Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

Ị̀ Ga-anọgide Na-ekwe Ka A Na-agbazi Gị?

Ị̀ Ga-anọgide Na-ekwe Ka A Na-agbazi Gị?

“N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nọgidenụ bụrụ ndị a na-agbazi.”—2 KỌR. 13:11.

ABỤ NKE 54 Lekwa Ụzọ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka e kwuru na Matiu 7:13, 14, olee otú o si bụrụ na anyị nọ n’ụzọ na-eme njem?

E NWERE ike ikwu na anyị niile nọ n’ụzọ na-eme njem. Ebe anyị na-aga bụ ụwa ọhụrụ, ebe Jehova ga-eji ịhụnanya na-achị anyị. Kwa ụbọchị, anyị na-agbalị aga n’ụzọ a na-eduba ná ndụ. Ma dị ka Jizọs kwuru, ụzọ a dị mkpagide, na-esikwa ike ọgịga mgbe ụfọdụ. (Gụọ Matiu 7:13, 14.) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịhapụ ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ tinye isi ebe ọzọ.—Gal. 6:1.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a? (Gụọkwa igbe bụ́ “ Ịdị Umeala n’Obi Na-enyere Anyị Aka Ime Mgbanwe.”)

2 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ, anyị ga-adị njikere ịna-agbanwe otú anyị si eche echiche, otú anyị si akpa àgwà, na ihe ndị anyị na-eme. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ume ka ha nọgide “bụrụ ndị a na-agbazi.” (2 Kọr. 13:11) Ihe ahụ Pọl kwuru gbasakwara anyịnwa taa. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ime mgbanwe, nakwa otú ndị enyi anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst nwere ike isi nyere anyị aka ịnọgide na-eje ije n’ụzọ nke ndụ. Anyị ga-atụlekwa mgbe ụfọdụ o nwere ike isiri anyị ike ịnabata ihe nzukọ Jehova kwuru ka e mee. Ma, anyị ga-atụle otú ịdị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ịna-eme mgbanwe ma nọgide na-enwe ọṅụ ka anyị na-efe Jehova.

KWE KA OKWU CHINEKE NA-AGBAZI GỊ

3. Gịnị ka Okwu Chineke nwere ike imere gị?

3 Ọ ga-esiri anyị ike iji aka anyị achọpụta ihe anyị na-eche na otú obi na-adị anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi anyị dị aghụghọ. N’ihi ya, o nwere ike isiri anyị ike ịma ebe obi anyị du anyị na-aga. (Jere. 17:9) O nwere ike ịdịrị anyị mfe iji “echiche ụgha” ghọgbuo onwe anyị. (Jems 1:22) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji Okwu Chineke na-enyocha onwe anyị. Okwu Chineke nwere ike ime ka anyị mata ụdị ndị anyị bụ, ya bụ, ‘echiche anyị na ihe anyị bu n’obi.’ (Hib. 4:12, 13) E nwere ike ikwu na Okwu Chineke dị ka ígwè e ji enyocha ime ahụ́. O nwere ike ime ka anyị mata otú anyị dị n’ime. Ma, anyị ga-adịrịrị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndụmọdụ Baịbụl ma ọ bụ ndụmọdụ Chineke si n’aka ndị o ji akụziri anyị ihe na-enye anyị baara anyị uru.

4. Olee ihe gosiri na Eze Sọl bịara dị mpako?

4 Ihe mere Eze Sọl gosiri ihe nwere ike ime anyị ma anyị kwụsị ịdị umeala n’obi. Sọl bịara dị mpako nke na o kwetaghị na o kwesịrị ịgbanwe echiche ya na ihe ndị ọ na-eme. (Ọma 36:1, 2; Hab. 2:4) Ihe Sọl mere mgbe Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme ma o bibichaa ndị Amalek mere ka o doo anya na Sọl dị mpako. Sọl emeghị ihe Jehova gwara ya mee. Mgbe Samuel onye amụma gwakwara ya banyere ihe ahụ o mejọrọ, o kwetaghị na o mejọrọ ihe. Kama nke ahụ, ọ gbalịrị ịgọrọ isi onwe ya, na-ekwu na ihe o mere adịghị njọ nke otú ahụ nakwa na ọ bụ ndị ọzọ kpatara ya. (1 Sam. 15:13-24) E nweekwala oge mbụ Sọl kpara ụdị àgwà a. (1 Sam. 13:10-14) Ọ dị mwute na Sọl bịara dị mpako. Ọ gbanweghị otú o si eche echiche. N’ihi ya, Jehova dọrọ ya aka ná ntị ma jụ ya.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Sọl?

