Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45

Nọgidenụ Na-egosi Ibe Unu Ịhụnanya Pụrụ Iche

Nọgidenụ Na-egosi Ibe Unu Ịhụnanya Pụrụ Iche

“Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche, na-emekwaranụ ibe unu ebere.”—ZEK. 7:9*.

ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị igosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche?

E NWERE ezigbo ihe mere anyị ga-eji gosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche. Olee ụfọdụ n’ime ha? Ihe ndị a si n’akwụkwọ Ilu ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a: “Akwụsịla igosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche. . . . I mee ya, ihe gị ga na-amasị ma Chineke ma mmadụ.” “Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru.” “Onye na-agbalị ime ezi omume ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya ga-adị ndụ.”—Ilu 3:3, 4*; 11:17; 21:21.

2 Ihe ndị a e kwuru n’akwụkwọ Ilu gwara anyị ihe atọ mere anyị kwesịrị iji gosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche. Nke mbụ, igosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche ga-eme ka Jehova jiri anyị kpọrọ ihe. Nke abụọ, ọ na-abara anyịnwa uru. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị na ndị ọzọ dị n’ezigbo mma. Nke atọ, ọ ga-abara anyị uru n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ọ ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji mee ihe a Jehova gwara anyị na Zekaraya 7:9. Ebe ahụ sịrị: “Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche, na-emekwaranụ ibe unu ebere.”

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ anọ. Olee ndị anyị kwesịrị igosi ịhụnanya pụrụ iche? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Rut gbasara igosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche? Olee otú anyị nwere ike isi na-egosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche taa? Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma anyị na-egosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche?

OLEE NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ IGOSI ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE?

4. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche? (Mak 10:29, 30)

4 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na ọ bụ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya ka ọ na-egosi ịhụnanya pụrụ iche. (Dan. 9:4) Anyị chọkwara ịbụ ndị ‘na-eme ka Chineke, maka na anyị bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.’ (Efe. 5:1) N’ihi ya, anyị chọrọ ịna-egosi ụmụnna anyị ịhụnanya pụrụ iche.—Gụọ Mak 10:29, 30.

5-6. Gịnị mere onye ọrụ ahụ e ji mee ihe atụ ka ji na-arụ n’ụlọ ọrụ ahụ?

5 O doro anya na ị ga-ekweta na ọ bụrụ na anyị aghọta ihe ịhụnanya pụrụ iche pụtara, ọ ga-enyere anyị aka ịna-egosi ya ụmụnna anyị. Iji nyere anyị aka ịghọtakwu ihe ọ pụtara, ka anyị legodị ihe atụ a.

6 Chegodị gbasara otu onye rụrụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. O nwere ike ịbụ na kemgbe ọ rụwara ọrụ ebe ahụ, ọ hụtụbeghị ndị nwe ụlọ ọrụ ahụ. O nwekwara ike ọ bụghị iwu niile e nwere n’ụlọ ọrụ ahụ dị ya mma. Ma, ihe mere o ji na-arụsi ọrụ ike bụ na ọrụ ahụ na-enye ya ego kwa ọnwa. Ọ ga-anọgidekwa na-arụ ebe ahụ ruo mgbe ọ lara ezumike nká ma ọ bụkwanụ mgbe o nwetara ebe ọzọ ka ya mma.

7-8. (a) Olee ihe na-eme ka mmadụ na-egosi ibe ya ịhụnanya pụrụ iche? (b) Gịnị mere anyị ga-eji leba anya n’amaokwu ụfọdụ n’akwụkwọ Rut?

