Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

“M Chọrọ Ịna-arụrụ Jehova Ọrụ”

“M Chọrọ Ịna-arụrụ Jehova Ọrụ”

ANYỊ gara leta ụmụnna ndị nọ n’obere ìgwè ndị e nwere n’ebe dị nso n’obodo Granbori, n’ime ime oké ọhịa obodo Surinama. Mmiri na-ezokarịkwa na ya. Mgbe anyị na-ala, anyị feere ha aka, banyezie n’otu ụgbọ mmiri e ji osisi rụọ ma si n’Osimiri Tapanahoni gawa. Ka ụgbọ anyị na-agbafe n’ebe mmiri ya na-asọsi ike, nke na-emighị emi, otu ihe dị ná njin a rụnyere n’azụ ụgbọ ahụ kụrụ n’otu nkume. Ozugbo ahụ, ihu ụgbọ mmiri ahụ banyere n’ime mmiri, mmiri erikpuo anyị. Obi wụnyere m n’afọ. Ọ bụ eziokwu na kemgbe m bụ onye nlekọta sekit, m na-eji ụgbọ mmiri aga ebe dị iche iche, amaghị m otú e si egwu mmiri.

Tupu mụ akọọ ihe mechara mee, ka m kọọrọ gị otú m si bido ozi oge niile.

A mụrụ m n’afọ 1942 n’ọmarịcha agwaetiti a na-akpọ Kurasau, nke dị n’Oké Osimiri Karịbian. Papa m bụ onye Surinama, ma ọrụ ya mere ka ọ kwaga n’agwaetiti ahụ. Papa m so ná ndị mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova e mere baptizim na Kurasau afọ ole na ole tupu a mụọ m. a Ọ na-amụrụ anyịnwa bụ́ ụmụ ya Baịbụl n’izu ọ bụla n’agbanyeghị na anyị anaghị achọ ịmụ ihe mgbe ụfọdụ. Mgbe m dị afọ iri na anọ, papa m kpọ anyị laa obodo ya bụ́ Surinama ka o nwee ike ịna-elekọta mama ya merela agadi.

INWE EZIGBO NDỊ ENYI NYEERE M AKA

Na Surinama, mụ na ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ malitere ịna-akpakọrịta. Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova. Ha tọrọ m afọ ole na ole, bụrụkwa ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ihu na-abụ ha sọ aṅụrị ma ha kọwa ihe ndị mere n’ozi ọma. A gbasaa ọmụmụ ihe, mụ na ndị enyi m na-ekwurịtakwa gbasara Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ mgbe anyị nọ n’èzí na-ele kpakpando. Ndị enyi m ndị ahụ nyeere m aka ịmata ihe m chọrọ ime ná ndụ. M chọrọ ịna-arụrụ Jehova ọrụ. N’ihi ya, m mere baptizim mgbe m dị afọ iri na isii, malitekwa ịsụ ụzọ oge niile mgbe m dị afọ iri na asatọ.

M MỤTARA IHE NDỊ BARA URU

Mgbe m na-asụ ụzọ na Paramaribo

M mụtara ọtụtụ ihe mgbe m bụ ọsụ ụzọ. Ihe ndị ahụ m mụtara abaarala m uru kemgbe ọtụtụ afọ m jewere ozi oge niile. Dị ka ihe atụ, otu n’ime ihe ndị mbụ m mụtara bụ na ịzụ ndị ọzọ bara uru. Mgbe m bidoro ịsụ ụzọ oge niile, otu onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Willem van Seijl gosiri m na ihe m masịrị ya. b Ọ kụziiri m ọtụtụ ihe banyere otú e si arụ ọrụ ọgbakọ. N’oge ahụ, amaghịdị m na ọzụzụ ahụ dị m ezigbo mkpa. N’afọ na-eso ya, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. M malitekwara inyere ụfọdụ ụmụnna aka, bụ́ ndị nọ n’obere ìgwè ndị dị n’ime ime oké ọhịa Surinama. Ebe ndị ahụ dịpụrụ adịpụ n’ebe ọgbakọ ndị ọzọ dị. Obi dị m ezigbo ụtọ maka ihe Nwanna Willem van Seijl na ụmụnna ndị ọzọ kụziiri m. Kemgbe ahụ, m na-agbalịsi ike iwepụta oge na-azụ ndị ọzọ otú ahụ ha meere m.

