Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

“Jehova Echefughị M”

“Jehova Echefughị M”

EBI M n’otu obere ime obodo a na-akpọ Oreala. Ọ dị n’ebe a na-akpọ Gayana. Ndị bi na ya dị ihe dị ka puku mmadụ abụọ. Obodo a dịpụrụ adịpụ. Naanị ihe mmadụ nwere ike iji ruo ya bụ obere ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọ mmiri.

A mụrụ m n’afọ 1983. Ahụ́ siri m ike mgbe m na-etolite. Ma, mgbe m dị afọ iri, ahụ́ niile malitere na-egbu m mgbu. Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, mgbe m tetara ụra n’otu isi ụtụtụ, enweghịzi m ike ịga ije. M gbalịsiri ike imegharị ụkwụ m. Ma, enwelighị m ike imegharị ya. Kemgbe ụbọchị ahụ ruo taa, agabeghị m ije ọzọ. Ọrịa a mekwara ka m kwụsị ito eto. Ruo taa, m ka hàkwa ka obere nwa.

Ọrịa a mere ka m gharazie ịna-apụ apụ. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. Ọ na-abụ ndị ọbịa bịa na nke anyị, mụ agaa zoo. Ma, ụbọchị ahụ Ndịàmà Jehova bịara, m hapụrụ ha ka ha gwa m okwu. Ha gwara m gbasara Paradaịs. Anụbuola m banyere Paradaịs a mgbe m dị ihe dị ka afọ ise. N’oge ahụ, otu onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Jethro bi na Surinama. Ọ na-abịakwa n’obodo anyị amụrụ papa m Baịbụl otu ugboro n’ọnwa ọ bụla. Jethro ji obiọma mesoo m ihe. Mụ na ya bịakwara bụrụ ezigbo enyi. Nna nna m na nne nne m na-akpọkwa m aga ọmụmụ ihe ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-enwe n’obodo anyị mgbe ahụ. Mgbe Florence, bụ́ otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị bịara ozi ọma na nke anyị ụbọchị ahụ, jụrụ m ma m̀ ga-enwe mmasị ịmụ Baịbụl, m sịrị ya ee.

Florence na di ya so bịa na nke anyị ụbọchị ọzọ, ha malitekwara ịmụrụ m Baịbụl. Mgbe ha chọpụtara na mụ amaghị otú e si agụ ihe, ha kụziiri m otú e si agụ ihe. Mgbe obere oge gachara, amụtara m ịgụ ihe. Otu ụbọchị, di na nwunye ahụ gwara m na e zigala ha ka ha gaa kwusawa ozi ọma na Surinama. N’ihi ya, o nweghịzi onye nọ n’Oreala ga na-amụrụ m Baịbụl. Ma, obi dị m ụtọ na Jehova echefughị m.

Mgbe obere oge gachara, otu onye ọsụ ụzọ aha ya bụ Floyd bịara Oreala. Ka ọ nọ na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, o rutere na nke anyị. Mgbe ọ gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl, m mụmụrụ ọnụ ọchị. Ọ jụrụ m, sị: “Gịnị na-atọ gị ọchị?” M gwara ya na amụọla m broshọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? nakwa na ebidola m ịmụ akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * M kọwaara ya ihe mere ọmụmụ ihe ahụ ji kwụsị. Floyd mụchapụụrụ m akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ. N’oge na-adịghị anya, e zipụkwara yanwa ka ọ gaa kwusawa ozi ọma ebe ọzọ. Ugbu a kwa, o nweghịzi onye ga na-amụrụ m Baịbụl.

Ma n’afọ 2004, e zitere Granville na Joshua, bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ka ha bịa jewe ozi n’Oreala. Ka ha nọkwa na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, ha rutere na nke anyị. Mgbe ha gwara m ka ha mụwara m Baịbụl, m mụmụrụ ọnụ ọchị. M gwara ha ka ha si n’isi mụọrọ m akwụkwọ Ihe Ọmụma ruo ná ngwụcha. M chọrọ ịma ma ihe ha ga-akụziri m ọ̀ ga-adị iche n’ihe ndị mbụ mụụrụ m ihe kụziiri m. Granville gwara m na e nwere ebe ha na-amụ ihe n’obodo anyị. Ọ bụ eziokwu na esibeghị m n’ụlọ anyị pụọ apụ kemgbe ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ afọ iri, mana achọrọ m ịga ọmụmụ ihe ha. Granville bịara jiri ígwè ndị ngwọrọ kwara m gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

Mgbe obere oge gachara, Granville gwara m ka m debanye aha m n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ gwara m, sị: “Ị naghị aga ije. Mana, ị na-ekwuli okwu. Otu ụbọchị, ị ga-ekwu okwu ihu ọha. Ọ ga-eme.” Ihe a ọ gwara m mere ka m nwee obi ike.

