Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Iji Ọṅụ Na-atachi Obi

Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Iji Ọṅụ Na-atachi Obi

“Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara. Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere.”​—AỊZA. 30:18.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. (a) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a? (b) Olee ihe na-egosi na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike inyere anyị aka?

 JEHOVA nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị ná ndụ ma jiri ọṅụ na-efe ya. Olee ihe ndị ọ na-eme iji nyere anyị aka? Olee otú anyị ga-esi rite ezigbo uru n’ihe ndị ahụ o ji enyere anyị aka? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a. Ma, ajụjụ dị mkpa anyị ga-ebugodị ụzọ zaa n’isiokwu a bụ: Jehova ọ̀ chọsiri ike inyere anyị aka?

2 Ihe Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Pọl dere, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?” (Hib. 13:6) Akwụkwọ ndị na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na okwu ahụ bụ́ “onye na-enyere m aka” n’amaokwu a pụtara onye ji ọsọ na-aga inyere onye na-arịọ ka e nyere ya aka aka. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Jehova ji ọsọ na-aga inyere onye nọ ná nsogbu aka. Ihe atụ a gosiri na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike inyere anyị aka. Ebe ọ bụ na Jehova na-enyere anyị aka, anyị ga-ejili ọṅụ na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị.

3. Olee ihe atọ Jehova na-eme iji nyere anyị aka iji ọṅụ na-edi nsogbu?

3 Olee ụfọdụ ihe Jehova na-eme iji nyere anyị aka iji ọṅụ na-edi nsogbu ndị bịaara anyị? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị gụọ ụfọdụ amaokwu n’akwụkwọ Aịzaya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ amụma Jehova mere ka e buo n’akwụkwọ Aịzaya gbasara ndị na-efe Chineke taa. Ihe ọzọ bụ na Aịzaya na-ejikarị okwu ndị dị mfe nghọta akọwa Jehova. Ka anyị jiri Aịzaya isi 30 mee ihe atụ. N’ebe ahụ, Aịzaya ji ihe atụ ndị magburu onwe ha kọwaa otú Jehova si enyere ndị ya aka. O dere ụzọ atọ Jehova si enyere anyị aka. Nke mbụ, ọ na-ege anyị ntị nke ọma, na-azakwa ekpere anyị. Nke abụọ, ọ na-eduzi anyị. Nke atọ, ọ na-emere anyị ihe ọma ugbu a. Ọ ga-emekwara anyị ihe ọma n’ọdịnihu. Ka anyị lebakwuo anya n’ihe atọ ndị a Jehova na-eme iji nyere anyị aka.

JEHOVA NA-EGE ANYỊ NTỊ

4. (a) Gịnị ka Jehova kwuru gbasara ndị Juu n’oge Aịzaya, gịnịkwa ka o kwere ka o mee ha? (b) Olee olileanya Jehova mere ka ndị na-erubere ya isi nwee? (Aịzaya 30:18, 19)

4 Ná mbido Aịzaya isi 30, Jehova kpọrọ ndị Juu “ụmụ dị isi ike” “na-eme mmehie n’elu nke ha mere eme.” Ọ sịkwara: “Ha bụ ndị na-enupụ isi, . . . ụmụ na-achọghị ịnụ iwu Jehova.” (Aịza. 30:1, 9) Aịzaya buru amụma na Jehova ga-ahapụ ha ka ọdachi dakwasị ha ebe ọ bụ na ha achọghị ige ntị. (Aịza. 30:5, 17; Jere. 25:8-11) Ọ bụ ihe mechara mee mgbe ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha. Ma, e nwere ụfọdụ n’ime ndị Juu na-erubere Jehova isi. Aịzaya bukwara amụma mere ka ha nwee olileanya. Ọ gwara ha na otu ụbọchị, Jehova ga-eme ka ha laghachi Izrel. (Gụọ Aịzaya 30:18, 19.) Ọ bụkwa ihe merenụ. Jehova mechara mee ka ha si na Babịlọn pụta. Ma, ọtụtụ afọ gafere tupu Jehova emee ya. Cheta na amaokwu nke 18 sịrị: “Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara.” O gosiri na ọtụtụ afọ ga-agafe tupu a napụta ndị Juu na-erubere Chineke isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị Izrel nọrọ afọ iri asaa na Babịlọn tupu ndị fọrọ afọ n’ime ha alaghachi Jeruselem. (Aịza. 10:21; Jere. 29:10) Ozugbo ha lọtara n’obodo ha, ha kwụsịrị ákwá ha bere na Babịlọn, ọnụ abụrụzie ha ọchị ọchị.

