Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45

Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ijezu Ozi Anyị

Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ijezu Ozi Anyị

“Ha ga-amara na e nwere mgbe ha na onye amụma nọ.”​—EZIK. 2:5.

ABỤ NKE 67 “Kwusaa Okwu Chineke”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya? Gịnịkwa ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

 ANYỊ kwesịrị ịtụ anya na a ga na-emegide anyị n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Mmegide ahụ nwere ike ịka njọ n’ọdịnihu. (Dan. 11:44; 2 Tim. 3:12; Mkpu. 16:21) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-enyere anyị aka. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova na-enyere ndị ohu ya aka mgbe niile ịrụ ọrụ o nyere ha n’agbanyeghị otú ọrụ ahụ siruru n’ike. Dị ka ihe atụ, ka anyị kwuo banyere ụfọdụ ihe mere Ezikiel onye amụma mgbe ọ nọ na-ezi ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ozi si n’aka Chineke.

2. Olee otú Jehova si kọwaa ndị Ezikiel kwusaara okwu ya? Gịnịkwa ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? (Ezikiel 2:3-6)

2 Olee ụdị ndị Ezikiel ziri ozi Chineke ziri ya? Jehova sịrị na ha bụ ndị “na-aka anya,” “ndị isi ike,” na “ndị nnupụisi.” Ha dị njọ ka ogwu na akpị. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gwa Ezikiel ugboro ugboro, sị: “Atụkwala ụjọ.” (Gụọ Ezikiel 2:3-6.) Ezikiel jezuru ozi ya n’ihi na (1) ọ bụ Jehova ziri ya ozi ahụ, (2) mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike, (3) okwu Chineke mekwara ka okwukwe ya sie ike. Olee otú ihe atọ ndị a si nyere Ezikiel aka? Oleekwa otú ha si enyere anyị aka taa?

Ọ BỤ JEHOVA ZIRI EZIKIEL OZI

3. Olee okwu o nwere ike ịbụ na ọ gbara Ezikiel ume? Oleekwa otú Jehova si mee ka obi sie Ezikiel ike na ya ga-akwado ya?

3 Jehova gwara Ezikiel, sị: “M na-ezi gị ka ị gakwuru ndị Izrel.” (Ezik. 2:3, 4) Ọ ga-abụrịrị na ihe a mere ka obi sie Ezikiel ike. N’ihi gịnị? O nwere ike ịbụ n’ihi na o chetara na Jehova kwuru ụdị ihe ahụ mgbe o mere ka Mosis na Aịzaya bụrụ ndị amụma ya. (Ọpụ. 3:10; Aịza. 6:8) Ezikiel makwa otú Jehova si nyere ndị amụma abụọ ahụ aka ịrụ ọrụ ahụ siri ike. N’ihi ya, mgbe Jehova gwara Ezikiel ugboro abụọ na ọ bụ ya na-eziga ya, o kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka. Ezikiel onye amụma dekwara ugboro ugboro, sị: “Jehova gwara m, sị.” (Ezik. 3:16) Ọtụtụ ugboro, o dekwara, sị: “Jehova gwara m okwu ọzọ, sị.” (Ezik. 6:1) A naghị ajụ ajụ na obi siri Ezikiel ike na ọ bụ Jehova dunyere ya ozi ahụ. Ihe ọzọ bụ na, ebe Ezikiel bụ nwa onye nchụàjà, ọ ga-abụ na nna ya kụziiri ya otú Jehova sirila na-emesi ndị amụma ya obi ike kemgbe ụwa na ọ nọnyeere ha. Jehova gwara Aịzik, Jekọb, na Jeremaya, sị: “M nọnyeere gị.”​—Jen. 26:24; 28:15; Jere. 1:8.