Ihe nke abụọ m mụtara bụ na mmadụ ịhazi ndụ ya ahazi ma ghara ịna-ebi ndụ okomoko na-aba uru. Ná mbido ọnwa ọ bụla, mụ na ọsụ ụzọ pụrụ iche mụ na ya na-ejekọ ozi na-ahazi nri na ihe ndị ọzọ ga-adị anyị mkpa n’izu ndị dị n’ọnwa ahụ. Otu onye n’ime anyị na-aga n’isi obodo ahụ, zụta ihe ndị ahụ dị anyị mkpa. Anyị na-akpachapụ anya emefu ego mmachi akpa a na-enye anyị n’ọnwa, jirikwa nwayọọ na-eri ihe anyị zụtara ka o nwee ike izuru anyị n’ọnwa ahụ. E nwee ihe gwụnahụrụ anyị ebe ahụ, ọ ga-esi ike ịhụ onye ga-enyere anyị aka. Ekwetara m na ihe nyeere m aka ilekwasị anya n’ọrụ Jehova ná ndụ m niile bụ na mgbe m ka na-eto eto, m mụtara ịhazi ndụ m ahazi ma ghara ịna-ebi ndụ okomoko.

Ihe nke atọ m mụtara bụ uru ọ na-aba iji asụsụ obodo mmadụ akụziri ya ihe. M bidoro mgbe m dị obere sụwa asụsụ Dọch, Bekee, Papịamento, nakwa Sranantongo (nke a na-akpọkwa Sranan). Ọ bụ asụsụ a na-asụkarị na Surinama. Ma, n’obodo ahụ dị n’oké ọhịa, achọpụtara m na ndị mmadụ na-aka ege ntị n’ozi ọma ma anyị jiri asụsụ obodo ha na-ezi ha ozi ọma. O siiri m ike ịsụ ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ, dị ka Saramekan, nke nwere ụda elu na ụda ala. Obi dị m ụtọ na m gbalịrị mụta ya n’agbanyeghị na ọ dịghịrị m mfe. Kemgbe ọtụtụ afọ, m kụzierela ọtụtụ ndị Baịbụl n’ihi na m na-asụ asụsụ obodo ha.

Ma, e nwere ihe ụfọdụ merenụ mere m ihere. Dị ka ihe atụ, e nwere otu oge m chọrọ ịjụ onye m na-amụrụ Baịbụl na-asụ Saramekan otú o mere n’ihi na afọ na-arụ ya. Ma, ihe m jụrụ ya bụ ma ọ̀ dị ime. Ajụjụ ahụ m jụrụ ya menyere ya ihere. N’agbanyeghị na e nwere mgbe ụfọdụ m kwuhiere ihe m chọrọ ikwu, m gbalịsiri ike na-asụ asụsụ obodo ndị m na-ezi ozi ọma.

ỊRỤ ỌRỤ NDỊ ỌZỌ E NYERE M

N’afọ 1970, a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit. N’afọ ahụ, m gara gosi ọtụtụ obere ìgwè ndị dị n’ebe dịpụrụ adịpụ n’oké ọhịa Surinama ihe nkiri slaịd isiokwu ya bụ “Ileta Isi Ụlọ Ọrụ Ụwa Niile nke Ndịàmà Jehova.” Mụ na ụfọdụ ụmụnna na-eji ụgbọ mmiri dị ogologo e ji osisi rụọ garuo ebe ụmụnna ndị ahụ nọ. Anyị na-eji ụgbọ mmiri anyị buru njin ọkụ, obere ihe e ji agbanye mmanụ ụgbọala, ọkụ tili, na ihe e ji egosi ihe nkiri slaịd. Anyị ruo ebe ụgbọ ahụ ga-akwụsị, anyị eburu ihe ndị ahụ niile tinye isi n’obodo ahụ dị n’oké ọhịa, ruo ebe anyị ga-anọ gosi ihe nkiri slaịd ahụ. Ma, ihe m kacha echeta gbasara ịga ebe ndị ahụ bụ otú ihe omume ahụ si atọ ndị ahụ bi n’ebe dịpụrụ adịpụ ezigbo ụtọ. Obi bụ m sọ aṅụrị na m nyeere ndị ọzọ aka ha amụta banyere Jehova na nzukọ ya dị n’ụwa. Ịhụ ndị m nyeere aka ha na Jehova adị ná mma na-eme ka obi dị m ụtọ na m gbara mbọ rụọrọ Jehova ọrụ.

ỤDỌ E JI ERIRI ATỌ TỤỌ

Mgbe mụ na Ethel nwunye m lụrụ na Septemba afọ 1971

N’oge ahụ, m ka chọrọ ịlụ nwaanyị n’agbanyeghị na m hụrụ otú alụghị nwaanyị si mee ka ọ dịkwuoro m mfe ije ozi m. N’ihi ya, amalitere m ikpe ekpere ka m nweta nwaanyị ga-eji obi ụtọ soro m na-eje ozi oge niile n’ebe a tara akpụ. Mgbe ihe dị ka otu afọ gara, mụ na otu nwanna nwaanyị bụ́kwa ọsụ ụzọ pụrụ iche bidoro ịkpa. Aha ya bụ Ethel. Ọ dị njikere ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova ọ bụrụgodị na ọ dịrịghị ya mfe. Malite mgbe ọ dị obere, ihe Pọl onyeozi mere masịrị ya. Ọ chọkwara ime ihe niile o nwere ike ime n’ozi Jehova otú ahụ Pọl mere. Mụ na ya lụrụ na Septemba afọ 1971, anyị abụọ malitekwara ọrụ sekit.

