Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

Uru Akwụkwọ Mkpughe Ga-abara Gị Taa

Uru Akwụkwọ Mkpughe Ga-abara Gị Taa

“Onye na-agụpụta okwu amụma a . . . na-enwe obi ụtọ.”​—MKPU. 1:3.

ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee otu ihe mere ihe e dere n’akwụkwọ Mkpughe kwesịrị iji masị anyị?

 È NWETỤLA mgbe mmadụ bunyere gị foto ya ka i lee? Ka ị na-ele ya, e nwere ọtụtụ ndị ị na-amaghị. Ma, e nwere otu foto masịrị gị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị nọ na foto ahụ. Ka ị na-ele ya, i chetara mgbe e sere foto ahụ na ebe a nọ see ya. Ị gbalịkwara ịmata ndị ọzọ niile nọ na foto ahụ. Foto ahụ masịrị gị nke ọma.

2 Akwụkwọ Mkpughe dị ka foto ahụ. N’ihi gịnị? E nwere ọ dịkarịa ala, ihe abụọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na ọ bụ anyị ka e deere ya. Amaokwu ya nke mbụ sịrị: “Ihe ndị a ka Jizọs Kraịst kpughere. Ọ bụ Chineke kpugheere ya ihe ndị a ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:1) N’ihi ya, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ụwa ka e deere akwụkwọ ahụ, kama ọ bụ ndị ohu Chineke nyefere ya onwe ha. Ebe anyị bụ ndị Chineke, o kwesịghị iju anyị anya na anyị so na-emezu amụma ụfọdụ e buru n’akwụkwọ a magburu onwe ya. N’ihi ya, anyị ga na-agụta ihe ndị gbasara anyị n’akwụkwọ Mkpughe.

3-4. Dị ka e kwuru ná Mkpughe, olee mgbe amụma ndị e buru na ya ga-emezu, oleekwa ihe o kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị mee?

3 Ihe nke abụọ mere amụma ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe ji gbasa anyị bụ oge amụma ndị ahụ ga-emezu. Mgbe Jọn onyeozi mere agadi, o kwuru mgbe amụma ndị ahụ ga-emezu. Ọ sịrị: “Mmụọ nsọ mere ka m nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpu. 1:10) Mgbe Jọn dere ihe a n’ihe dị ka afọ 96, “ụbọchị Onyenwe anyị” ka dị ezigbo anya. (Mat. 25:​14, 19; Luk 19:12) Ma, amụma ndị dị na Baịbụl gosiri na “ụbọchị Onyenwe anyị” malitere n’afọ 1914 mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe. Malite n’afọ ahụ gawa, amụma ndị e buru ná Mkpughe gbasara ndị Chineke malitere na-emezu. N’eziokwu, anyị bi “n’ụbọchị Onyenwe anyị.”

4 Ebe anyị bi n’oge a na-eme obi ụtọ, anyị kwesịrị itinye uche anyị n’ezigbo ndụmọdụ e dere ná Mkpughe 1:3. Ebe ahụ sịrị: “Onye na-agụpụta okwu amụma a, na onye na-anụ ya ma na-eme ihe ndị e dere na ya, na-enwe obi ụtọ, n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.” N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịgụpụta okwu amụma a’ ka anyị nwee ike ‘ịnụ ihe e dere na ya’ ma “na-eme” ya eme. Olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịna-eme?