5. Olee ihe na-emesi obi ike e kwuru n’Aịzaya 30:19?

5 Taa, ihe ahụ e kwuru n’Aịzaya 30:19 nwere ike ịkasi anyị obi, ya bụ, “ọ ga-emere unu amara mgbe ọ nụrụ ákwá unu na-ebe ka e nyere unu aka.” Aịzaya mesiri anyị obi ike na Jehova ga-ege ntị nke ọma ma anyị na-arịọ ya ka o nyere anyị aka. Ọ ga-azakwa anyị ya ngwa ngwa. Aịzaya kwukwara, sị: “Ọ ga-enyere unu aka ozugbo ọ nụrụ ya.” Ihe ndị a o kwuru na-emesi anyị obi ike na Nna anyị dị njikere inyere ndị niile rịọrọ ya ka o nyere ha aka aka. Ịma ihe a ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-atachi obi.

6. Olee otú ihe Aịzaya kwuru si gosi na Jehova na-ege ntị n’ekpere ohu ya ọ bụla?

6 Olee ihe ọzọ amaokwu Baịbụl a mere ka obi sie anyị ike na ya gbasara ekpere anyị? Jehova na-ege ntị n’ekpere onye ọ bụla n’ime anyị na-ekpe. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’amaokwu ndị mbụ n’Aịzaya isi 30, Jehova na-agwa ndị Juu niile okwu. Ọ bụ ya mere o ji sị “unu.” Ma, okwu Hibru a sụgharịrị “unu” n’amaokwu nke 19 bụ otu onye ka a na-ekwu gbasara ya. Ihe Aịzaya na-agwa onye ọ bụla n’ime ha bụ: ‘O nweghị ihe ga-eme ka i bee ákwá,’ ọ ‘ga-emere gị amara,’ nakwa ‘ọ ga-enyere gị aka.’ Ọ na-egosi ihe Jehova ga-emere onye ọ bụla n’ime ha. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ bụrụ na nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị adaa mbà, ọ naghị asị ya: “I kwesịrị isi ike ka nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwaanyị.” Kama, ọ na-eche banyere onye ọ bụla n’ime anyị ma na-ege ntị n’ekpere onye nke ọ bụla na-ekpe.​—Ọma 116:1; Aịza. 57:15.

Gịnị ka Aịzaya bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Na-arịọnụ” Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee otú Aịzaya na Jizọs si gosi na anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka?

7 Anyị nwee nsogbu ma rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, ihe o nwere ike ime ozugbo bụ inye anyị ike anyị ga-eji edi nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na nsogbu ahụ akwụsịghị ozugbo otú anyị tụrụ anya ya, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ugboro ugboro ka ọ na-enye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. Ọ gwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ. Ọ bụ ihe ihe Aịzaya kwuru na-egosi. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ” Jehova. (Aịza. 62:7) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ihe a Aịzaya kwuru chetaara anyị ihe atụ Jizọs mere gbasara ekpere na Luk 11:8-10, 13. N’ebe ahụ, Jizọs gwara anyị ka anyị ‘nọgidesie ike na-arịọ ya,’ nakwa ka anyị ‘na-arịọ ya’ ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o duzie anyị ka anyị kpebie ime ihe dị mma.

JEHOVA NA-EDUZI ANYỊ

8. N’oge ochie, olee otú ihe e kwuru n’Aịzaya 30:20, 21 si mezuo?

8 Gụọ Aịzaya 30:20, 21. Mgbe ndị agha Babịlọn nọchibidoro Jeruselem otu afọ na ọkara, ndị Juu tagidere ahụhụ, ya amara ha ahụ́ ka iri nri na ịṅụ mmiri. Ma, n’amaokwu nke 20 na nke 21, Jehova kwere ha nkwa na ọ ga-anapụta ha ma ọ bụrụ na ha echegharịa ma gbanwee àgwà ha. Aịzaya kpọrọ Jehova ‘Onye Ozizi ha kachanụ’ ma kwe ndị Juu nkwa na Jehova ga-akụziri ha otú ha ga-esi fee ya otú ọ chọrọ. Ihe ahụ o kwuru mezuru mgbe a hapụrụ ha na Babịlọn. Jehova gosiri ha na ọ bụ ‘Onye Ozizi ha kachanụ.’ O duziri ha, mee ka ha fewekwa ya otú ọ chọrọ. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere anyị taa na Jehova bụ Onye Ozizi anyị kachanụ.

9. Olee otu ụzọ Jehova si eduzi anyị taa?

9 N’amaokwu ndị ahụ, Aịzaya sị na anyị dị ka ụmụ akwụkwọ Jehova si ụzọ abụọ akụziri ihe. Nke mbụ, Aịzaya kwuru, sị: “Unu ga-ejikwa anya unu hụ Onye Ozizi unu kachanu.” Ihe Aịzaya kwuru n’ihe atụ a gosiri na Onye Ozizi ahụ kwụ n’ihu ụmụ akwụkwọ ya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Chineke na-akụziri anyị ihe taa. Olee otú Jehova si akụziri anyị ihe? Ọ na-eji nzukọ ya akụziri anyị ihe. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe doro anya nzukọ ya na-akụziri anyị. Ntụziaka ndị a na-enye anyị n’ọmụmụ ihe, ná mgbakọ, n’akwụkwọ anyị, n’ihe omume tiivi anyị, nakwa n’ebe ndị ọzọ na-enyere anyị aka iji ọṅụ na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị.

