Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onésime na Géraldine

Ngọzi Ndị Laghachiri n’Obodo Ha Na-enweta

Ngọzi Ndị Laghachiri n’Obodo Ha Na-enweta

ỌTỤTỤ ụmụnna anyị ndị hapụrụ obodo ha gaa mba ofesi alọghachila n’obodo ha. Ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe mmadụ ibe ha nọ emeela ka ha kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 22:37-39) Olee ihe ndị o furu ha, oleekwa ngọzi ndị ha nwetara? Iji chọpụta, ka anyị leba anya n’ihe mere na Kameruun bụ́ obodo dị n’ebe ọdịda anyanwụ Afrịka.

‘ỊKỤ AZỤ̀ N’EBE AZỤ̀ JURU’

N’afọ 1998, otu nwanna nwoke aha ya bụ Onésime si ná mba ya bụ́ Kameruun kwaga mba ofesi. O biri ebe ahụ afọ iri na anọ. Otu ụbọchị ọ gara ọmụmụ ihe, ọ nụrụ ka otu ọkà okwu mere ihe atụ gbasara izi ozi ọma. Ọkà okwu ahụ sịrị, “Ọ bụrụ na ndị enyi abụọ nọ ebe dị iche iche na-akụ azụ̀, otu onye ana-egbute azụ̀ karịa ibe ya, ọ̀ bụ na onye nke ọzọ agaghị agakwuru ya ka o nwee ike igbutekwu azụ̀?”

Ihe atụ a mere ka Onésime chee banyere ịlaghachi obodo ya bụ́ Kameruun, ebe yiri ebe ahụ e nwere ike igbutekwu azụ̀, ka o nwee ike inyere ndị nkwusa nọ ebe ahụ aka. Ma, o nwere ihe ndị nọ na-echu ya ụra. Ọ̀ ga-ebilikwa na Kameruun ọzọ ebe ọ bụ na o meela ọtụtụ afọ ọ hapụrụ ya gaa biri ná mba ofesi? Onésime gara biri na Kameruun ruo ọnwa isii iji mara otú ebe ahụ ga-adị ya n’ahụ́. N’afọ 2012, ọ gaziri biri ebe ahụ kpamkpam.

Onésime sịrị: “M malitekwara ịmụ otú e si ebi n’obodo ahụ nakwa otú e si anagide okpomọkụ dị na ya. M malitekwara ịmụ otú e si anọ n’oche bench dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Ma, o ji ọnụ ọchị kwuo, sị: “Ka m na-ege ntị n’ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe, ka m na-echefutụ oche kushọn m na-anọbu na ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ná mba ofesi.”

N’afọ 2013, Onésime lụrụ Géraldine. Géraldine si Frans, ebe o biri afọ itoolu, lọta Kameruun. Olee ngọzi ndị Onésime na Géraldine nwetara n’ihi na ha lekwasịrị anya n’ozi Jehova? Onésime sịrị: “Mụ na nwunye m jere Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, na-ejekwa ozi na Betel. N’afọ gara aga, mmadụ iri abụọ a na-amụrụ Baịbụl n’ọgbakọ anyị mere baptizim. Ugbu a, ọ dịzi m ka m̀ na-akụ azụ̀ n’ebe azụ̀ juru.” (Mak 1:17, 18) Géraldine kwukwara, sị: “Enwetala m ọtụtụ ngọzi karịa otú m tụrụ anya ya.”

IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ NA-ENYE ỌṄỤ

Judith na Sam-Castel

Judith hapụrụ obodo ya kwaga Amerịka. Ma ọ na-agụsi ya agụụ ike ijekwuru Jehova ozi. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla m gara ileta ndị ezinụlọ m na Kameruun, m nọchaa, chọọ ịlaghachite Amerịka, m na-ebe ákwá n’ihi na e nweela ọtụtụ ndị m malitere ịmụrụ Baịbụl m na-ahapụ.” Ma, ihe a emeghị ka Judith kwaga Kameruun ozugbo. Ọ na-arụ ọrụ na-enye ya nnukwu ego. Nke a mere ka o nwee ike ịna-elekọta nna ya ahụ́ na-adịghị nọ na Kameruun. Mana ọ tụkwasịrị Jehova obi ma kwaga Kameruun. O kwuru na ihe adịcharaghị ya mfe otú ọ dịịrị ya n’Amerịka. Ma, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ka Kameruun mara ya ahụ́. Otu onye nlekọta sekit na nwunye ya gbakwara ya ume.

Judith kwuru, sị: “N’ime afọ atọ, m nyeere mmadụ anọ aka ha emee baptizim.” Judith mechara bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Taa, ya na di ya bụ́ Sam-Castel na-arụ ọrụ nlekọta sekit. Ma, oleekwanụ maka nna Judith? Judith na ndị ezinụlọ ya chọtara otu ụlọ ọgwụ nọ ná mba ofesi kwetara ịwa papa ya ahụ́ n’anaghị ha ego. Ahụ́ ahụ a wara ya gakwara nke ọma.

JEHOVA NYEERE HA AKA

Caroline na Victor

Otu nwanna aha ya bụ Victor kwagara Kanada. Mgbe ọ gụchara otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche nke kwuru gbasara ịga mahadum, o chebaara mahadum ọ na-aga echiche. Ọ kwụsịrị ịga mahadum, malitezie ịmụ ọrụ na-agaghị ewe ya ogologo oge. Victor kwuru, sị: “Ihe a mere ka m nweta ọrụ ọsịịsọ, meekwa ka m nwee ike ime ihe na-agụ m agụụ ime kemgbe, ya bụ, ịsụ ụzọ oge niile.” Victor mechara lụọ Caroline, ha abụọ sokwa gaa Kameruun. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha gara legharịa anya n’alaka ụlọ ọrụ. A gbara ha ume ka ha lee ma hà ga-abịa jewe ozi na Kameruun. Victor kwuru, sị: “O nweghị ihe mere anyị ga-eji jụ ịga n’ihi na anyị emeela ka ndụ anyị dị mfe. Anyị nwere ike ịga jewe ozi na Kameruun.” N’agbanyeghị na ahụ́ na-enye Caroline nsogbu, ha kpebiri ịga jewe ozi na Kameruun.

Victor na Caroline malitere rụwa ọrụ ọsụ ụzọ oge niile ka ha nwee ike inyere ọtụtụ ndị nwere mmasị na Kameruun aka. Ego ha ji bịa Kameruun zuuru ha ruo oge ụfọdụ. Ma, ha mechara laghachi Kanada rụọ ọrụ ruo ọnwa ole na ole. O nyeere ha aka inweta ego ha ji lọghachite Kameruun, rụrụkwa ọrụ ọsụ ụzọ ha na-aga. Olee ngọzi ndị ha nwetara? Ha gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ugbu a, ha sozi ná ndị na-ewu ihe owuwu. Victor kwuru, sị: “Ịhapụ ebe ahụ maara anyị ahụ́ gaa biri na Kameruun mere ka anyị hụ otú Jehova si enyere anyị aka.”

INYERE NDỊ MMADỤ AKA INYEFE JEHOVA ONWE HA NA-EME OBI ỤTỌ

Stéphanie na Alain

N’afọ 2002, Alain bụ́ nwa akwụkwọ na mahadum dị na Jamanị gụrụ traktị bụ́ Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? Ihe ndị ọ gụtara na traktị ahụ mere ka ọ gbanwee ihe ọ chọrọ iji ndụ ya eme. N’afọ 2006, ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. E zigakwara ya ka ọ gaa jewe ozi na Kameruun bụ́ obodo ya.

Mgbe Alain ruru Kameruun, ọ chọtara ọrụ ọ ga na-arụ ụbọchị ụfọdụ n’izu. O mechara chọta ọrụ na-enye ya ego karịa ọrụ nke mbụ ahụ. Ma, ihe na-atụ ya uche bụ na o nwere ike ime ka ọ lawa azụ n’ozi ya. N’ihi ya, mgbe a gwara ya ka ọ bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọ nabatara ya ozugbo. Onye ọ na-arụrụ ọrụ kwuru na ọ ga-etinyere ya ego n’ụgwọ ọnwa ya, ma nke ahụ emeghị ka Alain gbanwee obi ya. Alain mechara lụọ Stéphanie. Stéphanie ebiela ọtụtụ afọ na Frans. Olee ihe ndị siiri ya ike mgbe ọ gara biri na Kameruun?