4. Olee okwu na-akasi obi o nwere ike ịbụ na o mere ka obi sie Ezikiel ike?

4 Gịnị ka ọtụtụ ndị Izrel ga-eme ma ha nụ ozi Ezikiel? Jehova gwara ya, sị: “Ndị Izrel agaghị ege gị ntị, ebe ọ bụ na ha achọghị ige m ntị.” (Ezik. 3:7) Ịjụ ozi Ezikiel pụtara na ha jụrụ Jehova. Ihe ahụ Jehova kwuru mere ka obi sie Ezikiel ike na ọjụjụ ndị Izrel jụrụ ya apụtaghị na ọ rụtaghị ọrụ ibu amụma Chineke nyere ya. Jehova mesikwara Ezikiel obi ike na mgbe ikpe ahụ ọ na-ekwusa ga-emezu, ndị Izrel “ga-amara na e nwere mgbe ha na onye amụma nọ.” (Ezik. 2:5; 33:33) O doro anya na okwu ahụ na-akasi obi mere ka Ezikiel nwee ike ijezu ozi ya.

Ọ BỤ JEHOVA ZIRI ANYỊ OZI

Dị ka Ezikiel, ụfọdụ nwere ike ịjụ ozi ọma anyị ma ọ bụ na-emegide anyị, ma anyị ma na Jehova nọnyeere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5. Gịnị ka Aịzaya 44:8 kwuru ga-eme ka obi sie anyị ike?

5 Obi na-esikwa anyịnwa ike maka na anyị ma na ọ bụ Jehova gwara anyị gaa kwusaa ozi ọma. O meere anyị ihe ọma kwe ka anyị bụrụ “ndị àmà” ya. (Aịza. 43:10) Ọ bụ ezigbo ùgwù ka ọ kwanyeere anyị. Otú ahụ Jehova sịrị Ezikiel: ‘Atụla egwu,’ ka ọ na-asịkwa anyị: “Unu atụla ụjọ.” Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ndị na-emegide anyị ụjọ? Ọ bụ maka na, dị ka Ezikiel, ọ bụ Jehova dunyere anyị ozi, na-akwadokwa anyị.​—Gụọ Aịzaya 44:8.

6. (a) Olee otú Jehova si eme ka obi sie anyị ike na ya na-akwado anyị? (b) Olee ihe na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike?

6 Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga na-enyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, tupu Jehova asị: “Unu bụ ndị àmà m,” ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu agafewe mmiri, m ga-anọnyere unu. Ọ bụrụkwa na unu agafewe osimiri, ọ gaghị eri unu. Ọ bụrụ na unu agafewe ebe ọkụ dị, ọ gaghị ere unu, ire ọkụ agaghịkwa ere unu.” (Aịza. 43:2) N’ozi ọma anyị na-ekwusa, nsogbu ndị na-abịara anyị mgbe ụfọdụ na-adị ka idei mmiri, ọnwụnwa ndị na-abịara anyị na-adịkwa ka ọkụ. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkwụsị ikwusa ozi ọma. (Aịza. 41:13) Otú ahụ ọtụtụ ndị jụrụ ozi Ezikiel ziri ha ka ọtụtụ ndị taa na-ajụkwa ozi ọma anyị. Mana, ọ pụtaghị na anyị anaghị ekwusa ozi ọma nke ọma. Obi na-esi anyị ezigbo ike maka na obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị anọsie ike n’ozi a ọ sịrị anyị kwusaa. Pọl onyeozi kwuru, sị: “A ga-akwụ onye ọ bụla . . . ụgwọ ihe ọ rụrụ.” (1 Kọr. 3:8; 4:1, 2) Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ kemgbe ọtụtụ afọ sịrị: “Obi na-atọgbu m atọgbu ma m cheta na Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ maka mbọ anyị na-agba.”

MMỤỌ CHINEKE MERE KA OBI SIE EZIKIEL IKE

Ezikiel hụrụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova n’ọhụụ. Ọhụụ ahụ mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-enyere ya aka ijezu ozi ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Mgbe ọ bụla Ezikiel chere banyere ọhụụ ahụ ọ hụrụ, olee otú ọ ga-abụrịrị na o mere ka obi dị ya? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

7 Ezikiel hụrụ otú mmụọ Chineke si akpa ike. Ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mere ka ọ mata na ọ bụ mmụọ nsọ na-enyere ndị mmụọ ozi dị ike aka, na-eduzikwa nnukwu wiil ndị dị n’otu ụgbọ ịnyịnya eluigwe. (Ezik. 1:20, 21) Gịnịzi ka Ezikiel mere? O dere ihe o mere. Ọ sịrị: “Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.” Ụjọ na-atụ ya mere ka ọ daa n’ala. (Ezik. 1:28) Mgbe ọ bụla Ezikiel chebaara ọhụụ ahụ dị ebube echiche, ọ ga-abụrịrị na o mere ka obi sikwuo ya ike na mmụọ nsọ Chineke ga-enyere ya aka ijezu ozi ya.

