Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru

Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru

“Ịhụnanya [Jehova] pụrụ iche na-adịru mgbe ebighị ebi.”—ỌMA 136:1*. *

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe Jehova gbara anyị ume ka anyị na-eme?

Ọ NA-ATỌ Jehova ụtọ igosi ịhụnanya pụrụ iche. (Hos. 6:6*) Ọ na-agbakwa ndị na-efe ya ume ime otú ahụ. Jehova si n’ọnụ Maịka onye amụma gwa anyị ka anyị “na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.” (Maị. 6:8*) O doro anya na anyị kwesịrị ịma ihe bụ́ ịhụnanya pụrụ iche tupu anyị amara otú anyị ga-esi egosi ya mmadụ.

2. Olee ihe e ji ama ịhụnanya pụrụ iche?

2 Gịnị bụ ịhụnanya pụrụ iche? Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl dị na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ kwuru na “ọ pụtara ịhụnanya si n’ala ala obi, ịhụnanya nke na-eme ka otu onye jiri obi ya niile na-akwado onye ọzọ ma ghara ịhapụ ya. Ọ pụtakwara ịhụnanya nke na-eme ka mmadụ na-erube isi. A na-ejikarị ya akọwa otú Chineke si hụ ndị mmadụ n’anya. Ma mmadụ nwekwara ike ịhụ mmadụ ibe ya n’anya otú ahụ.” Ọ bụ Jehova kacha egosi ụdị ịhụnanya a. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si egosi ụmụ mmadụ ịhụnanya pụrụ iche. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ndị na-efe Jehova nwere ike isi ṅomie Jehova ma na-egosi ibe ha ụdị ịhụnanya a.

‘ỊHỤNANYA JEHOVA PỤRỤ ICHE DỊ UKWUU’

3. Olee otú Jehova si mee ka Mosis mata ya?

3 Oge na-adịghị anya ndị Izrel si n’Ijipt pụta, Jehova mere ka Mosis mata aha ya na àgwà ndị o nwere. Ọ gwara ya, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya pụrụ iche na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya, onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 34:6, 7*) Jehova ji ihe ndị a o kwuru gbasara ụdị onye ọ bụ mee ka Mosis mata otu ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ịhụnanya ya pụrụ iche. Gịnị ka ọ bụ?

4-5. (a) Gịnị ka Jehova kwuru gbasara onwe ya? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza?

4 Ihe Jehova na-ekwu abụghị naanị na ya na-egosi ịhụnanya pụrụ iche, kama, na “ịhụnanya ya pụrụ iche dị ukwuu.” E nwere ebe ndị ọzọ e kwuru ihe ndị yiri ya na Baịbụl. (Ọnụ Ọgụ. 14:18; Nehe. 9:17; Ọma 86:15; 103:8; Joel 2:13; Jona 4:2) N’ebe ndị a niile, ọ bụ naanị Jehova ka e kwuru na o nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ọ bụghị ụmụ mmadụ. Ọ dị mkpa ịmata na Jehova si otú a kọwaa onwe ya na Baịbụl. Nke a gosiri na ịhụnanya pụrụ iche dị ya ezigbo mkpa. * Ọ bụ ya mere Eze Devid ji kwuo, sị: “Jehova, ịhụnanya gị pụrụ iche na-eru n’eluigwe . . . Chineke, ịhụnanya gị pụrụ iche enweghị atụ. Ọ bụ n’okpuru nku gị ka ndị mmadụ na-agbaba ka e chebe ha.” (Ọma 36:5, 7*) Dị ka Devid, ànyị ji ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi anyị kpọrọ ihe?

5 Iji nwee ike ịghọtakwu àgwà Jehova a, anyị ga-aza ajụjụ abụọ: Olee ndị Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche? Oleekwa otú o si abara anyị uru?

OLEE NDỊ JEHOVA NA-EGOSI ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE?

6. Ole ndị ka Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche?

6 Olee ndị Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche? Ọ bụ naanị mmadụ ka a na-egosi ịhụnanya pụrụ iche. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche. Ndị ọ na-egosi ụdị ịhụnanya a bụ ndị ya na ha dị n’ezigbo mma. Chineke anyị hụrụ ezigbo ndị enyi ya n’anya. O nwere ihe magburu onwe ya o zubere imere ha. Ọ gaghịkwa ahapụ ime ya.

Jehova na-emere ụmụ mmadụ niile ihe ọma ma ndị na-anaghị efe ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ niile n’anya?

7 Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya. Jizọs gwara otu nwoke aha ya bụ Nikọdimọs, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:1, 16; Mat. 5:44, 45.

Ihe Eze Devid na Daniel onye amụma kwuru gosiri na Jehova na-egosi ndị ma ya, ndị na-atụ egwu ya, ndị hụrụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya ịhụnanya pụrụ iche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8-9. (a) Gịnị mere Jehova ji egosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya?

8 Dị ka anyị kwuburu, ndị Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche bụ naanị ndị ya na ha dị n’ezigbo mma. Ihe Eze Devid na Daniel onye amụma kwuru gosiri na nke a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, Devid sịrị: “Akwụsịla ịhụ ndị ma gị n’anya.” “Jehova na-ahụ ndị na-atụ egwu ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi.” Daniel kwuru, sị: “Jehova bụ́ ezi Chineke, . . . onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, onye na-egosikwa ha na ọ hụrụ ha n’anya.” (Ọma 36:10; 103:17; Dan. 9:4) Ihe ndị a ha kwuru na-egosi na Jehova na-egosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche n’ihi na ha ma ya, na-atụ egwu ya, hụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya. Naanị ndị Jehova na-ahụ n’anya otú a bụ ndị na-efe ya otú ọ chọrọ.

9 Tupu anyị ebido ife Jehova, ọ hụrụ anyị n’anya otú o si hụ mmadụ niile n’anya. (Ọma 104:14) Ugbu a anyị na-efe ya, ọ na-egosi anyị ịhụnanya pụrụ iche. Jehova gwara ndị ohu ya, sị: “M gaghị akwụsị igosi [unu] ịhụnanya pụrụ iche.” (Aịza. 54:10*) Devid chọpụtara na “Jehova ga-emeso onye jisiri ya aka ike ihe otú pụrụ iche.” (Ọma 4:3) Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’ihi otú a Jehova si hụ anyị n’anya? Ọbụ abụ ahụ sịrị: “Onye ọ bụla ma ihe ga-ahụ ihe ndị a ma chebara ịhụnanya Jehova ezigbo echiche.” (Ọma 107:43) Ihe a bụ ihe Jehova chọrọ ka anyị mee. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ụzọ atọ ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi anyị si abara anyị uru.

OLEE OTÚ ỊHỤNANYA PỤRỤ ICHE JEHOVA SI ABARA ANYỊ URU?

Jehova na-emere ndị ohu ya ihe ọma ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 16) *

10. Olee otú ịhụnanya Jehova pụrụ iche nke na-anaghị akwụsị akwụsị si abara anyị uru? (Abụ Ọma 31:7)

10Ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi. E kwuru gbasara ya ugboro iri abụọ na isii n’akwụkwọ Abụ Ọma 136. Amaokwu nke mbụ ya sịrị: “Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya pụrụ iche na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Ọma 136:1*) Malite n’amaokwu nke abụọ ruo na nke iri abụọ na isii, e nwere okwu bụ́ “n’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi” n’amaokwu nke ọ bụla. Ka anyị na-agụ amaokwu ndị a, ọ ga-atọ anyị ụtọ ịhụ ọtụtụ ụzọ Jehova si egosi anyị ịhụnanya ya pụrụ iche n’akwụsịghị akwụsị. Otú e si na-ekwughachi “n’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi” mere ka obi sie anyị ike na ịhụnanya Jehova nwere maka ndị ya anaghị agbanwe agbanwe. Ịmata na Jehova agaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya na-eme ka obi sie anyị ike. Kama ịkwụsị ịhụ ndị enyi ya n’anya, ọ na-anọnyere ha mgbe niile, karịchaa, n’oge nsogbu. Otú o si abara anyị uru: Ịma na Jehova na-anọnyere anyị mgbe niile na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ, na-eme ka anyị nwee ike idi nsogbu ndị bịaara anyị, na-emekwa ka anyị nọgide na-efe ya.—Gụọ Abụ Ọma 31:7.

11. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 86:5, gịnị mere Jehova ji agbaghara?

