Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48

Na-eche Echiche Nke Ọma Mgbe O Siiri Gị Ike Irubere Jehova Isi

Na-eche Echiche Nke Ọma Mgbe O Siiri Gị Ike Irubere Jehova Isi

“Na-eche echiche nke ọma n’ihe niile.”​—2 TIM. 4:5.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka iche echiche nke ọma pụtara? (2 Timoti 4:5)

 E NWEE ihe mere n’ọgbakọ nke were anyị ezigbo iwe, o nwere ike isiri anyị ike irubere Jehova na ọgbakọ ya isi. Olee otú anyị ga-esi merie ụdị nsogbu ahụ? Anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma, mụrụ anya, ma mee ka okwukwe anyị sie ike. (Gụọ 2 Timoti 4:5.) Otú anyị si egosi na anyị na-eche echiche nke ọma bụ ịnọ jii, chebara ihe merenụ echiche ma gbalịa ka anyị lee ya anya otú Jehova si ele ya. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị ekwe ka otú obi dị anyị mee ka anyị chewe ihe na-adịghị mma.

2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru banyere nsogbu atọ ndị na-anọghị n’ọgbakọ nwere ike ịkpatara anyị. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu banyere nsogbu atọ nwere ike ịbịara anyị n’ọgbakọ, mee ka o siere anyị ike irubere Jehova isi. Ha bụ (1) mgbe nwanna mere ihe wutere anyị, (2) mgbe a dọrọ anyị aka ná ntị, na (3) mgbe o siiri anyị ike ịnabata ihe a gbanwere ná nzukọ Jehova. Olee otú anyị ga-esi na-eche echiche nke ọma ma jiri obi anyị niile na-erubere Jehova na nzukọ ya isi ma ụdị nsogbu ndị a bịara anyị?

NWANNA MEE IHE WUTERE ANYỊ

3. Nwanna mee ihe wutere anyị, olee ihe anyị nwere ike ichewe?

3 È nweela mgbe nwanna mere ihe wutere gị? O nwedịrị ike ịbụ okenye ma ọ bụ nwanna ọzọ e nyere ọrụ n’ọgbakọ. Ọ ga-abụ na nwanna ahụ ebughị n’obi ime ihe ga-ewute gị. (Rom 3:23; Jems 3:2) Ma, o nwere ike ịbụ na ihe o mere were gị ezigbo iwe, ụra ekweghịzi atụ gị maka na ihe ahụ ekweghị apụ gị apụ n’obi. I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ebe ọ bụ na nwanna mere m ụdị ihe a, ihe a ọ̀ ka bụzikwa ọgbakọ Chineke?’ Ọ bụ ihe Setan chọrọ ka anyị chewe. (2 Kọr. 2:11) Ụdị echiche ahụ nwere ike ime ka anyị hapụ Jehova na ọgbakọ ya. N’ihi ya, nwanna mee ihe wutere anyị, olee otú anyị ga-esi na-eche echiche nke ọma ma ghara ichewe ihe na-adịghị mma?

4. Olee otú Josef si gosi na ọ na-eche echiche nke ọma mgbe ụmụnne ya mejọrọ ya? Gịnịkwa ka ihe o mere na-akụziri anyị? (Jenesis 50:19-21)

4 Ebula iwe n’obi. Mgbe Josef ka na-eto eto, ụmụnne ya ndị tọrọ ya mere ya ihe ọjọọ. Ha kpọrọ ya asị. Ụfọdụ n’ime ha chọdịrị igbu ya. (Jen. 37:4, 18-22) Ha mechara ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. N’ihi ya, ọnwụnwa ndị tara akpụ bịaara Josef ruo ihe dị ka afọ iri na atọ. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka Josef chewe na Jehova ahụghịzi ya n’anya nakwa na Jehova ahapụla ya mgbe nsogbu bịaara ya. Ma, Josef ebughị iwe n’obi. Kama, ọ nọrọ jii, si otú ahụ gosi na ọ na-eche echiche nke ọma. Mgbe o nwetara ohere ọ gaara eji mesie ụmụnne ya ike, o meghị otú ahụ. Kama, o gosiri ha na ọ hụrụ ha n’anya ma gbaghara ha. (Jen. 45:4, 5) Ihe mere Josef ji mee ya bụ na ọ na-eche echiche nke ọma. Kama ichewe naanị banyere nsogbu ndị bịaara ya, ọ nọ na-eche banyere ihe kacha mkpa, ya bụ, ihe Jehova chọrọ. (Gụọ Jenesis 50:19-21.) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Nwanna mee ihe wutere gị, ewesala Jehova iwe ma ọ bụ chewe na Chineke ahapụla gị. Kama ime otú ahụ, na-atụgharị uche n’otú o si enyere gị aka idi nsogbu ahụ. Ihe ọzọ bụ na nwanna mee ihe wutere gị, gbalịa ka ị gbaghara ya iji gosi na ị hụrụ ya n’anya.​—1 Pita 4:8.