5 Ọ bụrụ na anyị achọghị ịdị ka Sọl, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Ọ bụrụ na mụ agụta ihe m kwesịrị ime n’Okwu Chineke, m̀ na-achọ ihe m ga-ekonye aka ghara ime ya? M̀ na-eche na ihe m na-eme adịchaghị njọ? M̀ na-ata ndị ọzọ ụta maka ihe mụnwa mejọrọ?’ Ọ bụrụ na e nwere ajụjụ nke anyị zara ee na ya, ọ pụtara na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà. Ma anyị emeghị ya, mpako nwere ike iri anyị isi, nke nwere ike ime ka Jehova jụ anyị, anyị agaghịzi abụ ndị enyi ya.—Jems 4:6.

6. Kọwaa ihe dị iche n’etiti Eze Sọl na Eze Devid.

6 E nwere ihe dị iche n’etiti Eze Sọl na eze ọzọ nọchiri ya, bụ́ Eze Devid. Devid bụ nwoke hụrụ “iwu Jehova” n’anya. (Ọma 1:1-3) Devid ma na Jehova na-azọpụta ndị dị umeala n’obi, nakwa na ọ na-ele ndị dị mpako anya ọjọọ. (2 Sam. 22:28) N’ihi ya, Devid kwere ka iwu Chineke gbazie echiche ya. O dere, sị: “M ga-agọzi Jehova, bụ́ onye nyeworo m ndụmọdụ. N’ezie, akụrụ m agbaziwo m n’abalị.”—Ọma 16:7.

OKWU CHINEKE

Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị mgbe ọ bụla anyị kpafuwara. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ekwe ka Okwu Chineke gbazie echiche na-ezighị ezi anyị nwere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, gịnị ka anyị ga-eme?

7 Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, anyị ga-ekwe ka Okwu Chineke gbazie echiche na-adịghị mma anyị nwere tupu anyị emee ya emee. Okwu Chineke ga-adị ka olu na-agwa anyị okwu, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” Ọ ga-adọkwa anyị aka ná ntị ma anyị chọwa ịhapụ ụzọ nke ndụ tinye isi n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. (Aịza. 30:21) Anyị gee Jehova ntị, ọ ga-abara anyị ọtụtụ uru. (Aịza. 48:17) Dị ka ihe atụ, anyị ga-esi otú ahụ zere ihere ndị ọzọ ga-emenye anyị ma ha gwawa anyị ihe anyị na-emetaghị. Ọ ga-emekwa ka anyị bịarukwuo Jehova nso n’ihi na anyị ma na o weere anyị ka ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.—Hib. 12:7.

8. Dị ka e kwuru na Jems 1:22-25, olee otú anyị nwere ike isi jiri Okwu Chineke mere enyo?

8 Anyị nwere ike iji Okwu Chineke mere enyo. (Gụọ Jems 1:22-25.) Ọtụtụ n’ime anyị na-ele enyo tupu anyị esi n’ụlọ anyị pụọ n’ụtụtụ ọ bụla. Ihe mere anyị ji eme ya bụ ka anyị mara ma è nwere ihe na-adịghị mma n’ahụ́ anyị anyị kwesịrị idozi tupu ndị ọzọ ahụ ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ọ ga-enyere anyị aka ịhụ ebe ndị anyị kwesịrị imezi ihe n’otú anyị si eche echiche nakwa n’akparamagwa anyị. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ bara uru ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ ọ bụla tupu ha apụwa. Ha na-ekwe ka ihe ha gụrụ duzie echiche ha. Ha na-agbalịkwa achọ otú ha ga-esi eme ihe ha mụtara n’Okwu Chineke n’ụbọchị ahụ niile. E wezụga ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, anyị kwesịkwara ịna-ewepụta oge kwa ụbọchị na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara. Ihe a nwere ike ịdị ka o nweghị oké ihe ọ bụ, ma o so n’ihe ndị kacha mkpa anyị ga-eme iji nọgide na-aga n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.