GBALỊA NA-EFE JEHOVA OTÚ Ọ CHỌRỌ

5. Olee otú akwụkwọ Mkpughe si gosi uru ife Jehova otú ọ chọrọ ga-abara anyị?

5 Malite n’isi mbụ n’akwụkwọ Mkpughe, anyị mụtara na Jizọs ma ihe niile na-eme n’ọgbakọ ya. (Mkpu. 1:​12-16, 20; 2:1) Ozi Jizọs zigaara ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ gosiri na ihe a bụ eziokwu. N’ozi ahụ, o kwuru ihe ndị ga-enyere Ndị Kraịst ndị ahụ aka ịhụ na ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ihe o kwuru n’ozi ahụ gbasakwara ndị niile na-efe Chineke taa. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na ya? Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs Kraịst maara ma anyị na Jehova ànyị dị ná mma, ka ọ̀ bụ na anyị adịghị. Jizọs na-edu anyị, na-echebe anyị. Ọ na-ahụkwa ihe niile. Ọ ma ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Jehova mma. Olee ihe o kwuru anyị kwesịrị ịna-eme taa?

6. (a) Dị ka e kwuru ná Mkpughe 2:​3, 4, olee nsogbu ọgbakọ dị n’Efesọs nwere? (b) Gịnị ka anyị na-amụta na ya?

6 Gụọ Mkpughe 2:​3, 4Anyị ekwesịghị ịkwụsị ịhụ Jehova n’anya otú anyị hụrụ ya na mbụ. Ihe Jizọs gwara ndị nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs gosiri na ha na-atachi obi, ha akwụsịbeghịkwa ife Jehova n’agbanyeghị nsogbu dị iche iche bịaara ha. Ma, ha ahụghịzi Jehova n’anya otú ha hụrụ ya na mbụ. Ha kwesịrị ịmalite hụwakwa Jehova n’anya otú ha hụrụ ya na mbụ. Ma ọ́ bụghị ya, Jehova agaghị na-anabata ofufe ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịna-atachi obi. Anyị kwesịrị ibu ezigbo ihe n’obi na-eme ya. Ihe dị Chineke mkpa abụghị naanị ihe anyị na-eme, kamakwa ihe mere anyị ji eme ya. Ihe anyị bu n’obi eme ihe ndị anyị na-eme dị ya ezigbo mkpa n’ihi na ọ chọrọ ka ihe ga-eme ka anyị na-efe ya bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị.​—Ilu 16:2; Mak 12:​29, 30.

7. (a) Dị ka e kwuru ná Mkpughe 3:​1-3, olee nsogbu Jizọs hụrụ n’ọgbakọ dị na Sadis? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime?

7 Gụọ Mkpughe 3:​1-3. Anyị kwesịrị ịmụrụ anya ma na-eche nche. Nsogbu ọgbakọ dị na Sadis nwere dị iche. Ọ bụ eziokwu na ha ji ihe gbasara ofufe Jehova kpọrọ ihe n’oge gara aga, ha malitere ịla azụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha ka ha ‘teta.’ Olee ihe anyị na-amụta na ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova agaghị echefu ọrụ ọ bụla anyị rụụrụ ya. (Hib. 6:10) Ma, anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị nweziri ike ịfanye aka n’ụkwụ ugbu a n’ihi na anyị fere ya n’oge gara aga. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike nwee ihe ụfọdụ anyị na-agaghịzi na-emeli, ma anyị kwesịrị ‘inwe ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyi.’ Anyị kwesịkwara ịmụrụ anya ma na-arụsi ọrụ ike ruo ọgwụgwụ.​—1 Kọr. 15:58; Mat. 24:13; Mak 13:33.

8. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe Jizọs gwara ọgbakọ dị na Leodisia ná Mkpughe 3:​15-17?

8 Gụọ Mkpughe 3:​15-17. Anyị kwesịrị ịna-anụ ọkụ n’obi, jirikwa obi anyị niile na-efe Jehova. Ozi Jizọs zigaara ọgbakọ dị na Leodisia gosiri nsogbu dị iche ha nwere. Ha ‘ajụghị oyi, ha ekpoghịkwa ọkụ’ n’ofufe ha na-efe Jehova. Ọ bụ ihe ahụ mere Jizọs ji gwa ha na ha “na-ahụsi anya, bụrụkwa ndị e kwesịrị imetere ebere.” Ha kwesịrị ịna-anụrụ Jehova na ofufe ya ọkụ n’obi. (Mkpu. 3:19) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na anyị anaghịzi anụcha ọkụ n’obi, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-enwekwu obi ụtọ maka ihe ọma niile Jehova na nzukọ ya na-emere anyị. (Mkpu. 3:18) Anyị ekwesịghị ikwe ka ịchọ ịba ọgaranya megharịa anyị anya, mee ka anyị gharazie ime ofufe Jehova ihe kacha anyị mkpa ná ndụ.

