Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23

Ekwela Ka “Ọkụ nke Jaa” Nyụọ

Ekwela Ka “Ọkụ nke Jaa” Nyụọ

Ịhụnanya dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa.’​—ABỤ SOLO. 8:6.

ABỤ NKE 131 “Ihe Chineke Kekọtara”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú Baịbụl si kọwaa ezigbo ịhụnanya?

 ‘ỊHỤNANYA dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa. Mmiri na-ekwo ekwo enweghị ike imenyụ ịhụnanya, osimiri enweghịkwa ike ibupụ ya.’ b (Abụ Solo. 8:6, 7) Otú a e si kọwaa ịhụnanya magburu onwe ya. Ọ na-emesi di na nwunye obi ike na ha ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu.

2. Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ịhụnanya ha ghara ịjụ oyi?

2 Ọ bụ di na nwunye ka ọ dị n’aka ịgba mbọ ka ha na-ahụ ibe ha n’anya ụbọchị niile ha dị ndụ. Iji maa atụ, ọkụ a kwanyere akwanye nwere ike inwuru na-aga naanị ma a na-etinyekwu ya nkụ. A hapụ ya, ọ ga-emecha nyụọ. Otú ahụkwa ka ịhụnanya di na nwunye dị. O nwere ike isi ike ruo oge niile ha dị ndụ ma ọ bụrụ na ha ana-agba mbọ ka ha na-adịkwu ná mma. Mgbe ụfọdụ, di na nwunye nwere ike ịchọpụta na ịhụnanya ha ajụwala oyi, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe na-esiri ha ike n’ihi ụkọ ego, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu dị n’ịzụ ụmụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, olee otú i nwere ike isi mee ka “ọkụ nke Jaa” ghara ịnyụ n’alụmdi na nwunye gị? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ atọ ị ga-esi eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-adịkwu ná mma, obi ana-adịkwa unu ụtọ. c

NA-EMENỤ KA UNU NA JEHOVA NA-ADỊKWU NÁ MMA

Di na nwunye kwesịrị ime ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma otú ahụ Josef na Meri mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee otú di na nwunye na Jehova ịdị n’ezigbo mma ga-esi eme ka ịhụnanya ha ghara ịnyụ ka ọkụ? (Ekliziastis 4:12) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

3 Ọ bụrụ na di na nwunye achọghị ka “ọkụ nke Jaa” nyụọ, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Olee otú ha na Jehova ịdị ná mma ga-esi enyere ha aka? Ọ bụrụ na di na nwunye ejiri adịm ná mma ha na Nna ha nke eluigwe kpọrọ ihe, ha ga-eji obi ha na-eme ihe o kwuru, nke ga-eme ka ha zere nsogbu ma ọ bụ merie nsogbu ndị nwere ike ime ka ịhụnanya ha jụọ oyi. (Gụọ Ekliziastis 4:12.) Ndị ha na Jehova dị ná mma na-agbasi mbọ ike ime ka ya ma na-akpa àgwà ka ya, dị ka inwe obiọma, inwe ndidi, na ịgbaghara ndị ọzọ. (Efe. 4:32–5:1) Di na nwunye nwee àgwà ndị a, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-ahụ ibe ha n’anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lena alụọla di ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Ọ sịrị: “Ọ na-adị mfe ịhụ onye ji ife Jehova kpọrọ ihe n’anya nakwa ịkwanyere ya ùgwù.”

4. Olee ihe mere Jehova ji họrọ Josef na Meri ka ha bụrụ nne na nna onye ga-abụ Mezaya?

4 Ka anyị leba anya n’otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl. Mgbe Jehova na-ahọrọ ndị ga-abụ nne na nna Mezaya, ọ họọrọ Josef na Meri n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị si n’agbụrụ Devid. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ha na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova makwa na ha ga-eme ka ife ya bụrụ ihe kacha ha mkpa. Ndị di na nwunye, olee ihe unu ga-amụta n’aka Josef na Meri?

