ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48
Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Ga-enyere Gị Aka Mgbe Ihe Siiri Gị Ike
“‘Dịkwanụ ike, . . . n’ihi na m nọnyeere unu.’ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”—HAG. 2:4.
ABỤ NKE 118 Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1-2. (a) Olee otú ihe na-eme n’oge anyị a si yie otú ihe si dịrị ndị Juu si Babịlọn lọta Jeruselem? (b) Kọwaa ụfọdụ nsogbu bịaara ndị Juu. (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Oge Hagaị, Zekaraya, na Ezra.”)
È NWERE mgbe ị na-echegbu onwe gị gbasara ọdịnihu? O nwere ike ịbụ na i nweghịzi ọrụ, gị ana-echegbu onwe gị gbasara otú ị ga-esi na-egboro ezinụlọ gị mkpa ha. I nwekwara ike ịna-eche gbasara ndị ezinụlọ gị ma ọ bụrụ na e nwere ọgba aghara n’ebe unu bi, a na-akpagbu unu, ma ọ bụ na a machiri ozi ọma anyị. È nwere nke bụ́ nsogbu gị n’ihe ndị a? Ọ bụrụ otú ahụ, ịmụ gbasara otú Jehova si nyere ndị Izrel aka mgbe ụdị nsogbu ahụ bịaara ha ga-agba gị ume.
2 Ndị Juu ndị biri na Babịlọn ná ndụ ha niile ga-enwe ezigbo okwukwe ka ha nwee ike ịhapụ Babịlọn bụ́ ebe ihe niile zuuru ha laghachi n’obodo ọtụtụ n’ime ha na-amachaghị. O teghịkwa aka ha lọtara, ya amalite isiri ha ike igboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. E nwere ọgba aghara n’Alaeze Ukwu Peshia, mba ndị gbara ha gburugburu ana-emegidekwa ha. Ihe a mere ka o siere ụfọdụ ndị Juu ike iwere ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. N’ihi ya, n’ihe dị ka n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova zigara ndị amụma ya abụọ bụ́ Hagaị na Zekaraya ka ha gaa mee ka ọ gụsiwekwa ndị Juu agụụ ike ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova. (Hag. 1:1; Zek. 1:1) Dị ka anyị ga-ahụ, ume ndị amụma ndị a gbara ndị Juu bara ezigbo uru. Ma, mgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise gachara, ọ dịkwa mkpa ka a gbaa ndị Juu ahụ ume ọzọ. Ezra, bụ́ aka ochie n’idepụta Iwu Mosis, si Babịlọn lọta Jeruselem ka ọ gbaa ndị Chineke ume iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha.—Ezra 7:1, 6.
3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza? (Ilu 22:19)
3 Otú ahụ amụma Hagaị na Zekaraya buru nyeere ndị Chineke aka n’oge ochie ịtụkwasị Jehova obi n’oge a na-emegide ha, o nwekwara ike ime ka obi sie anyị ike taa na Jehova ga-akwado anyị n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị. (Gụọ Ilu 22:19.) Ka anyị na-eleba anya n’ihe Ezra mere nakwa n’ozi Chineke ziri Hagaị na Zekaraya ka ha zie ndị Izrel, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú ihe isi ike si kpaa ndị Juu aka? Gịnị mere anyị kwesịrị iji were ime uche Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị mgbe ihe siiri anyị ike? Gịnị ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi mgbe ihe siiri anyị ike?
OTÚ IHE ISI IKE SI KPAA NDỊ JUU AKA
4-5. Olee ihe nwere ike ime ka ndị Juu ghara iji ịnụ ọkụ n’obi rụghachi ụlọ nsọ ahụ?
4 Mgbe ndị Juu si Babịlọn lọrutere Jeruselem, e nwere ọtụtụ ọrụ ha ga-arụ. Ha rụghachiri ebe ịchụàjà Jehova ozugbo ma tọọ ntọala ụlọ nsọ. (Ezra 3:1-3, 10) Ma, n’oge na-adịghị anya, ha kwụsịrị ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e wepụ ịrụghachi ụlọ Jehova, ha ga-arụ ụlọ nke ha, rụọ ọrụ ugbo, na-akpakwa afọ ezinụlọ ha. (Ezra 2:68, 70) Ihe ọzọ bụ na ndị iro ha na-emegide ha, na-agbalịkwa ịkwụsị ha ịrụ ụlọ nsọ ahụ.—Ezra 4:1-5.