M malitere iso Granville na-aga ozi ọma. Ma, ọtụtụ ụzọ dị n’obodo anyị adịghị mma. Ọ na-esi ike iji ígwè ndị ngwọrọ aga na ya. N’ihi ya, agwara m Granville ka o jirizie wilbaro na-akwa m. Nke a ka mma. N’ọnwa Eprel afọ 2005, m mere baptizim. Mgbe obere oge gachara, a zụrụ m ka m na-ahụ maka akwụkwọ na ígwè okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị.

Ma, ihe dị mwute mere n’afọ 2007. Papa m nwụrụ n’ihe mberede ụgbọ mmiri. Ihe a mere ka ezinụlọ anyị nọrọ n’iru uju. Granville kpeere anyị ekpere ma jiri amaokwu Baịbụl dị iche iche kasie anyị obi. Mgbe afọ abụọ gachara, ihe ọzọ dị mwute mere. Granville nwụkwara n’ihe mberede ụgbọ mmiri.

Obere ọgbakọ anyị nọ na-eru uju. Anyị enweghịzi okenye ọ bụla. Naanị ihe anyị nwere bụ otu ohu na-eje ozi. Ọnwụ Granville nyere m ezigbo nsogbu. Mụ na ya bụ ezigbo enyi. O ji obi ya niile gbooro m mkpa m, nyekwara m aka n’ọgbakọ. N’ọmụmụ ihe ọzọ anyị gara mgbe ọ nwụchara, ọ bụ mụnwa nwe ịgụpụta Ụlọ Nche ụbọchị ahụ. M jisiri ike gụọ paragraf nke mbụ na nke abụọ. Ma, ebidoro m bewe ákwá. Anya mmiri ekweghịzi m gụrụ gawa. Akwụsịrị m ịgụ ihe ahụ ma si n’elu ikpo okwu rịtuo.

Obi bịara dịtụwa m mma mgbe ụmụnna ụfọdụ si ọgbakọ ọzọ bịara Oreala ka ha nyere anyị aka. Alaka ụlọ ọrụ zitekwaara anyị Nwanna Kojo bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Obi tọrọ m ụtọ mgbe mama m na nwanne m nwoke nke obere malitere ịmụ Baịbụl, mechaakwa mee baptizim. N’ọnwa Mach 2015, a họpụtara m ka m bụrụ ohu na-eje ozi. Obere oge a họpụtachara m, m kwuru okwu ihu ọha mbụ m. Ụbọchị ahụ, m ji obi ụtọ mụmụọ ọnụ ọchị ma cheta ihe ahụ Nwanna Granville gwara m ọtụtụ afọ gara aga: “Otu ụbọchị, ị ga-ekwu okwu ihu ọha. Ọ ga-eme.”

Ka m na-ele ihe omume tiivi anyị, achọpụtara m na e nwekwara Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọkwa n’ụdị ọnọdụ a m nọ na ya. Ma, n’agbanyeghị na ha nwere nkwarụ, ha ji ndụ ha na-eme ihe bara uru, na-enwekwa obi ụtọ. E nwere ihe ụfọdụ m ka ga-emeli. M chọrọ imere Jehova ihe niile m nwere ike imere ya. Ọọ ya mere m ji malite ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. O nwere ozi m na-atụghị anya ya m nwetara n’ọnwa Septemba afọ 2019. N’ọnwa ahụ ka a họpụtara m ka m bụrụ okenye n’ọgbakọ anyị nke nwere ndị nkwusa iri anọ.

Obi dị m ụtọ maka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị mụụrụ m ihe ma nyere m aka ịna-eme nke ọma n’ozi Jehova. Ma karịchaa, obi dị m ụtọ na Jehova echefughị m.

^ par. 8 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ma a naghịzi ebipụta ya.