5. Olee ihe ndị di ga-amụta n’aka Josef?

5 Josef mere ihe Jehova gwara ya ozugbo. O mekwara ka ọ bụrụ ezigbo di. Ọ dịkarịa ala, e nwere ugboro atọ Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme gbasara ezinụlọ ya. Na nke ọ bụla n’ime ha, o rubere isi ozugbo, ma mgbe o siiri ya ike. (Mat. 1:20, 24; 2:13-15, 19-21) Otú Josef si mee ihe Chineke kwuru mere ka o chebe nwunye ya bụ́ Meri, kwadoo ya, gbookwara ya mkpa ya. Chegodịnụ otú Meri ga-esi hụkwuo Josef n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù n’ihi ihe ndị a o mere. Ndị di, unu nwere ike ime ka Josef ma ọ bụrụ na unu ana-eji ihe Baịbụl kwuru ekpebi otú unu si elekọta ezinụlọ unu. d Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe Baịbụl kwuru, ma mgbe o siiri unu ike, ọ na-egosi na unu hụrụ nwunye unu n’anya. Ọ ga-emekwa ka unu na nwunye unu dịrị n’ezigbo mma. E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Vanuwatu. Ọ lụọla di ihe karịrị afọ iri abụọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na di m ana-achọpụta ihe bụ́ uche Jehova ma na-eme ya, m na-akwanyekwuru ya ùgwù, obi na-eru m ala, na-esikwa m ike ịna-eme ihe ndị o kpebiri.”

6. Gịnị ka ndị nwunye nwere ike ịmụta n’aka Meri?

6 Meri na Jehova dịkwa n’ezigbo mma. Ihe mere ka ya na Jehova dị ná mma abụghị ihe Josef na-eme. Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. (Luk 1:46) O wepụtakwara oge na-atụgharị uche. (Luk 2:19, 51) O doro anya na otú Meri si jiri ife Chineke kpọrọ ihe mere ka ọ bụrụ ezigbo nwunye. Taa, ọtụtụ ndị nwunye na-agbasi mbọ ike ime ka Meri. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Emiko sịrị: “Mgbe m na-alụbeghị di, e nwere ihe ndị m na-eme ka mụ na Jehova na-adị ná mma. Ma, mgbe m lụchara di, m chọpụtara na ebe ọ bụ di m na-ekpe ekpere mgbe mụ na ya nọ ma na-ebute ụzọ n’ofufe ezinụlọ, m na-echerezi ka ọ na-emere m ihe ndị a. M bịara chọpụta na m kwesịrị ịgba mbọ n’onwe m ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma. N’ihi ya, m na-ewepụtazi oge mụ na Jehova ga-eji na-anọrị, ya bụ, oge ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, na ichebara ihe Jehova kwuru echiche.” (Gal. 6:5) Ndị nwunye, ka unu na-agba mbọ ka unu na Jehova dịrịkwuo ná mma, ndị di unu ga-ahụ ihe ndị ọzọ mere ha ga-eji hụkwuo unu n’anya ma na-eto unu.​—Ilu 31:30.