11Ịhụnanya Chineke pụrụ iche na-eme ka ọ na-agbaghara anyị mmehie. Ọ bụrụ na Jehova ahụ onye mmehie ji obi ya niile chegharịa ma hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, ịhụnanya ya pụrụ iche na-eme ka ọ gbaghara ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru gbasara Jehova, sị: “Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie, ọ naghịkwa akwụ anyị ụgwọ otú ihe ọjọọ anyị na-eme hà.” (Ọma 103:8-11) Devid si n’ihe mere ya mata otú ọ na-adị onye akọnuche ya na-ama ikpe. Ọ makwa na Jehova dị “njikere ịgbaghara.” Olee ihe mere Jehova ji agbaghara? E dere azịza ya n’Abụ Ọma 86:5. (Gụọ ya.) Dịkwa ka Devid kwuru n’ekpere ya, Jehova na-agbaghara mmehie n’ihi ịhụnanya pụrụ iche ọ na-egosi ndị ohu ya.

12-13. Ọ bụrụ na obi anyị ka na-ama anyị ikpe n’ihi ihe ndị anyị mere n’oge gara aga, gịnị ga-enyere anyị aka?

12 Anyị mee mmehie, o kwesịrị iwute anyị. O nwere ike ime ka anyị rịọ mgbaghara ma gbanwee. Ma, e nwere ụfọdụ ndị ohu Chineke obi ha ka na-ama ikpe n’ihi ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. Ọ na-eme ka ha chee na Jehova enweghị ike ịgbaghara ha n’agbanyeghị na ha echegharịala, rịọ Jehova mgbaghara ma kwụsị ime ihe ọjọọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú a ka ọ dị gị, ịghọta na Jehova dị njikere igosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche ga-enyere gị aka.

13Otú o si abara anyị uru. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike iji obi ụtọ na akọnuche dị ọcha na-efe Jehova. Ihe mere o ji kwe omume bụ na ‘ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ anyị mmehie niile.’ (1 Jọn 1:7) Ọ bụrụ na ihe ụfọdụ ị na-emejọ na-eme ka obi na-ada gị mbà, cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ. Lee otú Devid si kwuo ihe jikọrọ ịhụnanya pụrụ iche na mgbaghara mmehie. Ọ sịrị: “Otú a na-enweghị ike ịtụ ihe eluigwe ji dị elu karịa ụwa atụ̀ ka a na-enweghị ike ịtụ ịhụnanya pụrụ iche ọ na-egosi ndị na-atụ egwu ya. Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ bụkwa otú o wepụrụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ.” (Ọma 103:11, 12*) N’eziokwu, Jehova dị njikere ịgbaghara kpamkpam.—Aịza. 55:7.

14. Olee otú Devid si kọwaa otú ịhụnanya pụrụ iche Jehova si echebe anyị?

14Ịhụnanya Jehova pụrụ iche na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya. Mgbe Devid na-ekpe ekpere, ọ gwara Jehova, sị: “Ị bụụrụ m ebe nzuzo. Ị ga-echebe m n’oge nsogbu. Ị ga-eme ka ndị ga-eti mkpu ọṅụ maka na ị napụtala m gbaa m gburugburu. . . . Ịhụnanya Jehova na-echebe onye tụkwasịrị ya obi.” (Ọma 32:7, 10) Otú ahụ mgbidi gbara obodo gburugburu n’oge ochie na-echebe ya, ka ịhụnanya Jehova pụrụ iche na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya. Ihe ọzọkwa bụ na ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-eme ka ọ dọta anyị nso n’ebe ọ nọ.—Jere. 31:3.

15. Olee otú ịhụnanya pụrụ iche Jehova si yie ebe mgbaba na ebe a rụsiri ike?

15 Devid ji ihe atụ ọzọ kọwaa otú Jehova si echebe ndị ya. Ọ sịrị: “Ị bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m, Chineke onye hụrụ m n’anya.” Ọ sịkwara: “Ọ hụrụ m n’anya, ọ bụkwa ebe m a rụsiri ike. Ọ bụ ebe m na-agbaba aka aghara ịkpa m nakwa onye na-anapụta m. Ọ bụ ọta m nakwa Onye m gbabara n’ime ya, Onye na-emeriri m ndị mmadụ.” (Ọma 59:17; 144:2) Olee ihe mere Devid ji jiri ịhụnanya Jehova pụrụ iche tụnyere ebe mgbaba na ebe a rụsiri ike? Ọ bụrụhaala na anyị na-efe Jehova, ọ ga-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya. E kwukwara ihe yiri ihe a n’Abụ Ọma nke iri itoolu na otu. Onye dere abụ ọma ahụ sịrị: “M ga-asị Jehova: ‘Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m a rụsiri ike.’ ” (Ọma 91:1-3, 9, 14) Mosis kwukwara na Jehova bụ ebe mgbaba ya. (Ọma 90:1) Obere oge tupu Mosis anwụọ, o kwukwara ihe ọzọ na-akasi obi. Ọ sịrị: “Chineke bụ ebe mgbaba kemgbe oge ochie. O ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị.” (Diut. 33:27) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “o ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị” na-akọwara anyị gbasara Jehova?