5 Ihe ọzọ kpara ndị Juu ahụ lọtara aka bụ ụkọ ego na mgbanwe ọchịchị. Ọ bụzi ndị Peshia na-achị obodo ha. Mgbe eze Peshia bụ́ Saịrọs nwụchara n’afọ 530 Tupu Oge Ndị Kraịst, onye nọchiri ya bụ́ Kambisis gara lụso Ijipt agha. Mgbe ndị agha ya na-aga Ijipt, ọ ga-abụ na ha gwara ndị Izrel ka ha nye ha nri, mmiri, na ebe ha ga-ebi. Ihe ndị a mere ka ihe sikwuoro ndị Izrel ike. Mgbe Darayọs nke Mbụ, onye nọchiri Kambisis, bidoro ọchịchị ya, e nwere ọtụtụ nsogbu. Ụfọdụ ndị nupụụrụ ya isi, e nweekwa ọgba aghara n’Alaeze Ukwu Peshia. Ihe ndị a niile mere ka ọtụtụ ndị ahụ si Babịlọn lọta na-echegbu onwe ha gbasara otú ha ga-esi na-egboro ezinụlọ ha mkpa ha. O mere ka ụfọdụ ndị Juu chee na oge ahụ abụghị oge ha kwesịrị iji rụghachi ụlọ nsọ Jehova.—Hag. 1:2.
6. Dị ka e kwuru na Zekaraya 4:6, 7, olee nsogbu ndị ọzọ bịaara ndị Juu, oleekwa otú Zekaraya si mee ka obi sie ha ike?
6 Gụọ Zekaraya 4:6, 7. E wepụ ụkọ ego na ọgba aghara, nsogbu ọzọ ndị Juu nwere bụ na a na-emegide ha. N’afọ 522 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị na-emegide ndị Juu mere ka ndị ọchịchị Peshia machie ha ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova. Ma Zekaraya mere ka obi sie ndị Juu ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya dị ike nyere ha aka ịna-arụ ọrụ ahụ n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. N’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Eze Darayọs wepụrụ iwu ahụ a machiri ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ. O nyedịrị ndị Juu ego ha ga-eji arụghachi ya, nyekwa ndị gọvanọ iwu ka ha kwado ha.—Ezra 6:1, 6-10.
7. Mgbe ndị Juu ahụ si Babịlọn lọta lekwasịrị anya n’ime uche Chineke, olee otú Jehova si gọzie ha?
7 Jehova si n’ọnụ Hagaị na Zekaraya kwe ndị ya nkwa na ọ ga-anọnyere ha ma ọ bụrụ na ha ewere ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ ka ihe kacha mkpa. (Hag. 1:8, 13, 14; Zek. 1:3, 16) Ume a ndị amụma gbara ndị Juu mere ka ha maliteghachi ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst ma rụchaa ya n’ihe na-erughị afọ ise. Jehova gbooro ndị Juu mkpa ha, nyekwa ha ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-efe ya n’ihi na ha butere ọrụ ya ụzọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere. Ihe a mere ka ha jiri ọṅụ na-efe Jehova.—Ezra 6:14-16, 22.
LEKWASỊ ANYA N’IME UCHE CHINEKE
8. Olee otú ihe e kwuru na Hagaị 2:4 si enyere anyị aka ilekwasị anya n’ime uche Chineke? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
8 Ka oké mkpagbu na-eru nso, anyị ma na ọ dị ezigbo mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị rube isi n’iwu e nyere anyị ikwusa ozi ọma. (Mak 13:10) Ma, o nwere ike isiri anyị ike ilekwasị anya n’ikwusa ozi ọma ma ọ bụrụ na ego akọ anyị ma ọ bụkwanụ ma a na-emegide anyị. Olee ihe ga-enyere anyị aka ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? Ọ bụ obi isi anyị ike na “Jehova nke ụsụụ ndị agha” b nọnyeere anyị. Ọ ga-akwado anyị ma ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa bụ ihe gbasara Alaeze ya, ọ bụghị ihe nke anyị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ.—Gụọ Hagaị 2:4.