8-9. (a) Gịnị ka Jehova nyere Ezikiel iwu ka o mee? (b) Olee otú Jehova si mee ka obi sikwuo Ezikiel ike ịga zie ndị isi ike ozi?

8 Jehova nyere Ezikiel iwu, sị: “Nwa nke mmadụ, bilie ọtọ ka m gwa gị okwu.” Mmụọ nsọ na iwu ahụ Jehova nyere ya mere ka o nwee ike isi n’ala bilie ọtọ. Ezikiel dere, sị: “Mmụọ nsọ dakwasịrị m ma mee ka m guzoro ọtọ.” (Ezik. 2:1, 2) N’oge niile Ezikiel nọ na-eje ozi ya, aka Chineke, ya bụ, mmụọ nsọ Chineke, nọ na-eduzi ya. (Ezik. 3:22; 8:1; 33:22; 37:1; 40:1) Mmụọ Chineke nyeere Ezikiel aka ịrụ ọrụ Chineke nyere ya, nke bụ́ izi ‘ndị isi ike na ndị obi ha kpọchiri akpọchi’ ozi Chineke. (Ezik. 3:7) Jehova sịrị Ezikiel: “Emeela m ka ihu gị sie ike ka ihu ha, meekwa ka egedege ihu gị sie ike ka egedege ihu ha. Emeela m ka egedege ihu gị dịrị ka dayamọnd, siekwa ike karịa nkume. . . . Atụla ha egwu. Ụjọ atụkwala gị ma ị hụ ihu ha.” (Ezik. 3:8, 9) Ihe Jehova na-agwa Ezikiel bụ: ‘Ekwela ka isi ike ndị Izrel mee ka ike gwụ gị. M ga-eme ka obi sie gị ike.’

9 Mmụọ Chineke mechara buga Ezikiel n’ebe ọ ga-ezi ozi Chineke ziri ya. O dere, sị: “Mmụọ Jehova nọkwa na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ m.” Onye amụma ahụ ji otu izu mụtachaa banyere ozi ahụ ma ghọta ya nke ọma ka o nwee ike izi ya ka onye ihe ọ na-ekwu doro anya. (Ezik. 3:14, 15) Jehova gwara ya ka ọ gaa n’otu ndagwurugwu, ‘mmụọ nsọ adakwasị ya’ n’ebe ahụ. (Ezik. 3:23, 24) Ezikiel ejikerela ịmalite ozi ya.

MMỤỌ NSỌ CHINEKE NA-EME KA ANYỊ DỊ IKE

Olee ihe nyeere Ezikiel aka? Oleekwa ihe ndị na-enyere anyị aka taa ịna-ekwusa ozi ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma? N’ihi gịnịkwa?

10 Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma? Iji zaa ajụjụ a, cheta ihe mere Ezikiel. Tupu ya ebido izi ozi Chineke ziri ya, mmụọ Chineke mere ka ọ dị ike. Otú ahụ ọ dị Ezikiel ka ọ dịkwa anyị. Anyị ga-ekwusali ozi ọma naanị ma mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Setan na-alụso anyị ọgụ ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 12:17) E jiri anya mmadụ lewe ya, o nwetụdịghị ebe ike anyị ruru nke Setan. Ma, anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-emeri ya. (Mkpu. 12:9-11) Olee otú anyị si na-emeri ya? Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-egosi na anyị anaghị atụ ụjọ mba Setan na-aba. Mgbe ọ bụla anyị ziri ozi ọma, ọ bụ mmeri ka anyị meriri Ekwensu. N’ihi ya, gịnị ka anyị nwere ike ikwu maka ozi ọma a anyị na-ezi n’agbanyeghị na a na-emegide anyị? Anyị nwere ike ikwu na ọ bụ mmụọ nsọ na-enye anyị ike nakwa na ozi anyị na-eje dị Jehova mma.​—Mat. 5:10-12; 1 Pita 4:14.