16. Olee ihe ọma abụọ Jehova meere anyị? (Abụ Ọma 136:23)

16 Anyị jiri Jehova mere ebe mgbaba anyị, obi na-eru anyị ala. Ma, e nwere oge ndị anyị nwere ike ịda mbà. N’oge ndị ahụ, gịnị ka Jehova ga-emere anyị? (Gụọ Abụ Ọma 136:23.) Ọ ga-eji aka ya kuru anyị ma nyere anyị aka ibili. (Ọma 28:9; 94:18) Otú o si abara anyị uru: Ịma na anyị nwere ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe niile ga-enyere anyị aka ịma ihe ọma abụọ Jehova meere anyị. Nke mbụ, anyị nwere ebe mgbaba siri ezigbo ike n’agbanyeghị ebe anyị bi. Nke abụọ, Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị.

IHE MERE ỊHỤNANYA JEHOVA PỤRỤ ICHE JI EME KA OBI SIE ANYỊ IKE

17. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya n’ihi ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi anyị? (Abụ Ọma 33:18-22)

17 Dị ka anyị tụlere, ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere ya isi. (2 Kọr. 4:7-9) Jeremaya onye amụma sịrị: “Ọ bụ ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi mere na anyị anwụchabeghị, n’ihi na ebere ya anaghị agwụ agwụ.” (Ákwá 3:22*) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anọgide na-egosi anyị ịhụnanya ya pụrụ iche n’ihi na dị ka otu ọbụ abụ kwuru: “Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ, bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya pụrụ iche.”—Gụọ Abụ Ọma 33:18-22*.

18-19. (a) Gịnị ka anyị mụtara? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Gịnị ka anyị mụtara? Tupu anyị ebido ife Jehova, ọ hụrụ anyị n’anya otú o si hụ mmadụ niile n’anya. Ma, ugbu a anyị malitere ife ya, ọ na-egosi anyị ịhụnanya ya pụrụ iche. Ịhụnanya ahụ na-eme ka Jehova na-echebe anyị. Ọ ga-anọgide na-eme ka anyị nọrọ ya nso, mezuokwa nkwa ndị o kwere anyị. Ọ chọrọ ka anyị bụrụ ndị enyi ya ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 46:1, 2, 7) N’ihi ya, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị, Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji nọgide na-erubere ya isi.

19 Anyị ahụla otú Jehova si egosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche. Ọ chọkwara ka anyị na-egosi ụmụnna anyị ụdị ịhụnanya a. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Anyị ga-atụle ihe a dị mkpa n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 136 Ka Jehova Kwụọ Gị “Ụgwọ Ọrụ Zuru Ezu”

^ par. 3 N’Ụlọ Nche a, akara kpakpando (*) e tinyere n’akụkụ amaokwu Baịbụl na-egosi ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu ahụ.

^ par. 5 Gịnị bụ ịhụnanya pụrụ iche? Olee ndị Jehova na-egosi ụdị ịhụnanya a, oleekwa otú o si abara ha uru? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a na nke mbụ n’ime isiokwu abụọ kwuru gbasara àgwà a pụrụ iche.

^ par. 4 Amaokwu ndị ọzọ gosiri na Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche dị ukwuu bụ: Nehemaya 13:22; Abụ Ọma 69:13; 106:7; Abụ Ákwá 3:32.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, ma ndị ohu ya. Ihe ndị e sere n’elu ndị a nọ ebe a na-egosi ụzọ dị iche iche Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Nke kachanụ n’ime ha bụ Jizọs Kraịst o ji chụọ àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Jehova na-egosi ndị na-efe ya ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst ịhụnanya pụrụ iche. N’agbanyeghị na Jehova hụrụ ha n’anya otú o si hụ mmadụ niile n’anya, ịhụnanya nke o nwere n’ebe ha nọ pụrụ iche. Ihe ndị e sere n’elu ndị a nọ ebe a na-egosi ụzọ dị iche iche Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya.