dị iche iche, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ka ha bịa n’ụlọ anyị. Anyị na ha na-eri nri, sorokwa nwee Ofufe Ezinụlọ. Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya mmadụ nwere ike isi mata ụmụnna ndị a hụrụ Jehova n’anya ma jiri obi ụtọ na-efe ya. Ndị nlekọta sekit, ndị ozi ala ọzọ, nakwa ndị ọzọ na-anọ n’ụlọ anyị. Ụmụ anyị mụtara ezigbo ihe n’akụkọ ha, n’ịnụ ọkụ n’obi ha, nakwa n’otú ha si wepụta onwe ha na-ejere Jehova ozi. O nyeere ha aka ka ha na Jehova na-adị ná mma.” Ndị nne na nna, kpebisienụ ike inyere ụmụ unu aka ka ha na ndị ezigbo mmadụ bụrụ enyi.

AKWỤSỊLA INWE OLILEANYA

16. Ọ bụrụkwanụ na nwa gị asị na ya achọghị ife Jehova?

16 Ọ bụrụkwanụ na n’agbanyeghị mbọ niile ị gbara, otu n’ime ụmụ gị asị na ọ chọghị ife Jehova? Echela na ị bụghị ezigbo nne ma ọ bụ nna. Jehova nyere ma anyị niile ma nwa gị ohere ikpebi ihe anyị ga-eme, ya bụ, ma ànyị ga-efe ya ma ọ bụ na anyị agaghị efe ya. Ọ bụrụ na nwa gị ekpebie ịhapụ Jehova, akwụsịla inwe olileanya na ọ ka nwere ike ịlọghachikwute ya otu ụbọchị. Cheta akụkọ nwa mmefu. (Luk 15:​11-19, 22-24) Nwa mmefu ahụ mere ọtụtụ ihe ọjọọ. Ma, o mechara lọta. Mmadụ nwere ike ịsị: “Ihe ahụ bụnụ akụkọ. Ụdị ihe a ò nwere ike ime?” Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ime. Ọ bụ ihe mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Elie.

17. Olee otú akụkọ Elie si gbaa gị ume?

17 Mgbe Elie na-ekwu gbasara nne na nna ya, ọ sịrị: “Ha mere ike ha niile ịkụziri m ka m hụ Jehova n’anya ma jiri Okwu ya bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe. Ma, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na ise, m malitere inupụrụ ha isi.” Elie malitere ibi ndụ ihu abụọ. O kweghịkwa ege nne na nna ya ntị mgbe ha gbalịrị ike ha niile inyere ya aka ka ya na Jehova dịrị ná mma. O mechara si n’ụlọ ha pụọ, meekwa ezigbo ihe ọjọọ. Ma, mgbe ụfọdụ, ya na otu enyi ya na-ekwurịta gbasara Baịbụl. Elie sịrị: “Ka m na-agwakwu enyi m ahụ gbasara Jehova, ka m na-echekwu gbasara Jehova. Ka oge na-aga, eziokwu Baịbụl nne na nna m gbalịsiri ike kụnye n’obi m ka mkpụrụ ji nwayọọ nwayọọ na-eto.” Elie mechakwara lọghachi n’ọgbakọ. * Chegodị ụdị obi ụtọ nne na nna ya nwere na ha gbalịsiri ike malite na nwata na-akụziri ya ịhụ Jehova n’anya.​—2 Tim. 3:​14, 15.

18. Olee otú obi dị gị gbasara ndị nne na nna na-arụsi ọrụ ike ịkụziri ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya?

18 Ndị nne na nna, Jehova nyere unu ọrụ magburu onwe ya, nke bụ́ ịzụlite ọgbọ ọzọ ga-efe Jehova. (Ọma 78:​4-6) Ihe a abụghị obere ọrụ. Anyị na-aja unu mma maka otú unu si na-agbasi mbọ ike inyere ụmụ unu aka. Ọ bụrụ na unu ana-eme ike unu niile inyere ụmụ unu aka ka ha hụ Jehova n’anya, nakwa ịna-azụ ha ma na-agbazi ha otú Jehova chọrọ, obi ga-adị Jehova bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya ụtọ.​—Efe. 6:4.

ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

^ Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst hụrụ ụmụ ha n’anya nke ukwuu. Ha na-agbalịsi ike na-egboro ụmụ ha mkpa ha, na-emekwa ha obi ụtọ. Ihe kadị mkpa ha na-eme bụ na ha na-agbalị ike ha niile na-enyere ụmụ ha aka ka ha hụ Jehova n’anya nke ukwuu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere ndị nne na nna aka ime ihe a.

^ Gaa na jw.org ka ị hụ vidio isiokwu ya bụ Jehova Kụziiri Anyị Otú Anyị Ga-esi Zụọ Ụmụ Anyị.

^ Gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche Eprel 1, 2012.

^ NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na nwa ya na enyi nwa ya na-atụ basket bọl ka o nwee ike mata enyi nwa ya ahụ.