Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

ABỤ NKE 1 Àgwà Jehova

Tụkwasị Onye Obi Ebere “Na-ekpe Ụwa Niile Ikpe” Obi

Tụkwasị Onye Obi Ebere “Na-ekpe Ụwa Niile Ikpe” Obi

“Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?”​—JEN. 18:25.

IHE A GA-AMỤ

Ka anyị ghọtakwuo otú Jehova si eme ebere ma na-ekpe ikpe ziri ezi n’ihe gbasara ịkpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ.

1. Olee ihe na-akasi obi Jehova kụziiri Ebreham?

 ỌTỤTỤ afọ gara aga, Jehova ji otu mmụọ ozi ya gwa Ebreham na ọ ga-ebibi obodo Sọdọm na Gọmọra. Ọ bụ eziokwu na Ebreham nwere ezigbo okwukwe na Chineke, ma o siiri ya ike ịghọta. Ọ jụrụ Chineke, sị: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume? . . . Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?” Jehova medara obi nyere ohu ya Ebreham aka ịmụta ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, na Chineke emekataghị bibie ndị ezi omume. Ihe a na-abara anyị uru ma na-akasi anyị obi taa.​—Jen. 18:23-33.

2. Gịnị na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ebere?

2 Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na otú Jehova si ekpe ikpe dị mma nakwa na ọ na-egosi na ọ dị obi ebere? Ọ bụ n’ihi na anyị ma na “Jehova na-ahụ ihe dị n’obi” ndị mmadụ. (1 Sam. 16:7) N’eziokwu, ọ “ma obi onye ọ bụla.” (1 Eze 8:39; 1 Ihe 28:9) Ihe a bụ eziokwu dị ịtụnanya. Jehova ma ihe okpukpu okpukpu karịa anyị. N’ihi ya, anyị enweghị ike ịmatacha ihe mere o ji kpebie ihe ụfọdụ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo gbasara Jehova Chineke, sị: “Amamihe ya enweghị atụ.”​—Rom 11:33.

3-4. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ mgbe ụfọdụ, oleekwa ihe anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a? (Jọn 5:28, 29)

3 Ma, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inwe ajụjụ yiri ndị nke ahụ Ebreham jụrụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ndị Jehova bibiri, dị ka ndị Sọdọm na Gọmọra, è nwere ike ịkpọlite ha n’ọnwụ? È nwere ike ịkpọlite ụfọdụ n’ime ha mgbe a “ga-akpọlite . . . ndị ajọ omume nwụrụ anwụ”?’​—Ọrụ 24:15.

4 Ka anyị kwuo ihe anyị ghọtara gbasara mbilite n’ọnwụ. N’oge na-adịbeghị anya, anyị aghọtakwuola gbasara “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” na “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” a (Gụọ Jọn 5:28, 29 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe a anyị ghọtakwuru mere ka anyị gbanwee ihe ụfọdụ. Anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya. N’ihe gbasara otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi, anyị ga-ebu ụzọ eleba anya n’ihe anyị na-amaghị, anyị elebazie anya n’ihe anyị ma.

IHE ANYỊ NA-AMAGHỊ

5. Gịnị ka akwụkwọ anyị kwuru n’oge gara aga gbasara ndị Jehova bibiri na Sọdọm na Gọmọra?

5 N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru ihe ga-eme ndị Jehova mara ikpe na ha bụ ndị ajọ omume. Anyị kwuru na ndị dị ka ndị Sọdọm na ndị Gọmọra enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. Ma mgbe anyị kpechara ekpere, mụkwuo gbasara ya, anyị chọpụtara na anyị agaghị ekwuli otú ahụ hoo haa. Maka gịnị?

