Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-eme Nchọnchọ

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-eme Nchọnchọ

Ihe Ndị Anyị Ji Eme Nchọnchọ n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET

Ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ ga-enyere gị aka ịmụta gbasara isiokwu dị iche iche. Ụfọdụ ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ n’Ịntanet bụ Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl, na Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ.

Ebe e dere “Denye Isiokwu” n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET nwere ike inyere gị aka iji akwụkwọ ndị ahụ achọta ihe. I denyewe ihe n’ebe ahụ e dere “Denye Isiokwu,” aro ụfọdụ ga-apụta n’okpuru ya. Ị ga-ahụ okwu bụ́ “Isiokwu” n’akụkụ okwu ọ bụla a kọwara n’akwụkwọ ndị ahụ.

Mee ihe a: Denye “Jehova” n’ebe ahụ e dere “Denye Isiokwu” (A). Pịa “Jehova” nke e dere “Isiokwu” n’akụkụ ya (B). Ị ga-ahụ ebe ndị ọ gbara n’akwụkwọ ndị anyị ji eme nchọnchọ.