Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Ohu Na-eje Ozi?

Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Ohu Na-eje Ozi?

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—ỌRỤ 20:35.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-agba ụmụnna nwoke mere baptizim ume ka ha na-agbalị ka ha ruo eruo ịbụ ndị ohu na-eje ozi.

1. Olee otú Pọl onyeozi si were ndị ohu na-eje ozi?

 NDỊ ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ. Pọl onyeozi ji ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, o kelere ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye.​—Fil. 1:1.

2. Olee otú obi dị otu nwanna aha ya bụ Luis n’ihi na ọ bụ ohu na-eje ozi?

2 Ọ na-atọgbu ụmụnna nwoke mere baptizim atọgbu ịbụ ndị ohu na-eje ozi, ma hà ka na-eto eto ma hà etochaala. Dị ka ihe atụ, a họpụtara Nwanna Devan ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. Mana, a họpụtara nwanna ọzọ aha ya bụ Luis ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi mgbe ọ karịrị afọ iri ise. O kwuru otú obi na-adị ọtụtụ ndị. Ọ sịrị: “Obi na-atọgbu m atọgbu ịrụ ọrụ ohu na-eje ozi na-arụ, karịchaa ma m cheta otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ si egosi m na ha hụrụ m n’anya.”

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke mere baptizim, ya abụrụ na ị bụbeghị ohu na-eje ozi, ì nwere ike ịgba mbọ ka i ruo eruo ịbụ ya? Gịnị nwere ike ime ka ọ gụọ gị agụụ ime ya? Oleekwa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru i kwesịrị ime iji ruo eruo? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a. Mana, ka anyị burugodị ụzọ kwuo ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ.

GỊNỊ BỤ ỌRỤ OHU NA-EJE OZI?

4. Olee ọrụ ohu na-eje ozi na-arụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Ohu na-eje ozi bụ nwanna nwoke mere baptizim e ji mmụọ nsọ họpụta ka ọ na-enyere ndị okenye aka ịrụ ọtụtụ ọrụ a na-arụ n’ọgbakọ. Ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi na-ahụ na ụmụnna nwere ebe ha ga-ekwusa ozi ọma ga-ezuru ha nakwa akwụkwọ ndị ha ji aga ozi ọma. E nwere ndị nke na-enye aka ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. Ha na-enye ndị bịara ọmụmụ ihe oche, na-akpakwa aka n’ígwè n’ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ bụ ọrụ gbasara inyere ndị ọzọ aka. Ma, ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ibu ụzọ bụrụ ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ha hụrụ Jehova n’anya ma na-edebe iwu ya. Ha ji obi ha hụ ụmụnna ha n’anya. (Mat. 22:37-39) Olee otú nwanna nwoke mere baptizim ga-esi gbaa mbọ ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi?

Ndị ohu na-eje ozi na-eme ka Jizọs, na-ewepụta onwe ha ijere ndị ọzọ ozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee otú nwanna nwere ike isi gbalịa ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi?

5 Baịbụl kwuru ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:8-10, 12, 13) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi, mụọ gbasara ihe ndị a nke ọma ma gbalịa na-eme ha. Ma, i kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe gị ihe mere i ji chọọ ịbụ ohu na-eje ozi.

GỊNỊ MERE I JI CHỌỌ ỊBỤ OHU NA-EJE OZI?

6. Gịnị kwesịrị ime ka ị chọọ inyere ụmụnna gị aka? (Matiu 20:28; kọwaakwa foto.)

6 Chegodị gbasara onye anyị na-eso nzọụkwụ ya bụ́ Jizọs Kraịst. O mere ihe niile o mere n’ihi na ọ hụrụ Nna ya na ndị mmadụ n’anya. Ọ bụ ịhụnanya ahụ mere ka ọ rụọ ọrụ ụfọdụ ndị weere ka ọrụ dị ala. (Gụọ Matiu 20:28; Jọn 13:5, 14, 15) Ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ịbụ ohu na-eje ozi bụ na ị hụrụ Jehova na ụmụnna gị n’anya, Jehova ga-agọzi gị ma nyere gị aka ka i ruo eruo.​—1 Kọr. 16:14; 1 Pita 5:5.

Jizọs ji ihe o mere kụziere ndịozi ya na ha kwesịrị iwetu onwe ha ala na-ejere ndị ọzọ ozi kama ịna-achọ ọkwá (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Gịnị mere nwanna nwoke ekwesịghị ịchọ ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi naanị ka ndị ọzọ na-eto ya?

