Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48

‘Legide Anya n’Ihu’

‘Legide Anya n’Ihu’

“Anya gị abụọ kwesịrị ilegide n’ihu, ee, anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.”—ILU 4:25.

Abụ nke 77 Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru n’Ilu 4:25? Nye ihe atụ.

CHEGODỊ banyere ihe atụ ndị a. Otu nwanna nwaanyị merela agadi na-echeta ihe ọma ndị meere ya n’oge gara aga. N’agbanyeghị na ọ na-enwe ọtụtụ nsogbu ugbu a, ọ ka na-emekwa ike ya niile n’ozi Jehova. (1 Kọr. 15:58) Ụbọchị niile, ọ na-ewere ya na ọ na-ahụ onwe ya ebe ya na ndị ọ hụrụ n’anya nọ n’ụwa ọhụrụ. Nwanna nwaanyị ọzọ na-echeta ihe na-adịghị mma nwanna ibe ya mere ya. Mana, o kpebiri na ya agaghị eburu nwanna ahụ iwe n’obi. (Kọl. 3:13) Otu nwanna nwoke na-echeta ihe ọjọọ ndị o mere n’oge gara aga. Ma, o lekwasịziri anya n’ime ihe dị Jehova mma malite ugbu a gawa.—Ọma 51:10.

2 Olee otú akụkọ Ndị Kraịst atọ a si yie ibe ha? Ha niile na-echeta ihe ndị mere ná ndụ ha n’oge gara aga. Mana, ha anaghị etinye uche ha na ya, kama nke ahụ, ha legidere anya n’ihu.—Gụọ Ilu 4:25.

3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji ‘legide anya n’ihu’?

3 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ‘na-elegide anya n’ihu’? Ọ bụrụ na mmadụ ana-aga ije na-ele anya n’azụ, onye ahụ agaghị na-aga n’ihu n’ihu otú dị mma. Otú ahụkwa ka anyị na-agaghị na-aga n’ihu n’ozi Jehova ma ọ bụrụ na anyị etinye uche anyị n’ihe ndị mere ná ndụ anyị n’oge gara aga.—Luk 9:62.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ nwere ike ime ka anyị na-etinyekarị uche n’ihe ndị mere ná ndụ anyị n’oge gara aga. Ha bụ: (1) ịchọ ka ihe dịrị anyị otú ọ dịịrị anyị na mbụ, (2) Ibu iwe n’obi, na (3) ikwe ka obi anyị nọgide na-ama anyị ikpe. Na nke ọ bụla, anyị ga-atụle ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịnọgide na-eche banyere “ihe ndị dị n’azụ,” kama, ka anyị na-amatị onwe anyị inweta “ihe ndị dị n’ihu.”—Fil. 3:13.

MMADỤ ỊCHỌ KA IHE DỊRỊ YA OTÚ Ọ DỊỊRỊ YA NA MBỤ

Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike ilegide anya n’ihu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5, nke 9, na nke 13) *

5. Olee nsogbu Ekliziastis 7:10 dọrọ anyị aka ná ntị maka ya?

5 Gụọ Ekliziastis 7:10. Ị̀ chọpụtara na amaokwu a asịghị na ọ dị njọ ịjụ, sị: “Gịnị mere oge gara aga ji dị mma?” Ikike anyị nwere icheta ihe ndị dị mma mere n’oge gara aga bụ onyinye si n’aka Jehova. Mana, amaokwu a kwuru, sị: “Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’” N’ihi ya, ebe nsogbu dị bụ iji otú ihe si dịrị anyị n’oge gara aga na-atụnyere otú ihe si dịrị anyị ugbu a ma kpebie na otú ihe si dịrị anyị ugbu a ka njọ. Lee otú e si dee amaokwu a ná nsụgharị Baịbụl ọzọ. Ọ sịrị: “Asịla na ihe dị mma n’oge gara aga karịa oge ị nọ n’ime ya. Ụdị okwu ahụ na-egosi na ị maghị ihe.”

