Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22

Akwụsịla Ịga Ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’

Akwụsịla Ịga Ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’

“Okporo ụzọ ga-adị ebe ahụ. Ọ bụ ụzọ a na-akpọ Ụzọ Dị Nsọ.”​—AỊZA. 35:8.

ABỤ NKE 31 Soro Chineke Na-eje Ije

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Olee ihe dị mkpa ndị Juu bi na Babịlọn ga-ekpebi? (Ezra 1:​2-4)

 E NWERE ọkwa eze mara. Ọ sịrị na ndị Juu niile a dọọrọ n’agha laa Babịlọn kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa nweziri ike ịlaghachi ala ha bụ́ Izrel. (Gụọ Ezra 1:​2-4.) Ọ bụ naanị Jehova ga-emeli ka ihe a kwe omume. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha. (Aịza. 14:​4, 17) Ma, e meriela Babịlọn. Eze ọhụrụ agwala ndị Juu na ha nweziri ike ịlaghachi obodo ha. N’ihi ya, onye Juu ọ bụla, karịchaa onyeisi ezinụlọ, nwere ihe ọ ga-ekpebi. Ọ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ahapụ Babịlọn ma ọ̀ ga-anọrọwa ebe ahụ. Ikpebi ụdị ihe ahụ adịghị mfe. N’ihi gịnị?

2 O nwere ike ịbụ na nká mere ka o siere ọtụtụ ndị ike ime njem ahụ dị anya. Ebe ọ bụkwanụ na a mụrụ ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ na Babịlọn, ọ bụ naanị ebe ahụ ka ha birila. Ha anaghị ele Izrel anya ka obodo ha. Ọ bụ naanị ka obodo ndị nna nna ha. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ ndị Juu abaala ọgaranya na Babịlọn. N’ihi ya, o nwere ike isiri ha ike ịhapụ ụlọ ọma ha na ihe ndị ha ji akpata ego, kwalaa obodo ha na-amaghị.

3. Olee uru ịlaghachi Izrel ga-abara ndị Juu na-efe Jehova?

3 Ndị Juu ji obi ha niile na-efe Chineke ma na uru ha ga-erite ma ha laghachi Izrel ga-akarị ihe ọ bụla ha ga-ahapụ. Uru ọ ga-akacha baara ha bụ n’ofufe ha na-efe Chineke. Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe karịrị ụlọ arụsị iri ise na Babịlọn, e nweghị otu mkpụrụ ụlọ nsọ Jehova n’obodo ahụ. E nweghị ebe a na-achụ àjà ndị Izrel nwere ike ịchụ àjà Iwu Mosis kwuru ka ha na-achụ. E nweghịkwa ndị nchụàjà a haziri ahazi ịchụ àjà ndị ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-efe arụsị karịrị ndị na-efe Jehova n’obodo ahụ. Ndị ahụ na-efe arụsị enweghị ihe ha ji Jehova ma ọ bụ iwu ya kpọrọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu hụrụ Jehova n’anya na-atụsi anya ike mgbe ha ga-alaghachi n’obodo ha fewekwa Jehova otú ọ chọrọ.

4. Olee nkwa Jehova kwere ndị Juu ahụ na-alaghachi Izrel?

4 Isi Babịlọn gaa Izrel adịghị mfe. O nwere ike iwe ihe dị ka ọnwa anọ. Ma, Jehova kwere ha nkwa na ọ ga-ewepụrụ ha ihe ọ bụla nwere ike ime ka ha ghara ịlaghachi Izrel. Aịzaya dere, sị: “Dozienụ ụzọ Jehova! Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ. . . . Ala dị ndakoro ndakoro ga-adị larịị. Ala na-adịghị larịị ga-adịkwa larịị.” (Aịza. 40:​3, 4) Weregodị ya na ị na-ahụ ka ha na-aga n’okporo ụzọ dị n’ọzara, n’ala dị larịị. Obi ga na-atọ ha ụtọ ịna-aga ụdị ebe ahụ. Ọ ga-akara ha mfe ịna-aga n’okporo ụzọ dị larịị kama ịna-arịgo ugwu na-arịda ma ọ bụ ịna-aga ugwu gburugburu. Ha ga-erukwa ngwa ngwa.

5. Olee aha a kpọrọ okporo ụzọ ahụ si Babịlọn gaa Izrel?

5 Taa, ọtụtụ okporo ụzọ nwere aha ma ọ bụ nọmba e ji mara ha. O kporo ụzọ Aịzaya kwuru okwu ya nwekwara aha. Baịbụl sịrị: “Okporo ụzọ ga-adị ebe ahụ. Ọ bụ ụzọ a na-akpọ Ụzọ Dị Nsọ. Onye rụrụ arụ agaghị akpa ụkwụ na ya.” (Aịza. 35:8) Olee uru nkwa a baara ndị Izrel n’oge ahụ? Oleekwa uru ọ ga-abara anyị taa?