NA-EGE NDỊ ENYI BỤ́ EZIGBO NDỊ KRAỊST NTỊ

NDỊ ENYI ANYỊ BỤ́ EZIGBO NDỊ KRAỊST

Enyi anyị bụ́ ezigbo Onye Kraịst nwere ike imeda obi dọọ anyị aka ná ntị. Obi ọ̀ na-adị anyị ụtọ na enyi anyị katara obi dọọ anyị aka ná ntị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee mgbe enyi gị nwere ike ịgbazi gị?

9 Ò nwetụla mgbe i bidoro ịga n’ụzọ ga-eduru gị pụọ n’ebe Jehova nọ? (Ọma 73:2, 3) Ọ bụrụ na enyi gị bụ́ ezigbo Onye Kraịst katara obi bịa gwa gị ebe ị na-anaghị emeta, ì gere ya ntị ma mee ihe ahụ ọ gwara gị? Ọ bụrụ na i mere otú ahụ, i mere nke ọma. O dokwara anya na obi dị gị ezigbo ụtọ na enyi gị gbaziri gị.—Ilu 1:5.

10. Gịnị ka ị ga-eme ma enyi gị gwa gị na o nwere ihe i mejọrọ?

10 Okwu Chineke gwara anyị, sị: “Ọnyá onye hụrụ mmadụ n’anya mepụrụ ya si n’ezi obi.” (Ilu 27:6) Olee otú ihe a si bụrụ eziokwu? Ka anyị tụlegodị ihe atụ a: Ka e were ya na ị chọrọ ịgafe otu okporo ụzọ awara awara. Ma, ekwentị ị na-apị emee ka i chefuo onwe gị. Ị maghịzi mgbe i ji chọọ ịgafe okporo ụzọ ahụ n’eleghị anya. Enyi gị elepụ anya hụ gị ma dọghachite gị azụ ozugbo. Ma, ka ọ na-adọghachite gị azụ, ya emerụọ gị ahụ́ n’aka. Ma, ihe ahụ o mere mere ka ụgbọala na-abịanụ ghara ịkụtu gị. Ọ bụrụgodị na ahụ́ ahụ o merụrụ gị nọrọ ọtụtụ ụbọchị tupu ya alaa, ị̀ ga-ewewe iwe na enyi gị dọghachiri gị azụ? Ị gaghị eme otú ahụ. Kama, ị ga-ekele ya na ọ zọrọ gị ndụ. Ọ bụrụ na enyi gị agwa gị na ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere megidere iwu Chineke, o nwere ike iwute gị ná mmalite. Ma, ajụla ndụmọdụ ahụ ọ na-enye gị ma ọ bụ buwere ya iwe n’obi. Ndị na-eme otú ahụ bụ ndị nzuzu. (Ekli. 7:9) Kama ime otú ahụ, obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ na enyi gị katara obi bịa gwa gị gbasara ihe ahụ.

11. Gịnị nwere ike ime ka mmadụ jụ ndụmọdụ ezigbo enyi ya nyere ya?

11 Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ jụ ndụmọdụ ezigbo enyi ya nyere ya? Ọ bụ mpako. Ndị mpako na-achọ ịnụ “ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị.” Ha ‘na-ewepụkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu.’ (2 Tim. 4:3, 4) Ha anaghị ekwe ka e nye ha ndụmọdụ n’ihi na ha na-eche na ha ka ndị ọzọ mara ihe. Ma, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.” (Gal. 6:3) Eze Sọlọmọn chịkọtara okwu a nke ọma. O dere, sị: “Nwata nke maara ihe ma bụrụ ogbenye dị mma karịa eze meworo agadi nke dị iberiibe, bụ́ onye na-amaghị na ịdọ aka ná ntị ka dị ya mkpa.”—Ekli. 4:13.

12. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 2:11-14, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pita onyeozi?

12 Legodị ihe dị mma Pita mere mgbe Pọl gbaziri ya n’ihu ọha. (Gụọ Ndị Galeshia 2:11-14.) A sị na Pita chọrọ, ọ gaara ewewe iwe maka otú Pọl si gbazie ya nakwa n’ihi na ọ nọ n’ihu ọha gbazie ya. Ma, Pita maara ihe. N’ihi ya, ọ nabatara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ya, o bughịkwaara Pọl iwe n’obi. O mechadịrị kpọọ Pọl “nwanna anyị a hụrụ n’anya.”—2 Pita 3:15.

13. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị chọọ inye mmadụ ndụmọdụ?

13 Ọ bụrụ na i chere na ọ dị mkpa ka i nye enyi gị ndụmọdụ, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche? Tupu gị agakwuru ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Àbụ m “onye ezi omume gabiga ókè”?’ (Ekli. 7:16) Onye bụ́ onye ezi omume gabiga ókè anaghị eji iwu Jehova ekpe mmadụ ikpe, kama ọ na-eji ihe o chere ekpe mmadụ ikpe. Ọ naghịkwa emere mmadụ ebere. I nyochaa onwe gị nke ọma ma chọpụta na ọ dị mkpa ka ị gwa enyi gị okwu, gwa ya ihe ahụ o mejọrọ hoo haa ma jụọ ya ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịghọta ihe ahụ o mejọrọ. Jide n’aka na ihe ị na-agwa ya gbakwasịrị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ. Na-echetakwa na ọ bụghị gịnwa ka enyi gị ga-aza ajụjụ, kama ọ bụ Jehova. (Rom 14:10) Jiri ihe dị n’Okwu Chineke nyere ya aka. I nyewe mmadụ ndụmọdụ, ṅomie ọmịiko Jizọs. (Ilu 3:5; Mat. 12:20) Gịnị mere ihe a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ otú anyị si mesoo ndị ọzọ ihe ka Jehova ga-esikwa emeso anyị ihe.—Jems 2:13.

NABATA IHE Ọ BỤLA NZUKỌ CHINEKE SỊ KA E MEE

NZUKỌ CHINEKE

Nzukọ Chineke na-ewepụtara anyị akwụkwọ na vidio dị iche iche, na-ahazikwa nnọkọ ndị na-enyere anyị aka ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Mgbe ụfọdụ, Òtù Na-achị Isi na-agbanwetụ ihe n’otú ihe si aga ná nzukọ Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka nzukọ Jehova na-emere anyị?

14 Jehova si n’aka nzukọ ya na-edu anyị n’ụzọ nke ndụ. Nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị vidio na akwụkwọ dị iche iche, na-ahazikwa nnọkọ ndị na-enyere anyị aka ime ihe dị n’Okwu Chineke. E si na Baịbụl nweta ihe e ji kwadebe ihe ndị a niile. Òtù Na-achị Isi chọwa ikpebi otú kacha mma a ga-esi na-ekwusa ozi ọma, ha na-ekwe ka mmụọ nsọ Chineke duzie ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Òtù Na-achị Isi na-emekwa ha gụrụ gụrụ, ha elebagharịa anya n’ihe ndị ha kpebiri gbasara otú ihe si aga ná nzukọ Jehova. Gịnị mere ha ji eme ihe a? Ọ bụ n’ihi na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” Nzukọ Chineke na-agbanwekwa ihe ụfọdụ ka ọ daba n’otú ihe si kwụrụ.—1 Kọr. 7:31.