Ezinụlọ nwunye m hà abaghị ọgaranya. N’ihi ya, o gbughị oge, ije ozi n’obodo ahụ dị n’oké ọhịa amara ya ahụ́. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị ebu ọtụtụ ihe ma anyị gawa ileta ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ. Ọ bụ n’iyi ka anyị na-aga asa ahụ́, saakwa ákwà anyị. Anyị na-eri ihe oriri ọ bụla ụmụnna anyị nyere anyị. O nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ha gbutere n’ọhịa ma ọ bụ ná mmiri. Ọ bụrụ ndị na-enweghị efere, anyị na-eji akwụkwọ unere emere efere. N’ebe a na-enweghị ngaji, anyị na-eji aka eri nri. Otú mụ na Ethel nwunye m si gbakọọ aka na-ejere Jehova ozi ma hapụ ihe ụfọdụ emeela ka anyị bụrụ ụdọ e ji eriri atọ tụọ. (Ekli. 4:12) Anyị agaghị achọ iji ihe ọma ndị a gbanwere ihe ọ bụla.

Ọ bụ otu ụbọchị anyị si ileta ụmụnna anyị bi n’ebe ndị ahụ dị n’oké ọhịa na-alọta ka ihe ahụ m kọrọ ná mmalite mere. Ka ụgbọ anyị na-agbafe n’ebe mmiri ya na-asọsi ike, nke na-emighị emi, o mikpuru n’ime mmiri, seekwa n’elu mmiri ozugbo. Ihe zọrọ anyị bụ na anyị yicha ihe ga-enyere anyị aka ma ụgbọ anyị kpuo, anyị adapụghịkwa n’ụgbọ mmiri ahụ. Ma, mmiri juru n’ụgbọ anyị. Ihe anyị meziri bụ ịwụba nri dị n’ite anyị n’ime osimiri, werezie ite ndị ahụ na-ekupụsị mmiri n’ụgbọ ahụ.

Ebe ọ bụ na anyị enwezighị ihe anyị ga-eri, anyị gbalịwara ka anyị gbute azụ̀ ka anyị na-aga ná mmiri ahụ. Ma, e nweghị nke anyị gbutere. N’ihi ya, anyị kpere ekpere ka Jehova nye anyị nri anyị ga-eri n’ụbọchị ahụ. Ozugbo anyị kpechara ekpere, otu nwanna anyị na ya so wụnyere ihe e ji egbu azụ̀ n’ime mmiri ma gbute azụ̀ buru ibu zuuru anyị mmadụ ise n’abalị ahụ.

ỊBỤ DI, NNA, NA ONYE NLEKỌTA SEKIT

Ka mụ na nwunye m jere ozi ruo afọ ise, Jehova gọziri anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Nwunye m dịrị ime. Obi dị m ụtọ mgbe m nụrụ na ọ dị ime n’agbanyeghị na amaghị m otú ihe a ga-esi agbanwe ndụ anyị. Mụ na nwunye m chọsiri ike ịnọkwa na-eje ozi oge niile ma ọ bụrụ na ọ ka ga-ekwe omume. N’afọ 1976, anyị mụrụ Ethniël bụ́ nwa anyị nwoke nke mbụ. Mgbe afọ abụọ na ọkara gara, anyị mụrụ Giovanni bụ́ nwa anyị nwoke nke abụọ.

Mgbe anyị gara ime ndị mmadụ baptizim n’Osimiri Tapanahoni, nke dị nso na Godo Holo dị n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Surinama n’afọ 1983

N’ihi mkpa e nwere na Surinama n’oge ahụ, alaka ụlọ ọrụ haziri ka m ka bụrụ onye nlekọta sekit ma na-azụ ụmụ anyị. Mgbe ụmụ anyị dị obere, a gwara m ka m lekọtawa sekit ndị ọgbakọ dị na ha na-adịghị ọtụtụ. O mere ka m nwee ike iji izu ole na ole n’ọnwa ọ bụla gaa leta ọgbakọ, jirizie izu ndị fọdụrụ sụwakwa ụzọ oge niile n’ọgbakọ e kenyere anyị. Nwunye m na ụmụ anyị abụọ na-eso m ma m gawa ileta ọgbakọ ndị dị anyị nso. Ma, naanị m na-aga eleta ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ bụ́ oké ọhịa nakwa ma e nwee mgbakọ n’ebe ahụ.

