Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21

Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị

Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị

“Anyị ma na anyị ga-enweta ihe anyị na-arịọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.”​—1 JỌN 5:15.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Olee ihe anyị nwere ike ịna-eche gbasara ekpere anyị?

 Ì CHETỤLA ma Jehova ọ̀ na-aza ekpere gị? Ọ bụrụ na i chetụla otú ahụ, ọ bụghị naanị gị. E nwekwara ọtụtụ ụmụnna ndị kwuru na ha na-eche otú ahụ, karịchaa, mgbe nsogbu tara akpụ bịaara ha. Ọ bụrụ na anyị na-ata ahụhụ, o nwere ike isiri anyị ike ịchọpụta otú Jehova si aza ekpere anyị.

2 Ka anyị leba anya n’ihe ndị ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-aza ekpere ndị ohu ya. (1 Jọn 5:15) Anyị ga-elebakwa anya n’ajụjụ ndị a: Olee ihe mere o nwere ike iji yie mgbe ụfọdụ ka Jehova anaghị aza ekpere anyị? Olee ụzọ ndị Jehova si aza ekpere anyị taa?

JEHOVA NWERE IKE ỊZA EKPERE ANYỊ OTÚ ANYỊ NA-ATỤGHỊ ANYA YA

3. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na-ekpe ekpere?

3 Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nakwa na o ji anyị kpọrọ ihe. (Hag. 2:7; 1 Jọn 4:10) Ọ bụ ya mere o ji agwa anyị ka anyị na-arịọ ya ka o nyere anyị aka. (1 Pita 5:6, 7) Ọ chọrọ inyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma nakwa ka anyị die nsogbu ndị na-abịara anyị.

Jehova zara Devid ekpere ya napụta ya n’aka ndị iro ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Olee otú anyị si mara na Jehova na-aza ekpere ndị ohu ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Anyị gụọ Baịbụl, anyị na-agụtakarị ebe Jehova zara ekpere ndị ohu ya. È nwere onye nke i chetara? Otu onye n’ime ha bụ Eze Devid. Ndị iro gbara ya gburugburu ná ndụ ya niile. Ọ rịọkwara Jehova ọtụtụ ugboro ka o nyere ya aka. N’otu oge, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Jehova, biko, nụrụ ekpere m. Ṅaa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka. Za m n’ihi na ị bụ onye ezi omume na onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.” (Ọma 143:1) Jehova zara ekpere Devid ma napụta ya. (1 Sam. 19:10, 18-20; 2 Sam. 5:17-25) Ọ bụ ya mere Devid ji jiri obi ike sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” Obi nwekwara ike isi anyị ike otú ahụ.​—Ọma 145:18.

Jehova zara Pọl ekpere ya nye ya ike o ji die nsogbu bịaara ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Ọ̀ bụ mgbe niile ka Jehova zara ekpere ndị ohu ya n’oge gara aga otú ha tụrụ anya ya? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 O nwere ike otú Jehova ga-esi aza ekpere anyị abụghị otú anyị tụrụ anya ya. Ọ bụ ihe mere Pọl onyeozi. Ọ rịọrọ Jehova ka o wepụrụ ya ‘nsogbu na-adụ ya n’ahụ́ ka ogwu.’ O kpere ekpere ugboro atọ gbasara nsogbu ahụ. Jehova ọ̀ zara ya ekpere ya? Ee. Ọ zara ya. Mana, ọ bụghị otú Pọl tụrụ anya ya. Kama iwepụrụ ya nsogbu ahụ, Jehova nyere ya ike o ji die ya ma ka na-efe ya.​—2 Kọr. 12:7-10.

6. Mgbe ụfọdụ, olee ihe nwere ike ime ka o yie ka Jehova anaghị aza ekpere anyị?

6 Mgbe ụfọdụ, otú Jehova si aza ekpere anyị nwere ike ịdị iche n’ihe anyị tụrụ anya ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma kpọmkwem otú kacha mma ọ ga-esi enyere anyị aka. O nwedịrị ike ‘imere anyị ihe mmaji kwuru mmaji karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ ihe niile anyị na-eche n’echiche.’ (Efe. 3:20) N’ihi ya, Jehova nwere ike ịza ekpere anyị mgbe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ otú anyị na-atụghị anya ya.