11. Gịnị ka mmụọ nsọ Chineke na-emere anyị? Oleekwa otú anyị ga-esi na-enweta ya?

11 Olee ihe ọzọ anyị na-aghọta ma anyị cheta otú Jehova si mee ka ihu Ezikiel na egedege ihu ya sie ezigbo ike? Anyị na-aghọta na mmụọ nsọ Chineke ga-emeli ka anyị nwee ike imeri nsogbu ọ bụla bịaara anyị n’ozi anyị. (2 Kọr. 4:7-9) Ma, gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enweta mmụọ nsọ? Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile maka ya, obi esiekwa anyị ike na Jehova ga-anụ ekpere anyị. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-arịọnụ, . . . na-achọnụ, . .v. na-akụnụ aka.” Anyị mee otú ahụ, Jehova ‘ga-enye anyị mmụọ nsọ anyị na-arịọ ya.’​—Luk 11:9, 13; Ọrụ 1:14; 2:4.

OKWU CHINEKE MERE KA OKWUKWE EZIKIEL NA-ESIKWU IKE

12. N’ihi ihe e kwuru n’Ezikiel 2:9–3:3, olee ebe akwụkwọ mpịakọta ahụ si? Gịnịkwa ka e dere na ya?

12 Ọ bụghị naanị na mmụọ Chineke mere ka Ezikiel kata obi na-ezi ozi Chineke, kamakwa okwu Chineke mere ka okwukwe ya na-esikwu ike. N’ọhụụ e gosiri Ezikiel, ọ hụrụ aka ji otu akwụkwọ mpịakọta. (Gụọ Ezikiel 2:9–3:3.) Olee ebe akwụkwọ mpịakọta ahụ si? Gịnị ka e dere na ya? Olee otú o si mee ka okwukwe Ezikiel sikwuo ike? Ka anyị chọpụta. Akwụkwọ mpịakọta ahụ si n’ocheeze Chineke. Ọ ga-abụ na Jehova si n’aka otu n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ Ezikiel hụburu nye ya akwụkwọ mpịakọta ahụ. (Ezik. 1:8; 10:7, 20) Ihe e dere na ya bụ okwu Chineke, ya bụ, ozi amamikpe toro ogologo Ezikiel ga-ezi ndị nnupụisi ahụ a dọọrọ n’agha. (Ezik. 2:7) E dere ozi ahụ ma n’ihu akwụkwọ mpịakọta ahụ ma n’azụ ya.

13. Gịnị ka Jehova gwara Ezikiel ka o mee akwụkwọ mpịakọta ahụ? Gịnịkwa mere o ji tọọ ya ụtọ n’ọnụ?

13 Jehova gwara Ezikiel ka ọ taa akwụkwọ mpịakọta ahụ, “tajuo afọ.” Ezikiel rubere isi, tachaa akwụkwọ mpịakọta ahụ. Gịnị ka ihe a Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụtara? Ezikiel kwesịrị ịghọta ozi ahụ ọ na-aga izi nke ọma. O kwesịrị ikweta ihe e kwuru na ya ka o nwee ike ịna-enu ya enu ịga zie ya ndị ọzọ. Ihe na-eju anya meziri. Ezikiel chọpụtara na akwụkwọ mpịakọta ahụ ‘tọrọ ya ụtọ ka mmanụ aṅụ.’ (Ezik. 3:3) N’ihi gịnị? Ezikiel ghọtara na ùgwù Jehova kwanyeere ya kwe ka ọ gaa nọchite anya ya na-atọ ka mmanụ aṅụ. (Ọma 19:8-11) Obi dị ya ezigbo ụtọ na Jehova họpụtara ya ka ọ bụrụ onye amụma ya.

14. Olee ihe nyeere Ezikiel aka ịdị njikere ịrụ ọrụ Chineke nyere ya?

14 Jehova mechara sị Ezikiel: “Nụrụ okwu niile m na-agwa gị, burukwa ha n’obi.” (Ezik. 3:10) Jehova ji ihe a o kwuru na-agwa Ezikiel ka ọ gbalịa na-echeta ihe ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ ma na-atụgharị uche na ha. Ezikiel si otú ahụ mee ka okwukwe ya na-esikwu ike. O mekwara ka o nweta ozi na-akpa ike ọ ga-ezi ndị Izrel. (Ezik. 3:11) Ebe ozi Chineke dị Ezikiel n’obi nakwa n’egbugbere ọnụ, ọ dịla njikere ịga ziwe ozi Chineke ziri ya ruo mgbe ọ ga-ezicha ya.​—I nwere ike ịtụle Abụ Ọma 19:14.