Mgbe ụmụ Izrel si n’ala Ijipt pụta, olee ihe na-adịghị mma ha mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Gịnị mere na ọ dịghị mma ka anyị na-eche na ihe dịịrị anyị mma n’oge gara aga karịa ugbu a? Nye ihe atụ.

6 Gịnị mere na ọ dịghị mma ka anyị na-eche na otú ihe si dịrị anyị na mbụ ka mma karịa otú o si dịrị anyị ugbu a? Mmadụ ịchọ ka ihe dịrị ya otú ọ dịịrị ya na mbụ nwere ike ime ka onye ahụ na-echeta naanị ihe ọma ndị meere ya n’oge gara aga. O nwekwara ike ime ka onye ahụ chefuo nsogbu ndị o nwere n’oge ahụ. Ka anyị tụlee gbasara ụmụ Izrel oge ochie. Ozugbo ha si n’Ijipt pụta, ha chefuru otú ihe si siere ha ike mgbe ahụ. Naanị ihe ha na-echetazi bụ nri ọma ha nọ na-eri mgbe ahụ. Ha sịrị: “Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, tinyere kukumba na wọtamelọn na lik na yabaasị na galik!” (Ọnụ Ọgụ. 11:5) Ma ọ̀ bụ eziokwu na ha nọ na-eri ihe ndị ahụ “n’efu”? Mba. Ụmụ Izrel tara ahụhụ maka ihe niile ahụ ha riri. N’oge ahụ, Ndị Ijipt ji ha mere ohu, na-echi ha ọnụ n’ala. (Ọpụ. 1:13, 14; 3:6-9) Ma ha mechara chefuo ahụhụ niile ahụ ha tara n’Ijipt, ha ebidokwa chọwa ka ihe dịrị ha otú ọ dịịrị ha n’Ijipt. Ha lekwasịrị anya n’ihe ọma ndị ha na-enweta n’ala Ijipt kama ilekwasị anya n’ihe ọma ndị Jehova na-emere ha ugbu a. Ihe a ha mere adịghị Jehova mma.—Ọnụ Ọgụ. 11:10.

7. Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị aka izere ịchọ ka ihe dịrị ya otú ọ dịịrị ya na mbụ?

7 Olee otú anyị ga-esi zere ịna-achọ ka ihe dịrị anyị otú ọ dịịrị anyị na mbụ? Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị bidoro ije ozi na Betel dị na Bruklin n’afọ 1945. Mgbe afọ ole na ole gachara, nwanna na-ejekwa ozi na Betel lụrụ ya. Ha abụọ jekwara ozi na Betel ruo ọtụtụ afọ. Ma n’afọ 1976, di ya dara ọrịa. Ọ sịrị na mgbe di ya chọpụtara na ọ gaghị agbake n’ọrịa ahụ, o nyere ya ụfọdụ ndụmọdụ ga-enyere ya aka idi ọnwụ ya. Ọ gwara ya, sị: “Mụ na gị ebiela n’udo ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụghị mmadụ niile ka ụdị ihe a meerela.” Ma ọ gbakwara ya ume, sị: “Anọkwala na-eche gbasara ihe ndị mere n’oge gara aga, ọ bụ eziokwu na ha ka ga na-abata gị n’uche. Ma, ka oge na-aga, ị ga na-echefutụ ha. Anọkwala na-echegbu onwe gị ma ọ bụ na-ewe oké iwe maka ihe mere gị. Ka obi na-atọ gị ụtọ maka oge ndị mụ na gị ji fekọọ Jehova ọnụ. Ikike icheta ihe ndị mere n’oge gara aga bụ onyinye si n’aka Chineke.” Ihe a bụ ezigbo ndụmọdụ, ọ́ bụghị ya?

8. Olee uru ọ baara otu nwanna nwaanyị n’ihi na o lekwasịghị anya n’otú ihe si dịrị ya n’oge ndị gara aga?

8 Nwanna nwaanyị a mere ihe ndị a di ya gwara ya. Ọ nọgidere na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ mgbe ọ gbara afọ iri itoolu na abụọ. Tupu ya anwụọ, ọ sịrị: “M cheta afọ iri isii na atọ m ji jeere Jehova ozi oge niile, m ga-asị na ndụ m juru m afọ. Gịnị mere o ji kwuo ihe a? Ọ sịrị: “Ihe na-eme ka ndụ na-atọ anyị ezigbo ụtọ bụ ma anyị cheta na anyị na ụmụnna anyị ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, nọrọ na ya na-efe Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke, ruo mgbe ebighị ebi.” * Nwanna nwaanyị a bụ ezigbo ihe atụ nke onye legidere anya n’ihu.