7. Olee ihe mere o nwere ike iji dị mkpa ka anyị gbanwee ihe anyị na-ekpe n’ekpere? Nye ihe atụ.

7 Ka anyị na-amatakwu ihe bụ́ uche Jehova, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee ihe anyị na-ekpe n’ekpere. Ka anyị tụlee akụkọ Nwanna Martin Poetzinger. Obere oge nwanna a lụchara nwaanyị, a tụrụ ya mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Na mbụ, ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka o si n’ogige ịta ahụhụ ahụ pụta ka o nwee ike ilekọta nwunye ya, malitekwa ikwusa ozi ọma. Ma, mgbe izu abụọ gachara, ọ hụghị ihe gosiri na Jehova na-emepere ya ụzọ ka o si ebe ahụ pụta. N’ihi ya, ọ malitere ikpe ekpere, sị: “Jehova, biko mee ka m mata ihe ị chọrọ ka m mee.” Ọ malitere iche nsogbu ụmụnna nọ n’ogige ịta ahụhụ ahụ nwere. Ọtụtụ n’ime ha na-echegbu onwe ha gbasara nwunye ha na ụmụ ha. Nwanna Poetzinger kpeziri ekpere, sị: “Jehova, i meela nye m ọrụ ọhụrụ a. Nyere m aka ka m mee ka ụmụnna m dị ike ma gbaa ha ume.” Ihe a ka ọ nọ na-eme ruo afọ itoolu ọzọ ọ nọrọ ebe ahụ.

8. Olee ihe dị mkpa anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-ekpe ekpere?

8 Anyị kwesịrị ịna-echeta na Jehova nwere ihe o zubere ime. Ọ ga-emekwa ya n’oge o kpebiri ime ya. Ihe so ná nzube ya ahụ bụ iwepụ nsogbu niile na-eme ka anyị na-ata ahụhụ taa, nsogbu ndị dị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọrịa, na ọnwụ. Jehova ga-eji Alaeze ya mezuo ya. (Dan. 2:44; Mkpu. 21:3, 4) Ma, tupu mgbe ahụ, Jehova ka kwere ka Setan na-achị ụwa. b (Jọn 12:31; Mkpu. 12:9) Ọ bụrụ na Jehova ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ niile ugbu a, o nwere ike iyi ka ọchịchị Ekwensu ọ̀ na-aga nke ọma. N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe ndidi ka Jehova mezuo ụfọdụ nkwa o kwere anyị. Ma, ọ pụtaghị na ọ naghị enyere anyị aka. Ka anyị lee ụzọ ụfọdụ Jehova si enyere anyị aka.

ỤZỌ NDỊ JEHOVA SI AZA EKPERE ANYỊ TAA

9. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme? Nye ihe atụ.

9 Ọ na-enye anyị amamihe. Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji na-eme ezigbo mkpebi. Amamihe si n’aka Chineke dị anyị mkpa, karịchaa, mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị nwere ike ịgbanwe ndụ anyị, dị ka ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ na anyị agaghị alụ. (Jems 1:5) Ka anyị leba anya n’akụkọ otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Maria. c O ji obi ụtọ na-asụ ụzọ oge niile mgbe ya na otu nwanna nwoke matara. Nwanna nwaanyị a sịrị: “Ka mụ na ya na-adịkwu ná mma ka anyị malitere ịhụkwu ibe anyị n’anya. M matara na m kwesịrị ikpebi ihe m ga-eme. M kpesiri ekpere ike ruo ogologo oge banyere okwu ahụ. M chọrọ ka Jehova duzie m. Ma, m makwa na Jehova agaghị ekpebiri m ihe m ga-eme.” Nwanna nwaanyị a matara na Jehova zara ekpere ya, mee ka o nwee amamihe. Olee otú o si mee ya? Ka ọ na-eme nchọnchọ n’akwụkwọ anyị, ọ chọtara isiokwu dị iche iche nyeere ya aka ịza ajụjụ ndị o nwere. O chetakwara ezigbo ndụmọdụ mama ya na-efe Chineke nyere ya. Ndụmọdụ ahụ nyeere ya aka ichebara otú obi dị ya echiche. O mechara kpebie ihe dị mma.