7 Ị̀ chọpụtara ihe dị iche n’ịhụnanya pụrụ iche na ihe mere nwoke ahụ e ji mee ihe atụ ji na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ? Ihe mere nwoke ahụ ka ji na-arụ ebe ahụ bụ na ọ bụ ebe o si enweta ego o ji egbo mkpa ya. Ma na Baịbụl, ihe mere ndị Chineke ji gosi ibe ha ịhụnanya pụrụ iche abụghị iji mezuo iwu, ma ọ bụkwanụ ka e meekwara ha otú ahụ, kama, o si ha n’obi. Legodị ihe Devid mere. O gosiri enyi ya bụ́ Jonatan ịhụnanya pụrụ iche n’ihi na o si ya n’obi n’agbanyeghị na nna Jonatan chọrọ igbu ya. Mgbe ọtụtụ afọ gachara Jonatan nwụrụ, Devid nọgidere na-egosi nwa Jonatan bụ́ Mefiboshet ịhụnanya pụrụ iche.—1 Sam. 20:9, 14, 15; 2 Sam. 4:4; 8:15; 9:1, 6, 7.

8 Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara ịhụnanya pụrụ iche ma anyị gụọ ebe ụfọdụ n’akwụkwọ Rut. Olee ihe ndị anyị ga-amụta gbasara ịhụnanya pụrụ iche n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha ebe ahụ? Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe ndị ahụ anyị mụtara n’ọgbakọ anyị? *

GỊNỊ KA ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’AKWỤKWỌ RUT GBASARA ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE?

9. Gịnị mere Naomi ji chee na Jehova na-emegide ya?

9 N’akwụkwọ Rut, a kọrọ gbasara Naomi, nwunye nwa ya Rut, na Boaz bụ́ nwoke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ikwu di Naomi. Naomi, di ya, na ụmụ ya abụọ kwapụrụ n’Izrel n’ihi ụnwụ dị n’obodo ahụ, kwaga Moab. N’ebe ahụ, di Naomi nwụrụ. Ụmụ ya abụọ lụrụ nwaanyị. Ma, ọ dị mwute na ha mechakwara nwụọ. (Rut 1:3-5; 2:1) Ihe ndị a na-agbawa obi mere Naomi mere ka ọ daa mbà. Otú ọ dị ya mere ka o chee na Jehova na-emegide ya. Legodị ihe o kwuru gbasara otú obi dị ya n’ebe Chineke nọ. Ọ sịrị: ‘Jehova na-ata m ahụhụ.’ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emeela ka ndụ kwụsị ịtọ m ụtọ.” Ọ sịkwara: “Jehova emegidela m, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile akpatakwarala m ọdachi.”—Rut 1:13, 20, 21.

10. Gịnị ka Jehova mere gbasara ihe na-adịghị mma Naomi kwuru?

10 Gịnị ka Jehova mere gbasara ihe a Naomi kwuru? Ọ kwụsịghị inyere ya aka. Kama nke ahụ, o meteere ya ebere. Jehova ghọtara na “mmegbu nwere ike ime ka onye ma ihe mewe ara ara.” (Ekli. 7:7) Ma, a ka kwesịkwara inyere Naomi aka ka ọ ghọta na Jehova agbahapụbeghị ya. Olee otú Jehova si nyere ya aka? (1 Sam. 2:8) O mere ka Rut gosi Naomi ịhụnanya pụrụ iche. Rut ji obi ya niile nyere nne di ya aka ka ọ ghara ịda mbà ma mata na Jehova hụrụ ya n’anya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a Rut mere?

11. Gịnị mere ụmụnna nwere obiọma ji enyere ụmụnna ha aka ma nsogbu bịara ha?

11Ịhụnanya pụrụ iche na-eme ka anyị chọọ inyere ndị dara mbà aka. Otú ahụ Rut na-ekweghị ahapụ Naomi, ọtụtụ ụmụnna anyị taa dịkwa njikere inyere ụmụnna ha aka ma nsogbu bịara ha ma ọ bụkwanụ ma ha daa mbà. Ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, dịrịkwa njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji nyere ha aka. (Ilu 12:25; 24:10) Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị na-eme otú ahụ. Ọ sịrị: “Na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.”—1 Tesa. 5:14.

Otú anyị nwere ike isi nyere nwanna dara mbà n’obi aka bụ ige ya ntị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee ụzọ kacha mma isi nyere ụmụnna anyị dara mbà n’obi aka?