IBU IWE N’OBI

9. Dị ka e kwuru na Levitikọs 19:18, olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ịhapụ ibu iwe n’obi?

9 Gụọ Levitikọs 19:18. Ọtụtụ mgbe, ọ na-esiri anyị ike ichefu ihe e mere anyị, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye mere anyị ihe ahụ bụ nwanna anyị, ezigbo enyi anyị, ma ọ bụkwanụ onye ikwu anyị. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị nwanna nwaanyị ọzọ boro ebubo na o zuuru ego ya. Mgbe e mechara, nwanna nwaanyị ahụ boro ya ebubo bịara rịọ ya mgbaghara, ma nwanna nwaanyị ahụ e boro ebubo ekweghị echefu ihe ahụ merenụ. È nwetụla mgbe ụdị ihe a mere gị? Ọ bụrụgodị na ụdị ihe a emebeghị anyị, ọ ga-abụ na e nweela mgbe ọtụtụ n’ime anyị buuru ndị ọzọ iwe n’obi ma chee na anyị agaghị echefuli ihe ahụ.

10. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ibu iwe n’obi?

10 Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị iburu mmadụ iwe n’obi? Otu ihe anyị ga-echeta bụ na Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ ma ihe niile na-eme anyị, ma mmegbu a na-emegbu anyị. (Hib. 4:13) Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ ya n’obi. (Aịza. 63:9) O kwekwara nkwa na ọ ga-ewepụrụ anyị nsogbu niile mmegbu a na-emegbu anyị kpataara anyị.—Mkpu. 21:3, 4.

11. Olee uru ọ na-abara anyị ma anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi?

11 Anyị kwesịkwara icheta na anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi, ọ ga-abara anyịnwa uru. Nwanna nwaanyị ahụ e boro ebubo mechara chọpụta ihe a. Ka oge na-aga, ọ kwụsịrị iburu nwanna nwaanyị nke ọzọ ahụ iwe n’obi. O chetara na ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, Jehova ga-agbaghara anyị. (Mat. 6:14) Ọ bụ eziokwu na ọ ma na ihe nwanna nwaanyị nke ọzọ mere adịghị mma, mana o kpebiri ịgbaghara ya. Ihe a mere ka nwanna nwaanyị ahụ na-enwekwu obi ụtọ ma lekwasị anya n’ozi ọ na-ejere Jehova.

MMADỤ IKWE KA OBI YA NỌGIDE NA-AMA YA IKPE

12. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru na 1 Jọn 3:19, 20?

12 Gụọ 1 Jọn 3:19, 20. E nweghị onye obi ya na-anaghị ama ikpe mgbe ụfọdụ maka ihe ọjọọ o mere. Dị ka ihe atụ, obi ụfọdụ ndị na-ama ha ikpe maka ihe ndị ha mejọrọ tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Obi ndị ọzọ na-ama ha ikpe n’ihi ihe ndị ha mejọrọ mgbe ha mechara baptizim. (Rom 3:23) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-achọkarị ime ihe dị mma. Ma, “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2; Rom 7:21-23) O nweghị onye n’ime anyị obi na-atọ ụtọ ma obi ya na-ama ya ikpe, ma o nwere ike ịbara anyị uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi anyị ịma anyị ikpe nwere ike ime ka anyị gbanwee ma kpebisie ike ịghara ime ihe ahụ anyị mejọrọ ọzọ.—Hib. 12:12, 13.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara ikwe ka obi anyị nọgide na-ama anyị ikpe?

