Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

Ndị Lụrụ Di na Nwunye Ọhụrụ, Ka Ife Jehova Bụrụ Ihe Kacha Unu Mkpa ná Ndụ

Ndị Lụrụ Di na Nwunye Ọhụrụ, Ka Ife Jehova Bụrụ Ihe Kacha Unu Mkpa ná Ndụ

“Jehova bụ ike m . . . Ọ bụ ya ka m tụkwasịrị obi.”—ỌMA 28:7.

ABỤ NKE 131 “Ihe Chineke Kekọtara”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị mere ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kwesịrị iji tụkwasị Jehova obi? (Abụ Ọma 37:3, 4) (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

Ị̀ NA-AGA ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’oge na-adịghị anya, ka ùnu ka lụrụ ọhụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na ị na-atụ anya na ndụ ga-atọ unu ezigbo ụtọ. N’eziokwu, alụmdi na nwunye nwere nsogbu ya na ya so. E nwekwara mkpebi ụfọdụ dị ezigbo mkpa ndị di na nwunye lụrụ ọhụrụ kwesịrị ime. Mkpebi ndị unu mere nakwa ihe ndị unu mere mgbe nsogbu bịara ga-ekpebi ma ùnu ga-enwe obi ụtọ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na unu atụkwasị Jehova obi, unu ga-eme mkpebi ndị dị mma, unu ga-adịkwa n’ezigbo mma. Ma ọ bụrụ na unu ahapụ ime ihe Jehova kwuru, unu ga-enwe ọtụtụ nsogbu ndị ga-eme ka ihe siere unu ike.—Gụọ Abụ Ọma 37:3, 4.

2 Ọ bụ eziokwu na ihe e kwuru n’isiokwu a bụ maka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ, ma, anyị ga-elebakwa anya ná nsogbu na-abịara ndị di na nwunye niile, kwuokwa gbasara ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị fere Jehova n’oge Baịbụl mere. Anyị ga-esi n’akụkọ ha mụta ihe anyị ga-eme n’ihe dị iche iche anyị na-eme ná ndụ, ma n’alụmdi na nwunye. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe ndị a kọrọ gbasara ndị di na nwunye n’oge a.

OLEE NSOGBU NDỊ NWERE IKE ỊBỊARA NDỊ LỤRỤ DI NA NWUNYE ỌHỤRỤ?

Olee mkpebi ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ nwere ike ime ga-eme ka ha ghara iwepụtakwu oge ha jeere Jehova ozi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3-4. Olee nsogbu ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye nwere ike inwe?

3 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-agwa ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ ka ha na-ebi ndụ otú ọtụtụ ndị si ebi taa. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna na ndị ikwu ha nwere ike ịna-agba ha ume ka ha malite ịmụ ụmụ n’egbughị oge. Ụfọdụ ndị enyi ha ma ọ bụ ndị ikwu ha nwekwara ike ịna-agwa ha ka ha zụọ ụlọ ma kwajuo ya ihe ndị mara mma e ji ebi n’ụlọ.

4 Ma a kpachaghị anya, di na nwunye nwere ike ime mkpebi ndị nwere ike ime ka ha koro ezigbo ụgwọ. O nwekwara ike ime ka di na nwunye ahụ na-arụ ọrụ ogologo oge iji kwụọ ụgwọ ndị ha ji. Ọrụ ahụ nweziri ike ịna-ewekọrọ oge ha, ha agharazie inwe oge ha ga-eji na-amụ ihe n’onwe ha, na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ na-aga ozi ọma. O nwedịrị ike ime ka di na nwunye ahụ ghara inwe ike ịna-agachi ọmụmụ ihe anya n’ihi na ha na-arụ ọrụ mgbe ọrụ gbasara iji nwetakwuo ego ma ọ bụ ka a ghara ịchụ ha n’ọrụ. Ihe a niile nwere ike mee ka ha ghara iwepụtakwu onwe ha ijere Jehova ozi.

