Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Kwụsị Ife Jehova

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Kwụsị Ife Jehova

“Jehova, m tụkwasịrị gị obi.”​—ỌMA 31:14.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso?

 JEHOVA gwara anyị ka anyị bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Ọ chọrọ ịbụ Chineke anyị, Nna anyị, na Enyi anyị. Ọ na-aza ekpere anyị, na-enyekwara anyị aka n’oge ihe siri ike. Ọ na-eji nzukọ ya akụziri anyị ihe ma na-echebe anyị. Ma, gịnị ka anyị ga-eme iji bịaruo Jehova nso?

2. Olee otú anyị nwere ike isi bịaruo Jehova nso?

2 Anyị nwere ike ịbịaru Jehova nso ma anyị na-ekpe ekpere, na-amụ Okwu ya, na-atụgharịkwa uche na ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga-ahụkwu ya n’anya, obi ana-adịkwu anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Anyị ga-achọ ịna-erubere ya isi ma na-eto ya n’ihi na ọ bụ ya ka o ruuru. (Mkpu. 4:11) Ọ bụrụ na anyị ana-amatakwu Jehova, anyị ga na-atụkwasịkwu ya na ọgbakọ ya o ji enyere anyị aka obi.

3. Olee otú Ekwensu si agba mbọ ka anyị kwụsị ife Jehova? Ma, gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịhapụ Jehova na nzukọ ya? (Abụ Ọma 31:13, 14)

3 Ma, Ekwensu na-agba mbọ ka anyị hapụ Jehova, karịchaa, ma nsogbu bịara anyị. Olee otú o si eme ya? Ọ na-eji nwayọọ nwayọọ agbalị ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Ma, anyị ga-alụsoli ya ọgụ. Anyị agaghị ahapụ Jehova na nzukọ ya ma ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ike, anyị atụkwasịkwa ya obi anyị niile.​—Gụọ Abụ Ọma 31:13, 14.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná nsogbu atọ nwere ike isi n’aka ndị na-anọghị n’ọgbakọ bịara anyị. Nke ọ bụla n’ime ha nwere ike ime ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Olee otú nsogbu ndị ahụ nwere ike isi eme ka anyị kwụsị ife Jehova? Oleekwa ihe anyị nwere ike ime ka mbọ Setan kụọ afọ n’ala?

MGBE IHE SIIRI ANYỊ IKE

5. Olee otú nsogbu nwere ike isi eme ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi?

5 Mgbe ụfọdụ, ihe na-esiri anyị ike. O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ anyị na-akpagbu anyị ma ọ bụ na anyị enweghịzi ọrụ. Olee otú nsogbu ndị a nwere ike isi eme ka anyị ghara ịtụkwasị nzukọ Jehova obi, meekwa ka anyị kwụsị ife Jehova? Ọ bụrụ na nsogbu bịaara anyị ekweghị ala ala, anyị nwere ike iche na olileanya adịghịzi, ike ụwa agwụkwa anyị. Setan na-eji ụdị oge a eme ka anyị chewe na Jehova ahụghịzi anyị n’anya. Ọ chọrọ ka anyị chewe na ọ bụ Jehova ma ọ bụ nzukọ ya mere ka anyị na-ata ahụhụ. Ụdị ihe a mere ụfọdụ ndị Izrel n’Ijipt. Ná mmalite, ha kwetara na Jehova họpụtara Mosis na Erọn ka ha mee ka ha kwụsị ịgba ohu. (Ọpụ. 4:29-31) Ma, mgbe Fero mere ka ihe sikwuoro ha ike, ha malitere ịta Mosis na Erọn ụta, sị ha: “Unu emeela ka Fero na ndị na-ejere ya ozi kpọọ anyị asị. Unu enyekwala ha mma agha ka ha gbuo anyị.” (Ọpụ. 5:19-21) Ha tara ndị ohu Jehova ụta. Ihe a adịtụdịghị mma. Ọ bụrụ na nsogbu bịaara gị ekweghị ala ala, gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịkwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi?

6. Gịnị ka anyị mụtara n’aka Habakọk onye amụma gbasara otú anyị ga-esi die nsogbu bịaara anyị? (Habakọk 3:17-19)

6 Kpee ekpere kọọrọ Jehova otú ọ dị gị n’obi, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-enyere gị aka. Ọtụtụ nsogbu bịaara Habakọk onye amụma. O nwere ebe o ruru, ya adịzie ka ò chere na ihe banyere ya anaghị emetụ Jehova n’obi. N’ihi ya, o kpere ekpere kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. Ọ sịrị: “Jehova, olee mgbe m ga-etiru mkpu ka i nyere m aka, gị anụ? . . . Gịnịkwa mere i ji hapụ ndị na-emegbu ndị ọzọ?” (Hab. 1:2, 3) Jehova zara ekpere ahụ Habakọk ji obi ya niile kpee. (Hab. 2:2, 3) Mgbe Habakọk chere gbasara otú Jehova si zọpụta ndị ya, ọ malitekwara inwe obi ụtọ. Obi sikwara ya ike na ihe banyere ya na-emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ ga-enye ya ike idi nsogbu ọ bụla. (Gụọ Habakọk 3:17-19.) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara gị, kpee ekpere kọọrọ Jehova otú obi dị gị. Tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-enyere gị aka. I mee otú ahụ, obi ga-esi gị ike na Jehova ga-enye gị ike ị ga-eji edi nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na ị hụ otú o si nyere gị aka, ị ga-enwekwu okwukwe na ya.

7. Gịnị ka onye ikwu Nwanna Nwaanyị Shirley gbalịrị ime ka o kweta? Gịnị mere na ọ kwụsịghị inwe okwukwe na Jehova?

7 Na-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma. Ọ bụ ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Shirley aka mgbe nsogbu bịaara ya. b Ọ bụ onye Papụa Niu Gini. Ezinụlọ Nwanna Nwaanyị Shirley dara ogbenye. Mgbe ụfọdụ, o siiri ha ike inweta nri ga-ezuru ha. Otu onye ikwu ha gbalịrị ime ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. Ọ sịrị nwanna nwaanyị a: “Ọ̀ kwa ị sị na mmụọ nsọ Chineke na-enyere gị aka? Oleekwanụ aka ọ na-enyere gị? Ezinụlọ unu ka dara ogbenye. Ozi ọma ị na-aga bụ igbu oge gị.” Nwanna Nwaanyị Shirley sịrị: “M jụrụ onwe m, sị: ‘Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi, ka ọ̀ bụ na ọ naghị emetụ ya?’ N’ihi ya, m kpere ekpere ozugbo, gwa Jehova ihe niile dị m n’obi. Akwụsịghị m ịgụ Baịbụl na akwụkwọ anyị. Akwụsịghịkwa m ikwusa ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe.” Ọ dịghị anya, ya achọpụta na Jehova na-elekọta ezinụlọ ha. E nweghị mgbe ha na-enweghị nri ha ga-eri, ha na-enwekwa obi ụtọ. Nwanna Nwaanyị Shirley sịrị: “M chọpụtara na Jehova na-aza ekpere m.” (1 Tim. 6:6-8) Ọ bụrụ na ị kwụsịghị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma, ị gaghịkwa ekwe ka ihe isi ike ma ọ bụ obi abụọ mee ka ị kwụsị ife Jehova.

MGBE A NA-EMESI NDỊ NA-EDUZI ỌGBAKỌ IKE

8. Gịnị nwere ike ime ụmụnna Jehova ji eduzi nzukọ ya?

8 Ndị iro anyị na-esi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi nakwa n’Ịntanet akọsa ihe na-abụghị eziokwu banyere ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya. (Ọma 31:13) A nwụchiela ụfọdụ ụmụnna, ma bo ha ebubo na ha bụ ndị omekome. Ụdị ihe a mekwara Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs mgbe e boro Pọl onyeozi ebubo ụgha ma nwụchie ya. Gịnị ka ha mere?

9. Gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst mere mgbe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ?

9 Ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs kwụsịrị inyere Pọl onyeozi aka mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom. (2 Tim. 1:8, 15) N’ihi gịnị? Ihere ọ̀ nọ na-eme ha na ọhaneze weere Pọl ka onye omekome? (2 Tim. 2:8, 9) Ka ọ̀ bụ na ụjọ bịara ha na a ga-akpagbukwa hanwa? N’agbanyeghị ihe kpatara ya, chegodị otú obi dị Pọl n’oge ahụ. O diela ọtụtụ nsogbu maka ha. E nwedịrị mgbe o ji maka ha mee ihe gaara eme ka e gbuo ya. (Ọrụ 20:18-21; 2 Kọr. 1:8) Ka anyị ghara ime ka ndị ahụ gbaara Pọl ọsọ mgbe ọ nọ ná nsogbu. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe a na-akpagbu ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya?

10. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma a kpagbuwe ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya, n’ihi gịnịkwa?

10 Cheta ihe mere e ji akpagbu anyị na onye na-akpata ya. Timoti nke Abụọ 3:12 sịrị: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.” N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya ma Ekwensu kpagbuwe ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya. Ihe ọ chọrọ bụ ka mkpagbu ahụ mee ka ha kwụsị irubere Jehova isi, menyekwa anyị ụjọ.​—1 Pita 5:8.