13 Ma obi anyị nwere ike ịna-ama anyị ikpe gabiga oké. Ihe ọ pụtara bụ na obi anyị nwere ike ịna-ama anyị ikpe mgbe anyị chegharịcharala, Jehova egosikwa na ọ gbagharala anyị. Ụdị obi amamikpe a nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. (Ọma 31:10; 38:3, 4) Olee otú o nwere ike isi kpatara anyị nsogbu? Ka anyị tụlee gbasara otu nwanna nwaanyị obi ya nọgidere na-ama ikpe n’ihi ihe ndị o mere n’oge gara aga. Ọ sịrị: “M chere na ọ baghịzi uru ịgbawa mbọ n’ozi Jehova n’ihi na a gaghịzi azọpụta m.” O nwere ike ịna-adị ọtụtụ n’ime anyị otú ọ dị nwanna nwaanyị a. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ikwe ka obi anyị nọgide na-ama anyị ikpe. Chegodị otú obi ga-esi atọ Setan ụtọ ma ọ chọpụta na ike onwe anyị agwụla anyị ebe ọ bụkwanụ na ike anyị agwụbeghị Jehova.—Tụlee 2 Ndị Kọrịnt 2:5-7, 11.

14. Olee otú anyị ga-esi amara na ike anyị agwụbeghị Jehova?

14 Ma, anyị ka nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi mara na ike m agwụbeghị Jehova?’ Ọ bụrụ na anyị ajụọ ụdị ajụjụ a, ọ pụtara na Jehova ka nwere ike ịgbaghara anyị. Ọtụtụ afọ gara aga, otu Ụlọ Nche sịrị: “Anyị [nwere ike] ịchọpụta na anyị na-asụ ngọngọ, na-adakwa ọtụtụ mgbe ma a bịa n’ịkpa àgwà ọjọọ ụfọdụ ririla anyị ahụ́. . . . Ma, echela na olileanya adịghịzi, na i meela mmehie na-enweghị mgbaghara. Setan ga-achọ ka i chewe otú ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mwute ahụ ị na-enwe gosiri na ị bụghị onye na-enweghị ike ịgbanwe. Ka ike ghara ịgwụ gị iji obi umeala lọghachikwute Chineke ma rịọ ya ka ọ gbaghara gị ma mee ka ị dị ọcha. Gakwuru ya otú ahụ nwata si agakwuru nna ya mgbe ọ nọ ná nsogbu. Jehova ga-eji amara ya nyere gị aka n’agbanyeghị ugboro ole ị gakwuuru ya n’ihi otu nsogbu ahụ.”

15-16. Olee otú ọ na-adị ụfọdụ ndị ma ha chọpụta na ike ha agwụbeghị Jehova?

15 Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ha cheta na ike ha agwụbeghị Jehova. Dị ka ihe atụ, afọ ole na ole gara aga, otu akụkọ gbara n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” metụrụ otu nwanna nwoke n’obi. N’akụkọ ahụ, otu nwanna nwaanyị kwuru na ọ na-esiri ya ike ikweta na Jehova ga-ahụli ya n’anya ọzọ n’ihi ihe ndị o mere n’oge ndị gara aga. Ya na ihe a nọ na-alụ ruo ọtụtụ afọ, ma mgbe o mechara baptizim. Ma, ka ọ na-atụgharị uche n’àjà mgbapụta Jizọs, ọ malitere ikweta na Jehova ka hụrụ ya n’anya. *

16 Olee otú akụkọ ya si nyere nwanna nwoke ahụ aka? Nwanna nwoke ahụ dere, sị: “Mgbe m dị obere, ile ndị gba ọtọ riri m ahụ́. M nọkwa na-agbalị ịkwụsị ya. Ma, na nso nso a, m lere ya ọzọ. Agwala m ndị okenye ka ha nyere m aka. Emeriwekwala m nsogbu a. Ndị okenye emeela ka obi sie m ike na Jehova ka hụrụ m n’anya nakwa na ọ chọrọ ịgbaghara m. Ma mgbe ụfọdụ, ọ ka na-adị m ka e nweghị uru m bara nakwa na Jehova enweghị ike ịhụ m n’anya ọzọ. Ịgụ akụkọ [nwanna nwaanyị a] nyeere m ezigbo aka. Ugbu a, o doola m anya na mgbe ọ bụla m na-eche na Jehova enweghị ike ịgbaghara m, ihe m na-ekwu bụ na àjà Ọkpara ya erughị eru ikpuchi mmehie m. Achakapụtala m isiokwu a, ka m nwee ike ịgụ ya ma tụgharịa uche na ya mgbe ọ bụla m malitere iche na e nweghị uru m bara.