15. Olee ihe nwere ike isiri ụfọdụ ndị nkwusa ike?

15 O doro anya na anyị na-anabata ihe ọ bụla nzukọ Chineke ji Baịbụl gwa anyị gbasara ihe anyị kweere ma ọ bụkwanụ gbasara otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ma, gịnịkwanụ ka anyị na-eme ma nzukọ Chineke gwa anyị ihe nwere ike ịgbanwe ihe ndị ọzọ ná ndụ anyị? Dị ka ihe atụ, na nso nso a, ego a na-emefu iji rụọ ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova nakwa nke a na-emefu iji na-elekọta ha na-arị elu n’ike n’ike. Ọ bụ ya mere Òtù Na-achị Isi ji kwuo ka ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze amụ ihe. Ihe a emeela ka e kpokọta ọtụtụ ọgbakọ, reekwa ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. E jizi ego ndị e nwetara na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ndị ha dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na e rere Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ kpokọta ọgbakọ unu na ọgbakọ ọzọ, o nwere ike isitụrụ gị ike ịnabata ya. Ụfọdụ ndị nkwusa na-agazi ọmụmụ ihe n’ebe dịtụ anya. Ndị so rụsie ọrụ ike n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ilekọta ya nwere ike ịna-eche ihe mere e ji ree Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ha nwere ike ịna-eche na ha akwọọla aka tiere ọkụkọ akị. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ha na-akwado mgbanwe ndị a e mere, e kwesịkwara ịja ha mma maka ya.

16. Olee otú ime ihe e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:23, 24 ga-esi nyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ?

16 Obi ga na-atọ anyị ụtọ ma anyị cheta na ọ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ọrụ nakwa na ọ bụ ya na-eduzi nzukọ ya. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:23, 24.) Eze Devid mere ihe magburu onwe ya mgbe o nyere ego a ga-eji rụọ ụlọ nsọ. Ọ sịrị: “Ònye ka m bụ, ole ndị ka ndị m bụkwa, nke na anyị nwere ike inye onyinye afọ ofufo dị otú a? N’ihi na ihe niile si n’aka gị, ọ bụkwa n’aka gị ka anyị nwetara ihe anyị nyere gị.” (1 Ihe 29:14) Mgbe anyịnwa na-enyekwa onyinye, ihe anyị na-enye Jehova bụ ihe o nyere anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-enwe obi ụtọ na anyị ji oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere na-enye onyinye iji na-akwado ọrụ ya.—2 Kọr. 9:7.

NỌGIDE NA-EJE IJE N’ỤZỌ AHỤ DỊ MKPAGIDE

17. Gịnị mere obi ekwesịghị ịda anyị mbà ma ọ bụrụ na e nwere ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe?

17 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-eje ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ, anyị kwesịrị isochi nzọụkwụ Jizọs anya. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ dị mkpa ka i mee mgbanwe, obi adala gị mbà. O nwedịrị ike ịbụ ihe na-egosi na ị chọrọ ịna-eso nduzi Jehova. Cheta na Jehova anaghị atụ anya ka anyị, bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, na-emetacha ihe niile ka Jizọs.

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgaru ebe anyị na-aga?

18 Ka anyị niile lekwasị anya n’ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu ma dịrị njikere ịgbanwe otú anyị si eche echiche, otú anyị si akpa àgwà, na ihe ndị anyị na-eme. (Ilu 4:25; Luk 9:62) Ka anyị nọgide na-adị umeala n’obi, ‘na-aṅụrị ọṅụ ma nọgide bụrụ ndị a na-agbazi.’ (2 Kọr. 13:11) Anyị mee otú ahụ, “Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyere [anyị].” Anyị ga-agaru ebe anyị na-aga, jirikwa obi ụtọ garuo ya.

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

^ par. 5 O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche, otú anyị si akpa àgwà, ma ọ bụ ihe ndị anyị na-eme. Isiokwu a ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme mgbanwe ná ndụ anyị, nakwa otú anyị ga-esi jiri ọṅụ na-eme mgbanwe ndị ahụ.

^ par. 76 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwoke bụ́ okorobịa na-akọrọ nwanna nwoke ọzọ katarala ahụ́ ihe mere ya mgbe o mechara mkpebi na-adịghị mma, nwanna nwoke ahụ katarala ahụ́ (nke nọ n’aka nri) ana-ege ya ntị ka ọ mara ma è nwere ndụmọdụ ọ ga-enye ya.