5. Olee ihe ị mụtara n’aka Klaus na Marisa nwunye ya?

5 Ihe ndị mere eme egosila na iji ndụ anyị na-achụ akụnụba anaghị eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Legodị ihe otu di na nwunye aha ha bụ Klaus na Marisa mụtara gbasara ihe a. * Mgbe ha lụrụ ọhụrụ, ha abụọ ji oge ha niile na-arụ ọrụ iji nweta nnukwu ego. Ma ha enweghị obi ụtọ n’ime onwe ha. Klaus sịrị: “Ihe anyị nwere karịrị akarị. Ma, o nweghị ihe ọ bụla anyị bu n’obi imere Jehova. N’eziokwu, o mere ka ndụ siere anyị ike.” O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na iji ndụ gị niile na-achụ akụnụba agaghị eme ka ị na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ otú ahụ, adala mbà. Ileba anya ná mkpebi ndị dị mma ndị ọzọ mere nwere ike inyere gị aka. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe ndị bụ́ di nwere ike ịmụta n’aka Eze Jehoshafat.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI KA EZE JEHOSHAFAT

6. Olee otú Jehoshafat si mee ihe e kwuru n’Ilu 3:5, 6 mgbe ndị agha buru ezigbo ibu bịara ịlụso ya na ndị ya ọgụ?

6 Ndị di, ò nwere mgbe ụfọdụ ọrụ unu ji n’aka na-akarị akarị? Ọ bụrụ otú ahụ, unu nwere ike ịmụta ihe n’aka Eze Jehoshafat. Ebe Jehoshafat bụ eze, ọ bụ ọrụ ya ichebe ndị ọ na-achị. Olee otú o si rụọ ọrụ a siri ike? Ọ gbara ezigbo mbọ iji chebe ndị ọ na-achị. Ọ rụrụ obodo ndị siri ike na Juda, nweekwa ndị agha karịrị otu nde otu narị puku na iri puku isii. (2 Ihe. 17:12-19) Mgbe e mechara, otu nsogbu siri ezigbo ike bịaara ya. E nwere mgbe ndị agha buru ezigbo ibu si n’obodo Amọn, Moab, na Sia bụ́ ugwu ugwu bịara iyi ya na ndị ya egwu. (2 Ihe 20:1, 2) Gịnị ka Eze Jehoshafat mere? Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ka ọ dị ike. Ihe a o mere dabara n’ihe e kwuru n’Ilu 3:5, 6. (Gụọ ya.) Ekpere ahụ Jehoshafat ji obi umeala kpee ná 2 Ihe E Mere 20:5-12 gosiri na ọ tụkwasịrị Nna ya nke eluigwe obi. Olee otú Jehova si za Jehoshafat ekpere ya?

7. Olee otú Jehova si za Jehoshafat ekpere ya?

7 Jehova si n’ọnụ otu onye Livaị aha ya bụ Jahazayel gwa Jehoshafat okwu, sị: “Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.” (2 Ihe 20:13-17) O doro anya na ihe ahụ abụghị otú e si alụ agha. Ma, ihe ahụ a gwara ya mee esighị n’ọnụ mmadụ, ọ bụ okwu Jehova. Jehoshafat mere ihe a gwara ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Mgbe ya na ndị ya gara izute ndị iro ha, kama idowe ndị agha n’ihu, o dowere ndị na-abụ abụ n’ihu. Jehova emechughị ya ihu. O nyeere ya aka ya emerie ndị iro ya.—2 Ihe 20:18-23.

Ihe ga-eme ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kpebie iji ndụ ha na-ejere Jehova ozi bụ ikpe ekpere na ịmụ Okwu Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8, nke 10)

8. Gịnị ka ndị di nwere ike ịmụta n’aka Jehoshafat?

8 Ndị bụ́ di, o nwere ihe unu ga-amụta n’aka Jehoshafat. Ọ bụ unu ka ilekọta ezinụlọ unu dị n’aka. N’ihi ya, unu kwesịrị ịgbasi mbọ ike chebe ezinụlọ unu ma na-akwado ha. Nsogbu bịara unu, unu nwere ike iche na unu ga-ama ihe unu ga-eme gbasara ya. Ma, unu ekwesịghị ịtụkwasị obi n’ike aka unu, kama, kpeenụ ekpere n’onwe unu maka enyemaka Jehova. Ihe ọzọkwa bụ unu na nwunye unu ikpe ekpere gbasara ya. Unu mụọ Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ nzukọ a bipụtara iji mata ihe bụ́ uche Jehova ma na-eme ihe unu mụtara. E nwere ike ụfọdụ ndị agaghị akwado mkpebi ndị ahụ unu ji ihe e kwuru na Baịbụl mee. Ha nwere ike na-asị na ọ bụ mkpebi iberiibe ka unu mere. Ha nwekwara ike ịna-asị na ọ bụ inweta ego na ihe ndị e ji ya azụta bụ ihe kacha mma unu ga-emere ezinụlọ unu. Ma chetanụ ihe Jehoshafat mere. Ọ tụkwasịrị Jehova obi ma gosi ya n’omume. Jehova agbahapụghị ya. Ọ gaghịkwa agbahapụ unu. (Ọma 37:28; Hib. 13:5) Gịnị ka ndị di na nwunye nwere ike ime iji na-enwe obi ụtọ?