10. Olee otú anyị si ‘anụ olu si n’azụ na-agwa anyị’ okwu?

10 Aịzaya kwuru ụzọ nke abụọ Jehova si enye anyị ntụziaka. Ọ sịrị: “Unu ga-anụ olu ga-esi n’azụ na-agwa unu” okwu. N’ebe a, Aịzaya kwuru na Jehova dị ka onye nkụzi kwụ ụmụ akwụkwọ ya n’azụ, na-egosi ha ebe ha ga-aga. Taa, anyị na-anụ olu Jehova ka o si n’azụ na-agwa anyị okwu. Olee otú anyị si anụ ya? E si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl ọtụtụ afọ gara aga. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl, ọ dị ka ebe Chineke si n’azụ na-agwa anyị okwu.​—Aịza. 51:4.

11. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ọṅụ na-edi nsogbu anyị, n’ihi gịnịkwa?

11 Gịnị ka anyị ga-eme ka ntụziaka Jehova si ná nzukọ ya na n’Okwu ya na-enye anyị baara anyị ezigbo uru? Legodị ihe abụọ Aịzaya kwuru. Nke mbụ bụ “lekwanụ ụzọ,” nke abụọ abụrụ “na-aganụ na ya.” (Aịza. 30:21) Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịmata “ụzọ” ahụ. Anyị kwesịkwara ‘ịna-aga na ya.’ Okwu Chineke na ihe ndị nzukọ ya na-akọwara anyị na-eme ka anyị mụta ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Anyị na-amụtakwa otú anyị ga-esi na-eme ihe ndị anyị na-amụta. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe abụọ ndị ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ọṅụ na-atachi obi n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ọ bụ naanị ma anyị mee ihe abụọ ndị a ka Jehova ga-agọzi anyị.

JEHOVA NA-AGỌZI ANYỊ

12. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 30:23-26, olee otú Jehova si gọzie ndị ya?

12 Gụọ Aịzaya 30:23-26. Olee otú amụma a si mezuo mgbe a hapụrụ ndị Juu, ha esi Babịlọn lọta Izrel? Jehova nyere ha ọtụtụ ihe ga-eme ka ha dịrị ndụ nakwa ihe ndị ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. Jehova nyere ndị ya nri n’ụba. Ma, nke kacha mkpa bụ na o nyere ha ihe niile ga-eme ka ha fewekwa ya otú ọ chọrọ. Jehova esitụbeghị otú ahụ gọzie ndị ya. Dị ka e kwuru n’amaokwu nke 26, Jehova mere ka ha ghọtakwuo Okwu ya. (Aịza. 60:2) Ngọzi ndị a Jehova nyere ndị ya mere ka ha nwee ume ma jiri ọṅụ na-efe ya “n’ihi na obi dị ha mma.”​—Aịza. 65:14.

13. Olee otú amụma e buru gbasara ịmalitekwa fewe Jehova otú ọ chọrọ si emezu n’oge anyị a?

13 Amụma a Baịbụl buru gbasara ịmalitekwa fewe Jehova otú ọ chọrọ ọ̀ gbasara anyị taa? Ee. Ọ gbasara anyị. Olee otú o si gbasa anyị? Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ nde mmadụ esila na Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, pụta. Chineke edubala ha n’ebe ka ala ahụ e kwere ndị Izrel ná nkwa ezigbo mma. Ha nọzi n’ebe obi ruru ha ala ha ga-anọ jiri otu obi na-efe Jehova otú ọ chọrọ. (Aịza. 51:3; 66:8) Olee ebe bụ́ ebe ahụ?

14. Olee ihe ọma Chineke na-emere ndị e tere mmanụ na ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’? Gịnịkwa ka ha ga-eme iji na-enweta ihe ọma ahụ?

14 Kemgbe afọ 1919, ndị e tere mmanụ na-efekọ Jehova ọnụ. Ka oge na-aga, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, ndị so n’atụrụ ọzọ, sonyeere ndị e tere mmanụ n’ebe ahụ ha nọ. Jehova na-akụziri ha ihe niile ga-enyere ha aka ịna-efe ya. E nweghịkwa ụgha ndị chọọchị na-akụzi dị na ya. Anyị nwekwara ọtụtụ ọrụ gbasara ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-arụ. Anyị na Jehova dị ná mma, anyị na ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya dịkwa n’udo. Ha na-enyere anyị aka iji ọṅụ na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. Mgbe anyị banyere n’ebe a bụ mgbe anyị malitere ife Jehova otú ọ chọrọ, na-agbalịkwa ime ka ya.​—Jọn 10:16; Aịza. 25:6; 65:13.

