Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Idi Mmegbu

Idi Mmegbu

Gụọ Jenesis 37:23-28; 39:17-23 ka ị mụta otú Josef si die mmegbu.

Chebara akụkọ ahụ echiche. Gịnị mere e ji megbuo Josef? (Jen. 37:3-11; 39:1, 6-10) Afọ ole ka e megburu Josef? (Jen. 37:2; 41:46) N’oge ndị ahụ, gịnị ka Jehova meere Josef, ma olee ihe ọ na-emereghị ya?​—Jen. 39:2, 21; w23.01 17 ¶13.

Matakwuo ihe mere. Baịbụl ekwughị na Josef gọọrọ isi onwe ya mgbe nwunye Pọtịfa boro ya ebubo. Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a ga-esi nyere anyị aka iche echiche ihe mere o nwere ike iji bụrụ na Josef họọrọ ịgbachi nkịtị, ma ọ bụkwanụ ihe mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya ka a gwa anyị ihe niile merenụ? (Ilu 20:2; Jọn 21:25; Ọrụ 21:37) Olee àgwà ndị o nwere ike ịbụ ha nyeere Josef aka idi mmegbu e megburu ya?​—Maị. 7:7; Luk 14:11; Jems 1:2, 3.

Olee ihe ndị ị mụtara na ya? Jụọ onwe gị, sị: