Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ekpere Anyị Na-akakwu Mma

Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ekpere Anyị Na-akakwu Mma

Gwanụ ya ihe niile dị unu n’obi.”​—ỌMA 62:8.

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe niile ma rịọ Jehova ka ọ na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Gịnị ka Jehova gwara ndị na-efe ya ka ha na-eme? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

 ÒNYE ka anyị nwere ike ịgakwuru ka o nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ onye ga-akasi anyị obi ma ọ bụ duzie anyị? Anyị ma azịza ya. Anyị nwere ike ịgakwuru Jehova n’ekpere. Jehova gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere. Ọ chọrọ ka anyị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile.’ (1 Tesa. 5:17) Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ, rịọ ya ka o duzie anyị n’ihe ọ bụla anyị na-eme. (Ilu 3:5, 6) Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. N’ihi ya, ọ gwara anyị na anyị nwere ike ikpe ekpere ugboro ole ọ bụla anyị chọrọ.

2. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Obi dị anyị ụtọ na Jehova kwere ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. Ma, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ iwepụta oge kpee ekpere. Anyị nwekwara ike ịchọpụta na ọ dị mkpa ka anyị mee ka ekpere anyị kwakwuo mma. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-ahụ ihe ndị na-agba anyị ume na ihe ndị na-eduzi anyị na Baịbụl. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Jizọs mere nke ga-enyere anyị aka ịna-ewepụta oge na-ekpe ekpere. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ise ga-enyere anyị aka ime ka ekpere anyị na-akakwu mma.

JIZỌS NA-EWEPỤTA OGE IKPE EKPERE

3. Gịnị ka Jizọs ma gbasara ekpere?

3 Jizọs ma na Jehova ji ekpere kpọrọ ihe. Ogologo oge tupu ya abịa n’ụwa, ọ hụrụ ka Nna ya zara ekpere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ji obi ha niile na-efe ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs nọ n’akụkụ Nna ya mgbe ọ zara ekpere Hana, Devid, Ịlaịja, na ndị ọzọ si n’obi ha kpee. (1 Sam. 1:10, 11, 20; 1 Eze 19:4-6; Ọma 32:5) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile, obi esiekwa ha ike na a ga-aza ekpere ha.​—Mat. 7:7-11.

4. Olee ihe anyị na-amụta n’ekpere ndị Jizọs kpere?

4 Jizọs mere ihe anyị ga-amụta gbasara ekpere n’otú o si gwa Nna ya okwu n’ekpere. N’oge niile ọ na-eje ozi ya n’ụwa, o kpere ekpere ọtụtụ ugboro. Ebe ọ bụ na ya na ndị mmadụ na-anọkarị, ya ana-ejikwa ọrụ n’aka mgbe niile, ọ na-agba mbọ wepụta oge ọ ga-eji kpee ekpere. (Mak 6:31, 45, 46) Ọ na-ebili n’isi ụtụtụ ka o nwee ike ịnọ naanị ya kpee ekpere. (Mak 1:35) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere otu oge o kpere ekpere abalị niile tupu ya emee mkpebi dị ezigbo mkpa. (Luk 6:12, 13) Jizọs kpekwara ekpere ọtụtụ ugboro n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya tupu ya emee ihe kacha taa akpụ n’ozi o jere n’ụwa.​—Mat. 26:39, 42, 44.

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs n’ihe gbasara ekpere?

5 Otú Jizọs si kpee ekpere na-akụziri anyị na n’agbanyeghị otú anyị si eji ọrụ n’aka, anyị kwesịrị ịna-ewepụta oge na-ekpe ekpere. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị na-ewepụta oge anyị ga-eji na-ekpe ekpere otú ahụ Jizọs mere. O nwere ike ịbụ ibili n’isi ụtụtụ ma ọ bụkwanụ ịmụrụ anya mgbe chi jiri kpee ekpere. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi Jehova na anyị ji onyinye a pụrụ iche kpọrọ ihe. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lynne chetara otú obi si tọọ ya ụtọ mgbe mbụ ọ mụtara na o nwere ike ikpe ekpere. Ọ sịrị: “Mgbe m mụtara na m nwere ike ịgwa Jehova okwu n’oge ọ bụla, o nyeere m aka iwere ya ka ezigbo Enyi m, meekwa ka m chọọ ime ka ekpere m na-akakwu mma.” O doro anya na ọ bụkwa otú a ka ọ na-adị ọtụtụ n’ime anyị. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe ise anyị nwere ike ikpe n’ekpere anyị.