N’agbanyeghị na a tụrụ Pọl mkpọrọ, Onesịfọrọs ji obi ike kwado ya. Taa, ụmụnna anyị na-akwado ụmụnna ha a tụrụ mkpọrọ, dị ka e gosiri na foto a (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Onesịfọrọs mere? (2 Timoti 1:16-18)

11 Akwụsịla ịkwado ụmụnna gị. (Gụọ 2 Timoti 1:16-18.) Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ, otu nwanna aha ya bụ Onesịfọrọs emeghị ka ụmụnna ndị ọzọ. ‘Agbụ ígwè e kere Pọl emeghị ya ihere.’ Kama, ọ chọrọ Pọl, chọta ya ma nyere ya aka nweta ihe ndị dị ya mkpa. Onesịfọrọs mere ihe ndị ahụ n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe a o mere? Anyị ekwesịghị ikwe ka egwu mmadụ mee ka anyị ghara inyere ụmụnna anyị aka mgbe a na-akpagbu ha. Kama, ka anyị na-agbachitere ụmụnna anyị ma na-enyere ha aka. (Ilu 17:17) Anyị kwesịrị ịhụ ha n’anya ma na-akwado ha.

12. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa na-eme?

12 Chegodị otú ụmụnna anyị nọ na Rọshịa si enyere ụmụnna ha a tụrụ mkpọrọ aka. Mgbe a na-ekpe ụfọdụ n’ime ha ikpe n’ụlọikpe, ọtụtụ ụmụnna anyị na-abịa n’ụlọikpe ịkwado ha. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? E kwutọwa ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya, nwụchie ha ma ọ bụ na-akpagbu ha, atụla ụjọ. Na-echeta ha n’ekpere, na-enyere ndị ezinụlọ ha aka, na-achọkwa ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi na-akwado ha.​—Ọrụ 12:5; 2 Kọr. 1:10, 11.

MGBE A NA-AKWA ANYỊ EMO

13. Olee otú ọchị a na-achị anyị nwere ike isi mee ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi?

13 Ndị ikwu anyị na-abụghị Ndị Kraịst, ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ịna-achị anyị ọchị n’ihi na anyị na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụ n’ihi na anyị na-erubere iwu Jehova isi. (1 Pita 4:4) Ha nwere ike ịsị anyị: “Ihe gị masịrị m. Ma, okpukpe unu ahụ anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Unu amaghịzi nke ekwe na-akụ.” Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-akatọ anyị maka otú anyị si emeso ndị a chụrụ n’ọgbakọ. Ha nwere ike ịna-asị anyị: “Olee otú ị ga-esi na-ekwu na ị hụrụ mmadụ ibe gị n’anya?” Ụdị okwu a nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ. Anyị nwere ike ichewe, sị: ‘Jehova ọ̀ chọrọ ka m mee ihe m na-agaghị emeli? Ọgbakọ ya ọ̀ na-eke mmadụ agbụ?’ A gwa gị ụdị ihe a, gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịhapụ Jehova na nzukọ ya?

Job ekwetaghị ụgha ndị sị na ha bụ ndị enyi ya ghara iji kwaa ya emo. Kama, o kpebisiri ike na ọ ga na-erubere Jehova isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ndị ọzọ na-akwa anyị emo maka na anyị na-erubere iwu Jehova isi? (Abụ Ọma 119:50-52)

14 Kpebisie ike na ị ga na-erubere Jehova isi. Job rubeere Jehova isi n’agbanyeghị emo a na-akwa ya maka ya. Otu n’ime ndị sị na ha bụ ndị enyi Job chọdịrị ime ka o kweta na Jehova achọghị ịma ma ọ̀ na-erubere ya isi ma ọ bụ na ọ naghị erubere ya isi. (Job 4:17, 18; 22:3) Ma Job ekweghị ekweta ụgha ahụ. Ọ ma na ihe ọ bụla Jehova kwuru gbasara ihe dị mma na ihe na-adịghị mma ziri ezi. O kpebisikwara ike ịna-erubere ya isi. O kweghị ka ndị ọzọ mee ka ọ kwụsị ịna-eme ezi omume. (Job 27:5, 6) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ekwela ka ọchị a na-achị gị mee ka ị kwụsị irubere Jehova isi. Chee banyere ihe ndị merela ná ndụ gị. Ọ̀ bụ na ị hụbeghị ọtụtụ ugboro na iwu Jehova ziri ezi nakwa na ọ na-abara gịnwa uru? Kpebisie ike na ị ga-anọ n’ọgbakọ nakwa na ị ga na-erubere iwu ndị ahụ isi. I mee otú ahụ, e nweghị ụdị ịkwa emo ga-eme ka ị kwụsị ife Jehova.​—Gụọ Abụ Ọma 119:50-52.

