Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Mọdekaị ọ̀ dịrị ndụ n’eziokwu?

ONYE Juu aha ya bụ Mọdekaị rụrụ ọrụ dị mkpa n’ihe ndị Baịbụl kọrọ mere n’akwụkwọ Esta. O so ná ndị Juu a dọọrọ n’agha. Ọ na-ejekwa ozi n’obí eze ndị Peshịa. Ihe a mere obere oge afọ 500 Tupu Oge Ndị Kraịst gachara, “n’oge [Eze] Ahazuirọs na-achị.” (Taa, ọtụtụ ndị kwetara na eze a bụ Zaksis nke Mbụ) Mọdekaị mere ka nkata a kpara igbu eze ahụ ghara inwe isi. Otú obi si tọọ eze ụtọ mere ka ọ hazie ka a kwanyere Mọdekaị ùgwù n’ihu ọhaneze. E nwere otu nwoke aha ya bụ Heman. Ọ bụ onye iro Mọdekaị na ndị Juu ndị ọzọ. Mgbe ọ nwụchara, eze buliri Mọdekaị n’ọkwá, mee ya osote eze. Ọkwá ahụ mere ka Mọdekaị nwee ike inye iwu zọrọ ndị Juu ndụ ka a ghara igbukpọ ha n’Alaeze Ukwu Peshịa.​—Esta 1:1; 2:5, 21-23; 8:1, 2; 9:16.

Ụfọdụ ndị na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie kwuru na akwụkwọ Esta bụ akụkọ ifo, nakwa na e nweghị onye bitụrụla n’ụwa a aha ya bụ Mọdekaị. Ma n’afọ 1941, ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie hụrụ ihe nwere ike igosi na ihe ndị Baịbụl kọrọ banyere Mọdekaị bụ eziokwu. Gịnị ka ha hụrụ?

Ndị na-eme nchọpụta hụrụ ihe ndị Peshịa ji ụdị ide ihe a na-akpọ kunifọm dee banyere otu nwoke a kpọrọ Marduka. (Otú e si ede ya n’Igbo bụ Mọdekaị). Ọ bụ onye ọchịchị n’obodo Shushan. O nwere ike ịbụ onye na-agụkọ ego. Mgbe a hụrụ ihe ahụ ndị Peshịa dere, otu ọkachamara n’akụkọ gbasara ihe mere n’oge ochie, aha ya bụ Arthur Ungnad, kwuru na ‘e wepụ Baịbụl, ọ bụ naanị kunifọm ahụ bụ ebe ọzọ kwuru gbasara Mọdekaị.’

Kemgbe Ungnad dechara ihe ahụ, ndị ọkà mmụta asụgharịala ọtụtụ puku kunifọm ndị ọzọ bụ́ nke ndị Peshia. Ụfọdụ n’ime ha bụ mbadamba ụrọ ndị a hụrụ n’ebe bụ́bu obodo Pesepọlis. A hụrụ ha n’ebe a na-edowebu akụ̀, n’akụkụ mgbidi obodo ahụ. A chọpụtara na ọ bụ n’oge Zaksis nke Mbụ na-achị ka e dere ihe ndị dị ná mbadamba ụrọ ndị ahụ. E dere ha n’asụsụ ndị Elam. Ọtụtụ aha ndị dị n’akwụkwọ Esta dịkwa na ha. a

Otú e si dee Mọdekaị (Marduka) n’ihe ahụ ndị Peshịa dere n’oge ochie

Ihe e dere n’ụfọdụ mbadamba ụrọ ndị ahụ a hụrụ na Pesepọlis kpọrọ aha ahụ bụ́ Marduka, kwuokwa na ọ bụ odeakwụkwọ n’obí eze dị na Shushan n’oge Zaksis nke Mbụ na-achị. Otu n’ime ha kwuru na Marduka bụ onye nsụgharị. Ihe ahụ o kwuru dabara adaba n’otú Baịbụl si kọwaa Mọdekaị. O jeere Eze Ahazuirọs (ya bụ, Zaksis nke Mbụ) ozi. Ọ na-asụkwa ọ dịkarịa ala, asụsụ abụọ. Mọdekaị na-anọkarị n’ọnụ ụzọ ámá eze n’obí eze dị na Shushan. (Esta 2:19, 21; 3:3) Ọnụ ụzọ ámá a bụ nnukwu ụlọ, bụrụkwa ebe ndị na-eje ozi n’obí eze na-anọ eje ozi.

E nwere ụzọ ndị pụrụ iche Marduka a a kpọrọ aha ya n’ihe ahụ e dere ná mbadamba ụrọ ndị ahụ si yie Mọdekaị e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ha dịrị ndụ n’otu oge, nwee otu ọkwá, rụọkwa otu ụdị ọrụ ahụ. O yiri ka ihe ndị a niile hà na-egosi na Marduka na Mọdekaị bụ otu onye ahụ.

a N’afọ 1992, otu prọfesọ aha ya bụ Edwin M. Yamauchi dere aha iri dị ná mbadamba ụrọ ndị ahụ a hụrụ na Pesepọlis. Aha ndị ahụ dịkwa n’akwụkwọ Esta.