5. Olee otú otu nwanna si gosi na ọ na-eche echiche nke ọma mgbe e mejọrọ ya?

5 Chegodị ihe mere otu okenye si na Kọntinent Ebe Ndịda Amerịka. Aha ya bụ Miqueas. b O chetara otu mgbe ụfọdụ ndị okenye mere ihe gbawara ya obi. Ọ sịrị: “Ụdị ihe ahụ emetụbeghị m. Obi ekweghị ezu m ike. Ụra anaghị aga m n’anya n’abalị. M na-ebe ákwá maka na amaghị m ihe m ga-eme.” Ma, nwanna a gosiri na ọ ka na-eche echiche nke ọma, gbalịsiekwa ike ijide onwe ya. O kpere ekpere ọtụtụ ugboro, rịọ Jehova ka o nye ya mmụọ nsọ na ike ọ ga-eji tachie obi. O mekwara nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ọ chọta ihe ga-enyere ya aka. Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Ọ bụrụ na nwanna emejọọ gị, nọrọ jii ma gbalịa ijide onwe gị ka ị ghara ichewe ihe na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na ị maghị ihe mere nwanna ahụ ji kwuo ihe o kwuru ma ọ bụ mee ihe o mere. N’ihi ya, kpee ekpere kọọrọ ya Jehova ma rịọ ya ka o nyere gị aka ile ihe ahụ anya otú onye ahụ si ele ya. Ime otú ahụ nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ichewe na nwanna ahụ bu n’obi ime gị ihe ọjọọ. O nwekwara ike ime ka i leghara ihe ahụ o mere gị anya. (Ilu 19:11) Cheta na Jehova ma otú ihe si dịrị gị nakwa na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji na-atachi obi.​—2 Ihe 16:9; Ekli. 5:8.

MGBE A DỌRỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ

6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta na ọ bụ onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị? (Ndị Hibru 12:5, 6, 11)

6 Ịdọ aka ná ntị nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ. Ma, ọ bụrụ na anyị echewe naanị gbasara otú o si na-ewute anyị, anyị nwere ike iche na aka ná ntị a dọrọ anyị adabaghị adaba ma ọ bụ na a chọrọ imesi anyị ike. O nwere ike ime ka anyị ghara ịghọta otu ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, na ọ bụ onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị. (Gụọ Ndị Hibru 12:5, 6, 11.) Ọ bụrụkwa na anyị ana-eche mgbe niile banyere otú aka ná ntị ahụ a dọrọ anyị si ewute anyị, anyị na-emeghere Setan ụzọ ọ ga-esi nweta anyị. Ọ chọrọ ka anyị jụ aka ná ntị a dọrọ anyị. Nke kadị njọ bụ na ọ chọrọ ka anyị hapụ Jehova na ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na a dọrọ gị aka ná ntị, olee otú ị ga-esi gosi na ị na-eche echiche nke ọma?

Pita dị umeala n’obi ma nabata ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị. Ọ bụ ya mere o ji bakwuoro Jehova uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. (a) Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú Jehova si jiri Pita rụọ ọrụ mgbe ọ nabatachara aka ná ntị a dọrọ ya? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe Pita mere?

7 Nabata aka ná ntị a dọrọ gị, gbanweekwa àgwà i kwesịrị ịgbanwe. Jizọs nọ n’ihu ndịozi ya ndị ọzọ baara Pita mba ihe karịrị otu ugboro. (Mak 8:33; Luk 22:31-34) O nwere ike ịbụ na o mere ka ihere mee Pita. Ma, ọ kwụsịghị irubere Jizọs isi. Ọ nabatara aka ná ntị ahụ Jizọs dọrọ ya ma si n’ihe o mejọrọ mụta ihe. Ọ bụ ya mere Jehova ji gọzie Pita ma nyekwuo ya nnukwu ọrụ n’ọgbakọ. (Jọn 21:15-17; Ọrụ 10:24-33; 1 Pita 1:1) Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Pita? Ọ bụrụ na anyị anabata aka ná ntị a dọrọ anyị, gbanwee àgwà anyị, ma kwụsị iche naanị gbasara otú aka ná ntị ahụ si wute anyị, ọ ga-abara anyị na ndị ọzọ uru. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-abakwuru Jehova na ụmụnna anyị uru.

8-9. Mgbe a dọrọ Nwanna Bernardo aka ná ntị, olee otú obi dị ya ná mmalite? Ma, gịnị nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ele aka ná ntị ahụ anya?

8 Chegodị ihe mere Nwanna Bernardo, onye bi na Mozambik. A kwụsịrị ya ịbụ okenye. Olee otú obi dị ya ná mmalite? Ọ sịrị: “Ezigbo iwe were m maka na aka ná ntị ahụ a dọrọ m adịghị mụ mma.” Ihe bụ́ mkpa ya bụ otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi na-ele ya anya. Ọ sịrị: “Ọnwa ole na ole gara tupu mụ ebido ile aka ná ntị ahụ a dọrọ m anya otú kwesịrị ekwesị ma bidokwa ịtụkwasị Jehova na ọgbakọ ya obi.” Olee ihe nyeere nwanna a aka ịgbanwe otú o si na-ele ya anya?

9 Nwanna Bernardo gbanwere otú o si eche echiche. O kwuru, sị: “Mgbe m bụ okenye, m na-eji Ndị Hibru 12:7 enyere ndị ọzọ aka ịmata otú ha kwesịrị isi na-ele aka ná ntị Jehova dọrọ ha anya. M jụziri onwe m, sị: ‘Ònye kwesịrị ime ihe amaokwu Baịbụl a kwuru?’ Ọ bụ ndị niile na-efe Jehova, ma mụnwa.” Nwanna Bernardo gbakwuru mbọ ka o nwee ike ịtụkwasịwakwa Jehova na ọgbakọ ya obi. O wepụtakwuru oge na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche n’ihe ndị ọ gụrụ. N’agbanyeghị na ọ ka nọkwa na-eche otú ụmụnna si ele ya anya, ya na ha so na-aga ozi ọma, ya ana-azakwa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ka oge na-aga, a họpụtara nwanna a ka ọ bụrụkwa okenye. Ọ bụrụ na a dọrọ gị aka ná ntị otú ahụ a dọrọ nwanna a, jisie ike ka ị ghara ichewe naanị otú o si mechuo gị ihu. Nabata ndụmọdụ ahụ ma gbanwee àgwà ndị i kwesịrị ịgbanwe. c (Ilu 8:33; 22:4) I mee otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi gị maka na ị na-erubere ya na ọgbakọ ya isi.

MGBE O SIIRI ANYỊ IKE ỊNABATA IHE A GBANWERE NÁ NZUKỌ JEHOVA

10. Olee ihe a gbanwere n’Izrel oge ochie nke nwere ike ime ka o siere ụfọdụ n’ime ha ike irubere Jehova isi?

10 Ihe a gbanwere ná nzukọ Jehova nwere ike ime ka o siere anyị ike irubere Jehova isi. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwedịrị ike ikwe ka ha mee ka anyị kwụsị ife Jehova. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke nyere ndị Izrel Iwu Mosis, chegodị otú ihe si gbanweere ụfọdụ n’ime ha. Mgbe Iwu ahụ na-adịbeghị, ọ bụ ndị isi ezinụlọ na-arụ ọrụ ịchụ àjà. Ha na-arụ ebe ịchụàjà ma chụọrọ Jehova àjà maka ndị ezinụlọ ha. (Jen. 8:20, 21; 12:7; 26:25; 35:1, 6, 7; Job 1:5) Ma, mgbe Chineke nyere ndị Izrel Iwu Mosis, a napụrụ ndị isi ezinụlọ ọrụ ahụ. Jehova si n’ezinụlọ Erọn họpụta ndị nchụàjà ga na-achụ àjà. Malite mgbe ahụ gawa, ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ na-abụghị nwa Erọn arụọ ọrụ ịchụ àjà, e nwere ike igbu ya. d (Lev. 17:3-6, 8, 9) Ihe a a gbanwere ò nwere ike iso n’ihe mere Kora, Detan, Abaịram, na narị ndị isi abụọ na iri ise (250) ji nupụrụ Mosis na Erọn isi? (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3) Anyị amaghị. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, Kora na ndị òtù ya erubereghị Jehova isi. Ọ bụrụ na ihe a gbanwere ná nzukọ Jehova emee ka o siere gị ike irubere Jehova isi, gịnị ka i kwesịrị ime?