12 Ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị dara mbà aka bụ ige ha ntị nke ọma na ime ka obi sie ha ike na anyị hụrụ ha n’anya. Obi na-adị Jehova mma ma anyị nyere ndị ohu ya aka. (Ọma 41:1) Ilu 19:17 sịrị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.”

Rut sooro Naomi bụ́ nne di ya. Ma, Ọpa laghachiri Moab. Rut gwara Naomi, sị: “Ebe ị gara ka m ga-aga” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee ihe Rut mere dị iche n’ihe Ọpa mere? Gịnị mere mkpebi Rut mere ji gosi na o nwere ịhụnanya pụrụ iche n’ebe Naomi nọ? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

13 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara ihe mere Naomi mgbe di ya na ụmụ ya abụọ nwụrụ, anyị ga-aghọtakwu gbasara ịhụnanya pụrụ iche. Mgbe Naomi matara na “Jehova agọziwela ndị ya, nyewe ha nri,” o kpebiri ịlaghachi obodo ha. (Rut 1:6) Naomi na ndị nwunye nwa ya abụọ laghachiwere Juda. Mgbe ha nọ n’ụzọ, Naomi gwara ha ugboro atọ ka ha laghachi Moab. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: “Ọpa susuru nne di ya ọnụ lawa. Ma Rut ekweghị ahapụ ya.” (Rut 1:7-14) Ọpa mere ihe Naomi gwara ya ma laghachi Moab. Ma, Rut ekweghị alaghachi. Ọ bụrụ na ọ chọrọ, ọ gaara ekpebi ịlaghachi Moab. Ma, o kpebiri ka ọ nọrọ nyere Naomi aka n’ihi na o nwere ịhụnanya pụrụ iche n’ebe ọ nọ. (Rut 1:16, 17) Rut kpebiri na ọ gaghị ahapụ Naomi. Ihe mere o ji kpebie ime otú ahụ abụghị n’ihi na iwu ji ya ime ya, kama ọ bụ n’ihi na ọ bụ ihe ọ chọrọ ime. Rut gosiri Naomi ịhụnanya pụrụ iche. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe a Rut mere?

14. (a) Olee ihe ụmụnna anyị na-eme taa? (b) Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 13:16, olee otú anyị nwere ike isi na-eme Jehova obi ụtọ?

14Ịhụnanya pụrụ iche na-eme ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji nyere ndị ọzọ aka. Dị ka ọ dị n’oge gara aga, ọtụtụ ụmụnna anyị taa egosila ụmụnna ha ịhụnanya pụrụ iche, ma ndị ha na-ahụtụbeghị. Dị ka ihe atụ, ọdachi ndị na-emere onwe ha mee, ha na-agba mbọ nyere ụmụnna ha aka ozugbo. Ọ bụrụ na nsogbu abịara nwanna, ụmụnna na-agba ezigbo mbọ nyere ya aka. Ha na-eme ike ha niile iji nyere ụmụnna ha aka otú ahụ ụmụnna ndị nọ n’oge ndịozi mere na Masedonia. Ha na-ahapụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa, na-enyedị ihe “karịa otú ike ha hà,” iji nyere ndị nsogbu bịaara aka. (2 Kọr. 8:3) Ihe a na-eme Jehova ezigbo obi ụtọ.—Gụọ Ndị Hibru 13:16.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-EGOSI ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE TAA?

15-16. Olee ihe gosiri na ike inyere Naomi aka agwụghị Rut?

15 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta ma anyị leba anya n’otú Rut si nyere Naomi aka. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

16Ike agwụla gị. Mgbe Rut gwara nne di ya na ọ ga-eso ya laa Juda, na mbụ, Naomi ekwetaghị. Ma, ike agwụghị Rut. Gịnị si na ya pụta? “Mgbe Naomi hụrụ na Rut kpebisiri ike na ọ ga-eso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya ihe ga-eme ka ọ lawa.”—Rut 1:15-18.