Mgbe m bụ onye nlekọta sekit, m na-ejikarị ụgbọ mmiri aga eleta ọgbakọ ndị dị n’ebe dịpụrụ adịpụ

M na-ahazi ihe ndị m na-eme nke ọma ka m nwee ike rụchaa ihe niile m kwesịrị ịrụ. M na-ahụ na anyị mụrụ ọmụmụ ihe ezinụlọ kwa izu. Mgbe ọ bụla m gara ileta ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ bụ́ oké ọhịa, nwunye m na-akpọkọta ụmụ anyị ma duzie ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị. Ma, ezinụlọ anyị na-emekọ ihe ọnụ ọtụtụ mgbe. Mụ na Ethel nwunye m na-enwekwa oge anyị na ụmụ anyị na-eji atụrụ ndụ, nke bụ́ igwu egwuregwu ma ọ bụ ịga legharịa anya. Ọtụtụ ugboro, m na-anọ ebe m na-akwado ihe omume m chi ejimie. Nwunye m dịkwa ka ezigbo nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’Ilu 31:15. Ọ na-ebili mgbe chi na-abọchabeghị iji hụ na anyị gụrụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’oge ma rikọọ nri ụtụtụ ọnụ tupu ụmụ anyị agawa ụlọ akwụkwọ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m lụtara nwaanyị na-agba mbọ otú a, onye na-enyere m aka mgbe niile ịrụ ọrụ Jehova nyere m.

Anyị gbalịsiri ike inyere ụmụ anyị aka ka ha hụ Jehova n’anya ma jiri ozi ọma kpọrọ ihe. Anyị chọrọ ka ihe ga-eme ka ụmụ anyị họrọ iji ndụ ha jee ozi oge niile bụrụ maka na ọ bụ ihe ha chọrọ ime, ọ bụghị maka na ọ bụ ihe anyị chọrọ ka ha mee. Anyị na-agwakarị ha ụdị ọṅụ ozi oge niile ga-eme ka ha nwee. Anyị anaghị ezoro ha ihe ụfọdụ siiri anyị ike n’ozi oge niile. Ma, anyị na-ekwusi ike banyere otú Jehova si nyere ezinụlọ anyị aka ma gọzie anyị. Anyị gbakwara mbọ hụ na ụmụnna ndị ha na ụmụ anyị na-anọrị bụ ndị weere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa.

Jehova nyere anyị ihe niile dị anyị mkpa iji zụọ ụmụ anyị. Ma, m gbalịkwara mee ihe ndị m kwesịrị ime. Ihe ndị mere mgbe m na-alụbeghị nwaanyị, n’oge ahụ m bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo ahụ dị n’oké ọhịa, kụziiri m na m kwesịrị ịna-edowe ego maka ihe ndị ga-akpa anyị. Ma n’agbanyeghị na anyị mere ike anyị, mgbe ụfọdụ, anyị anaghị enwecha ihe niile dị anyị mkpa. N’oge ndị ahụ, Jehova nyeere anyị aka. Dị ka ihe atụ, malite n’afọ 1986 ruo n’afọ 1992, e nwere ọgba aghara n’obodo Surinama. N’afọ ndị ahụ, e nwere mgbe ọ na-esi ike inwetadị ihe ndị dị ezigbo mkpa. Ma, Jehova gbooro anyị mkpa anyị.​—Mat. 6:32.

ICHETA IHE NDỊ MERE NÁ NDỤ M

Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Mụ na Ethel nwunye m

Nwa anyị nke ọkpara, bụ́ Ethniël, na Natalie nwunye ya

Nwa anyị nwoke Giovanni na Christal nwunye ya

Jehova na-elekọta ezinụlọ anyị mgbe niile. O meekwala ka anyị na-enwe obi ụtọ, ihe ndị anyị nwere ana-ejukwa anyị afọ. Ụmụ anyị na-eme anyị obi ụtọ. Obi bụkwa anyị sọ aṅụrị na anyị zụlitere ha, ha ana-efe Jehova. Obi atọgbuola anyị na ha họọrọ iji ndụ ha na-eje ozi oge niile. Ụmụ anyị abụọ bụ́ Ethniël na Giovanni gara ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova. Ha na nwunye ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ dị na Surinama.

Mụ na nwunye m emeela agadi ugbu a. Ma, anyị ka bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, jirikwa obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. N’ihi ọtụtụ ihe anyị na-arụ, enwebeghịdị m ohere mụta igwu mmiri. Ma anaghị m akwa mmakwaara. M cheta ihe ndị mere ná ndụ m, obi siri m ike na ihe ahụ m kpebiri mgbe m ka na-eto eto, ya bụ, iji ndụ m niile jeere Jehova ozi, bụ ihe kacha mma m kpebitụrụla.

b Akụkọ ndụ Nwanna Willem van Seijl gbara na Teta! Bekee nke October 8, 1999, peeji nke 12.