7. Olee ihe ndị di na nwunye ga-amụta n’aka Josef na Meri gbasara ifekọ Jehova ọnụ?

7 Josef na Meri gbakọrọ mbọ ọnụ iji hụ na ha na Jehova dị n’ezigbo mma. Ha ghọtara na ọ dị ezigbo mkpa ka ezinụlọ ha na-efekọ Jehova ọnụ. (Luk 2:22-24, 41; 4:16) O nwere ike ịbụ na o siiri ha ike ime otú ahụ, karịchaa, ka ha na-amụkwu ụmụ. Mana, ha gbasiri mbọ ike na-eme ya. Ndị di na nwunye kwesịrị ịna-eme otú ahụ taa. Ọ bụrụ na unu amụọla ụmụ ka Josef na Meri, o nwere ike isiri unu ike ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ iwepụta oge na-enwe ofufe ezinụlọ. Nke nwedịrị ike ịka siere unu ike bụ iwepụta oge unu abụọ ga-eji na-amụ ihe ma ọ bụ na-ekpe ekpere. Ma, cheta na ọ bụrụ na unu ana-efekọ Jehova ọnụ, unu na Jehova ga-adịkwu ná mma, unu ana-adịkwukwa ná mma. N’ihi ya, meenụ ka ife Jehova bụrụ ihe kacha unu mkpa.

8. Gịnị ka di na nwunye nwere nsogbu nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ na-abakwuru ha uru?

8 Ọ bụrụkwanụ na unu na-enwe nsogbu? O nwere ike ọ gaghị na-agụcha unu agụụ ịna-enwe ofufe ezinụlọ. Ọ bụrụ otú ahụ, unu nwere ike iji ihe dị nkenke ga-atọ unu ụtọ malite, ya bụ, ihe unu abụọ kwekọrịtara ikwurịta. Ịmalite ime ihe a nwere ike ime ka unu na-adịkwu ná mma, meekwa ka unu na-achọkwu ịna-emekọ ihe ndị gbasara ofufe Jehova ọnụ.

NA-ANỌKỌNỤ

9. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-ewepụta oge na-anọkọ?

9 Ndị di na nwunye, ịnọkọ ọnụ nwere ike ime ka ịhụnanya unu ghara ịnyụ ka ọkụ. Ọ ga-eme ka onye nke ọ bụla mara ihe ibe ya na-eche na otú obi na-adị ya. (Jen. 2:24) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lilia na di ya bụ́ Ruslan alụọla ihe karịrị afọ iri na ise. Lee ihe ha chọpụtara obere oge ha lụchara. Nwanna Nwaanyị Lilia sịrị: “Anyị chọpụtara na anyị agaghị enwecha oge anyị ga-eji anọkọ ọnụ otú anyị cheburu. Ịrụ ọrụ ego, ọrụ ụlọ, nakwa ụmụ ndị anyị mechara mụta mere ka anyị ghara ịna-enwe efe. Anyị chọpụtara na ọ bụrụ na anyị abụọ anaghị ewepụta oge na-anọkọ ọnụ, o nwere ike ime ka anyị ghara ịdịcha ná mma.”

10. Olee otú di na nwunye nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:15, 16?

10 Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha nwee oge ha ga-eji na-anọkọ? O nwere ike ịdị mkpa ka unu wepụta oge unu ga-eji na-anọkọ. (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Otu nwanna bi na Naịjirịa aha ya bụ Uzondu sịrị: “M haziwe ihe ndị m na-eme, m na-echeta na m kwesịrị iwepụta oge mụ na nwunye m ga-eji na-anọrị. O so n’ihe ndị kacha m mkpa.” (Fil. 1:10) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anastasia bụ nwunye onye nlekọta sekit na Mọldova. O kwuru otú o si eji oge ya eme ihe ndị kacha mkpa. Ọ sịrị: “M na-agbalị ime ihe ndị dịịrị m ma di m na-arụ ọrụ ya. Ime otú ahụ na-eme ka anyị abụọ nwee ike ịnọkọ ọnụ mgbe anyị mechara.” Ọ bụrụkwanụ na otú unu si hazie oge unu mere ka ọ na-esiri unu ike ịnọrị?

Olee ihe ndị gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike imekọ ọnụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11. Gịnị ka Akwịla na nwunye ya Prisila mekọrọ ọnụ?