IHE “ỤZỌ DỊ NSỌ” PỤTARA N’OGE AHỤ NAKWA N’OGE A

6. Gịnị mere e ji sị na ụzọ ahụ dị nsọ?

6 “Ụzọ Dị Nsọ” a kpọrọ ụzọ ahụ magburu onwe ya. Gịnị mere e ji sị na ụzọ ahụ dị nsọ? Ọ bụ n’ihi na a gaghị ekwe ka “onye rụrụ arụ” nọrọ n’Izrel, ya bụ, onye Juu ọ bụla kpebisiri ike ịna-eme omume rụrụ arụ, ịna-ekpere arụsị, ma ọ bụ ịna-eme mmehie ndị ọzọ dị oké njọ. Ndị Juu ahụ na-alaghachi Izrel ga-abụkwara Chineke ha “ndị dị nsọ.” (Diut. 7:6) Ma, ihe a apụtaghị na e nweghị ihe ndị ahụ si Babịlọn na-alaghachi Izrel kwesịrị ịgbanwe ná ndụ ha iji mee ihe dị Jehova mma.

7. Olee ihe ụfọdụ ndị Juu kwesịrị ịgbanwe? Nye ihe atụ.

7 Dị ka anyị kwuburu, a mụrụ ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ na Babịlọn. O nwekwara ike ịbụ na otú ndị Babịlọn si eme ihe na ihe ha kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ amarala ọtụtụ ndị Juu ahụ ahụ́. Mgbe ọtụtụ afọ gara ndị Juu mbụ lara Izrel lachara, Ezra matara na ụfọdụ ndị Juu alụọla ụmụ nwaanyị na-ekpere arụsị. (Ọpụ. 34:​15, 16; Ezra 9:​1, 2) Ka oge na-agakwa, o juru Gọvanọ Nehemaya anya mgbe ọ chọpụtara na ụmụ a mụrụ n’Izrel amaghịdị asụsụ ndị Juu. (Diut. 6:​6, 7; Nehe. 13:​23, 24) Olee otú ụmụaka ndị ahụ ga-esi mụta ịhụ Jehova n’anya na ife ya ma ọ bụrụ na ha anaghị aghọta asụsụ Hibru, bụ́kwanụ asụsụ a kacha jiri dee Okwu Chineke? (Ezra 10:​3, 44) N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ihe ndị Juu ahụ kwesịrị ịgbanwe. Ma, ọ ga-adịrị ha mfe ime ya ma ọ bụrụ n’Izrel ka ha nọ n’ihi na e ji nwayọọ nwayọọ na-amaliteghachi ife Jehova otú ọ chọrọ n’Izrel.​—Nehe. 8:​8, 9.

Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ahapụla Babịlọn Ukwu, malitekwa ịga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Gịnị mere akụkọ ihe mere ọtụtụ afọ gara aga ga-eji baara anyị uru taa? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

8 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Akụkọ a magburu onwe ya. Ma, olee otú ihe mere ndị Juu ọtụtụ afọ gara aga si gbasa anyị taa?’ N’eziokwu, ọ gbasara anyị. E nwere ike ikwu na anyị na-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ànyị so n’atụrụ ọzọ, anyị kwesịrị ịna-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’ n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịna-efe Jehova ugbu a nakwa n’ọdịnihu, mgbe Alaeze Chineke ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma mee n’ụwa a. b (Jọn 10:16) Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ nde ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ahapụla Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, malitekwa ịna-aga ije n’ụzọ ahụ. O nwere ike ịbụ na i so na ha. Ọ bụ eziokwu na e mepere ụzọ ahụ ihe dị ka otu narị (100) afọ gara aga, ma e nwere ndị malitere ịkwadebe ụzọ ahụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ.

ỊKWADEBE ỤZỌ AHỤ

9. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 57:​14, olee otú e si kwadebe “Ụzọ Dị Nsọ”?

9 Jehova hụrụ na e wepụrụ ihe ọ bụla nwere ike ịnọchiri ndị Juu si Babịlọn na-ala ụzọ. (Gụọ Aịzaya 57:14.) Gịnịkwanụ ka e mere “Ụzọ Dị Nsọ” n’oge anyị a? Ọtụtụ narị afọ tupu afọ 1919, Jehova ji ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu ya mepeere ndị mmadụ ụzọ isi na Babịlọn Ukwu pụta. (I nwere ike ịtụle Aịzaya 40:3.) Ha mere ihe ndị dị mkpa ga-eme ka o kwe ndị nwere ezi obi omume ịhapụ okpukpe ụgha ma soro ndị Jehova na-efe ya. Olee ọrụ ndị ha rụrụ? Legodị ihe ụfọdụ ha rụrụ iji kwadebe ụzọ ahụ.