7 N’ụwa taa, ndị mmadụ na-asọpụrụkarị ndị na-eme onwe ha ka ha yie ndị dị mkpa. Ma ọ bụghị otú ọ dị n’ọgbakọ Jehova. Onye hụrụ ụmụnna ya n’anya ka Jizọs anaghị achọ ka ọ na-achị ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ka e were ya ka onye dị mkpa. A họpụta onye dị mpako ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ, o nwere ike ọ gaghị achọ ịrụ ọrụ ndị dị ala e kwesịrị ịrụ ka e nyere atụrụ Jehova aka. O nwere ike iwere ọrụ ndị ahụ ka ọrụ o toferela. (Jọn 10:12) Jehova agaghị agọzi onye ọ bụla dị mpako.​—1 Kọr. 10:24, 33; 13:4, 5.

8. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndịozi ya?

8 Mgbe ụfọdụ, ndị bụ́ ezigbo ndị enyi Jizọs chọrọ inweta ọrụ ụfọdụ. Mana ha ebughị ezigbo ihe n’obi na-achọ ya. Ka anyị legodị ihe ndịozi Jizọs abụọ bụ́ Jems na Jọn mere. Ha rịọrọ Jizọs ka o nye ha ọkwá pụrụ iche n’Alaeze ya. Jizọs ajaghị ha mma maka ihe a ha chọrọ. Kama, ọ gwara ma hanwa ma ndịozi ndị ọzọ, sị: “Onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu niile.” (Mak 10:35-37, 43, 44) Ọ bụrụ na ihe ụmụnna nwoke bu n’obi na-achọ ịbụ ndị ohu na-eje ozi bụ ijere ụmụnna ha ozi, ha ga-esi n’ọtụtụ ụzọ nyere ụmụnna ha aka.​—1 Tesa. 2:8.

GỊNỊ GA-EME KA Ị CHỌỌ ỊBỤ OHU NA-EJE OZI?

9. Gịnị ka ị ga-eme ka ọ na-agụsikwu gị agụụ ike ijere ụmụnna gị ozi?

9 O doro anya na ị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ijere ụmụnna gị ozi. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ naghị agụcha gị agụụ ịrụ ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ. Olee otú ị ga-esi mee ka ọ gụsiwe gị agụụ ike ijere ụmụnna gị ozi? Ọ ga-adị mma ma i chee gbasara ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ma ị na-ejere ụmụnna gị ozi. Jizọs sịrị: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) O mere ihe a o kwuru. Ijere ndị ọzọ ozi mekwara ya obi ụtọ. Ọ ga-emelikwa gị obi ụtọ.

10. Olee otú Jizọs si gosi na obi na-adị ya ụtọ ijere ndị ọzọ ozi? (Mak 6:31-34)

10 Ka anyị lee otú Jizọs si gosi na ijere ndị ọzọ ozi na-atọ ya ụtọ. (Gụọ Mak 6:31-34.) E nwere otu oge ike gwụrụ Jizọs na ndịozi ya. Ha nọ na-aga ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị ka ha zurutụ ike. Ma, ìgwè mmadụ bu ha ụzọ ruo ebe ahụ. Ha chọrọ ka Jizọs kụziere ha ihe. Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ, ọ gaara asị na o nweghị ohere maka ha. A sị ka e kwuwe, ya na ndịozi ya ‘enweghị ohere ọ bụla, ma ohere iri nri.’ Jizọs gakwaara akụziri ha otu ihe ma ọ bụ abụọ sị ha lawa. Ma, ebe ọ bụ na ọ hụrụ ha n’anya, ‘ọ malitere izi ha ọtụtụ ihe.’ Ọ nọkwa na-akụziri ha ihe ruo mgbe “mgbede” ruwere. (Mak 6:35) Ihe mere o ji mee ya abụghị na ọ bụ ihe o kwesịrị ime, kama ọ bụ n’ihi na ‘o meteere ha ebere.’ Ọ chọrọ ịkụziri ha ihe n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ijere ndị ọzọ ozi na-eme Jizọs ezigbo obi ụtọ.

11. Olee otú Jizọs si nyere ndị ọ na-akụziri ihe aka? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Mgbe Jizọs jeere ìgwè mmadụ ozi, ihe o mere abụghị naanị ịkụziri ha ihe. O gbokwara mkpa ha. Ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka e nwee nri ha ga-eri, gwakwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaara ya ndị mmadụ. (Mak 6:41) Jizọs ji ihe a o mere kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ejere ndị ọzọ ozi. O gosikwara ha na ọrụ ndị dị ka ọrụ ndị ahụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ dị mkpa. Chegodị otú obi si tọọ ndịozi Jizọs ụtọ mgbe ha na ya gbakọrọ aka nye ìgwè mmadụ ahụ nri ruo mgbe ‘ha niile rijuru afọ.’ (Mak 6:42) Nke bụ́ eziokwu bụ na nke ahụ abụghị naanị oge Jizọs hapụrụ mkpa nke ya buru nke ndị ọzọ n’isi. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o ji ndụ ya niile jeere ndị ọzọ ozi. (Mat. 4:23; 8:16) Ịkụziri ndị mmadụ ihe na igboro ha mkpa ha na-eme Jizọs ezigbo obi ụtọ. Obi sikwara anyị ike na obi ga-adị gị ezigbo ụtọ ma ị gbalịa ka i ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi ka i nwee ike ijere ụmụnna gị ozi.