11 Ndị di na nwunye nwere ike ịmụta ihe n’aka Akwịla na Prisila. Ha bụ di na nwunye ọtụtụ Ndị Kraịst oge mbụ na-akwanyere ùgwù. (Rom 16:3, 4) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara alụmdi na nwunye ha, mana ihe o kwuru gbasara ha gosiri na ha gbakọrọ aka rụọ ọrụ ego, kwusaa ozi ọma, nyekwara ndị ọzọ aka. (Ọrụ 18:2, 3, 24-26) N’eziokwu, e nweghị mgbe ọ bụla Baịbụl kpọrọ aha Akwịla n’akpọghị aha nwunye ya bụ́ Prisila.

12. Olee ihe di na nwunye nwere ike ime ka ha wepụtakwuo oge ha ga-eji na-anọkọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Olee otú ndị di na nwunye nwere ike isi mee ka Akwịla na Prisila? Chee gbasara ọtụtụ ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ime. Ùnu nwere ike imekọ ụfọdụ n’ime ha ọnụ kama ime ha iche iche? Dị ka ihe atụ, Akwịla na Prisila kwusakọrọ ozi ọma ọnụ. Ùnu na-ahazi ka unu na-eme otú ahụ? Akwịla na Prisila rụkọkwara ọrụ ego ọnụ. O nwere ike ọ gaghị ekwe unu omume ịrụ otu ọrụ ego. Ma, ùnu nwere ike ịrụkọ ọrụ ụlọ ọnụ? (Ekli. 4:9) Ọ bụrụ na unu enyere ibe unu aka rụọ ọrụ, ọ ga-eme ka unu na-enwekwu otu obi, meekwa ka unu nwee ohere unu ga-eji na-ekwurịta okwu. Otu nwanna aha ya bụ Robert na nwunye ya Linda alụọla ihe karịrị afọ iri ise. Nwanna Robert sịrị: “N’eziokwu, anyị anaghị enwe oge buru ibu anyị abụọ ji atụrụ ndụ. Ma, ọ bụrụ na mụ ana-asa efere, nwunye m ana-ehicha ya, ma ọ bụkwanụ m nọrọ n’èzí na-abọ ahịhịa, nwunye m abịa na-enyere m aka, ọ na-eme ka obi na-atọgbu m atọgbu. Imekọ ihe ọnụ na-eme ka anyị dịkwuo ná mma, na-ahụkwukwa ibe anyị n’anya.”

13. Olee ihe di na nwunye kwesịrị ime ka ha dịkwuo ná mma?

13 Ma, cheta na naanị ịnọkọ ọnụ agaghị eme ka di na nwunye na-adịkwu ná mma. Otu nwanna nwaanyị bi na Brazil sịrị: “N’oge ndị a, e nwere ọtụtụ ihe na-emegharị mmadụ anya. M chọpụtala na anyị nwere ike iche na anyị na-anọkọ ọnụ mgbe niile n’ihi na anyị bi n’otu ụlọ. Amụtala m na ịnọkọ ọnụ dị mkpa, mana ọ bụghị ebe okwu biri. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịna-ege di m ntị.” Lee ihe Nwanna Bruno na nwunye ya Tays na-eme iji hụ na ha na-ege ibe ha ntị nke ọma. Nwanna Bruno sịrị: “Anyị abụọ nọkọọ ọnụ mgbe a na-enweghị ihe anyị na-eme, anyị na-edowe ekwentị anyị n’ebe ọzọ ka anyị nwee ike ịnọrị.”

14. Gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ naghị atọ ha ụtọ ịna-anọkọ?

14 Ma, olee ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ naghị atọ unu ụtọ ịnọkọ ọnụ? O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na ihe na-amasị unu dị iche iche ma ọ bụkwanụ na ihe anaghị adabara unu abụọ. Olee ihe unu ga-eme? Chegodị gbasara ọkụ ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite. A kwanye ọkụ, ọ naghị enwusi ike ozugbo ahụ. A ga-eji nwayọọ nwayọọ na-etinye ya nkụ ndị bukwuru ibu ka o nwee ike ịna-enwu. Otú ahụkwa ka ọ dị di na nwunye. Otú unu nwere ike isi ebido bụ iwepụta obere oge unu ga-eji na-anọkọ kwa ụbọchị. Hụnụ na ihe unu ga-eme bụ ihe na-atọ unu ụtọ, ọ bụghị ihe ga-akpata esemokwu. (Jems 3:18) Unu bido nwayọọ nwayọọ, o nwere ike ime ka onye nke ọ bụla bidokwa ịhụ ibe ya n’anya.