Mgbe a gbanwere ihe ụmụ Kohat na-arụ, ha ji obi ha niile rụwa ọrụ ịbụ abụ, iche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ma ọ bụ ilekọta ụlọ ndị a na-akwasa ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị ka ị mụtara n’ihe ụfọdụ n’ime ụmụ Kohat bụ́ ndị Livaị mere?

11 Jiri obi gị niile na-akwado ihe ndị a gbanwere ná nzukọ Jehova. Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, e nyere ụmụ Kohat ọrụ pụrụ iche. Mgbe ọ bụla ndị Izrel chọrọ isi n’ebe ha mara ụlọikwuu kwapụ, ọ bụ ụfọdụ n’ime ụmụ Kohat na-ebu igbe ọgbụgba ndụ n’ihu ndị Izrel niile. (Ọnụ Ọgụ. 3:29, 31; 10:33; Josh. 3:2-4) Ọ bụ nnukwu ọrụ. Ma, ihe gbanweere ha mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa. A naghịzi ebugharị Igbe ahụ ebugharị. N’ihi ya, n’oge Solomọn na-achị, e nyere ụfọdụ ụmụ Kohat ọrụ ịbụ abụ, ụfọdụ n’ime ha abụrụ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ụfọdụ ana-elekọta ụlọ ndị a na-akwasa ihe. (1 Ihe 6:31-33; 26:1, 24) E nweghị ihe gosiri na ụmụ Kohat tamuru ntamu ma ọ bụ kwuwe ka e nyekwuo ha nnukwu ọrụ maka na ha na-arụbu ọrụ pụrụ iche. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado ihe ọ bụla a gbanwere ná nzukọ Jehova, ọ bụrụgodị na ọ gbasara ihe anyị na-arụ. Na-enwe obi ụtọ n’ọrụ ọ bụla e nyere gị. Na-echeta na ọ bụghị ụdị ọrụ e nyere gị ga-eme ka Jehova jiri gị kpọrọ ihe. Jehova ji isi ị na-erubere ya kpọrọ ihe karịa ụdị ọrụ ọ bụla.​—1 Sam. 15:22.

12. Olee otú obi dị Nwanna Nwaanyị Zaina mgbe e si na Betel zipụ ya ka ọ gaa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche?

12 Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Zaina. A gbanwere ụdị ozi ọ na-eje, nke bụ́kwanụ ozi na-atọgbu ya atọgbu. Mgbe o jechara ozi na Betel ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na atọ, e zipụrụ ya ka ọ gaa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ sịrị: “Ihe a a gbanwere mere ka obi wụba m n’afọ. Ọ dịzi m ka e nweghị uru m bara. Ihe m nọ na-ajụ onwe m bụ, ‘Olee ihe m mejọrọ?’” Ọ dị mwute na ụfọdụ ụmụnna n’ọgbakọ mere ka ọ na-ewutekwu ya. Ha nọ na-asị ya: “A sị na ị na-arụ ọrụ gị nke ọma, a garaghị asị gị pụọ na Betel.” Otú obi si na-ajọ nwanna nwaanyị a njọ mere ka ọ na-ebe ákwá n’abalị ọ bụla. Ma, ọ sịrị: “O nweghị mgbe m chewere ma ihe a ọ̀ bụkwa ọgbakọ Jehova ma ọ bụ ma Jehova ọ̀ hụkwara m n’anya.” Olee ihe nyeere ya aka ịna-eche echiche nke ọma?

13. Olee ihe nyeere Nwanna Nwaanyị Zaina aka ịkwụsị iwe na-ewe ya?

13 Nwanna Nwaanyị Zaina mechara kwụsị iwe iwe maka ihe ahụ merenụ. Gịnị nyeere ya aka? Ọ gụrụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ anyị kwuru banyere nsogbu ahụ bịaara ya. Isiokwu bụ́ “Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ,” nke gbara n’Ụlọ Nche February 1, 2001, nyeere ya ezigbo aka. Isiokwu ahụ kọwara na o nwere ike ịbụ otú ahụ ka obi dị Mak, bụ́ onye so dee Baịbụl, mgbe ozi ọ na-eje gbanwere. Nwanna Nwaanyị Zaina sịrị: “Ọ bụ ihe Mak mere mere ka obi kwụsị ịna-ajọ m njọ.” Ihe ọzọ nyeere ya aka bụ iso ndị enyi ya na-anọrị. O bidoghị ịnọrọ onwe ya ma ọ bụ ịkwa ụwa. Ọ chọpụtara na ọ bụ mmụọ Jehova na-eduzi nzukọ ya nakwa na ndị Jehova ji eduzi ọgbakọ ya hụrụ yanwa n’anya. Ma, ọ ghọtakwara na nzukọ Chineke ga-emerịrị ihe kacha mma ha ga-emeli ka a rụọ ọrụ Jehova.