9. Dị ka anyị hụrụ n’ozi Jizọs zigaara Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Tayataịra, olee ihe anyị kwesịrị izere?

9 Anyị kwesịrị ịjụ ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi. Jizọs baara ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Pagamọm mba n’ihi na ha na-akpata nkewa. (Mkpu. 2:​14-16) Ọ jara ndị nọ n’ọgbakọ dị na Tayataịra mma n’ihi na ha na-ezere “ihe ndị dị omimi nke Setan.” Ọ gwakwara ha ka ha jidesie eziokwu ike. (Mkpu. 2:​24-26) Ndị Kraịst okwukwe ha na-esighị ike n’ọgbakọ ahụ kwere ka e jiri ozizi ụgha ghọgbuo ha. Ha kwesịrị ichegharị. Anyịnwa kwanụ? Anyị kwesịkwara izere nkụzi ọ bụla dị iche n’ihe Jehova chere. Ndị si n’ezi ofufe dapụ nwere ike ime “ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha anaghị erubere ya isi.” (2 Tim. 3:5) Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke nke ọma, ọ ga-adịrị anyị mfe ịchọpụta ihe bụ́ nkụzi ụgha ma jụ ya.​—2 Tim. 3:​14-17; Jud 3, 4.

10. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs gwara ndị nọ n’ọgbakọ dị na Pagamọm na Tayataịra?

10 Anyị ekwesịghị ịna-eme omume ọ bụla rụrụ arụ, na-akwado ya ma ọ bụ na-eleghara ya anya. E nwekwara nsogbu ọzọ ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Pagamọm na Tayataịra nwere. Jizọs baara ụfọdụ n’ime ha mba n’ihi na ha ajụghị omume rụrụ arụ. (Mkpu. 2:​14, 20) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Anyị agaghị atụ anya ka obi dị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị etinye aka n’ụdị omume rụrụ arụ ọ bụla, ọ bụrụgodị na anyị efeela ya ruo ọtụtụ afọ, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ ugbu a. (1 Sam. 15:22; 1 Pita 2:16) Ọ chọrọ ka anyị ghara itinye aka na ya n’agbanyeghị otú ụwa anyị bi n’ime ya jọruru ná njọ.​—Efe. 6:​11-13.

11. Gịnị ka anyị mụtarala? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Anyị Ga-amụta Taa.”)

11 Gịnị ka anyị mụtarala? Anyị ahụla na anyị kwesịrị ịgbalị hụ na anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ọ bụrụ na e nwere ihe anyị na-eme ga-eme ka Jehova ghara ịnabata ofufe anyị, anyị kwesịrị ịgbalị kwụsị ya ozugbo. (Mkpu. 2:​5, 16; 3:​3, 16) Ma, e nwere ihe ọzọ Jizọs kwukwara n’ozi o zigaara ọgbakọ ndị ahụ. Gịnị ka ọ bụ?

DỊRỊ NJIKERE IDI MKPAGBU

Olee otú Setan si na-emegide ndị Chineke kemgbe a chụpụchara ya n’eluigwe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 16)

12. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs gwara ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Smeana na Filadelfịa? (Mkpughe 2:10)

12 Ka anyị leba anya n’ihe Jizọs gwara ọgbakọ dị na Smeana na Filadelfịa. Ọ gwara Ndị Kraịst ndị ahụ ka ha ghara ịtụ egwu mkpagbu n’ihi na Jehova ga-agọzi ha ma ọ bụrụ na ha atachie obi. (Gụọ Mkpughe 2:10; 3:10) Olee ihe anyị na-amụta na ya? Anyị kwesịrị ịna-atụ anya na a ga-akpagbu anyị, dịrịkwa njikere idi ya. (Mat. 24:​9, 13; 2 Kọr. 12:10) Olee ihe mere o ji dị mkpa na e chetaara anyị ihe a?