6. Olee ụfọdụ ndị ajọ omume Jehova mara ikpe, gịnịkwa ka anyị na-amaghị?

6 Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ajụjụ gbasara ya. E nwere akụkọ Baịbụl ụfọdụ kwuru gbasara ikpe Jehova mara ndị ajọ omume, dị ka ọtụtụ ndị nwụrụ n’Iju Mmiri, mba asaa nọ n’Ala Nkwa ahụ Jehova nyere ndị ya iwu ka ha bibie, nakwa ndị agha Asiria dị otu narị puku na iri puku asatọ na puku ise (185,000) mmụọ ozi Jehova gburu n’otu abalị. (Jen. 7:23; Diut. 7:1-3; Aịza. 37:36, 37) N’akụkọ ndị a, Baịbụl ò kwuru hoo haa na Jehova mara ndị a niile ikpe mbibi ebighị ebi, na ọ gaghị akpọlite ha n’ọnwụ? Mba. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

7. Gịnị ka anyị na-amaghị gbasara ndị nwụrụ n’Iju Mmiri ma ọ bụkwanụ ndị ndị Izrel gburu na Kenan? (Kọwaa foto)

7 Anyị amaghị otú Jehova si kpee onye nke ọ bụla ikpe, anyị amaghịkwa ma onye nke ọ bụla e gburu ò nwere ohere ịmụ banyere Jehova na ohere ichegharị. N’oge Iju Mmiri, Baịbụl kwuru na Noa “nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ma, o kwughị na n’oge ahụ ọ nọ na-arụ nnukwu ụgbọ, na ọ nọ na-agba mbọ ịgakwuru onye ọ bụla gwa ya gbasara Iju Mmiri na-abịanụ. Anyị amaghịkwa ma ndị ajọ omume niile bi n’ala Kenan hà nwere ohere ịmụta banyere Jehova na ịgbanwe ndụ ọjọọ ha na-ebi.

Ebe Noa na ezinụlọ ya na-arụ nnukwu ụgbọ ahụ. Anyị amaghị ma Noa ọ̀ haziri otú ọ ga-esi kwusaa ozi ọma n’oge ọ na-arụ ụgbọ ahụ, gwa mmadụ niile nọ n’ụwa n’oge ahụ ihe Chineke ga-eme tupu Iju Mmiri ahụ abịa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Gịnị ka anyị na-amaghị gbasara ndị Sọdọm na Gọmọra?

8 Oleekwanụ maka ndị Sọdọm na Gọmọra? Lọt, bụ́ onye ezi omume, bi na Sọdọm. Ma, à gwara anyị na Lọt kwusaara ha niile ozi ọma? Mba. Ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị ajọ omume, ma, onye ọ bụla n’ime ha ọ̀ ma ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi? Cheta na ụmụ nwoke niile nọ n’obodo ahụ nuuru n’ìgwè bịa idina ndị bịara ileta Lọt n’ike. Baịbụl kwuru na ha bụ “ma nwata ma okenye.” (Jen. 19:4; 2 Pita 2:7) Jehova Chineke anyị bụ́ onye obi ebere ọ̀ mara ha niile ikpe na a gaghị akpọlite ha n’ọnwụ? Anyị agaghị ekwuli otú ahụ. Jehova mere ka obi sie Ebreham ike na ndị ezi omume nọ n’obodo ahụ erughịdị mmadụ iri. (Jen. 18:32) N’ihi ya, ha bụ ndị ajọ omume. O zikwara ezi na Jehova bibiri ha maka ihe ha mere. Ànyị ga-ekwuli hoo haa na e nweghị onye ọ bụla n’ime ha a ga-akpọlite n’ọnwụ n’oge a “ga-akpọlite . . . ndị ajọ omume”? Anyị agaghị ekwuli otú ahụ.