MEENỤ KA IFE JEHOVA BỤRỤ IHE KACHA MKPA NÁ NDỤ UNU OTÚ AHỤ AỊZAYA NA NWUNYE YA MERE

9. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu gbasara Aịzaya onye amụma na nwunye ya?

9 Aịzaya onye amụma na nwunye ya ji ife Jehova mere ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Aịzaya bụ onye amụma. O nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe nwunye ya buru amụma n’ihi na a kpọrọ ya “onye amụma nwaanyị.” (Aịza. 8:1-4) Aịzaya na nwunye ya ji ife Jehova kpọrọ ihe ná ndụ ha. Ihe ndị ha mere ga-abakwara ndị di na nwunye ezigbo uru taa.

10. Olee otú ịmụ gbasara amụma Baịbụl nwere ike isi nyere ndị di na nwunye aka ikpebi ime ike ha niile n’ozi Jehova?

10 Taa, ndị di na nwunye nwere ike ime ka Aịzaya na nwunye ya ma ọ bụrụ na ha ana-eme ike ha niile n’ozi Jehova. Ha nwere ike ịtụkwasịkwu Jehova obi ma ọ bụrụ na ha amụọ gbasara amụma ndị dị na Baịbụl ma chọpụta otú ha si mezuo. * (Taị. 1:2) Ha nwekwara ike iche otú ha si soro na-emezu ụfọdụ amụma ndị Baịbụl buru. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike iso na-emezu amụma Jizọs buru gbasara ozi ọma a ga-ekwusa n’ụwa niile tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 24:14) Ọ bụrụ na di na nwunye ejide n’aka na amụma Baịbụl na-emezu, ọ ga-eme ka ha kpebisikwuo ike ịna-eme ike ha niile n’ozi Jehova.

BUTENỤ IHE GBASARA ALAEZE CHINEKE ỤZỌ DỊ KA PRISILA NA AKWỊLA

11. Gịnị ka Prisila na Akwịla mere, n’ihi gịnịkwa?

11 Ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ nwere ike ịmụta ihe n’aka Prisila na Akwịla. Ha bụ ndị Juu bi na Rom. Ha anụla eziokwu gbasara Jizọs, ghọọkwa Ndị Kraịst. O doro anya na ndụ ha na-atọ ha ụtọ. Ma, ihe gbanwere ná ndụ ha na mberede mgbe Eze Ukwu Klọdiọs nyere ndị Juu iwu ka ha kwapụ na Rom. Chegodị ihe nke ahụ kpataara Akwịla na Prisila. Ọ pụtara na ha ga-ahapụ ebe maara ha ahụ́, chọta ebe ọhụrụ ha ga-anọ na-arụ ọrụ ha bụ́ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Otú a ihe si gbanweere ha ọ̀ ga-eme ka ha ghara ibu ụzọ na-achọ ihe gbasara Alaeze Chineke? O yiri ka ị̀ ma azịza ya. Mgbe Prisila na Akwịla ruru n’ebe ọhụrụ ha bi na Kọrịnt, ha malitere inyere ọgbakọ dị ebe ahụ aka ma soro Pọl onyeozi na-eme ka ụmụnna nọ ebe ahụ dị ike. Ha mechakwara gaa n’obodo ndị ọzọ a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 18:18-21; Rom 16:3-5) Ha nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ, ndụ tọkwara ha ụtọ.

12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye kpebie ihe ndị ha chọrọ ime n’ozi Jehova?