14. Gịnị ka a gbanwere n’ọgbakọ nke siiri Nwanna Vlado ike ịnabata? Olee ihe nyeere ya aka?

14 E nwere otu okenye bi na Slovenia. Aha ya bụ Vlado. Ọ dị afọ iri asaa na atọ. Obi adịghị ya mma mgbe e kpokọtara ọgbakọ ha na ọgbakọ ọzọ, mechie Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ sịrị: “Aghọtaghị m ihe mere e ji mechie ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. O wutere m maka na ọ dịbeghị anya a rụzigharịrị ya. Abụ m kapịnta. Ọ bụ m rụrụ ụfọdụ oche dị na ya. Ihe ọzọ bụ na ikpokọta ọgbakọ anyị na ọgbakọ ọzọ pụtara na anyịnwa bụ́ ndị nkwusa merela agadi ga-agbanwe ọtụtụ ihe anyị na-eme. Ọ dịrịghị anyị mfe.” Gịnị nyeere Nwanna Vlado aka ịkwado ihe ahụ a gbanwere? Ọ sịrị: “Ịnabata ihe ọ bụla nzukọ Jehova gbanwere na-eme ka Jehova gọzie anyị mgbe niile. Mgbanwe ndị a na-eme ka anyị jikere maka ihe ndị ka ha a ga-agbanwe n’ọdịnihu.” È kpokọtara ọgbakọ unu na ọgbakọ ọzọ, ka à gbanwere ụdị ozi ị na-eje, ya ana-esiri gị ike ịnabata mgbanwe ndị ya na ya so? Ka obi sie gị ike na Jehova ghọtara otú obi dị gị. Ọ bụrụ na ị kwado ihe ndị ahụ a gbanwere ma jiri obi gị niile na-erubere Jehova na ọgbakọ ya isi, e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịgọzi gị.​—Ọma 18:25.

NA-ECHE ECHICHE NKE ỌMA N’IHE NIILE

15. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-eche echiche nke ọma ma ihe ụfọdụ siere anyị ike n’ọgbakọ?

15 Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ihe ụfọdụ nwere ike isiri anyị ike n’ọgbakọ. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka o siere anyị ike irubere Jehova isi. Ọ bụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-eche echiche nke ọma. Nwanna mee ihe wutere gị, ekwela ka o mee ka ọsụkọsụ nwa mkpi na-asụ gị. A dọọ gị aka ná ntị, echela naanị banyere otú o si mechuo gị ihu. Kama, nabata ya ma gbanwee àgwà ndị i kwesịrị ịgbanwe. Nzukọ Jehova gbanwee ihe ụfọdụ mere ka ihe sitụrụ gị ike, jiri obi gị niile nabata ya ma mee ihe a gwara gị.

16. Olee otú ị ga-esi na-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi?

16 E nwee ihe mere ka o siere gị ike irubere Jehova isi, ị ga-atụkwasịli ya na ọgbakọ ya obi. Ma, ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ ịna-eche echiche nke ọma, ya bụ, ịnọrọ jii, chebara ihe merenụ echiche ma lewe ya anya otú Jehova si ele ya. Kpebisie ike ịna-amụ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị diri ụdị ihe ahụ. Chebakwara àgwà ọma ndị ha kpara echiche. Na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ahapụla ọgbakọ gaa nọrọ naanị gị. I mee ihe ndị a, n’agbanyeghị ihe merenụ, Setan agaghị enwe ike ime ka ị hapụ Jehova na nzukọ ya.​—Jems 4:7.

ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike

a O nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ irubere Jehova na ọgbakọ ya isi, karịchaa ma e nwee ihe ndị mere n’ọgbakọ were anyị ezigbo iwe. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu banyere atọ n’ime ha nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-erubere Jehova na ọgbakọ ya isi.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c Ị ga-ahụ aro ndị ọzọ ga-abara gị uru n’isiokwu bụ́ “Ì Nwetụla Ihe Ùgwù Ije Ozi? Ì Nwere Ike Inwe Ya Ọzọ?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche August 15, 2009, peeji nke 30.

d Iwu Mosis kwuru na ndị isi ezinụlọ chọọ igbu anụ ụlọ ha ga-ata, ha ga-eji ya gaa n’ebe nsọ. Naanị ndị a gụpụrụ bụ ndị isi ezinụlọ bi n’ebe dị ezigbo anya n’ebe nsọ ahụ.​—Diut. 12:21.