Ruo ọtụtụ narị afọ tupu afo 1919, ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu Chineke nyere aka megheere ndị mmadụ ụzọ ka ha nwee ike isi na Babịlọn Ukwu pụta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

10-11. Olee otú ibi Baịbụl na ịsụgharị ya si mee ka ndị mmadụ mata eziokwu Baịbụl? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Ibi Baịbụl. Ruo ihe dị ka n’afọ 1450, e ji aka na-edepụta Baịbụl. Ọrụ a na-ewe ogologo oge. Ọ na-emekwa ka Baịbụl dị ụkọ, dịkwa oké ọnụ. Ma, kemgbe e mepụtara ígwè ndị e ji ebi akwụkwọ, ọ na-adịzi mfe ibipụta ọtụtụ Baịbụl, kesaakwa ya.

11 Ịsụgharị Baịbụl. Ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ n’asụsụ Latịn ka e nwere ọtụtụ Baịbụl, bụ́kwanụ asụsụ naanị ndị gụrụ akwụkwọ na-aghọta. Ma, mgbe a malitere ibi akwụkwọ n’ọtụtụ ebe, ndị na-atụ egwu Chineke gbalịsiri ike ịsụgharị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ ndị na-agụghị akwụkwọ na-asụ. Ọtụtụ ndị nweziri ike iji ihe Baịbụl na-akụzi mara ma ihe ndị isi chọọchị na-akụziri ha ọ̀ bụ eziokwu.

Ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu Chineke nyere aka megheere ndị mmadụ ụzọ ka ha nwee ike isi na Babịlọn Ukwu pụta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 14) c

12-13. Nye ihe atụ otú ndị ji obi ha niile na-amụ Baịbụl n’ihe dị ka n’afọ 1835 si malite ịgba ozizi ụgha ndị chọọchị na-akụzi n’anwụ.

12 Ihe ndị e ji amụ Baịbụl. Ndị kpachapụrụ anya na-amụ Baịbụl mụtara ọtụtụ ihe mgbe ha na-agụ Okwu Chineke. Ma, ezigbo iwe were ọtụtụ ndị isi okpukpe mgbe ha malitere ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha na-amụta. Dị ka ihe atụ, malite n’ihe dị ka n’afọ 1835, ụfọdụ ndị nwere ezi obi malitere ibi traktị na-agba ụgha ndị okpukpe ụgha na-akụzi n’anwụ.

13 N’ihe dị ka n’afọ 1835, otu nwoke na-atụ egwu Chineke, aha ya bụ Henry Grew, biri traktị na-ekwu ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ. Na traktị ahụ, o ji Baịbụl gosi na naanị ihe ga-eme ka mmadụ bụrụ onye na-enweghị ike ịnwụ anwụ bụ ma Chineke nye ya onye ahụ ka onyinye, ọ bụghị na o bu ya pụta ụwa otú ahụ ọtụtụ chọọchị na-akụzi. N’afọ 1837, otu ụkọchukwu aha ya bụ George Storrs hụrụ traktị ahụ mgbe ọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè. Ọ gụrụ ya, kwetasiekwa ike na ihe ọ gụtara na ya bụ eziokwu dị ezigbo mkpa. O kpebiri ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọ mụtara. N’afọ 1842, o kwuru ọtụtụ okwu n’isiokwu bụ́ “Nchọpụta​—Ndị Ajọ Omume Há Enweghị Ike Ịnwụ Anwụ?” Otu onye so mụta ihe n’ihe George Storrs dere bụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Charles Taze Russell.

14. Olee uru Nwanna Russell na ndị enyi ya ritere n’otú ndị ọzọ si kwadebe ụzọ ahụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Olee uru Nwanna Russell na ndị enyi ya ritere n’ọrụ ụfọdụ ndị rụrụ ọtụtụ afọ gara aga iji kwadebe ụzọ ahụ? Mgbe ha na-amụ ihe, ha lebara anya n’akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ndị e depụtara okwu ụfọdụ nakwa nsụgharị Baịbụl dị iche iche e nwere n’oge ahụ. E wepụtara ihe ndị ahụ niile tupu ha amalite ọrụ ha. Nchọnchọ ndị dị ka Henry Grew, George Storrs, na ndị ọzọ si na Baịbụl mee bakwaara ha uru. Nwanna Russell na ndị enyi ya sokwa kwadebe ụzọ ahụ. Otú ha si mee ya bụ ibipụta ọtụtụ akwụkwọ na traktị kọwara ihe Baịbụl na-ekwu.