17. Gịnị ga-enyere anyị aka ka ike ghara ịgwụ anyị ngwa ngwa?

17Ihe anyị na-amụta: Ọ dịghị mfe inyere ndị dara mbà aka. Ma, ike ekwesịghị ịgwụ anyị inyere ha aka. Nwanna nwaanyị chọrọ enyemaka nwere ike ghara ikwe ka anyị nyere ya aka na mbụ. * Ma, ịhụnanya pụrụ iche anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-eme ka ike ghara ịgwụ anyị inyere ya aka. (Gal. 6:2) Anyị ga-enwekwa olileanya na ọ ga-emecha kwe ka anyị nyere ya aka.

18. Olee ihe ọ ga-abụ na ọ gbawara Rut obi?

18Ewerela ha iwe. Mgbe Naomi na Rut bịarutere Betlehem, Naomi hụrụ ndị bụbu ndị agbata obi ya. Ọ gwara ha, sị: “Aka m juru eju mgbe m pụrụ, ma Jehova emeela ka m gbara aka lọta.” (Rut 1:21) Chegodị otú obi ga-adị Rut mgbe ọ nụrụ ka Naomi kwuru ihe ndị a. Rut agbaala ezigbo mbọ iji nyere ya aka. Rut esorola ya bee ákwá, kasie ya obi, sorokwa ya mee njem ọtụtụ ụbọchị. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Naomi sịrị: “Jehova emeela ka m gbara aka lọta.” Ihe ndị a Naomi kwuru mere ka o yie ka ọ̀ bụ na o jighị aka Rut na-enyere ya kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ na ihe ahụ gbawara Rut obi. Ma, ọ kwụsịghị inyere Naomi aka.

19. Gịnị ga-enyere anyị aka ka ike ghara ịgwụ anyị inyere onye nọ ná nsogbu aka?

19Ihe anyị na-amụta: Taa, nwanna nwaanyị nọ ná nsogbu nwere ike gwa anyị okwu ọjọọ n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara inyere ya aka. Ma, ka anyị gbalịa ghara iwere ya iwe. Ka anyị nọgide na-enyere ya aka, na-arịọkwa Jehova ka o nyere anyị aka ịchọta ụzọ ndị anyị ga-esi kasie ya obi.—Ilu 17:17.

Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Boaz? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20 na nke 21)

20. Gịnị mere ka ike ghara ịgwụ Rut inyere Naomi aka?

20Na-agba ndị ọzọ ume mgbe ọ dị ha mkpa. Rut gosiri Naomi ịhụnanya pụrụ iche. Ma ugbu a, agbamume dị Rut mkpa. Jehova mekwara ka Boaz gbaa ya ume. Boaz sịrị Rut: “Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ ihe ọma ndị i mere. Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye ị gbabara n’okpuru nku ya, kwụọ gị ụgwọ ọrụ zuru ezu.” Okwu ọma ndị a Boaz gwara Rut gbara ya ezigbo ume. Rut gwaziri Boaz, sị: “Ị kasiela m obi. I kwuokwala okwu mesiri ohu gị obi ike.” (Rut 2:12, 13) Ihe a Boaz gwara Rut n’oge agbamume dị ya mkpa mere ka ike ghara ịgwụ ya.

21. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 32:1, 2, olee ihe ndị okenye na-eme?

21Ihe anyị na-amụta: E kwesịkwara ịgba ndị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche ume mgbe ụfọdụ. Boaz jara Rut mma. Taa, ndị okenye na-ajakwa ụmụnna nọ n’ọgbakọ mma ma ha hụ na ha na-enyere ndị ọzọ aka. Ụdị ịja mma a ga-eme ka ike ghara ịgwụ ụmụnna ndị a ịnọgide na-enyere ibe ha aka.—Gụọ Aịzaya 32:1, 2.

OLEE IHE ỌMA NA-EMERE NDỊ NA-EGOSI NDỊ ỌZỌ ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE?

