Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ịtụkwasị Jehova Obi Chebere M

Ịtụkwasị Jehova Obi Chebere M

Ọ BỤRỤ na ndị mmadụ ajụọ m ihe m merela n’ozi Jehova, m na-agwa ha na m dị ka akpa Jehova na-eji aga ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ihe m bu n’obi ekwu ihe a bụ na otú ahụ m na-ebu akpa m aga ebe ọ bụla m chọrọ ibu ya aga ka m chọkwara ka Jehova na nzukọ ya na-eme m. M chọrọ ka ọ bụrụ ha ga na-agwa m ebe m ga-aga na mgbe m ga-aga ebe ahụ. E nweela ọrụ ndị e nyere m, ndị chọrọ ka m hapụ ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ, mgbe ụfọdụ, mee ihe ndị nwere ike ịta isi m. Ma, m mụtara na ihe ga-echebe m bụ ịtụkwasị Jehova obi.

OTÚ M SI MATA JEHOVA MA TỤKWASỊ YA OBI

A mụrụ m n’afọ 1948, n’otu obere obodo dị n’ebe ọdịda anyanwụ Naịjirịa. N’oge ahụ, nwanne papa m nke ọ tọrọ aha ya bụ Moustapha na ọkpara nne m aha ya bụ Wahabi mere baptizim, ghọọ Ndịàmà Jehova. Mgbe m dị afọ itoolu, papa m nwụrụ. Obi gbawara m. Wahabi nwanne m gwara m na anyị nwere ike ịhụ papa ọzọ ma a kpọlite ya n’ọnwụ. Ihe a na-akasi obi ọ gwara m mere ka m malite ịmụ Baịbụl. M mere baptizim n’afọ 1963. Ụmụnne m nwoke atọ ndị ọzọ mekwara baptizim.

N’afọ 1965, m gara soro nwanne m aha ya bụ Wilson biri na Legọs. Obi dị m ụtọ na e nwere ndị ọsụ ụzọ mụ na ha nọ n’Ọgbakọ Igbobi. Otú ha si enwe obi ụtọ na otú ha si jiri ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe mere ka mụnwa bụrụkwa ọsụ ụzọ n’afọ 1968.

Otu nwanna na-eje ozi na Betel aha ya bụ Albert Olugbebi haziri ka ya na ndị na-eto eto nwee nnọkọ pụrụ iche ka ọ gwa ha na a chọkwuru ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ugwu Naịjirịa. M ka na-echeta okwu Nwanna Olugbebi ji obi ya niile gwa anyị. Ọ sịrị anyị: “Unu ka bụ okorobịa. Unu nwere ike iji oge unu na ike unu fee Jehova. E nwere ọrụ ndị unu ga-arụ.” M chọrọ iwepụta onwe m jeere Jehova ozi otú ahụ Aịzaya onye amụma mere. N’ihi ya, m dejupụtara fọm ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche​—Aịza. 6:8.

N’ọnwa Mee afọ 1968, e zigara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Kano nke dị n’ebe ugwu Naịjirịa. Ihe a bụ n’oge a na-alụ Agha Biafra (n’afọ 1967 ruo 1970). Agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe ugwu Naịjirịa, mechazie ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ. E nwere otu nwanna gbalịrị ime ka m ghara ịga n’ebe ugwu Naịjirịa n’ihi na ọ chọghị ka ihe mee m. Ma, m sịrị ya: “Obi dị m ụtọ maka echiche ọma ị na-echere m. Ma, ọ bụrụ na Jehova chọrọ ka m jee ozi n’ebe ahụ, obi siri m ike na ọ ga-anọnyere m.”

ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI N’EBE A NA-ALỤ AGHA

Ị hụ ihe mere na Kano n’oge a na-alụ agha, ọ ga-ewute gị. Agha ahụ mebisịrị ọtụtụ ihe n’obodo a buru ibu. Anyị nọrọ n’ozi ọma mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụ ozu ndị e gburu n’agha ahụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ụfọdụ ọgbakọ na Kano, ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị nọ ebe ahụ agbapụla. Ndị nkwusa fọziri n’ebe ahụ erughị mmadụ iri na ise. Ụjọ na-atụ ha, obi dakwara ha mbà. Obi tọgburu ụmụnna anyị ndị ahụ atọgbu mgbe anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche isii rutere ebe ahụ. Otú anyị si gbaa ha ume mere ka obi dịkwa ha mma. Anyị nyeere ha aka ịmaliteghachi inwe ọmụmụ ihe na ikwusa ozi ọma, malitekwa izigara alaka ụlọ ọrụ akụkọ ozi anyị na ọda akwụkwọ anyị.

Anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche malitere ịmụ asụsụ Awụsa. Mgbe ọtụtụ ndị nọ n’obodo ahụ nụrụ ozi ọma anyị n’asụsụ ha, ha gere anyị ntị. Ma, ndị nọ n’okpukpe a kacha ekpe na Kano achọghị iji ntị anụ ozi ọma anyị na-ekwusa. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya. E nwere otu oge otu nwoke ji mma chụọ mụ na onye mụ na ya so gaa ozi ọma ọsọ. Obi dị anyị ụtọ na anyị gbakarịrị ya n’ọsọ, nke mere na o jideghị anyị. N’agbanyeghị nsogbu ndị a, Jehova mere ka ‘obi ruo anyị ala,’ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa amalitekwa ịmụba. (Ọma 4:8) Taa, e nwere ihe karịrị narị ndị nkwusa ise (500) na-eje ozi n’ọgbakọ iri na otu na Kano.

A KPAGBURU ANYỊ NA NIJIE

Mgbe m bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Niame dị na Nijie

N’ọnwa Ọgọst afọ 1968, mgbe anyị ka nọchara na Kano ọnwa ole na ole, e zigara mụ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ ọzọ na Niame, bụ́ isi obodo Nijie Rịpọblik. Ọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. N’oge na-adịghị anya, anyị chọpụtara na Nijie bụ otu n’ime ebe ndị kacha ekpo ọkụ n’ụwa. Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi ebi n’ebe ahụ na-ekpo ọkụ, mụtakwa French, bụ́ asụsụ a kacha asụ n’obodo ahụ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, anyị tụkwasịrị Jehova obi ma malite ikwusa ozi ọma n’isi obodo ahụ, anyị na ndị nkwusa ole na ole nọ ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile nọ na Niame, ndị nwere ike ịgụ ihe, nwetara akwụkwọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh⁠-⁠Ebi. Ndị mmadụ na-achọdị anyị abịa ka anyị nye ha akwụkwọ ahụ.

N’oge na-adịghị anya, anyị chọpụtara na ndị ọchịchị achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. N’ọnwa Julaị afọ 1969, anyị gara mgbakọ sekit mbụ e nwere n’obodo ahụ. Ihe dị ka mmadụ iri abụọ bịakwara ya. Ọ nọ na-agụsi anyị agụụ ike ka anyị hụ mgbe a ga-eme ndị nkwusa abụọ baptizim. Ma, n’ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, ndị uwe ojii bịara kwụsị ihe omume ahụ. Ha kpọọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na onye nlekọta sekit gawa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Mgbe ha gbachara anyị ajụjụ ọnụ, ha gwara anyị ka anyị bịaghachi n’echi ya. Mgbe anyị chọpụtara na agwọ nọ n’akịrịka, anyị haziri ka e kwuo okwu baptizim n’ụlọ mmadụ, mee ndị nkwusa ahụ baptizim na nzuzo n’otu osimiri.

Mgbe izu ole na ole gachara, ndị ọchịchị chụpụrụ mụ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ise ndị ọzọ. Ha nyere anyị awa iri anọ na asatọ ịpụ n’obodo ha. Ọ bụkwa anyị ga-eji aka anyị hazie otú anyị ga-esi ala. Anyị rubeere ha isi ma laghachi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Naịjirịa. E nyere anyị ọrụ ọzọ n’ebe ahụ.

E zigara m n’obodo Orisunbare dị na Naịjirịa. Ikwusa ozi ọma ebe ahụ na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl tọrọ m ụtọ. Mụ na obere ìgwè ndị nkwusa nọ ebe ahụ so jee ozi. Ma, mgbe ọnwa isii gachara, alaka ụlọ ọrụ gwara m ka naanị m gaghachi Nijie. O juru m anya ná mmalite, ụjọ atụtụkwa m. Ma, m chọkwara ịhụ ụmụnna anyị nọ na Nijie ọzọ.