IHE ISE DỊ MKPA ANYỊ NWERE IKE IKPE N’EKPERE

6. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 4:10, 11, olee ihe Jehova kwesịrị inweta?

6 Na-eto Jehova. N’ọhụụ dị ịtụnanya Jọn onyeozi hụrụ, ọ hụrụ ndị okenye iri abụọ na anọ nọ n’eluigwe na-efe Jehova. Ha toro Chineke, kwuo na ọ bụ “onye dị ike” nakwa na ‘o ruru eru ka ndị niile too ya ma sọpụrụ ya.’ (Gụọ Mkpughe 4:10, 11.) Ndị mmụọ ozi na-efe Chineke nwekwara ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-eto Jehova ma na-asọpụrụ ya. Ha na ya nọ n’eluigwe, ha amatakwala ya nke ọma. Ha na-ahụ otú ihe ndị ọ na-eme si egosi ụdị onye ọ bụ. Ka ha na-ahụ otú Jehova si eme ihe, ọ na-eme ka ha na-eto ya.​—Job 38:4-7.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ito Jehova maka ya?

7 Anyịnwa chọkwara ịna-eto Jehova ma anyị na-ekpe ekpere, na-agwa ya ihe ndị na-amasị anyị banyere ya. Ka ị na-amụ Baịbụl, gbalịa ka ị chọpụta àgwà Jehova ndị kacha amasị gị. (Job 37:23; Rom 11:33) Gwa Jehova otú obi dị gị gbasara àgwà ndị ahụ. Anyị nwekwara ike ito Jehova maka otú o si enyere ma anyịnwa ma ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile aka. Ọ na-elekọta anyị ma na-echebe anyị mgbe niile.​—1 Sam. 1:27; 2:1, 2.

8. Olee ụfọdụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova? (1 Ndị Tesalonaịka 5:18)

8 Na-ekele Jehova. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova n’ekpere anyị. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:18.) Anyị nwere ike ikele ya maka ihe ọma ọ bụla anyị nwere. A sị ka e kwuwe, ihe ọma ọ bụla anyị nwere si n’aka ya. (Jems 1:17) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgwa ya otú obi si atọ anyị ụtọ maka ụwa mara mma o nyere anyị, nakwa maka otú ihe ndị o kere eke si atụ anyị n’anya. Anyị nwekwara ike ikele ya maka ndụ anyị dị, ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, nakwa maka olileanya o nyere anyị. Anyị kwesịkwara ịna-ekele Jehova maka otú o si kwe ka anyị na ya dị ná mma.

9. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mụta ikele Jehova maka ihe ndị ọ na-emere anyị?

9 O nwere ike ịdị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gbaa mbọ chee gbasara ihe ndị mere o kwesịrị iji na-ekele Jehova. Anyị bi n’ụwa ndị mmadụ na-anaghị ekele ndị meere ha ihe. Ihe na-aka ndị mmadụ mkpa bụ ihe ndị ha chọrọ inweta, ọ bụghị otú ha ga-esi gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ha nwere. Ọ bụrụ na anyị amụta àgwà ahụ, ekpere anyị nweziri ike ịbụ naanị arịrịọ. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka nke ahụ mee, anyị kwesịrị ịgbalị na-amụta ikele Jehova maka ihe niile ọ na-emere anyị.​—Luk 6:45.

Ikele Jehova maka ihe ndị ọ na-emere anyị ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú ikele Jehova maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị si nyere otu nwanna nwaanyị aka idi nsogbu bịaara ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Ikele Jehova maka ihe ndị ọ na-emere anyị nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu. Chegodị gbasara Nwanna Nwaanyị Kyung-sook akụkọ ya gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2015. A chọpụtara na ọrịa kansa eriela ya ahụ́. Ọ sịrị: “Ọrịa a a chọpụtara mere ka obi gbawaa m. O mere ka ọ dị m ka ụwa agwụla. Ezigbo ụjọ bịakwara m.” Gịnị nyeere ya aka idi nsogbu a? Ọ sịrị na tupu ya alakpuo n’abalị ọ bụla, ọ na-agbago n’elu ụlọ ha kpee ekpere n’olu dara ụda ma gwa Jehova ihe ise o meere ya n’ụbọchị ahụ mere o ji na-ekele ya. Ihe a mere ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya, meekwa ka ọ na-egosi Jehova na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ chọpụtara otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka mgbe nsogbu tara akpụ bịaara ha. Ihe a nyekwaara ya aka ịghọta na otú Jehova si agọzi anyị karịrị nsogbu ndị na-abịara anyị. Dịkwa ka Nwanna Nwaanyị Kyung-sook, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova mgbe ọ bụla, ọ bụrụgodị na nsogbu bịaara anyị. Ikele Jehova n’ekpere anyị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ahụ, meekwa ka obi na-adị anyị ụtọ.