9-10. Olee otú otu nwanna na nwunye ya si chọpụta na ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 bụ eziokwu?
9 Ka anyị leba anya n’akụkọ Nwanna Oleg na Irina c nwunye ya. Ha abụọ bụ ndị ọsụ ụzọ. Mgbe ha kwafere ebe ọzọ ka ha nyere otu ọgbakọ aka, ha enweghịzi ọrụ n’ihi na ihe nọ na-akakwu njọ n’obodo ha. Ruo ihe dị ka otu afọ, o siiri ha ike ịchọta ọrụ ha ga na-arụ mgbe niile. N’agbanyeghị ya, ha chọpụtara otú Jehova si na-akwado ha. Ụmụnna na-enyekwara ha aka mgbe ụfọdụ. Olee ihe nyeere ha aka n’oge ahụ? Na mbụ, obi adịghị Nwanna Oleg mma. Ma, ọ sịrị: “Ikwusa ozi ọma mgbe niile nyeere anyị aka ilekwasị anya n’ihe kacha mkpa ná ndụ.” Ka ya na nwunye ya nọ na-achọ ọrụ, ha na-ekwusasi ozi ọma ike.
10 Otu ụbọchị, mgbe ha si ozi ọma lọta, a gwara ha na otu ezigbo enyi ha gbara ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii (160) wetara ha akpa abụọ nri juru. Nwanna Oleg sịrị: “N’ụbọchị ahụ, anyị hụkwara ọzọ otú Jehova na ụmụnna anyị si elekọta anyị. Obi siri anyị ike na Jehova anaghị echefu ndị ohu ya n’agbanyeghị otú ọnọdụ ha dịruru ná njọ.”—Mat. 6:33.
11. Gịnị ka anyị nwere ike ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ime uche Chineke?
11 Jehova chọrọ ka ihe ka anyị mkpa bụrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, si otú ahụ zọọ ha ndụ. Dị ka e kwuru na paragraf nke asaa, Hagaị gbara ndị Jehova ume ka ha malite ịrụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ha egee ntị, Jehova kwere nkwa na ọ “ga-agọzi” ha. (Hag. 2:18, 19) Obi kwesịkwara isi anyịnwa ike na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị ma ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa abụrụ ịrụ ọrụ o nyere anyị.
OTÚ ANYỊ GA-ESI ATỤKWASỊKWU JEHOVA OBI
12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Ezra na ndị Juu ibe ya chọrọ isi Babịlọn laghachi Jeruselem nwee okwukwe siri ike?
12 N’afọ 468 Tupu Oge Ndị Kraịst, Ezra so ná ndị nke abụọ si Babịlọn na-alaghachi Jeruselem. Ha kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka ha nwee ike ịlaghachi. Ha ga-esi n’ụzọ jọgburu onwe ya, buru ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha e nyere n’onyinye iji rụzie ụlọ nsọ ahụ. Ihe a nwere ike ime ka e zuo ha ohi. (Ezra 7:12-16; 8:31) Ihe ọzọ bụ na ọ dịghị anya ha achọpụta na ibi na Jeruselem agaghị adịchara ha mfe. Ọtụtụ ndị ebighị n’obodo ahụ. E kwesịkwara ịrụzi mgbidi ya na ọnụ ụzọ ámá ya. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Ezra gbasara ịtụkwasịkwu Jehova obi?
13. Olee ihe mere ka Ezra tụkwasịkwuo Jehova obi? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
13 Ezra hụrụ otú Jehova si kwado ndị ya n’oge nsogbu bịaara ha. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ya bụ, n’afọ 484 Tupu Oge Ndị Kraịst, Ezra bi na Babịlọn mgbe Eze Ahazuirọs nyere iwu ka e gbuchaa ndị Juu nọ n’ebe niile ndị Peshia na-achị. (Esta 3:7, 13-15) Ihe a nwere ike ime ka e gbuo Ezra. Mgbe ndị Juu niile nọ “n’ógbè ọ bụla” nụrụ ya, ha buru ọnụ ma ruo uju. O doro anya na ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. (Esta 4:3) Chegodị otú obi dị Ezra na ndị Juu ibe ya mgbe e gburu ndị ahụ niile kpara nkata ka e gbuchapụ ndị Juu. (Esta 9:1, 2) Ọ ga-abụ na ihe ndị ahụ Ezra ji anya ya hụ n’oge ihe siri ike mere ka ọ kwadebe maka nsogbu ndị ọzọ ga-abịara ya n’ọdịnihu. Ọ ga-abụkwa na o mere ka ọ tụkwasịkwuo Jehova obi na ọ ga-echebeli ndị ya. d