12 Taa, ndị di na nwunye nwere ike ime ka Prisila na Akwịla ma ha na-ebute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ. Oge kacha mma ha ga-eji kwuo ihe ndị ha ga-eme ná ndụ ha bụ tupu ha alụọ. Ọ bụrụ na ha ekpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova ma gbakọọ mbọ ọnụ iji hụ na ha mere ha, ha ga-ahụ ọtụtụ ụzọ Jehova ga-esi na-enyere ha aka ná ndụ ha. (Ekli. 4:9, 12) Ka anyị tụlee akụkọ otu nwanna aha ya bụ Russell na nwunye ya Elizabeth. Russell sịrị: “Tupu anyị alụọ, anyị kwuru hoo haa ihe anyị ga-eme n’ofufe Jehova.” Nwunye ya sịrị: “Ihe mere anyị ji kwuo ya bụ e nwee ihe dapụtaranụ, ọ gaghị agbanwe ihe ahụ anyị kpebiri na mbụ.” Russell na nwunye ya mechara kwaga Maịkronishia ebe ha nọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.

Ihe ga-eme ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kpebie iji ndụ ha na-ejere Jehova ozi bụ ikpebi ihe ha ga-eme n’ofufe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 28:7, olee uru ịtụkwasị Jehova obi na-abara anyị?

13 Dị ka Russell na Elizabeth, ọtụtụ di na nwunye ekpebiela ịghara itinye aka n’ọtụtụ ihe iji nwee ike iji oge buru ibu na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na di na nwunye ekpebie ezigbo ihe ha ga-eme n’ozi Jehova ma gbalịa ime ya, ọtụtụ ihe ọma ga-esi na ya pụta. Ha ga-ahụ otú Jehova ga-esi na-elekọta ha, tụkwasịkwuo ya obi, na-enwekwa ezigbo obi ụtọ.—Gụọ Abụ Ọma 28:7.

TỤKWASỊ NKWA JEHOVA KWERE OBI DỊ KA PITA ONYEOZI NA NWUNYE YA

14. Olee otú Pita onyeozi na nwunye ya si gosi na ha tụkwasịrị nkwa e kwere na Matiu 6:25, 31-34 obi?

14 Ndị di na nwunye nwekwara ike ịmụta ihe n’aka Pita onyeozi na nwunye ya. Mgbe ihe dị ka ọnwa isii ruo otu afọ ya na Jizọs hụchara nke mbụ ya gara, o mere mkpebi dị ezigbo mkpa ná ndụ ya. Ihe Pita ji akpa afọ ya bụ ịkụ azụ̀. N’ihi ya, mgbe Jizọs kpọrọ ya ka o jiri oge ya niile na-eso ya, Pita chebaara ezinụlọ ya echiche mgbe ọ na-ekpebi ihe ọ ga-eme. (Luk 5:1-11) Pita kpebiri iso Jizọs na-aga ekwusa ozi ọma. Mkpebi a o mere dị mma. O nwekwara ezigbo ihe mere anyị ga-eji kweta na nwunye Pita kwadoro mkpebi a o mere. Baịbụl kwuru ihe gosiri na mgbe a kpọlitechara Jizọs Kraịst n’ọnwụ, nwunye Pita so Pita gaa ebe ụfọdụ. (1 Kọr. 9:5) O doro anya na àgwà ọma nwunye Pita kpara dị ka ezigbo Onye Kraịst mere ka Pita nwee ike inye ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ndụmọdụ n’atụghị ụjọ ọ bụla. (1 Pita 3:1-7) O doro anya na Pita na nwunye ya tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga na-egboro ndị butere ihe gbasara Alaeze ya ụzọ ná ndụ ha mkpa ha.—Gụọ Matiu 6:25, 31-34.

15. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Tiago na Esther nwunye ya?

15 Ọ bụrụ na unu alụọla di ma ọ bụ nwunye ruo afọ ole na ole, gịnị ka unu ga-eme ka ọ na-agụ unu agụụ ijekwuru Jehova ozi? Otu ụzọ bụ ịmụ gbasara otú ụfọdụ ndị di na nwunye si jekwuoro Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgụ isiokwu ndị na-agba n’isiokwu bụ́ “Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha.” Isiokwu ndị ahụ nyeere otu di na nwunye bụ́ ndị Brazil aha ha bụ Tiago na Esther aka ikpebisi ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Tiago sịrị: “Ka anyị na-agụ akụkọ ndị gosiri otú Jehova si nyere ndị ya aka n’oge a, anyịnwa chọrọ ịhụ otú ọ ga-adị ma Jehova na-eduzi anyị ma na-elekọta anyị.” Ha mechara kwaga Paragụwaị n’afọ 2014, ebe ha na-eje ozi n’ebe a na-asụ asụsụ Pọtugiiz. Esther nwunye ya sịrị: “Otu amaokwu Baịbụl na-atọ anyị ezigbo ụtọ bụ Ndị Efesọs 3:20. Anyị ahụkwala ọtụtụ ugboro otú ihe e kwuru n’amaokwu ahụ si mezuo n’ozi anyị na-ejere Jehova.” N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Efesọs, o kwuru ihe mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emere anyị karịa ihe anyị rịọrọ ya. Nkwa a e kwere n’amaokwu a emezuola ọtụtụ ugboro.

