ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Nọvemba 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Disemba 25, 2017 ruo Jenụwarị 28, 2018.

Jirinụ Ọṅụ Na-abụku Jehova Abụ

Ọ bụrụ na ọ na-eme gị ihere iso ọgbakọ na-abụ abụ, olee ihe i nwere ike ime ka i jiri olu gị na-eto Jehova?

Ị̀ Gbabala n’Ime Jehova?

Ndokwa ndị e mere maka obodo mgbaba n’Izrel oge ochie na-akụziri anyị banyere otú Jehova si agbaghara anyị mmehie.

Na-eṅomi Jehova n’Ikpe Ikpe Ziri Ezi na n’Ime Ebere

Olee otú obodo mgbaba si gosi na Jehova na-eme ebere? Olee ihe ha na-akụziri anyị gbasara otú Chineke si ele ndụ anya? Olee otú ha si gosi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi?

Chineke “Ga-agọzi” Onye Na-emesapụ Aka

Anyị nwere ike iji oge anyị, ike anyị nakwa ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi.

Echela Echiche Ka Ndị Ụwa

Anyị niile ga-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. Tụlee ihe ise gosiri otú ndị ụwa si eche echiche.

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ

Mgbe Pọl onyeozi gwachara ụmụnna ya banyere olileanya ahụ magburu onwe ya ha nwere, ọ gwara ha okwu ụfọdụ iji dọọ ha aka ná ntị.

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Gị Mara Gị Ahụ́?

Ị gafee n’ọgbakọ ọhụrụ, ụjọ nwere ike na-atụ gị. Olee ihe ga-enyere gị aka ka ọ mara gị ahụ́?