Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Nke Na-eru Mmadụ n’Obi

Okwu Nke Na-eru Mmadụ n’Obi

E NWERE ụfọdụ ụmụ nwaanyị Jizọs kpọrọ “nwaanyị” mgbe ọ chọrọ ịgwa ha okwu. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-agwọ otu nwaanyị huuru ehuru kemgbe afọ iri na asatọ, ọ sịrị ya: “Nwaanyị, a tọhapụwo gị n’adịghị ike gị.” (Luk 13:10-13) Ọ bụdị ihe Jizọs kpọrọ nne ya mgbe ọ na-agwa ya okwu. N’oge ochie, a naghị ewere ya ka mkparị. (Jọn 19:26; 20:13) Ma, e nwere okwu ọzọ a na-anaghị ewere ka okwu mkparị.

E nwere ihe kacha eru n’obi a kpọrọ ụfọdụ ụmụ nwaanyị na Baịbụl. Ọ bụ ihe ahụ ka Jizọs kpọrọ otu nwaanyị rịara oruru ọbara afọ iri na abụọ. Iwu Chineke kwuru na onye na-arịa ụdị ọrịa ahụ adịghị ọcha. Otú nwaanyị ahụ si bịakwute Jizọs gosiri na ọ dara iwu ahụ. Mmadụ nwere ike ikwu na o kwesịrị ịnọpụ iche n’ihi ọrịa ya. (Lev. 15:19-27) Ma, ọ chọsiri ike ka ọrịa ya laa. N’eziokwu, ‘ọ taala ahụhụ nke ukwuu n’aka ọtụtụ ndị ọgwọ ọrịa, mefuokwa ihe niile o nwere, ma o nwebeghị nke baara ya uru, kama nke ahụ, ọ kara njọ.’—Mak 5:25, 26.

Nwaanyị ahụ heere ehere sí n’etiti ìgwè mmadụ ahụ gawa ebe Jizọs nọ, sí n’azụ metụ ọnụ ọnụ uwe elu Jizọs aka. Ọrịa ya lara ozugbo. O chere na Jizọs agaghị amata, ma Jizọs jụrụ, sị: “Ònye bitụrụ m aka?” (Luk 8:45-47) Ụjọ bịara nwaanyị ahụ, ya amara jijiji daa n’ala n’ụkwụ Jizọs, “gwa ya eziokwu niile.”—Mak 5:33.

Iji mee ka obi ruo nwaanyị ahụ ala, Jizọs weturu obi sị ya: “Nwee obi ike, nwa m nwaanyị.” (Mat. 9:22) Ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na n’asụsụ Hibru na Grik, mmadụ nwere ike ịkpọ nwaanyị “nwa m nwaanyị” iji gosi na o nweere ya “obiọma.” Jizọs kwukwara ihe ọzọ mere ka obi sikwuo nwaanyị ahụ ike. Ọ sịrị ya: “Okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”—Mak 5:34.

Otu nwoke Izrel bara ọgaranya aha ya bụ Boaz kpọrọ Rut, bụ́ nwaanyị Moab, “nwa m.” Obi ekwesịghị iru Rut ala n’ihi na ọ nọ na-atụtụkọrọ ọka bali e wefọrọ n’ubi otu nwoke ọ na-amaghị. Boaz sịrị ya, “Nwa m, ọ̀ kwa ị nụla?” Ọ gwaziri Rut ka ọ tụtụrụwa ọka e wefọrọ n’ubi ya. Rut dara n’ala n’ihu Boaz, jụọ ya ihe mere o ji na-emere yanwa bụ́ onye mbịarambịa ụdị ihe ọma ahụ. Boaz gwakwara ya ihe mere ka obi sie ya ike. Ọ sịrị Rut: “A kọworo m ihe niile i meere nne di gị [bụ́ Neomi nwaanyị di ya nwụrụ] . . . Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ dị ka omume gị si dị.”—Rut 2:8-12.

Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịna-eme otú ahụ Jizọs na Boaz mere. Mgbe ụfọdụ, ndị okenye abụọ nwere ike ịga leta nwanna nwaanyị e kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ nyere aka ma gbaa ume. Ha kpechaa ekpere rịọ Jehova ka o duzie ha, geekwa nwanna nwaanyị ahụ ntị nke ọma, ha ga-enwe ike iji Okwu Chineke mesie ya obi ike, gbaakwa ya ume.—Rom 15:4.