15. Olee ihe dị mkpa mere n’afọ 1919?

15 N’afọ 1919, ndị Chineke si na Babịlọn Ukwu pụta ma nwere onwe ha. N’afọ ahụ, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” malitere ọrụ ha ka ndị nwere ezi obi malite ịga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ (Mat. 24:​45-47) Ọrụ ndị ọzọ rụrụ n’oge gara aga iji kwadebe ụzọ ahụ nyeere ndị malitere ịga ije n’okporo ụzọ ahụ aka ịna-amụtakwu gbasara Jehova na nzube ya. (Ilu 4:18) O mekwara ka ha malite ibi ndụ otú Jehova chọrọ. Jehova atụghị anya na ndị ya ga-agbanwe ihe niile ha kwesịrị ịgbanwe otu mgbe. Kama, o mere ka ha na-emekwu nke ọma ka oge na-aga. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Jehova Ji Nwayọọ Nwayọọ Na-anụcha Ndị Ya.”) Obi ga-adị anyị niile ụtọ mgbe ihe niile anyị ga na-eme ga-adị Jehova mma.​—Kọl. 1:10.

E MECHIBEGHỊ “ỤZỌ DỊ NSỌ”

16. Kemgbe afọ 1919, olee ọrụ a nọ na-arụ ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’? (Aịzaya 48:17; 60:17)

16 E kwesịrị ịna-arụ ọrụ n’okporo ụzọ ọ bụla ka ọ ghara imebi. Kemgbe afọ 1919, a ka na-arụ ọrụ ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’ ka ndị mmadụ nwee ike ịna-apụtakwu na Babịlọn Ukwu. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche a họpụtara ọhụrụ malitere ọrụ. N’afọ 1921, ha bipụtara otu akwụkwọ e ji amụ Baịbụl nke ga-enyere ndị ọhụrụ aka ịmụta eziokwu Baịbụl. Aha akwụkwọ ahụ bụ The Harp of God. E mechara kesaa ya ihe fọrọ obere ka o ruo nde isii (6,000,000) n’asụsụ iri atọ na isii. Ọtụtụ ndị sikwa na ya mụta eziokwu Baịbụl. N’oge na-adịbeghị anya, e wepụtaara anyị ọmarịcha akwụkwọ ọhụrụ e ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl aha ya bụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. N’oge ikpeazụ a niile, Jehova ji nzukọ ya na-eme ka anyị nweta ntụziaka si n’Okwu ya nke ga-enyere anyị niile aka ịna-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’​—Gụọ Aịzaya 48:17; 60:17.

17-18. Olee ebe “Ụzọ Dị Nsọ” na-eduga anyị?

17 Anyị nwere ike ikwu na mgbe ọ bụla mmadụ kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, onye ahụ enwetala ohere ịmalite gawa ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ Ụfọdụ nwere ike ịgatụ ije n’ụzọ ahụ, mechaakwa hapụ ya. E nwekwara ndị nke kpebisiri ike ịna-aga ije n’ụzọ ahụ ruo mgbe ha ruru ebe ha na-aga. Olee ebe ha na-aga?

18 “Ụzọ Dị Nsọ” ga-eduga ndị nwere olileanya ịga eluigwe na “paradaịs Chineke” dị n’eluigwe. (Mkpu. 2:7) “Ụzọ Dị Nsọ” ga-eduga ndị nwere olileanya ibi n’ụwa n’oge ha ga-ezu okè ná ngwụcha otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. Ọ bụrụ na ị nọ n’ụzọ ahụ taa, elekwala anya n’azụ. Ahapụkwala ya ruo mgbe ị garuru ebe ị na-aga, ma ọ bụ n’eluigwe ọhụrụ ma ọ bụ n’ụwa ọhụrụ. Ka Jehova duruo gị n’udo.

ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

a O nwere ụzọ Jehova ji mee ihe atụ. Ọ bụ ụzọ si Babịlọn gaa Izrel. Ọ kpọrọ ya “Ụzọ Dị Nsọ.” Jehova ò mepeerela ndị ya ụdị ụzọ ahụ n’oge a? À na-ajụkwa ajụ? Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ nde mmadụ ahapụla Babịlọn Ukwu malite ịga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ Anyị niile kwesịrị ịna-aga ije n’ụzọ ahụ ruo mgbe anyị ruru ebe anyị na-aga.

b Gụọ Amụma Aịsaịa​—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke II, peeji nke 56 na nke 57.

c NKỌWA FOTO: Ebe Nwanna Russell na ndị enyi ya na-amụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl e bipụtara tupu oge ha.