ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Nọvemba 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Disemba 26, 2016 ruo Jenụwarị 29, 2017.

Okwu Nke Na-eru Mmadụ n’Obi

Olee ihe Jizọs kpọrọ ụfọdụ ụmụ nwaanyị nke na-abụghị okwu mkparị?

“Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”

Gịnị mere ịgba ume ji dị mkpa? Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jehova, Jizọs, na Pọl si gbaa ndị ọzọ ume? Olee otú ị ga-esi gbaa ndị ọzọ ezigbo ume?

Chineke Haziri Ndị Ya Otú Akwụkwọ Nsọ Kwuru

Otú Jehova si ahazi ihe enweghị atụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ọ ga-ahazi ndị na-efe ya ahazi?

Ì Ji Okwu Chineke Bụ́ Baịbụl Kpọrọ Ihe?

Ime ihe Baịbụl kwuru na ime ihe nzukọ Chineke kwuru na-abara ndị Chineke ezigbo uru.

“Ọrụ A Dị Ukwuu”

I nwere ike ịkwado ya.

Ndị A Kpọpụtara n’Ọchịchịrị

Olee otú ndị Chineke si banye n’ọchịchịrị mgbe ndịozi Jizọs nwụchara? Olee otú ha si jiri nwayọọ nwayọọ na-apụta n’ọchịchịrị? Oleekwa mgbe ọ bụ?

Ha Si n’Okpukpe Ụgha Pụta

Olee mgbe a napụtara ndị Chineke kpamkpam n’aka Babịlọn Ukwu ahụ?

“Ndị Nkwusa Alaeze Nọ́ na Briten​—⁠Tetanụ n’Ụra!!”

E nweghị ezigbo ọganihu n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na Briten ruo afọ iri! Gịnị mere egwú ji dagharịa?