NA-AKWANYERENỤ IBE UNU ÙGWÙ

15. Olee ihe mere di na nwunye ịkwanyere ibe ha ùgwù ga-eji eme ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya?

15 Di na nwunye kwesịrị ịna-akwanyere ibe ha ùgwù. Nkwanye ùgwù dị ka ikuku nke na-eme ka ọkụ na-enwusi ike. Ọ bụrụ na ikuku adịghị, ọkụ ga-anyụ ozugbo. Ọ bụrụkwa na di na nwunye anaghị akwanyere ibe ha ùgwù, ha ga-achọpụta na ịhụnanya ha nwere ike ịjụ oyi n’egbughị oge. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye agbaa mbọ na-akwanyere ibe ha ùgwù, ọ ga-eme ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya. Ma, cheta na ihe dị mkpa abụghị gịnwa iche na ị na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù, kama, ọ bụ ma yanwa ọ̀ ghọtara na ị na-akwanyere ya ùgwù. Nwanna Aret na nwunye ya bụ́ Penny alụọla ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Nwanna Nwaanyị Penny sịrị: “Otú anyị abụọ si akwanyere ibe anyị ùgwù mere ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. Ọ na-adịrị anyị mfe ịgwa ibe anyị obi anyị n’ihi na anyị ma na a ga-eji ihe anyị kwuru kpọrọ ihe.” N’ihi ya, olee ihe i nwere ike ime iji mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị ghọta na i ji obi gị na-akwanyere ya ùgwù? Ka anyị leba anya n’akụkọ Ebreham na Sera.

Nwanna nwoke kwesịrị ịna-ege nwunye ya ntị nke ọma iji gosi na ọ na-akwanyere ya ùgwù (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Gịnị ka ndị di nwere ike ịmụta n’aka Ebreham? (1 Pita 3:7) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Ebreham kwanyeere Sera ùgwù. Ọ na-echebara ihe Sera kwuru na otú obi na-adị ya echiche. E nwere oge iwe nọ na-ewe Sera, ya agwa di ya ihe na-ewe ya iwe, kwuokwa na ọ bụ Ebreham kpatara ya. Ebreham ò were iwe ma gwa Sera okwu ọjọọ? Mba. Ọ ma na Sera bụ ezigbo nwaanyị na-asọpụrụ ya ma na-akwado ya. Ebreham gere ya ntị ma gbalịa dozie nsogbu ahụ. (Jen. 16:5, 6) Olee ihe anyị na-amụta na ya? Ndị di, unu nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme n’ezinụlọ unu. (1 Kọr. 11:3) Ma, ihe ga-egosi na ị hụrụ nwunye gị n’anya bụ ige ya ntị ma chebara ihe o kwuru echiche tupu gị ekpebie ihe ị chọrọ ikpebi, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe ahụ gbasara ya. (1 Kọr. 13:4, 5) O nwere mgbe ụfọdụ o nwere ike iju nwunye gị obi, ya achọọ ịkọrọ gị otú obi dị ya. Ị̀ na-ege ya ntị ma ọ na-akọrọ gị otú obi dị ya? (Gụọ 1 Pita 3:7.) Nwanna Nwaanyị Angela na di ya bụ́ Dmitry alụọla ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ. Nwanna Nwaanyị Angela kwuru na di ya na-eme ka ọ ghọta na ọ na-akwanyere ya ùgwù. Ọ sịrị: “Di m na-ege m ntị mgbe niile ma iwe bịa m ma ọ bụkwanụ mgbe m chọrọ ịgwa ya okwu. Ọ na-enwere m ndidi, ọ bụrụgodị na otú m si na-ekwu ya adịchaghị mma.”

17. Gịnị ka ndị nwunye nwere ike ịmụta n’aka Sera? (1 Pita 3:5, 6)

17 Sera kwadoro ihe Ebreham kpebiri, si otú ahụ gosi na ọ na-akwanyere ya ùgwù. (Jen. 12:5) E nwere otu oge Ebreham kpebiri ile ndị bịara na nke ha mgbe ha na-atụghị anya ya ọbịa. Ọ gwara Sera ka ọ hapụ ihe ọ na-eme ma mee achịcha buru ezigbo ibu. (Jen. 18:6) Sera mere ihe Ebreham gwara ya ozugbo. Ndị nwunye, unu nwere ike ime ka Sera ma ọ bụrụ na unu ana-akwado ihe ndị di unu kpebiri. Ime otú ahụ ga-eme ka unu na di unu na-adịkwu ná mma. (Gụọ 1 Pita 3:5, 6.) Nwanna Dmitry anyị kwuru okwu ya na paragraf bu nke a ụzọ kwuru otú nwunye ya si akwanyere ya ezigbo ùgwù. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ maka otú nwunye m si agba mbọ na-akwado ihe ndị m kpebiri ọ bụrụgodị na ihe anyị chere abụghị otu. Ihe m kpebiri ghọ anyị ahịa, ọ naghị akatọ m maka ya.” N’eziokwu, ọ na-adị mfe ịhụ onye na-akwanyere gị ùgwù n’anya.

18. Olee uru ọ ga-abara ndị di na nwunye ma ọ bụrụ na ha agbaa mbọ mee ka ịhụnanya ha ghara ịnyụ ka ọkụ?

18 Taa, Ekwensu chọrọ ime ka ịhụnanya ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst nyụọ ka ọkụ. Ọ ma na ọ bụrụ na di na nwunye ahụghịzi ibe ha n’anya, o nwere ike ime ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. Ma, ezigbo ịhụnanya agaghị anyụli. N’ihi ya, ka otú unu si hụ ibe unu n’anya dịrị ka nke ahụ a kọwara n’Abụ Solomọn. Kpebisienụ ike na unu ga-eme ka ihe gbasara ofufe Jehova bụrụ ihe kacha unu mkpa. Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị, na-akwanyekwaranụ ibe unu ùgwù. Unu ga-esi otú ahụ mee ka e too Jehova bụ́ Onye ezigbo ịhụnanya si n’aka. Ịhụnanya unu ga na-enwukwa ruo oge niile unu dị ndụ otú ahụ ọkụ a na-etinye nkụ si enwu.

ABỤ NKE 132 Anyị Bụzi Di na Nwunye

a Alụmdi na nwunye bụ onyinye Jehova nyere ụmụ mmadụ. Ọ na-eme ka di na nwunye na-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu. Ma, mgbe ụfọdụ, ịhụnanya ahụ nwere ike ịjụ oyi. Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, isiokwu a ga-enyere gị aka ka ịhụnanya unu ghara ịnyụ ka ọkụ, obi ana-adịkwa unu ụtọ.

b Ezigbo ịhụnanya anaghị agbanwe agbanwe. Ọ na-adịgidekwa. A kpọrọ ya “ọkụ nke Jaa” n’ihi na o si n’aka Jehova.

c Ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị abụghị Onyeàmà Jehova, ihe ndị e kwuru n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka ka gị na ya na-adịkwu ná mma.​—1 Kọr. 7:12-14; 1 Pita 3:1, 2.

d Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgụ ihe ụfọdụ ga-abara gị uru n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka.” Ọ dị na jw.org nakwa na JW Library®.