Olee otú Jehova si enye anyị ike anyị ji edi nsogbu anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:13, olee ihe Jehova ga-emere ndị na-efe ya? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Ọ na-enye anyị ike anyị ga-eji tachie obi. Jehova na-enye anyị ike anyị na-eji edi nsogbu bịaara anyị otú ahụ o nyere Pọl onyeozi. (Gụọ Ndị Filipaị 4:13.) Ka anyị lee otú Jehova si nyere otu nwanna aha ya bụ Benjamin aka idi nsogbu tara akpụ bịaara ya. Ọtụtụ mgbe n’oge Nwanna Benjamin na-eto eto, ya na ndị ezinụlọ ya bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ n’Afrịka. Ọ sịrị: “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro na-arịọ Jehova ka o nye m ike ime ihe na-amasị ya. Jehova zara ekpere m mee ka obi ruo m ala, mee ka m kata obi na-ekwusa ozi ọma, meekwa ka m na-enweta akwụkwọ ndị ga-eme ka okwukwe m na-esikwu ike.” Ọ sịkwara: “Ịgụ ihe Ndịàmà Jehova ibe m kọrọ na ịmata otú Jehova si nyere ha aka idi nsogbu ha emeela ka m kpebisikwuo ike ịna-efe Jehova.”

Olee otú ị chọpụtarala Jehova na-esi esi n’aka ụmụnna anyị enyere anyị aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12) d

11-12. Olee otú Jehova nwere ike isi jiri ụmụnna anyị za ekpere anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ọ na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà, o kpesiri ekpere ike, rịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka ndị mmadụ chee na ya na-ekwulu ya ma ma ya ikpe maka ya. Kama ime otú ahụ, Jehova ziteere Jizọs otu mmụọ ozi ka ọ bịa nyere ya aka mee ka ọ dị ike. (Luk 22:42, 43) Jehova nwekwara ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka. O nwere ike ime ka nwanna kpọọ anyị n’ekwentị gbaa anyị ume ma ọ bụ bịa leta anyị. Anyị niile kwesịrị ịna-achọta ohere anyị ga-eji na-agwa ụmụnna anyị “okwu ọma.”​—Ilu 12:25.

12 Ka anyị kwuo banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Miriam. Izu ole na ole di ya nwụchara, ọ nọ n’ụlọ naanị ya, obi ana-ajọ ya njọ, ike ụwa agwụkwa ya. Ọ nọ na-ebe naanị ákwá, chọọkwa onye ọ ga-akọrọ otú obi dị ya. Ọ sịrị: “Enweghịdị m otu mkpụrụ ume ịkpọ mmadụ. N’ihi ya, m kpere ekpere. Mgbe m ka nọ na-ebe ákwá ma na-ekpe ekpere, a kpọrọ m n’ekwentị. Onye kpọrọ m bụ otu okenye ya na nwunye ya na-anaghị eji m egwu egwu.” Okenye a na nwunye ya gbara nwanna nwaanyị a ezigbo ume. Obi siri ya ike na ọ bụ Jehova mere ka nwanna ahụ kpọọ ya.

Olee otú Jehova nwere ike isi mee ka ndị ọzọ nyere anyị aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13. Kọọ otu ihe gosiri otú Jehova nwere ike isi jiri ndị na-anaghị efe ya za ekpere anyị.

13 O nwere ike iji ndị na-anaghị efe ya nyere anyị aka. (Ilu 21:1) Mgbe ụfọdụ, otú Jehova si aza ekpere ndị ohu ya bụ ime ka ndị na-anaghị efe ya nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, o mere ka Eze Atazaksis kwe ka Nehemaya laghachi Jeruselem nye aka rụghachi obodo ahụ. (Nehe. 2:3-6) Taakwa, Jehova nwere ike ime ka ndị na-anaghị efe ya gbatara anyị ọsọ enyemaka mgbe nsogbu bịaara anyị.

14. Gịnị masịrị gị n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Soo Hing? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Soo Hing matara na Jehova si n’aka dọkịta ya nyere ya aka. E nwere ọrịa ụfọdụ nwa ya nwoke na-arịa na-emetụ ya n’isi. Mgbe nwa ya ahụ nwere nnukwu ihe mberede, nwanna nwaanyị ahụ na di ya gbara arụkwaghịm n’ọrụ ha ka ha nwee ike lekọta ya. Ihe a mere ka ego na-akọ ha. Nwanna Nwaanyị Soo Hing sịrị na o chere na ọ gaghị edilizi nsogbu ahụ. Ọ gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi, rịọ ya ka o nyere ya aka. Dọkịta ha kpebiri ịchọta ụzọ ọ ga-esi enyere ya na ezinụlọ ya aka. Ihe ahụ mere ka ndị ọchịchị na-enyere ezinụlọ nwanna nwaanyị ahụ aka, ha enwetakwa ebe ha ga-akwụli ụgwọ ya ha ga-ebi. Mgbe e mechara, Nwanna Nwaanyị Soo Hing sịrị: “Anyị hụrụ otú Jehova si nyere anyị aka. N’eziokwu, Jehova bụ ‘Onye na-anụ ekpere.’”​—Ọma 65:2.