22-23. Olee otú obi Naomi si gbanwee, n’ihi gịnịkwa? (Abụ Ọma 136:23, 26)

22 Mgbe oge ụfọdụ gachara, Boaz bunyere Rut na Naomi nnukwu nri. (Rut 2:14-18) Olee ihe Naomi mere mgbe ọ hụrụ ihe ndị a Boaz nyere ha? Ọ sịrị: “Ka Jehova, onye na-akwụsịtụbeghị igosi ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ịhụnanya pụrụ iche, gọzie ya.” (Rut 2:20a*) Ihe a mere ka obi Naomi gbanwee. Na mbụ, o ji mwute kwuo, sị: “Jehova emegidela m.” Ma ugbu a, o ji obi ụtọ kwuo, sị: “Jehova . . . akwụsịtụbeghị igosi . . . ịhụnanya pụrụ iche.” Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ka obi Naomi gbanwee?

23 Naomi mechara hụ na Jehova agbahapụbeghị ya. Jehova ji Rut nyere ya aka na nlọta ha lọtara Juda. (Rut 1:16) Naomi hụkwara otú Jehova si nyere ya aka mgbe Boaz, bụ́ otu n’ime “ndị ga-agbara” ihe ha, bunyere ha nri. * (Rut 2:19, 20b) Ọ ga-abụ na Naomi kwuru, sị, ‘Ugbu a, aghọtala m na o nweghị mgbe Jehova gbahapụrụ m. Ọ na-enyere m aka n’oge a niile.’ (Gụọ Abụ Ọma 136:23, 26.) Obi dị Naomi ezigbo ụtọ na ike agwụghị Rut na Boaz inyere ya aka. Obi dị ha niile ụtọ na Naomi mechakwara na-enwe ọṅụ, nweekwa ike o ji na-efe Jehova.

24. Gịnị mere anyị ji chọọ ịnọgide na-egosi ụmụnna anyị ịhụnanya pụrụ iche?

24 Gịnị ka anyị mụtara n’akwụkwọ Rut gbasara ịhụnanya pụrụ iche? Ịhụnanya pụrụ iche na-eme ka ike ghara ịgwụ anyị inyere ụmụnna anyị ndị nọ ná nsogbu aka. Ọ na-emekwa ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji nyere ha aka. Ndị okenye kwesịrị ịna-agba ụmụnna ndị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche ume. Ọ bụrụ na anyị ahụ na ndị nọ ná nsogbu enwewekwala ọṅụ na ike ha ji efe Jehova, anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Ma, olee ihe bụ́ isi mere anyị ji nọgide na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche? Ọ bụ n’ihi na anyị chọrọ ịna-eme ka Jehova, onye “ịhụnanya ya pụrụ iche dị ukwuu.”—Ọpụ. 34:6*; Ọma 33:22.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

^ par. 5 Jehova chọrọ ka anyị na-egosi ụmụnna anyị ịhụnanya pụrụ iche. Anyị ga-aghọtakwu ihe ịhụnanya pụrụ iche pụtara ma ọ bụrụ na anyị atụlee otú ụfọdụ ndị fere Chineke n’oge ochie si gosi ibe ha ụdị ịhụnanya a. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe anyị ga-amụta n’aka Rut, Naomi, na Boaz.

^ par. 8 Iji ghọtakwuo isiokwu a nke ọma, biko, jisie ike gụọ Rut isi nke mbụ na nke abụọ.

^ par. 17 Ebe ọ bụ na anyị na-ekwu gbasara Naomi, anyị ga na-ekwu gbasara ụmụnna nwaanyị nọ ná mkpa. Ma ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụnna nwoke.

^ par. 23 Ị chọọ ịmatakwu otú Boaz si bụrụ otu n’ime ndị ga-agbara ihe ezinụlọ di Naomi, gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha, ‘Ezigbo Nwaanyị.’ ” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Ọktoba 1, 2012, peeji nke 20.