Ihe ga-eme ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kpebie iji ndụ ha na-ejere Jehova ozi bụ ịgakwuru ndị di na nwunye katara ahụ́ ka ha nyere ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Ole ndị ka di na nwunye lụrụ ọhụrụ chọrọ ijekwuru Jehova ozi nwere ike ịgakwuru ka ha nye ha ndụmọdụ?

16 Ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị di na nwunye ọzọ tụkwasịrị Jehova obi. Ụfọdụ n’ime ha ejirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi oge niile. Ọ́ gaghị adị mma ka unu gakwuru ha ka ha nye unu ndụmọdụ ma ọ bụrụ na unu chọrọ imekwu ihe n’ozi Jehova? Ihe a bụ ụzọ ọzọ unu ga-esi egosi na unu tụkwasịrị Jehova obi. (Ilu 22:17, 19) Ndị okenye nwekwara ike inyere ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ aka ka ha kpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova, nyekwara ha aka ime ya.

17. Gịnị mere Nwanna Klaus na Marisa nwunye ya? Gịnịkwa ka anyị na-amụta n’akụkọ ha?

17 Mgbe ụfọdụ, mkpebi anyị mere ijekwuru Jehova ozi nwere ike ọ gaghị agacha otú anyị tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Nwanna Klaus na Marisa anyị kwuburu okwu ha lụrụ ruo afọ atọ, ha wepụtara onwe ha iso rụọ ụlọ ndị a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Finland. Ma ha mechara chọpụta na a gaghị ekwe ka ha nọrọ ebe ahụ karịa ọnwa isii. Ná mmalite, o wutere ha. Ma, e mechara gwa ha ka ha mụọ asụsụ Arabik. Ugbu a, obi dị ha ụtọ na ha na-ejezi ozi ná mba a na-asụ asụsụ Arabik. Marisa chetara ihe ndị mere n’oge ahụ, ọ sịrị: “Ụjọ tụrụ m ime ihe ndị m na-emetụbeghị mbụ. M kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Ahụla m otú Jehova si nyere anyị aka n’ụzọ ndị anyị na-atụghị anya ha. Ihe ndị a mere ka m tụkwasịkwuo Jehova obi.” Akụkọ a gosiri na obi kwesịrị isi gị ike na Jehova agaghị ahapụ gị ma ị tụkwasị ya obi kpamkpam.

18. Gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ka ha nwee ike ịna-atụkwasị Jehova obi?

18 Alụmdi na nwunye bụ onyinye si n’aka Jehova. (Mat. 19:5, 6) Ọ chọkwara ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. (Ilu 5:18) Ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ, chebaranụ ihe unu ji ndụ unu eme echiche. Ùnu na-eme ihe niile unu nwere ike ime iji gosi Jehova na unu ji onyinye o nyere unu kpọrọ ihe? Kọsaranụ Jehova obi unu. Gaanụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl chọta ihe ndị ga-enyere unu aka. Mezienụ ihe unu mụtara na Baịbụl. Obi sie unu ike na unu ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ebute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ unu.

ABỤ NKE 132 Anyị Bụzi Di na Nwunye

^ par. 5 Mkpebi ụfọdụ anyị na-eme nwere ike ime ka anyị ghara inwe ike na oge anyị ga-eji efe Jehova. E nwere mkpebi ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ ga-eme ga-agbasa ihe ga-eme ná ndụ ha. Isiokwu a ga-enyere ha aka ime mkpebi ndị ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ ná ndụ ha.

^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 10 Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ileba anya n’ihe unu ga-amụta n’ihe e kwuru n’isi nke 6, nke 7, na nke 19 n’akwụkwọ bụ́ Pure Worship of Jehovah—Restored At Last!