15. Ebee ka ebe ahụ Jehova kpọbatara ndị na-efe ya taa dị?

15 Ebee ka ebe ahụ Jehova kpọbatara ndị na-efe ya taa dị? Ndị na-efe Jehova nọ n’ebe niile n’ụwa. N’ihi ya, ebe ọ kpọbatara ha dịkwa n’ebe niile n’ụwa. N’agbanyeghị ebe ọ bụla anyị bi n’ụwa, anyị nwere ike iso ná ndị na-enwe obi ụtọ n’ọgbakọ Jehova ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị niile na-efe ya otú ọ chọrọ.

Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi mee ka ọgbakọ Jehova na-amakwu mma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-ahụ otú ọgbakọ Ndị Kraịst si bụrụ ọpụrụiche?

16 Anyị chọọ ịnọsi ike n’ebe a a na-efe Jehova otú ọ chọrọ, otu n’ime ihe ndị anyị kwesịrị ime bụ ịna-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ọgbakọ Ndị Kraịst dị n’ụwa niile. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-emeta, ọ bụghị n’ebe ha na-emejọ. (Jọn 17:20, 21) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa? Chegodị banyere ihe atụ a. Mmadụ gaa n’oké ọhịa, ọ ga-atụ anya ịhụ ụdị osisi dị iche iche. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọgbakọ Jehova. E nwere ụdị ndị dị iche iche e nwere ike iji tụnyere osisi ndị ahụ. (Aịza. 44:4; 61:3) Anyị kwesịrị ịna-elekwasị anya n’otú ọgbakọ si maa mma, ọ bụghị n’ihe nwanna nọ anyị nso na-anaghị emeta. Anyị ekwesịghị ikwe ka ezughị okè anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ mee ka anyị ghara ịna-ahụ otú ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ si bụrụ ọpụrụiche.

17. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu?

17 Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi eme ka ọgbakọ dịrị n’udo? Ọ bụ ịna-eme udo. (Mat. 5:9; Rom 12:18) Mgbe ọ bụla anyị bu ụzọ mewe ihe ga-eme ka anyị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ dịrị n’udo, anyị na-eme ka ọgbakọ na-amakwu mma. Ka anyị buru n’obi na ọ bụ Jehova dọtara onye ọ bụla batara n’ọgbakọ ya. (Jọn 6:44) Chegodị otú obi si adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị niile na-agbasi mbọ ike ka anyị na ndị bara ezigbo uru n’anya ya dịrịkwuo n’udo ma dịrị n’otu, ya bụ, ndị na-efe ya.​—Aịza. 26:3; Hag. 2:7.

18. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-echebara echiche, n’ihi gịnịkwa?

18 Gịnị ka anyị ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma Jehova na-enye ndị na-efe ya baara anyị ezigbo uru? Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst, nke ga-eme ka anyị ‘na-ahụ ibe anyị n’anya ka ụmụnne’ ma ‘na-enwere ha ọmịiko.’ (Rom 12:10) Anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ndị ọ na-emere anyị ugbu a echiche. Ichebara ihe ndị o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu echiche ga-eme ka anyị na-atụsi anya ike na anyị ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị a niile ga-eme ka anyị jiri ọṅụ na-efe ya ugbu a.

KPEBISIE IKE ỊNA-ATACHI OBI

19. (a) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 30:18, olee ihe obi siri anyị ike na ya? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-atachi obi?

19 Jehova ga-ebili inyere anyị aka mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. (Aịza. 30:18) Obi siri anyị ike na Jehova, bụ́ “Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi,” agaghị ekwe ka ụwa Ekwensu a jiri otu ụbọchị nọfee otú o kwesịrị. (Aịza. 25:9) Ka anyị nwee ndidi chere ka ụbọchị Jehova ga-anapụta anyị ruo. Ka ọ dị ugbu a, anyị kpebisiri ike ịna-ekpe ekpere, na-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe ndị anyị na-amụta, na-echebakwara ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-atachi obi n’ofufe ya.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

a N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ụzọ atọ Jehova si enyere ndị na-efe ya aka iji ọṅụ na-edi nsogbu ụwa a. Anyị ga-eleba anya n’Aịzaya isi 30 iji mata ụzọ atọ ndị ahụ. Anyị lebawa anya na ya, a ga-echetara anyị uru anyị ga-erite ma anyị na-ekpe ekpere, na-amụ Okwu Chineke, ma na-eche gbasara ọtụtụ ihe ọma Jehova na-emere anyị ugbu a na ndị nke ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.