11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee obi ike mgbe Jizọs laghachichara eluigwe?

11 Rịọ Jehova ka o mee ka i nwee obi ike n’ozi ọma. Obere oge tupu Jizọs alaghachi eluigwe, o chetaara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ha nwere ịbụ ndị àmà ya “ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8; Luk 24:46-48) Mgbe obere oge gachara, ndị isi ndị Juu nwụchiri Pita onyeozi na Jọn onyeozi ma kpọpụta ha n’ihu Sanhedrin, nye ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Ha yidịrị ha egwu. (Ọrụ 4:18, 21) Gịnị ka Pita na Jọn mere?

12. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 4:29, 31, olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs mere?

12 Mgbe ndị isi okpukpe ndị Juu yiri Pita na Jọn egwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha sịrị: “Chegodịnụ ma ọ̀ ga-adị Chineke mma ka e gee unu ntị kama ige yanwa ntị. Ma, anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.” (Ọrụ 4:19, 20) Mgbe a hapụrụ Pita na Jọn, ha kpere ekpere ka Chineke nyere ha aka ime uche ya. Ha sịrị: ‘Nye anyị bụ́ ndị ohu gị ike ka anyị na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.’ Jehova zakwara ha ekpere ahụ ha ji obi ha niile kpee.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:29, 31.

13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Nwanna Jin-hyuk?

13 Otú anyị ga-esi na-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ịna-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị gwara anyị ka anyị kwụsị. Legodị ihe mere Nwanna Jin-hyuk. A tụrụ ya mkpọrọ n’ihi na o kweghị aga agha. N’ụlọ mkpọrọ ahụ, e nyere ya ọrụ ilekọta ụfọdụ ndị mkpọrọ naanị ha nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ. Ma, a machiri ya ịgwa ndị mkpọrọ ndị ahụ ihe ọ bụla na-agbasaghị ọrụ ya. A machikwara ya ịgwa ha gbasara Baịbụl. Ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya obi ike, meekwa ka o jiri akọ na-ekwusara ha ozi ọma mgbe ọ bụla ohere ya dapụtara. (Ọrụ 5:29) Ọ sịrị: “Jehova zara ekpere m, mee ka m nwee obi ike na amamihe m ji malite iji nkeji ise amụrụ ọtụtụ ndị mkpọrọ Baịbụl n’ọnụ ụzọ ha. O ruo ná mgbede, m na-ede akwụkwọ ozi m ga-enye ndị mkpọrọ n’ụbọchị na-eso ya.” Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ijezu ozi anyị. Anyị nwere ike ikpe ekpere otú ahụ Nwanna Jin-hyuk mere ka Jehova nye anyị obi ike na amamihe.

14. Olee ihe ga-enyere anyị aka idi nsogbu anyị? (Abụ Ọma 37:3, 5)

14 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka idi nsogbu gị. Nsogbu ndị na-abịara ọtụtụ n’ime anyị bụ ọrịa ma ọ bụ obi ịjọ njọ, ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya, nsogbu ezinụlọ, mkpagbu, ma ọ bụ nsogbu ọzọ. Ọrịa na-efe efe na agha na ihe ndị ọzọ emeela ka ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-akakwu njọ. Gwa Jehova otú obi dị gị maka ihe ndị a. Kọọrọ ya otú ihe si dịrị gị otú ahụ ị ga-esi kọọrọ ya ezigbo enyi gị. Obi sie gị ike na Jehova “ga-enyere gị aka.”​—Gụọ Abụ Ọma 37:3, 5.

15. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ‘ịna-atachi obi mgbe a na-akpagbu anyị’? Nye ihe atụ.