Ịhụ Jehova n’anya nakwa ịchọ ijere ndị ọzọ ozi ga-eme ka ị rụọ ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) a


12. Gịnị mere onye ọ bụla n’ime anyị ekwesịghị iche na ọ baghị uru n’ọgbakọ?

12 Ọ bụrụ na i chee na i nweghị nkà pụrụ iche, obi adala gị mbà. O doro anya na i nwere nkà ndị ị ga-eji nyere ọgbakọ aka. Chee gbasara ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 12:12-30. Rịọzie Jehova ka o nyere gị aka ka ị mata otú ị ga-esi eme ya. Ihe Pọl kwuru mere ka o doo anya na ma gịnwa ma ndị ọzọ na-efe Jehova dị mkpa, na-arụkwa ọrụ bara uru n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na i rubeghị eru ịbụ ohu na-eje ozi ugbu a, ike agwụla gị. Kama, na-eme ihe niile i nwere ike ime iji jeere Jehova na ụmụnna gị ozi. Ka obi sie gị ike na ndị okenye ga-eche gbasara ihe ndị ị ga-emeli ma ha chọwa inye gị ọrụ ị ga-arụ.​—Rom 12:4-8.

13. Gịnị ka anyị ma gbasara ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi?

13 Chegodị otu ihe ọzọ mere i ji kwesị ịgbalị ka i ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eme ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. N’eziokwu, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịbịaru Jehova nso, inye ndị ọzọ ihe ana-eme ya obi ụtọ, ya ana-akpakwa àgwà ọma ndị ọzọ ga-amụta. Ma, olee ihe nwanna nwoke ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi?

IHE Ị GA-EME KA I RUO ERUO

14. Gịnị ka ịbụ onye “na-eji ihe akpọrọ ihe” pụtara? (1 Timoti 3:8-10, 12)

14 Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru na 1 Timoti 3:8-10, 12. (Gụọ ya.) Ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ onye “na-eji ihe akpọrọ ihe.” Okwu ahụ nwekwara ike ịpụta onye “kwesịrị nsọpụrụ” ma ọ bụ “onye a na-akwanyere ùgwù.” Ihe a apụtaghị na e nweghị mgbe ị ga-achị ọchị ma ọ bụ gwuo egwu. (Ekli. 3:1, 4) Ma, i kwesịrị iji ọrụ niile e nyere gị kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ị na-arụcha ọrụ e nyere gị ma na-arụta ya, ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu ga-ama na a ga-atụkwasịli gị obi. Ha ga na-akwanyere gị ùgwù.

15. Olee otú ị ga-esi gosi na ị ‘bụghị onye ire abụọ’ na ‘onye ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ya uru’?

15 ‘Abụghị onye ire abụọ’ pụtara na ị na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye a tụkwasịrị obi. Ị na-eme ihe i kwuru. Ị naghịkwa aghọgbu ndị ọzọ. (Ilu 3:32) ‘Abụghị onye ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ya uru’ pụtara na gị na ndị mmadụ mekọọ ihe gbasara azụmahịa ma ọ bụ ego, ị na-ekwu eziokwu. Ị gaghị eji adịm ná mma gị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ na-akpa ego.

16. (a) Gịnị ka ‘abụghị onye na-aṅụ oké mmanya’ pụtara? (b) Gịnị ka ‘ịbụ onye akọnuche ya na-anaghị ama ikpe’ pụtara?

16 ‘Abụghị onye na-aṅụ oké mmanya’ pụtara na ị naghị aṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụkwanụ bụrụ onye a ma ka onye aṅụrụma. ‘Ịbụ onye akọnuche ya na-anaghị ama ikpe’ pụtara na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụ eziokwu na i zughị okè, ma obi na-eru gị ala n’ihi na gị na Chineke dị ná mma.