15. Gịnị mere e ji kwaa Nwanna Nwaanyị Brizit emo?

15 Chegodị banyere ihe e mere otu nwanna nwaanyị bi n’India aha ya bụ Brizit. Ndị ezinụlọ ya kwara ya emo n’ihi ihe o kweere. Mgbe o mechara baptizim n’afọ 1997, obere oge agaa, a chụrụ di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova n’ọrụ. N’ihi ya, di Brizit kpebiri ịkpọrọ ya na ụmụ nwaanyị atọ ha mụtara gaa biri na nke nne na nna ya n’obodo ọzọ. Ma, nsogbu ndị ka ndị a ka ga-abịara Nwanna Nwaanyị Brizit. Ebe ọ bụ na di ya enweghịzi ọrụ, ọ ga-eji oge ya niile na-arụ ọrụ ka o nwee ike ịna-elekọta ezinụlọ ha. Ihe ọzọ bụ na isi ebe ahụ ruo n’ọgbakọ kacha dịrị ha nso dị ihe dị ka narị kilomita atọ na iri ise. Ọ dị mwute na ndị ezinụlọ di ya bidoro inye ya nsogbu maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Otú nsogbu ahụ si sie ike mere ka Nwanna Nwaanyị Brizit hà kwapụkwa ọzọ. Ka oge na-aga, di ya nwụrụ na mberede. Ọrịa kansa mechara gbuo nwa ya nwaanyị dị naanị afọ iri na abụọ. Nke ka njọ bụ na ndị ikwu Nwanna Nwaanyị Brizit kwuru na ọ bụ ya kpatara ọdachi ndị ahụ. Ha sịrị na ọdachi niile ahụ agaraghị eme ma a sị na ọ bụghị Onyeàmà Jehova. Ma, ọ kwụsịghị ịtụkwasị Jehova obi, ọ hapụghịkwa ọgbakọ ya.

16. Olee otú Jehova si gọzie Nwanna Nwaanyị Brizit maka na ọ hapụghị ya na ọgbakọ ya?

16 Ebe ọ bụ na Nwanna Nwaanyị Brizit bi n’ebe dị ezigbo anya n’ebe ọgbakọ dị, otu onye nlekọta sekit gbara ya ume ka ọ na-ezi ozi ọma n’ebe ahụ o bi ma na-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ya. Ná mmalite, nwanna nwaanyị a chere na ya agaghị emeli ya. Ma, o mere ihe ahụ a gwara ya. O bidoro izi ndị ọzọ ozi ọma, na-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ya, wepụtakwa oge ya na ụmụ ya ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ. Olee uru ihe ndị ahụ o mere bara? Nwanna Nwaanyị Brizit mụụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl, ọtụtụ n’ime ha emeekwa baptizim. N’afọ 2005, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Jehova gọziri ya maka na ọ tụkwasịrị ya obi, nọsiekwa ike n’ọgbakọ ya. Ụmụ ya ji obi ha niile na-efe Jehova. E nwekwara ọgbakọ abụọ n’ebe ahụ ugbu a. Obi siri Nwanna Nwaanyị Brizit ike na ọ bụ Jehova nyere ya ike imeri nsogbu ndị ahụ nakwa idi emo ahụ ndị ikwu ya nọ na-akwa ya.

NA-ERUBERE JEHOVA NA ỌGBAKỌ YA ISI MGBE NIILE

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 Setan chọrọ ka anyị kweta na Jehova na-ahapụ anyị ma nsogbu bịara anyị, nakwa na ọgbakọ ya ga-eme ka ihe sikwuoro anyị ike. Setan chọrọ ka ụjọ bịa anyị ma a katọwa ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya, na-akpagbu ha, ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ. Ọ chọkwara iji emo a na-akwa anyị mee ka anyị kwụsị ịtụkwasị iwu Jehova na nzukọ ya obi. Ma, anyị ma ụzọ aghụghọ ọ chọrọ isi nweta anyị. Anyị agaghị ekwe ka ọ ghọgbuo anyị. (2 Kọr. 2:11) Kpebisie ike na ị ga-ajụ ụgha Ekwensu niile ma na-erubere Jehova na nzukọ ya isi. Cheta na Jehova emekataghị hapụ gị. (Ọma 28:7) N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị kwụsị ife Jehova.​—Rom 8:35-39.

18. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

18 N’isiokwu a, anyị ekwuola nsogbu ndị nwere ike isi n’aka ndị na-anọghị n’ọgbakọ bịara anyị. Ma, nsogbu ndị si n’ọgbakọ bịara anyị nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Olee otú anyị nwere ike isi merie nsogbu ndị ahụ? Ọ bụ ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 118 Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike

a Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-atachi obi n’oge ikpeazụ a, anyị ga na-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Ekwensu na-agbalị iji ọnwụnwa ndị na-abịara anyị mee ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu banyere ihe atọ Ekwensu na-eme nakwa ihe anyị ga-eme ka mbọ ọ na-agba kụọ afọ n’ala.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.