M gaghachiri Niame. N’ụbọchị na-esote ụbọchị m ruru ebe ahụ, otu nwoke onye Naịjirịa, bụ́ ọchụnta ego, matara na m bụ Onyeàmà Jehova. Ọ malitere ịjụ m ajụjụ gbasara Baịbụl. Mụ na ya mụrụ ihe. Mgbe ọ kwụsịkwara ịṅụ sịga na ịṅụ oké mmanya, o mere baptizim. Mgbe e mechara, obi dị m ụtọ na m so kwusaa ozi ọma na Nijie. Ndị mmadụ jikwa nwayọọ nwayọọ na-anabata eziokwu Baịbụl. Mgbe m bịara n’obodo ahụ, e nwere Ndịàmà Jehova iri atọ na otu. Ma, mgbe m na-apụ, ha dịzi iri isii na itoolu.

“ANYỊ AMACHAGHỊ OTÚ OZI ỌMA SI AGA NA GINI”

N’ọnwa Disemba afọ 1977, m lọtara Naịjirịa maka ọzụzụ. Mgbe ọzụzụ ahụ were izu atọ gwụrụ, onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ aha ya bụ Malcolm Vigo nyere m akwụkwọ ozi si n’alaka ụlọ ọrụ Siera Lion ka m gụọ. Ha na-achọ nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ́ gbasiri ike, onye na-alụbeghị nwaanyị, nakwa onye na-asụ Bekee na French nke ọma, ka o nwee ike ịbụ onye nlekọta sekit na Gini. Nwanna Vigo gwara m na ọ bụ ọrụ ahụ mere e ji na-azụ m. Mana, ọ gwasiri m ike na ọrụ ahụ abụghị obere ọrụ. Ọ sịrị m: “Chee ya nke ọma tupu gị ekweta ịrụ ya.” M gwara ya ozugbo, sị: “Ebe ọ bụ Jehova na-eziga m ebe ahụ, m ga-aga.”

M ji ụgbọelu gaa Siera Lion, gaa n’alaka ụlọ ọrụ dị ebe ahụ. Otu onye so na Kọmitii Alaka obodo ahụ sịrị m: “Anyị amachaghị otú ozi ọma si aga na Gini.” Ọ bụ eziokwu na ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ozi ọma a na-ekwusa na Gini, bụ́ obodo dị ha nso, ha anaghị enweta ozi si n’aka ndị nkwusa nọ n’obodo ahụ n’ihi na e nwere ọgba aghara. Mbọ niile ha gbara inweta onye ga na-anọchite anya ha n’obodo ahụ kụrụ afọ n’ala. N’ihi ya, ha gwara m ka m gaa n’isi obodo Gini bụ́ Kọnakrị gbalịa ka ndị ọchịchị nye m ikike ibi n’obodo ahụ.

“Ebe ọ bụ Jehova na-eziga m ebe ahụ, m ga-aga”

Mgbe m rutere na Kọnakrị, m gara n’ọfis ndị na-anọchite anya Naịjirịa n’obodo ahụ, hụ onyeisi ha. M gwara ya na m chọrọ ịna-ekwusa ozi ọma na Gini. Ọ gwara m ka m ghara ịnọ ebe ahụ n’ihi na e nwere ike ịnwụchi m ma ọ bụ merụọ m ahụ́. Ọ sịrị m: “Laghachi Naịjirịa gaa kwusawa ozi ọma.” Mana m sịrị ya: “Achọsiri m ike ịnọ ebe a.” N’ihi ya, o degaara Minista Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme ná Mba Gini akwụkwọ ozi ka o nyere m aka. Minista ahụ nabatakwara m nke ọma.

Mgbe obere oge gachara, m gaghachiri n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Siera Lion, gwa ha na minista ahụ nyeere m aka inweta ikike ịnọrọwa n’obodo ahụ. Obi tọgburu ụmụnna ndị ahụ atọgbu mgbe ha nụrụ otú Jehova si gọzie ije m. Ndị ọchịchị kwere ka m nọrọ na Gini.

Mgbe m na-elekọta sekit na Siera Lion

Malite n’afọ 1978 ruo n’afọ 1989, m rụrụ ọrụ sekit na Gini na Siera Lion, bụrụkwa onye na-enyere onye nlekọta sekit aka na Laịberịa. Ná mmalite, m na-arịakarị ọrịa, mgbe ụfọdụ n’obodo dịpụrụ adịpụ. Ma, ụmụnna na-agbalị ike ha niile kpọga m ụlọ ọgwụ.

N’otu oge, ịba na òkpò jisiri m ike. Mgbe m mechara gbakee, m chọpụtara na ụmụnna nọ na-ekwurịta ebe ha ga-eli m n’ihi na ha chere na m ga-anwụ. N’agbanyeghị nsogbu ndị a, o nweghị mgbe ọ bụla m chere echiche ịhapụ ozi m na-eje. Obi sikwara m ike na ọ bụ naanị Chineke ga-akacha chebe m, n’ihi na anyị nwụgodị, o nwere ike ịkpọlite anyị n’ọnwụ.

MỤ NA NWUNYE M TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI

N’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’afọ 1988

N’afọ 1988, m matara Dorcas. Ọ bụ nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ, onye ji ife Jehova kpọrọ ihe, dịrịkwa umeala n’obi. Anyị lụrụ, mụ na ya esoro na-arụ ọrụ sekit. O so m rụsie ọrụ ike n’ozi m. Ọ dịkwa njikere ịhapụ ihe ọ bụla maka ofufe Jehova. Mụ na ya na-eji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita iri abụọ na ise, buru akpa anyị, gaa leta ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọgbakọ anyị chọrọ ileta dị anya karịa nke ahụ, anyị na-abanye n’ihe ọ bụla ga-ebugali anyị ebe ahụ, ya bụ, ihe ọ bụla nwere ike iburu anyị gafee ụzọ ọjọọ apịtị juru.

Nwunye m Dorcas nwere obi ike. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ụfọdụ anyị na-agafe mmiri agụ iyi juru na ya. N’otu oge anyị mere njem were abalị ise, otu àkwà mmiri gbajiri, e jirizie ụgbọ epeepe bufee anyị. Mgbe nwunye m biliri ka o si n’ụgbọ ahụ pụta, ọ dabara n’ime mmiri ahụ, n’ebe miri emi. Ma mụ ma yanwa amaghị mmiri egwu. E nwekwara agụ iyi ná mmiri ahụ. Obi dị anyị ụtọ na ụfọdụ ụmụ okorobịa mabara ná mmiri ahụ gụpụta ya. Anyị abụọ rọrọ nrọ ọjọọ gbasara ya ruo oge ụfọdụ. Ma, anyị ka nọkwa na-arụ ọrụ sekit anyị.

Ụmụ anyị abụọ bụ́ Jahgift na Eric bụ onyinye Jehova nyere anyị

Ná mmalite afọ 1992, o juru anyị anya mgbe anyị matara na nwunye m dị ime. Ihe a ọ̀ ga-eme ka anyị kwụsị ozi oge niile pụrụ iche anyị nọ na ya? Anyị chere, sị: “Jehova enyela anyị onyinye.” N’ihi ya, anyị kpebiri ịgụ nwa anyị nwaanyị ahụ Jahgift, nke pụtara Onyinyejaa. Mgbe afọ anọ gachara anyị mụrụ Jahgift, anyị mụrụ nwanne ya nwoke bụ́ Eric. Ụmụ anyị abụọ a bụ onyinye Jehova nyere anyị. Jahgift jere ozi n’ọfis ndị nsụgharị dị na Kọnakrị ruo oge ụfọdụ, Eric abụrụ ohu na-eje ozi.

Ọ bụ eziokwu na nwunye m mechara kwụsị ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọ kwụsịghị ịsụ ụzọ oge niile, ma mgbe ọ nọ na-azụ ụmụ anyị. Jehova nyeere m aka mụ aka nọrọkwa n’ozi oge niile pụrụ iche. Mgbe ụmụ anyị tolitere, nwunye m malitekwara ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ugbu a, anyị abụọ bụ ndị ozi ala ọzọ na Kọnakrị.

JEHOVA NA-ECHEBE ANYỊ

M gara ebe ọ bụla Jehova chọrọ ka m gaa. Mụ na nwunye m ahụla otú Jehova si chebe anyị ma gọzie anyị ọtụtụ ugboro. Ịtụkwasị Jehova obi emeela ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị otú ahụ ndị tụkwasịrị akụnụba obi na-echegbu onwe ha. Mụ na nwunye m esila n’ihe ndị mere anyị mụta na onye na-echebe anyị bụ “Chineke, onye nzọpụta anyị,” bụ́ Jehova. (1 Ihe 16:35) Obi siri m ike na Jehova ga-echebe ndị niile tụkwasịrị ya obi “otú mmadụ si echebe ihe bara ezigbo uru e kechiri n’akpa.”​—1 Sam. 25:29.