17. Gịnị ka ‘ibu ụzọ nwalee nwanna iji mara ma ò ruru eru’ pụtara? (1 Timoti 3:10; kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 ‘Ibu ụzọ nwalee gị iji mara ma ì ruru eru’ pụtara na i meela ihe gosiri na ị ga-arụli ọrụ e nyere gị. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị okenye enye gị ọrụ ị ga-arụ, saa anya ná mmiri soro ntụziaka ha nyere gị nakwa ntụziaka nzukọ Jehova nyere. Jidekwa n’aka na ị ghọtara ihe niile gbasara ọrụ ahụ ị na-arụ nakwa mgbe i kwesịrị ịrụcha ya. Ka ị na-arụsi ọrụ nke ọ bụla e nyere gị ike, ndị nọ n’ọgbakọ unu ga-ahụ ya, ha ga-ahụkwa na ị na-emekwu nke ọma. Ndị okenye, jidenụ n’aka na unu na-azụ ụmụnna nwoke mere baptizim. (Gụọ 1 Timoti 3:10.) È nwere ụmụnna nwoke mere baptizim n’ọgbakọ unu nọ n’agbata afọ iri na afọ iri na anọ ma ọ bụ ndị na-erubeghị ya? Hà na-amụchi ihe anya? Hà na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-esokwa aga ozi ọma? Ọ bụrụ otú ahụ, nye ha ọrụ dabara n’afọ ole ha dị. Unu ga-esi otú ahụ na-anwale ụmụnna ndị ahụ ‘iji mara ma hà ruru eru.’ Ọ bụrụzie na ha anọrọ n’agbata afọ iri na asaa na afọ iri na itoolu, ha nwere ike iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi.

Ọ bụrụ na ndị okenye ana-enye ụmụnna nwoke mere baptizim ọrụ, ha ‘na-anwale ha iji mara ma hà ruru eru’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)


18. Gịnị ka ịbụ onye ‘a na-enweghị ihe ọ bụla a ga-asị na o mere’ pụtara?

18 Ịbụ onye ‘a na-enweghị ihe ọ bụla a ga-asị na o mere’ pụtara na ị bụghị onye a ga-ebo ebubo na i mere ihe dị oké njọ, ya abụrụ eziokwu. Mana, e nwere ike ibo Onye Kraịst ebubo ụgha. E boro Jizọs ọtụtụ ebubo ụgha. O kwukwara na a ga-eme ndị na-eso ụzọ ya otú ahụ. (Jọn 15:20) Ma, ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà dị mma otú Jizọs mere, ị ga-enwe aha ọma n’ọgbakọ.​—Mat. 11:19.

19. Gịnị ka “ịbụ di otu nwaanyị” pụtara?

19 Di otu nwaanyị.” Ọ bụrụ na ị lụọla nwaanyị, i kwesịrị ịkwanyere ndokwa Jehova mere maka alụmdi na nwunye ùgwù, ya bụ, otu nwoke na otu nwaanyị. (Mat. 19:3-9) Onye Kraịst ekwesịghị ịkwa iko. (Hib. 13:4) Mana, ọ bụghị naanị ihe o kwesịrị ime. O kwesịghị ịna-agba n’èzí. N’ihi ya, obi ya ekwesịghị ịdịwa n’ebe ụmụ nwaanyị ndị ọzọ nọ.​—Job 31:1.

20. Olee otú nwoke na-esi elekọta ezinụlọ ya “nke ọma”?

20 “O kwesịrị ịna-elekọta ụmụ ya na ezinụlọ ya nke ọma.” Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, jiri ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ kpọrọ ihe. Gị na ezinụlọ gị kwesịrị ịna-enwe ofufe ezinụlọ mgbe niile. Gị na onye nke ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịna-arụ n’ozi ọma. Nyere ụmụ gị aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. (Efe. 6:4) Nwoke na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma na-egosikwa na ọ ga-elekọtali ọgbakọ.​—I nwere ike ịtụle 1 Timoti 3:5.

21. Ọ bụrụ na ị ghọbeghị ohu na-eje ozi, gịnị ka i kwesịrị ime?

21 Ụmụnna nwoke, ọ bụrụ na unu aghọbeghị ndị ohu na-eje ozi, biko, gụọnụ isiokwu a nke ọma ma kpeenụ ekpere banyere ya. Mụọnụ ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Gbasiekwanụ mbọ ike ka unu na-eme ihe ndị ahụ. Cheenụ gbasara otú unu si hụ Jehova na ụmụnna unu n’anya nke ukwuu. Meenụ ka ọ na-agụsi unu agụụ ike ijere ha ozi. (1 Pita 4:8, 10) Gbasienụ mbọ ike ka unu bụrụ ndị ohu na-eje ozi. Unu ga-enwe ọṅụ ma unu na-ejere ụmụnna unu ozi. Ka Jehova gọzie unu nke ukwuu maka mbọ unu na-agba ka unu ruo eruo ịbụ ndị ohu na-eje ozi.​—Fil. 2:13.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

a NKỌWA FOTO: N’aka ekpe, ebe Jizọs weturu onwe ya ala na-ejere ndị na-eso ụzọ ya ozi; n’aka nri, ebe otu ohu na-eje ozi na-enyere otu nwanna nwoke mere agadi aka n’ọgbakọ.