17. Olee ihe nyeere Pọl aka ịghara ikwe ka obi ya nọgide na-ama ya ikpe?

17 Ụdị akụkọ a na-echetara anyị banyere Pọl onyeozi. Tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst, o mere ọtụtụ mmehie dị oké njọ. O chetara ihe ndị ahụ o mere. Ma, ọ naghị eche banyere ya mgbe niile. (1 Tim. 1:12-15) O weere ihe mgbapụta ahụ dị ka onyinye Jehova nyere ya. (Gal. 2:20) Pọl si otú a ghara ikwe ka obi ya nọgide na-ama ya ikpe ma lekwasị anya n’ime ike ya niile n’ozi Jehova malite mgbe ahụ gaa n’ihu.

LEGIDE ANYA N’IHU

Ka anyị kpebisie ike ilegide anya n’ihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19) *

18. Olee ihe anyị mụtarala n’isiokwu a?

18 Gịnị ka anyị mụtarala n’ihe ndị a anyị tụlere n’isiokwu a? (1) Ikike mmadụ nwere icheta ihe ndị dị mma meere ya bụ ngọzi si n’aka Jehova. Ma, n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị mma n’oge gara aga, a gaghị eji ya tụnyere olileanya anyị nwere ibi n’ụwa ọhụrụ. (2) Ndị ọzọ nwere ike imejọ anyị. Ma anyị gbaghara ha, ọ ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ozi anyị na-ejere Jehova. (3) Anyị kwe ka obi anyị nọgide na-ama anyị ikpe, o nwere ike ime ka anyị ghara iji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị, otú ahụ obi siri Pọl ike.

19. Olee otú anyị si mara na n’ụwa ọhụrụ, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị mere n’oge gara aga?

19 Anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. N’ụwa ọhụrụ Chineke, obi agaghịzi na-ajọ anyị njọ n’ihi ihe ndị mere n’oge gara aga. Baịbụl kwuru gbasara oge ahụ, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile.” (Aịza. 65:17) Chegodị ya, ụfọdụ n’ime anyị aghọọla ndị agadi n’ozi Chineke. Mana n’ime ụwa ọhụrụ, anyị niile ga-aghọ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ. (Job 33:25) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị mere n’oge gara aga. Kama, ka anyị lekwasị anya n’ụwa ọhụrụ Chineke ma mee ike anyị niile iji banye na ya.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

^ par. 5 Ọ dị mma icheta ihe ndị mere n’oge gara aga. Ma, anyị ekwesịghị itinye uche anyị niile n’ihe ndị mere n’oge gara aga, ya emezie ka anyị ghara iji ndụ anyị mee ihe bara uru ugbu a ma ọ bụkwanụ ya emee ka uche anyị pụọ n’ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ nwere ike ime ka anyị na-etinyekarị uche anyị n’ihe ndị mere n’oge gara aga. Anyị ga-atụlekwa ihe Baịbụl kwuru nakwa akụkọ ndị mere eme n’oge anyị a ndị ga-enyere anyị aka izere ihe atọ a.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Mmadụ ịchọ ka ihe dịrị ya otú ọ dịịrị ya na mbụ, ibu iwe n’obi, na mmadụ ikwe ka obi ya nọgide na-ama ya ikpe dị ka ebe mmadụ bu ibu dị arọ nke na-eme ka o siere ya ike ịnọgide na-eje ije n’ụzọ nke ndụ.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ọ bụrụ na anyị ahapụ ihe ndị a na-anyịgbu anyị, anyị na-enwe obi ụtọ, nweekwa ume ọhụrụ. Ọ bụzi mgbe ahụ ka anyị ga-elegide anya n’ihe ndị dị n’ihu.