9. Gịnị ka anyị na-amaghị gbasara Solomọn?

9 Ma, anyị gụtakwara na Baịbụl gbasara ụfọdụ ndị ezi omume mechara ghọọ ndị ajọ omume. Eze Solomọn bụ otu n’ime ha. A kụziiri ya Okwu Chineke nke ọma, Jehova agọziekwa ya nke ukwuu. Ma, o mechara fewe arụsị. Mmehie o mere kpasuru Jehova iwe, ya ataa ndị Izrel ahụhụ maka ya ruo ọtụtụ narị afọ. Mgbe Solomọn nwụrụ, Baịbụl sịrị na ọ “nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ,” ma Eze Devid ma ndị ọzọ ji obi ha niile fee Jehova. (1 Eze 11:5-9, 43; 2 Eze 23:13) Ma, otú a e si kọwaa ọnwụ Solomọn ò gosiri na Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ? Baịbụl ekwughị. Ma ụfọdụ ndị nwere ike ịsị na “onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya.” (Rom 6:7) Ọ bụ eziokwu. Mana, ọ pụtaghị na a ga-akpọlite mmadụ niile nwụrụ anwụ ka à ga-asị na ọnwụ ha nwụrụ mere ka ha ruo eruo ịdị ndụ ọzọ. Ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ bụ onyinye Chineke hụrụ anyị n’anya na-enye. Ọ na-enyekwa ya ndị ọ chọrọ ka ha fee ya ruo mgbe ebighị ebi. (Job 14:13, 14; Jọn 6:44) À ga-enye Solomọn onyinye ahụ? Ọ bụ Jehova ma; anyị amaghị. Mana, ihe anyị ma bụ na Jehova ga-eme ihe ziri ezi.

IHE ANYỊ MA

10. Olee otú ibibi ndị mmadụ na-adị Jehova? (Ezikiel 33:11) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Gụọ Ezikiel 33:11. Jehova gwara anyị otú obi na-adị ya gbasara ikpe ndị mmadụ ikpe. Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwughachi ihe Ezikiel dere banyere Jehova. Ọ sịrị: “O nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie.” (2 Pita 3:9) Ihe a na-akasi anyị obi. Anyị ma na Jehova agaghị ebibi mmadụ, ma ya ikpe na a gaghị akpọlite ya n’ọnwụ, ọ gwụkwala ma è nwere ezigbo ihe kpatara ya. Jehova na-eme ebere nke ukwuu, ọ na-emekwara ndị mmadụ ebere mgbe ọ bụla o kwere omume.

Mgbe a ga-akpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ, a ga-enye ọtụtụ ndị ohere ịmụta gbasara Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Olee ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ, oleekwa otú anyị si mara?

11 Gịnị ka anyị ma gbasara ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ? Baịbụl kwuru naanị ole na ole n’ime ha. b Ihe Jizọs kwuru gosiri na a gaghị akpọlite Judas Iskarịọt. (Mak 14:21; Jọn 17:12) c Judas kpachaara anya megide Jehova Chineke na Ọkpara ya. (Mak 3:29) d Jizọs kwukwara na ụfọdụ ndị isi okpukpe megidere ya ga-anwụ n’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. (Mat. 23:33) Pọl onyeozi kwukwara na ọ bụrụ na ndị si n’ọgbakọ pụọ echegharịghị, a gaghị akpọlite ha n’ọnwụ.​—Hib. 6:4-8; 10:29.

12. Gịnị ka anyị ma gbasara ebere Jehova? Nye ihe atụ.

12 Ma, gịnị ka anyị ma gbasara obi ebere Jehova? Olee otú o si gosi na “o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie”? Chegodị gbasara otú o si meere ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ ebere. Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ, dị ka ịkwa iko na igbu mmadụ. Ma, o chegharịrị, Jehova emeere ya ebere, gbaghara ya. (2 Sam. 12:1-13) Eze Manase mere ọtụtụ ihe ọjọọ ná ndụ ya. N’agbanyeghị ọtụtụ ihe ọjọọ o mere, Jehova meere ya ebere ma gbaghara ya n’ihi na o chegharịrị. (2 Ihe 33:9-16) Akụkọ ndị a na-echetara anyị na Jehova na-emere mmadụ ebere mgbe ọ bụla ọ hụrụ ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Ọ ga-akpọlite ndị dị otú ahụ n’ọnwụ n’ihi na ha ghọtara na ha mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa.