13-14. Olee ihe mere ndị Chineke n’ihi ihe e kwuru ná Mkpughe isi 12?

13 Akwụkwọ Mkpughe gwara anyị na a ga-akpagbu ndị Chineke bi “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” ya bụ, n’oge anyị a. Mkpughe isi 12 kwuru na agha malitere n’eluigwe ozugbo Alaeze Chineke malitere ịchị. Maịkel na ndị agha ya lụsoro Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya agha. Maịkel bụ Jizọs mgbe ọ laghachiri n’eluigwe. (Mkpu. 12:​7, 8) E meriri ndị iro Chineke ma chụdata ha n’ụwa a. Ọ bụ ya mere ndị nọ n’ụwa ji na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. (Mkpu. 12:​9, 12) Ma, olee otú ihe a si gbasa ndị Chineke?

14 Akwụkwọ Mkpughe gwakwara anyị ihe Ekwensu mere. Ọ naghịzi enwe ike ịba n’eluigwe. N’ihi ya, ọ na-ewesozi ndị e tere mmanụ fọrọnụ n’ụwa ezigbo iwe n’ihi na ọ bụ ha na-anọchi anya Alaeze Chineke n’ụwa. Ọ bụkwa ha nwere “ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (Mkpu. 12:17; 2 Kọr. 5:20; Efe. 6:​19, 20) Olee otú amụma a si mezuo?

15. Olee ndị bụ́ ‘ndị àmà abụọ’ ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe isi 11, gịnịkwa mere ha?

15 Ekwensu mere ka ndị iro Chineke na-akpagbu ụmụnna e tere mmanụ bụ́ ndị na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ha ka ‘ndị àmà abụọ’ ahụ e gburu, e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe, nọchiri anya ha. * (Mkpu. 11:​3, 7-11) N’afọ 1918, e boro ụmụnna asatọ ndị na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị ebubo ụgha, maa ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ ọtụtụ afọ. Ọtụtụ ndị chere na a kwụsịla ọrụ ụmụnna ndị a e tere mmanụ.

16. Olee ihe a na-atụghị anya ya mere n’afọ 1919, ma olee ihe Ekwensu na-akwụsịbeghị ime kemgbe ahụ?

16 Amụma ahụ e buru ná Mkpughe isi 11 kwukwara na a ga-akpọlite ‘ndị àmà abụọ’ ahụ mgbe obere oge gachara. Amụma ahụ mezukwara. E nwere ihe dị ịtụnanya mere mgbe ha nọrọ ihe na-erughị otu afọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ọnwa Mach afọ 1919, a tọhapụrụ ụmụnna ndị ahụ e tere mmanụ, mechaakwa kwuo na aka ha dị ọcha. Ụmụnna ndị ahụ malitere ozugbo kwusawa ozi ọma. Ma, Ekwensu akwụsịghị imegide ndị Chineke. Kemgbe ahụ, Ekwensu emeela ka mkpagbu “yiri osimiri” na-abịara ndị Chineke niile. (Mkpu. 12:15) N’eziokwu, anyị niile “kwesịrị ịtachi obi, nweekwa okwukwe.”​—Mkpu. 13:10.

NA-EME IKE GỊ NIILE N’ỌRỤ JEHOVA NYERE ANYỊ

17. Olee otú e si nyere ndị Chineke aka mgbe ha na-atụghị anya ya n’agbanyeghị otú Ekwensu si na-akpagbu ha?

17 Mkpughe isi 12 gosiziri na a ga-esi ebe a na-atụghị anya ya nyere ndị Chineke aka. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na “ala” meghere loo “mmiri ahụ” yiri mkpagbu. (Mkpu. 12:16) Ọ bụ nnọọ ihe merenụ. Mgbe ụfọdụ, ụlọikpe ma ọ bụ òtù ụfọdụ na-enyere ndị Chineke aka. E nweela ọtụtụ ikpe ndị Jehova meriri, nke mere ka e nwee oge ndị a na-anaghị enye ha nsogbu n’ofufe ha na-efe Jehova. Gịnị ka ha ji oge ahụ mee? Ha ji oge ahụ na-arụsi ọrụ Jehova nyere ha ike. (1 Kọr. 16:9) Olee ihe bụ́ ọrụ a Jehova nyere ha?

Olee ozi abụọ ndị Chineke na-ekwusa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

18. Olee ọrụ bụ́ isi anyị na-arụ n’oge ikpeazụ a?

18 Jizọs buru amụma na ndị ya ‘ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke’ n’ebe niile n’ụwa tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 24:14) Ndị mmụọ ozi na-enyere ha aka ma ha na-ekwusa ya. Baịbụl kwuru na ndị mmụọ ozi “na-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile ozi ọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.”​—Mkpu. 14:6.

19. Olee ozi ọzọ ndị hụrụ Jehova n’anya ga-ekwusa?

19 Ozi ọma ndị Chineke ga-ekwusa abụghị naanị gbasara Alaeze Chineke. Ha kwesịkwara ịna-akwado ọrụ ndị mmụọ ozi ahụ e kwuru gbasara ha n’akwụkwọ Mkpughe isi 8 ruo na nke 10 na-arụ. Ndị mmụọ ozi ahụ na-ekwu gbasara ahụhụ ndị jụrụ Alaeze Chineke ga-ata. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova nọkwa na-ekwusa ozi amamikpe nke e ji tụnyere “akụ́ mmiri igwe a gwakọtara ya na ọkụ.” Ha na-akọwakwa ikpe Chineke ga-ama òtù dị iche iche nke ụwa Setan a. (Mkpu. 8:​7, 13) E kwesịrị ime ka ndị mmadụ mata na ọgwụgwụ ụwa a dị ezigbo nso ka ha nwee ike ịgbanwe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe ná ndụ ha ma soro ná ndị Jehova ga-echebe n’ụbọchị iwe ya. (Zef. 2:​2, 3) Ma, ọtụtụ ndị achọghị ịnụ ozi a. Anyị kwesịrị inwe obi ike iji kwusaa ya. N’oge oké mkpagbu ahụ, ozi amamikpe a ga-akpasukwu ndị mmadụ iwe.​—Mkpu. 16:21.

NA-EME IHE NDỊ E BURU N’AMỤMA A

20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu abụọ na-esonụ?

20 Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị e dere ‘n’okwu amụma a’ n’ihi na anyị so ná ndị ga-emezu ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Mkpughe. (Mkpu. 1:3) Ma, olee otú anyị ga-esi na-atachi obi ma a na-akpagbu anyị ma jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma? E nwere ihe abụọ ga-enyere anyị aka. Nke mbụ bụ ihe akwụkwọ Mkpughe kwuru gbasara ndị iro Chineke, nke abụọ abụrụ ihe ọma ga-abịara anyị ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ife Chineke. Anyị ga-eleba anya n’ihe ndị a n’isiokwu abụọ na-esonụ.

ABỤ NKE 32 Na-akwado Jehova

^ Anyị bi n’oge na-eme obi ụtọ. E nwere amụma ndị dị n’akwụkwọ Mkpughe na-emezu n’oge a. Olee otú amụma ndị a si gbasa anyị? N’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ ndị ọzọ na-eso ya, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Mkpughe. Anyị ga-amụta otú ime ihe e dere n’akwụkwọ Mkpughe ga-esi eme ka anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ.

^ Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2014, peeji nke 30.