OKWUKWE GA-EME KA ANYỊ CHỌPỤTA OTÚ JEHOVA SI AZA EKPERE ANYỊ, NABATAKWA IHE Ọ ZARA ANYỊ

15. Olee ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aka ịchọpụta na Jehova na-aza ekpere ya?

15 Ọ bụghị mgbe niile ka otú Jehova si aza ekpere anyị na-apụ iche. Ma, otú Nna anyị nke eluigwe si aza ya na-eme ka anyị ghara ịkwụsị ife ya. N’ihi ya, ka anya na-eru gị ala ịchọpụta otú Jehova si aza ekpere gị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yoko chere na Jehova anaghị aza ekpere ya. Ma, ọ malitere ide ihe ndị ọ rịọrọ Jehova n’akwụkwọ. Mgbe obere oge gachara, ọ gara lee anya n’akwụkwọ ahụ ma chọpụta na Jehova azala ọtụtụ n’ime ekpere ndị ahụ o kpere, ma ndị nke o chefurula. Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị akwụsị ma chebara otú Jehova si aza ekpere anyị echiche.​—Ọma 66:19, 20.

16. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe n’ihe gbasara ekpere anyị kpere? (Ndị Hibru 11:6)

16 Otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe abụghị naanị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka, kama, ọ bụ ịnabata otú o si za ekpere anyị n’agbanyeghị otú o si za ya. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Mike na nwunye ya bụ́ Chrissy. Ha bu n’obi ije ozi na Betel. Nwanna Mike sịrị: “Mụ na nwunye m dejupụtara akwụkwọ ruo ọtụtụ afọ na anyị chọrọ ije ozi na Betel, kpeekwa ekpere rịọ Jehova ugboro ugboro ka o mee ka anyị jee ozi na Betel. Ma, a kpọghị anyị.” Obi siri Nwanna Mike na nwunye ya ike na Jehova ma otú kacha mma ọ ga-esi jiri ha jee ozi ya. Ha ka nọkwa na-eme ihe niile ha ga-emeli, na-asụ ụzọ oge niile n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, sorokwa na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Taa, Nwanna Mike na nwunye ya nọ n’ọrụ sekit. Nwanna Mike sịrị: “Ọ bụghị mgbe niile ka Jehova zara ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Ma, ọ zara ha. Otú o sikwa za ha dị mma karịa ihe ọ bụla anyị nwere ike iche n’echiche.”

17-18. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 86:6, 7, olee ihe obi siri anyị ike na ya?

17 Gụọ Abụ Ọma 86:6, 7. Obi siri ọbụ abụ bụ́ Devid ike na Jehova nụrụ ekpere ya ma za ya. Obi kwesịkwara isi gị ike otú ahụ. Ndị a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji die nsogbu ndị na-abịara anyị. O nwere ike iji ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anaghị efe ya ugbu a si n’ụzọ ụfọdụ nyere anyị aka.

18 O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka Jehova ga-aza ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Mana, anyị ma na ọ ga-aza ya. Ọ ga-enye anyị ihe dị anyị mkpa nakwa n’oge ọ dị anyị mkpa. N’ihi ya, akwụsịla ikpe ekpere. Nwee okwukwe na Jehova ga-aza ekpere gị. Ka obi siekwa gị ike na ọ ga na-elekọta gị ugbu a, nakwa na n’ụwa ọhụrụ ya, ọ ga-ewere “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”​—Ọma 145:16.

ABỤ NKE 46 Anyị Na-ekele Gị, Jehova

a Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na ọ daba n’uche ya. Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịna-erubere ya isi. Ka anyị tụlee ụzọ ndị Jehova si aza ekpere anyị.

b Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe mere Jehova ji kwe ka Ekwensu na-achị ụwa a, gụọ isiokwu bụ́ “Lekwasị Anya n’Ihe Dị Ezigbo Mkpa.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jun 2017.

c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

d NKỌWA FOTO: Otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị gbatara ọsọ ndụ n’obodo ọzọ. Ụmụnna ha nabatara ha ma nyere ha aka.