13. (a) Gịnị mere Jehova ji meere ndị Ninive ebere? (b) Olee ihe Jizọs mechara kwuo gbasara ndị Ninive?

13 Anyị makwa otú Jehova si meere ndị Ninive ebere. Chineke gwara Jona, sị: “Anụla m ihe ọjọọ ndị ha na-eme.” Ma, mgbe ha chegharịrị, Jehova gbaghaara ha. Jehova meere ha ebere karịa otú Jona meere ha. Iwe were Jona. N’ihi ya, Chineke chetaara ya na ndị Ninive “amaghịdị ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jona 1:1, 2; 3:10; 4:9-11) Jizọs mechara jiri akụkọ ha kụzie otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi na otú o si eme ebere. Jizọs kwuru na ndị Ninive ahụ chegharịrịnụ “ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe.”​—Mat. 12:41.

14. Olee uru “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” ga-abara ndị Ninive?

14 Olee “n’Ụbọchị Ikpe” ndị Ninive “ga-ebili”? Jizọs kwuru na a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” n’ọdịnihu. (Jọn 5:29 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe ọ na-ekwu gbasara ya bụ mgbe ọ ga-achị otu puku afọ, n’oge a ga-akpọlite “ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ọ ga-abụrụ ndị ajọ omume a kpọlitere n’ọnwụ “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” Ihe ọ pụtara bụ na Jehova na Jizọs ga-eleru àgwà ha anya, chọpụtakwa ma hà na-eme ihe a na-akụziri ha. Ọ bụrụ na onye Ninive a kpọlitere n’ọnwụ ajụ ife Jehova, Jehova agaghị ekwe ka ọ dịrị ndụ na-aga. (Aịza. 65:20) Ma, ndị niile kpebiri iji obi ha niile na-efe Jehova ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—Dan. 12:2.

15. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwu na e nweghị onye ọ bụla a ga-akpọlite n’ọnwụ ná ndị ahụ Jehova bibiri na Sọdọm na Gọmọra? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe e kwuru na Jud 7? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Gịnị Ka Ihe Jud Kwuru Pụtara?”)

15 Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara ndị Sọdọm na Gọmọra, o kwuru na ọ ga-adịrị ha mfe “n’Ụbọchị Ikpe” karịa ndị jụrụ ya na ozi ya. (Mat. 10:14, 15; 11:23, 24; Luk 10:12) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ ihe atụ nke na-egosi na ndị oge ya jọrọ ezigbo njọ karịa ndị Sọdọm na Gọmọra? Cheta na mgbe Jizọs kwuru na ndị Ninive “ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe,” ihe o kwuru abụghị ihe atụ. Kama, o yiri ka Jizọs ọ̀ na-ekwu na ọ bụ ihe ga-eme ndị Sọdọm na Gọmọra. “Ụbọchị Ikpe” o kwuru okwu ya ugboro abụọ ahụ bụ otu. Ndị Sọdọm na Gọmọra mere ihe ọjọọ otú ahụ ndị Ninive mere. Ma, ndị Ninive nwere ohere chegharịa. Chetakwa ihe Jizọs kwuru gbasara “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” Ndị ga-eso ná ndị a ga-akpọlite bụ “ndị mere ihe ọjọọ.” (Jọn 5:29) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ndị Sọdọm na Gọmọra nwetụrụ olileanya. E nwere ike ịkpọlite ụfọdụ n’ime ha n’ọnwụ, anyị enwee ohere ịkụziri ha gbasara Jehova na Jizọs Kraịst.

16. Olee ihe anyị ma gbasara otú Jehova ga-esi ekpebi ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ? (Jeremaya 17:10)

16 Gụọ Jeremaya 17:10. Amaokwu a kwuru ihe anyị ma gbasara otú Jehova si ekpe ikpe. Jehova “na-enyocha obi, na-enyochakwa ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya.” O kpebiwe ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ n’ọdịnihu, ọ ga-akwụ “onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà.” Jehova ga-ebibi ndị mmadụ mgbe o kwesịrị ime otú ahụ ma mee ebere mgbe ọ dabara adaba. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na a gaghị akpọlite mmadụ n’ọnwụ ọ gwụla ma Baịbụl ò kwuru otú ahụ.