Stéphanie kwuru, sị: “M bidoro rịawa ụmụ nkịrịnka ọrịa dị iche iche. Ma, m chọtara ebe m na-aga anara ọgwụ, ya emee ka m na-enwetatụ onwe m.” Jehova gọziri di na nwunye a n’ihi mbọ ha gbara. Alain kwuru, sị: “Mgbe anyị gara ikwusa ozi ọma n’otu ime obodo a na-akpọ Katé, anyị hụrụ ọtụtụ ndị chọrọ ka a mụwara ha Baịbụl. Anyị mechara si n’ekwentị na-amụrụ ha Baịbụl. Mmadụ abụọ n’ime ha emeela baptizim, e nweekwala otu ìgwè n’ebe ahụ. O nweghị ihe na-eme obi ụtọ karịa inyere ndị mmadụ aka ha enyefee Jehova onwe ha. Ka anyị na-eje ozi ebe a, anyị enwetala ụdị obi ụtọ a ọtụtụ ugboro.” Ugbu a, Alain na Stéphanie na-arụzi ọrụ nlekọta sekit.

“ANYỊ MERE NNỌỌ IHE ANYỊ KWESỊRỊ IME”

Léonce na Gisèle

Gisèle mere baptizim mgbe ọ na-amụ banyere ahụ́ ike n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ịtali. Otú di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ mụụrụ ya Baịbụl si ebi ndụ dị mfe masịrị ya. O mere ka ọ gụwa ya agụụ imekwu ihe n’ozi Jehova. N’ihi ya, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile mgbe ọ gụchawara akwụkwọ.

Ọ na-agụ Gisèle agụụ ịlaghachi Kameruun jekwuoro Jehova ozi. Ma, e nwere ihe ndị na-eche ya uche. Ọ sịrị: “Ihe ọ pụtara bụ na m ga-ahapụ Ịtali, hapụkwa ndị enyi m na ndị ezinụlọ m bi n’Ịtali.” N’agbanyeghị ihe ndị a, na Mee afọ 2016, Gisèle laghachiri Kameruun. Mgbe obere oge gachara, ọ lụrụ di. Aha di ya bụ Léonce. Alaka ụlọ ọrụ Kameruun gbara ha ume ka ha gaa Ayos, bụ́ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.

Olee otú ihe dịịrị ha mgbe ha ruru Ayos? Gisèle kwuru, sị: “Anyị anaghị enwe ọkụ ruo ọtụtụ izu, e nweghị ebe anyị ga-akwụnye ekwentị anyị n’ọkụ. Ọtụtụ mgbe, ekwentị anyị na-atọgbọrọ nkịtị. M mụtara iji nkụ esi nri. Anyị na-ejikwa wilbaro na tọọchị echu iyi n’abalị mgbe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị n’iyi.” Olee ihe nyeere di na nwunye a aka? Gisèle sịrị: “Mmụọ nsọ Jehova, agbamume ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị gbara anyị, na ego ha nyere anyị nyeere anyị aka. Di m kwadokwara m.”

Obi ọ̀ dị Gisèle ụtọ na ọ lọtara obodo ya bụ́ Kameruun? Ọ sịrị: “Ee. Obi dị m ezigbo ụtọ.” O kwukwara, sị: “E nwere ihe ụfọdụ siiri anyị ike ná mmalite, obi datụkwara anyị mbà. Ma, mgbe anyị meriri nsogbu ndị ahụ niile, obi bịara sie mụ na di m ike na ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime. Anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị na ya adịkwuokwala ná mma.” Léonce na Gisèle mechara gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ugbu a, ha bụzi ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nwa oge.

Ndị ọkụ azụ̀ na-emeri nsogbu dị iche iche iji gbute ọtụtụ azụ̀. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị laghachiri obodo ha iji kwusaa ozi ọma. Ha na-ahapụ ọtụtụ ihe ka ha nwee ike inyere ndị nwere ezi obi nabatara ozi ọma Alaeze aka. O doro anya na Jehova ga-echeta ụmụnna ndị a ma meere ha ihe ọma n’ihi ịhụnanya ha gosiri maka aha ya. (Nehe. 5:19; Hib. 6:10) Ọ bụrụ na i bi ná mba ọzọ, ya abụrụkwa na a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’obodo gị, ị̀ ga-alaghachili n’obodo gị gaa nye aka? I mee otú ahụ, ị ga-enweta ọtụtụ ngọzi.—Ilu 10:22.