14. Gịnị ka otu nwanna nwaanyị mụtara mgbe Jehova nyeere ya aka n’oge ọ nọ ná nsogbu?
14 Ọ bụrụ na Jehova enyere anyị aka n’oge ihe siiri anyị ike, anyị na-atụkwasịkwu ya obi. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anastasia. O bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Ọ hapụrụ ọrụ ya n’ihi na ndị ọrụ ibe ya chọrọ ka o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ sịrị: “Nke a bụ nke mbụ m nọrọ n’enweghị shịshị.” Ọ sịkwara: “M kpere ekpere, hụkwa otú Jehova si nyere m aka. E nwee mgbe ọzọ m na-enweghịzi ọrụ, ụjọ agaghị atụ m. Ọ bụrụ na Jehova lekọtara m taa, ọ ga-elekọtakwa m echi.”
15. Olee ihe nyeere Ezra aka ịtụkwasị Jehova obi? (Ezra 7:27, 28)
15 Ezra chọpụtara na Jehova nyeere yanwa aka. Mgbe Ezra chetara oge ndị Jehova nyeere ya aka, ọ ga-abụ na o mere ka ọ tụkwasịkwuo ya obi. O kwuru, sị: “Jehova bụ́ Chineke m nọnyeere m.” (Gụọ Ezra 7:27, 28.) Ezra kwuru ụdị okwu a ugboro ise ọzọ n’akwụkwọ Ezra.—Ezra 7:6, 9; 8:18, 22, 31.
16. Olee mgbe o nwere ike idokwu anyị anya na Jehova na-enyere anyị aka? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
16 Jehova nwere ike inyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị. Dị ka ihe atụ, anyị gwawa onye anyị na-arụrụ ọrụ na anyị chọrọ ka ọ hapụ anyị ka anyị gaa mgbakọ, ma ọ bụ ka a gbanwetụ oge anyị ji arụ ọrụ ka anyị nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe niile, anyị nwere ike ịhụ otú Jehova ga-esi nyere anyị aka. Ihe a ga-aza anyị nwere ike ịdị mma karịa ihe anyị tụrụ anya ya. O nwere ike ime ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi.
17. Olee otú Ezra si gosi na ọ dị umeala n’obi mgbe ihe siiri ya ike? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
17 Ezra weturu onwe ya ala kpee ekpere ka Jehova nyere ya aka. Mgbe ọ bụla Ezra nọ na-echegbu onwe ya maka ọrụ ndị ọ ga-arụ, ọ na-ewetu onwe ya ala ma kpee ekpere. (Ezra 8:21-23; 9:3-5) Ebe ọ bụ na Ezra tụkwasịrị Jehova obi, ndị ọzọ kwadoro ya, nweekwa okwukwe ka ya. (Ezra 10:1-4) Mgbe ọ bụla anyị chegbuwere onwe anyị gbasara ego ma ọ bụ ezinụlọ anyị, anyị kwesịrị ikpe ekpere, obi esie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka.
18. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehova obi?
18 Ọ bụrụ na anyị ewetuo onwe anyị ala rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, kwekwa ka ụmụnna anyị nyere anyị aka, anyị ga-atụkwasịkwu Jehova obi. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Erika mụrụ ụmụ atọ. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka, ma mgbe ihe ọjọọ mere ya. Nwa o bu n’afọ nwụrụ. Obere oge, di ọma ya anwụọkwa. Mgbe o chetara ihe ndị ahụ niile, ọ sịrị: “Mmadụ agaghị amatali otú Jehova ga-esi nyere ya aka n’ọdịnihu. O nwere ike isi n’ụzọ ndị anyị na-atụghị anya ha nyere anyị aka. Achọpụtala m na Jehova si n’ihe ụmụnna m mere na n’ihe ha kwuru za ọtụtụ ekpere m. Ọ bụrụ na mụ akọọrọ ndị enyi m otú ihe si dịrị m, o nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe inyere m aka.”