“ONYE NA-EKPE ỤWA NIILE IKPE” GA-EME “IHE DỊ MMA”

17. Gịnị ga-eme ndị nwụrụ anwụ?

17 Kemgbe Adam na Iv so Setan nupụrụ Jehova bụ́ Chineke isi, ọtụtụ ijeri mmadụ anwụọla. “Ọnwụ bụ onye iro.” O gbuokwala ọtụtụ ndị. (1 Kọr. 15:26) Gịnị ga-eme ndị ahụ niile? A ga-akpọlite ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ, ha agaa eluigwe bụrụ ndị mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ha niile ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). (Mkpu. 14:1) A ga-akpọlite imirikitiimi ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị hụrụ Jehova n’anya mgbe a “ga-akpọlite ndị ezi omume” n’ọnwụ. Ha ga-ebikwa n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ime ezi omume n’otu puku afọ Kraịst ga-achị nakwa n’oge ule ikpeazụ. (Dan. 12:13; Hib. 12:1) N’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, a ga-enyekwa “ndị ajọ omume” ohere ịgbanwe ndụ ha ma fewe Chineke, ma ndị na-enweghị mgbe ha fere Jehova ma ndị “mere ihe ọjọọ.” (Luk 23:42, 43) Ma, ụfọdụ ndị bụ ndị ajọ omume, ndị kpebisiri ike na ha ga-enupụrụ Jehova isi, na-agbakwa nzube ya ụkwụ. Jehova ekpebiela na ọ gaghị akpọlite ụdị ndị ahụ n’ọnwụ chaa chaa.​—Luk 12:4, 5.

18-19. (a) Olee ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike gbasara ikpe Jehova ga-ekpe ndị nwụrụ anwụ? (Aịzaya 55:8, 9) (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

18 Obi ò kwesịrị isi anyị ike na mgbe ọ bụla Jehova kpere ndị mmadụ ikpe, na ikpe ya na-abụ ikpe ziri ezi? Ee. Ebreham ghọtara nke ọma na Jehova bụ “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe,” onye zuru okè, onye kacha nwee amamihe, nakwa onye na-eme ebere. Ọ zụọla Ọkpara ya ikpe ikpe, nyefeekwa ya ọrụ ikpe mmadụ niile ikpe. (Jọn 5:22) Ma Jizọs ma Nna ya nwere ike ịmata ihe dị onye ọ bụla n’obi. (Mat. 9:4) N’ihi ya, ha kpewe onye nke ọ bụla ikpe, ha ga-eme “ihe dị mma.”

19 Ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova na ihe ndị o kpebiri obi. Anyị ma na anyị erughị eru ikpe ikpe. Ma, Jehova ruru eru ikpe ikpe. (Gụọ Aịzaya 55:8, 9.) N’ihi ya, obi na-esi anyị ike ịhapụrụ ya na Ọkpara ya ikpe niile. Anyị makwa na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ebere ka Nna ya. (Aịza. 11:3, 4) Ma, gịnị ka anyị nwere ike ikwu gbasara ikpe Jehova na Jizọs ga-ekpe ndị mmadụ n’oge oké mkpagbu? Olee ihe ndị anyị na-amaghị? Olee ihe ndị anyị ma? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

b Ị chọọ ịmata ma à ga-akpọlite Adam, Iv, na Ken n’ọnwụ, gụọ Ụlọ Nche Jenụwarị 1, 2013, peeji nke 12, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

c Okwu bụ́ “nwa mbibi” e kwuru na Jọn 17:12 pụtara na Judas nwụọ, nke ya agaala ruo mgbe ebighị ebi, a gaghịkwa akpọlite ya n’ọnwụ.

d Gụọ isiokwu gbara na jw.org bụ́ “Gịnị Bụ Mmehie Na-enweghị Mgbaghara?