15 Ịnọgide na-ekpe ekpere ga-enyere anyị aka ‘ịna-atachi obi mgbe a na-akpagbu anyị.’ (Rom 12:12) Jehova ma nsogbu ndị na-abịara ndị na-efe ya. “Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.” (Ọma 145:18, 19) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kristie chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Ọ bụ ọsụ ụzọ dị afọ iri abụọ na itoolu. Ọrịa ọ na-atụghị anya ya malitere ịkpa ya aka ọjọọ, ya emee ka ike ụwa gwụ ya. Ka oge na-aga, ọ nụrụ na mama ya na-arịa ezigbo ọrịa ga-egbu ya. Nwanna Nwaanyị Kristie sịrị: “M kpesiri ekpere ike rịọ Jehova ka o nye m ike m ga-eji die nsogbu m n’ụbọchị ọ bụla. M gbalịrị na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-amụkwa ihe n’onwe m.” Ọ sịkwara: “Ekpere nyeere m ezigbo aka idi oge ahụ siri ezigbo ike. M ma na Jehova nọ m nso mgbe niile. Icheta ya mere ka obi ruo m ala. Ọ bụ eziokwu na ọrịa m ahụ alaghị ozugbo, Jehova zara ekpere m mee ka obi ruo m ala.” Ka anyị ghara ichefu na “Jehova ma otú o si anapụta ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ọnwụnwa.”​—2 Pita 2:9.

Ọ bụrụ na ị chọrọ imeri ọnwụnwa, (1) na-ekpe ekpere ka Jehova nyere gị aka, (2) na-agbalịsi ike ka i zere ihe ọ bụla nwere ike itinye gị n’ọnwụnwa, (3) na-emekwa ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Gịnị mere enyemaka Jehova ji dịrị anyị mkpa iji merie ọnwụnwa?

16 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeri ọnwụnwa. Ebe anyị na-ezughị okè, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ime ihe na-adịghị mma. Ekwensu na-eme ihe niile o nwere ike ime ka o siere anyị ezigbo ike. Otu n’ime ihe ndị o ji agbalị imebi echiche anyị bụ ihe ndị rụrụ arụ e ji atụrụ ndụ. Ụdị ihe ndị ahụ e ji atụrụ ndụ nwere ike ime ka echiche na-adịghị mma ju n’obi anyị, ya bụ, echiche ga-eme ka anyị ghara ịdị ọcha n’anya Jehova, meekwa ka anyị mee mmehie dị oké njọ.​—Mak 7:21-23; Jems 1:14, 15.

17. Anyị kpechaa ekpere ka Jehova nyere anyị aka, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike izere ọnwụnwa? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa na-abịara anyị ime ihe ọjọọ. Lee ihe Jizọs kwuru n’ekpere o ji kụziere anyị otú e si ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Ekwela ka a nwata anyị, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) Jehova chọrọ inyere anyị aka. Ma, anyị kwesịrị ikpe ekpere rịọ ya ka o nyere anyị aka. Anyị kpechaa, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike zere ihe ọ bụla nwere ike itinye anyị n’ọnwụnwa. Anyị ga-agbasikwa mbọ ike ka anyị ghara ịna-agụ ma ọ bụ na-ege echiche na-ezighị ezi juru n’ụwa Setan. (Ọma 97:10) Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl, na-amụkwa ya ka o mee ka echiche dị mma na-eju anyị n’obi. Ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma ga-echebe obi anyị. Jehova kwekwara nkwa na ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị.​—1 Kọr. 10:12, 13.

18. N’ihe gbasara ekpere, gịnị ka anyị niile kwesịrị ime?

18 Anyị niile kwesịrị ịna-ekpekwu ekpere karịa otú anyị na-ekpebu ka anyị nwee ike jiri obi anyị niile na-efe Jehova n’oge ikpeazụ a tara ezigbo akpụ. Na-ewepụta oge ị ga-eji na-ekpe ekpere si gị n’obi kwa ụbọchị. Jehova chọrọ ka anyị ‘na-agwa ya ihe niile dị anyị n’obi’ ma anyị kpewe ekpere. (Ọma 62:8) Na-eto Jehova ma na-ekele ya maka ihe niile ọ na-eme. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka inwe obi ike n’ozi ọma. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara gị na imeri ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara gị. Ekwela ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla kwụsị gị iwepụta oge na-ekpe ekpere mgbe niile. Ma, olee otú Jehova si aza ekpere anyị? Anyị ga-aza ajụjụ a dị mkpa n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 42 Ekpere Ohu Chineke

a Anyị chọrọ ka ekpere anyị dịrị ka akwụkwọ ozi anyị si n’obi anyị degara ezigbo enyi anyị. Ma, ọ naghị adịrị anyị mfe mgbe niile iwepụta oge na-ekpe ekpere. O nwekwara ike isiri anyị ike ịma ihe anyị ga-ekpe n’ekpere. Anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ a dị mkpa n’isiokwu a.