TỤKWASỊ JEHOVA OBI RUO ỌGWỤGWỤ
19-20. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị Juu na-enweghị ike ịlaghachi Jeruselem?
19 Anyị nwekwara ike ịmụta ihe bara uru n’aka ndị Juu na-enweghị ike ịlaghachi Jeruselem. Ọ ga-abụ na o nweghị oké ihe ụfọdụ n’ime ha ga-emeli n’ihi na ha emeela agadi, na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ n’ihi ibu ezinụlọ. N’agbanyeghị ya, ha ji obi ha niile nye onyinye iji kwado ndị na-alaghachi Jeruselem. (Ezra 1:5, 6) Mgbe ihe dị ka afọ iri na itoolu gachara ndị Juu mbụ lọtara Jeruselem, o yiri ka ndị Juu fọrọ na Babịlọn hà ka na-ezigakwa onyinye ha Jeruselem.—Zek. 6:10.
20 Ọ bụrụgodị na anyị chere na o nwechaghị oké ihe anyị ga-emeli n’ozi Chineke, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ji mbọ ọ bụla anyị na-agba ime ya obi ụtọ kpọrọ ihe. Olee otú anyị si mara? N’oge Zekaraya onye amụma, Jehova gwara ya ka o jiri ọlaedo na ọlaọcha ndị Juu nọ na Babịlọn zitere mee okpueze. (Zek. 6:11) ‘Okpueze ahụ pụrụ iche’ ga-abụ “ihe a ga-eji na-echeta” otú ndị Juu si mesapụ aka nye onyinye. (Ihe e dere n’ala ala peeji Zek. 6:14.) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị echefu mbọ anyị ji obi anyị niile gbaa ife ya n’oge ihe siri ike.—Hib. 6:10.
21 Olee ihe ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu?
21 O doro anya na ọtụtụ nsogbu ka ga-abịara anyị n’oge ikpeazụ a. O nwekwara ike ịka njọ n’ọdịnihu. (2 Tim. 3:1, 13) Ma, o kwesịghị ime ka anyị chegbuwe onwe anyị. Cheta ihe Jehova gwara ndị ya n’oge Hagaị. Ọ sịrị: “M nọnyeere unu . . . Unu atụla egwu.” (Hag. 2:4, 5) Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova ga-anọnyere anyị ma ọ bụrụhaala na anyị ana-agbasi mbọ ike ime uche ya. Ime ihe anyị mụtara n’amụma Hagaị na Zekaraya buru nakwa n’akụkọ Ezra ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu.
ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm
a E wepụtara isiokwu a ka o mee ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka mgbe ego kọrọ anyị, mgbe ọgba aghara dị, ma ọ bụkwanụ mgbe a na-emegide anyị maka ozi ọma anyị na-ekwusa.
b Okwu bụ́ “Jehova nke ụsụụ ndị agha” pụtara ugboro iri na anọ n’akwụkwọ Hagaị. O chetaara ndị Juu na ike Jehova enweghị atụ nakwa na o nwere ìgwè ndị mmụọ ozi bụ́ ndị agha ya—Ọma 103:20, 21.
c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
d Ebe Ezra bụ aka ochie n’idepụta Iwu Chineke, ọ tụkwasịrị amụma Jehova obi tupudị ya alaghachi Jeruselem—2 Ihe 36:22, 23; Ezra 7:6, 9, 10; Jere. 29:14.
e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-agwa onye ọ na-arụrụ ọrụ ka o kwe ka ọ gaa mgbakọ ukwu, mana o kweghị. O kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka ma duzie ya mgbe ọ chọrọ ịgakwuru ya ọzọ. O gosiziri ya akwụkwọ ịkpọ òkù mgbakọ ahụ, kọwaara ya otú Baịbụl ga-esi eme ka anyị bụrụ ndị ezigbo mmadụ. Obi tọrọ onye ọ na-arụrụ ọrụ ụtọ, ya ekwezie ka ọ gaa mgbakọ ahụ.