OKWU CHINEKE NA-EME KA OKWUKWE ANYỊ NA-ESIKWU IKE

15. Anyị chọọ ịnọsi ike n’ozi anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ‘iburu n’obi’?

15 Anyị chọọ ịnọsi ike n’ozi anyị, anyị kwesịkwara ikwe ka okwu Chineke mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Anyị kwesịrị ‘iburu n’obi’ ihe niile Jehova na-agwa anyị. Jehova si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị okwu taa. Olee otú anyị ga-esi mee ka Okwu Chineke na-eduzi ihe anyị na-eche, otú obi dị anyị, na ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme?

16. Gịnị ka anyị kwesịrị iji Okwu Chineke na-eme? Oleekwa otú anyị ga-esi mee ka ọ baa anyị n’obi?

16 Ọ na-abụ, anyị rie nri, ya agbarie, nye anyị ihe n’ahụ́. Ọ bụ otú ahụ ka ịmụ Okwu Chineke ma tụgharịa uche na ya na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Anyị kwesịrị ịna-echeta ihe Jehova ji akwụkwọ mpịakọta ahụ na-akụziri anyị. Jehova chọrọ ka anyị na-eri Okwu ya ka nri, na-eriju ya afọ, ya bụ, ka ọ baa anyị n’ụmị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere, na-agụ Okwu ya, na-atụgharịkwa uche na ya. Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịkwadebe obi anyị ka o nwee ike ịnabata echiche Chineke. Ihe ọzọ bụ ịgụ ebe anyị chọrọ ịgụ na Baịbụl. Anyị gụchaa, anyị akwụsịtụ chebara ihe anyị gụrụ echiche. Olee uru ọ ga-abara anyị? Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche na ya, anyị ga na-aghọtakwu Okwu Chineke, ya emee ka okwukwe anyị na-esikwu ike.

17. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ na Baịbụl?

17 Gịnị mere ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ maka na ọ na-eme ka anyị kata obi na-ezi ozi ọma anyị na-ezi ugbu a, dịkwa njikere izi ozi amamikpe anyị nwere ike izi n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharịkwa uche n’ọmarịcha àgwà Jehova nwere, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma. Ọ ga-eme ka obi na-eru anyị ala, obi ana-adịkwa anyị ezigbo ụtọ. Ọ bụ ihe magburu onwe ya nke na-atọkarị mmanụ aṅụ.​—Ọma 119:103.

ANYỊ KPEBISIRI IKE ỊNA-ATACHI OBI

18. Gịnị ka ndị anyị na-ezi ozi ọma ga-emecha ghọta? N’ihi gịnịkwa?

18 Chineke enyeghị anyị ọrụ ibu amụma otú ahụ o nyere Ezikiel. Ma, anyị kpebisiri ike ịna-ekwusa ozi Jehova mere ka e dee na Baịbụl ruo mgbe e kwusachara ya otú ọ chọrọ. Oge ikpe ruo, ndị anyị na-ezi ozi ọma agaghị ahụ ihe ha ga-akụdo aka sị na a dọghị ha aka ná ntị ma ọ bụ na Chineke leghaara ha anya. (Ezik. 3:19; 18:23) Kama, ha ga-emecha ghọta na ozi anyị ziri ha si n’aka Chineke.

19. Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike ijezu ozi anyị?

19 Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike ijezu ozi anyị? Ọ bụ ụzọ ihe atọ ahụ mere ka obi sie Ezikiel ike. Anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma n’ihi na anyị ma na ọ bụ Jehova ziri anyị ozi a, na mmụọ nsọ Chineke na-enye anyị ike, nakwa na Okwu Chineke na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Jehova ga-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ijezu ozi anyị ma na-atachi obi “ruo ọgwụgwụ.”​—Mat. 24:13.

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

a N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ nyeere Ezikiel onye amụma aka ikwusa ozi Chineke sịrị ya kwusaa. Ka anyị na-atụle otú Jehova si nyere ya aka, obi ga-esikwu anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ijezu ozi anyị.