Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Okenye?

Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Okenye?

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eruo ịbụ onye nlekọta, ịrụ ezigbo ọrụ na-agụ ya.”​—1 TIM. 3:1.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwanna nwoke ga-eme ka o ruo eruo ịbụ okenye.

1-2. Gịnị bụ “ezigbo ọrụ” okenye na-arụ?

 Ọ BỤRỤ na ị bụ ohu na-eje ozi, ọ ga-abụ na ị na-agbalịsi ike ime ọtụtụ n’ime ihe onye chọrọ ịbụ okenye kwesịrị ịna-eme. Ị̀ ga-achọ ịrụ “ezigbo ọrụ” ndị okenye na-arụ?​—1 Tim. 3:1.

2 Gịnị ka okenye na-arụ? Okenye na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, na-agbasi mbọ ike n’ịzụ atụrụ Chineke, na-akụzikwa ihe. Ọ na-ejikwa okwu ọnụ ya na omume ya eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na ndị okenye, ndị na-arụsi ọrụ ike, bụ ndị ‘e ji nye onyinye.’​—Efe. 4:8.

3. Gịnị ka nwanna ga-eme ka o ruo eruo ịbụ okenye? (1 Timoti 3:1-7 na Taịtọs 1:5-9)

3 Gịnị ka nwanna nwoke ga-eme ka o ruo eruo ịbụ okenye? Iru eru ịbụ okenye adịghị ka mmadụ iru eru ka e wee ya n’ọrụ. Ọ bụrụ na mmadụ na-achọ ọrụ, ya enweekwa nkà onye ga-ewe ya n’ọrụ chọrọ, o nwere ike inweta ọrụ ahụ. Mana, tupu a họpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye, ihe ọ ga-eme abụghị naanị ịna-ekwusa ozi ọma na ịna-akụzi ihe nke ọma. O kwesịrị ịna-eme ihe ndị e kwuru na Baịbụl ndị okenye kwesịrị ịna-eme. E dere ha na 1 Timoti 3:1-7 na Taịtọs 1:5-9. (Gụọ ha.) Isiokwu a ga-ekwu banyere ihe atọ dị mkpa ndị okenye kwesịrị ịna-eme, ya bụ, inwe aha ọma n’ọgbakọ nakwa n’èzí, ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ, na ịdị njikere ịna-ejere ọgbakọ ozi.

INWE AHA ỌMA

4. Gịnị ka “ịbụ onye ndị mmadụ na-agaghị enwe ihe ha ga-eji kwujọọ ya” pụtara?

4 Ị chọọ ịbụ okenye, i kwesịrị “ịbụ onye ndị mmadụ na-agaghị enwe ihe ha ga-eji kwujọọ ya,” ya bụ, ị ga-enwe aha ọma n’ọgbakọ n’ihi na ị na-akpa àgwà ọma. Ihe ọzọ bụ na ị ga-abụ “onye ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya.” Ndị na-abụghị Ndị Kraịst nwere ike ịna-akatọ ihe ndị i kweere. Ma e kwesịghị inwe ezigbo ihe mere ha ga-eji kwuo na ị naghị akwụwa aka ọtọ ma ọ bụkwanụ na ị naghị akpa àgwà ọma. (Dan. 6:4, 5) Jụọ onwe gị, sị, ‘Ndị nọ n’ọgbakọ na ndị na-anọghị n’ọgbakọ hà na-akwanyere m ùgwù?’

5. Olee otú ị ga-esi gosi na ị bụ “onye hụrụ ihe ọma n’anya”?

5 Ọ bụrụ na ị bụ “onye hụrụ ihe ọma n’anya,” ị na-achọpụta ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma ma na-aja ha mma maka ya. Obi na-atọkwa gị ụtọ imere ndị ọzọ ihe ọma ọ bụrụgodị ihe ha na-atụghị anya ka i meere ha. (1 Tesa. 2:8; Taị. 1:8) a Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịbụ ndị hụrụ ihe ọma n’anya? Ọ bụ n’ihi na ha na-ewepụta oge buru ibu elebara mkpa ụmụnna ha anya, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ. (1 Pita 5:1-3) N’agbanyeghị na ndị okenye na-arụ nnukwu ọrụ, obi na-adị ha ezigbo ụtọ n’ihi mbọ ha na-agba inyere ndị ọzọ aka.​—Ọrụ 20:35.

6. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi “na-ele ọbịa”? (Ndị Hibru 13:2, 16; kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Otú ị ga-esi gosi na ị “na-ele ọbịa” bụ ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma, ma ndị na-abụghị ndị enyi gị. (1 Pita 4:9) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na onye na-ele ọbịa na-emere ndị mmadụ ihe ọma, ma ndị ọ na-amaghị. Ọ na-atọkwa ya ụtọ ịnabata ha n’ụlọ ya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ndị mmadụ hà ma m ka onye na-anabata ndị ọbịa?’ (Gụọ Ndị Hibru 13:2, 16.) Onye na-ele ọbịa na-enye ndị ọbịa ihe o nwere, ma ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha ma ndị na-arụsi ọrụ ike, dị ka ndị nlekọta sekit na ndị si esi bịa n’ọgbakọ ha ikwu okwu.​—Jen. 18:2-8; Ilu 3:27; Luk 14:13, 14; Ọrụ 16:15; Rom 12:13.

Ebe otu di na nwunye na-anabata onye nlekọta sekit na nwunye ya n’ụlọ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Olee otú okenye si egosi na ọ bụghị “onye hụrụ ego n’anya”?

7 “O kwesịghị ịbụ . . . onye hụrụ ego n’anya.” Ihe a pụtara na ihe ga-aka gị mkpa abụghị akụnụba. Ma ị̀ bara ọgaranya ma ị̀ dara ogbenye, i kwesịrị iwere ihe gbasara Alaeze Chineke ka ihe kacha mkpa n’ihe niile ị na-eme ná ndụ. (Mat. 6:33) I kwesịrị ịna-eji oge gị, ike gị, na ihe ndị ọzọ i nwere na-efe Jehova, na-elekọta ezinụlọ gị, na-ejekwara ọgbakọ ozi. (Mat. 6:24; 1 Jọn 2:15-17) Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si ele ego anya? Ihe ndị dị mkpa ná ndụ hà na-eju m afọ? Ka mkpa m ọ̀ bụ ịkpatakwu ego na inwetakwu ọtụtụ ihe?’​—1 Tim. 6:6, 17-19.

8. Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi gosi na ị “na-emeru ihe n’ókè,” ‘na-ejidekwa onwe gị’?

8 Ọ bụrụ na ị bụ “onye na-emeru ihe n’ókè” na “onye na-ejide onwe ya,” ị na-echebara ihe niile ị na-eme echiche nke ọma. Ọ pụtara na ị naghị eri oké nri ma ọ bụ na-aṅụ oké mmanya. Ejiji gị na-adịkwa mma n’anya. Ihe ndị i ji eme onwe gị obi ụtọ na-abụ ihe ndị dị mma. Ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa anaghịkwa agba gị ara. (Luk 21:34; Jems 4:4) Ị bụkwa onye isi jụrụ oyi, ya bụ, ị na-ejide onwe gị ọ bụrụgodị na a kpasuru gị iwe. I “kwesịghị ịbụ onye aṅụrụma.” A gaghị eji ịṅụ oké mmanya mara gị. Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m na-emeru ihe n’ókè, na-ejidekwa onwe m?’

9. Gịnị ka ịbụ “onye na-ele ihe anya otú dị mma” na “onye na-eme ihe n’usoro” pụtara?

9 Ọ bụrụ na ị bụ “onye na-ele ihe anya otú dị mma,” ị na-eche banyere ihe Baịbụl kwuru tupu i mee ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ. I chebarala ihe ndị a echiche nke ọma, ya emee ka ị na-aghọta ihe nke ọma ma na-eme ezigbo mkpebi. Ị naghị eme mkpebi ọkụ ọkụ, kama ị na-ejide n’aka na ị matara otú ihe si mee tupu gị emee mkpebi. (Ilu 18:13) Ihe a na-eme ka ị na-eme mkpebi dị mma nke na-adaba n’uche Jehova. Ọ bụrụ na ị “na-eme ihe n’usoro,” ị na-akpakọ onwe gị ọnụ, na-agakwa ihe n’oge. A ma gị ka onye a ga-atụkwasịli obi na onye na-eso ntụziaka. Àgwà ndị a ga-eso eme ka i nwee aha ọma. Ka anyị lebazie anya n’àgwà ndị Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo onyeisi ezinụlọ.

ỊBỤ EZIGBO ONYEISI EZINỤLỌ

10. Olee otú nwoke si ‘elekọta ezinụlọ ya nke ọma’?

10 Ọ bụrụ na ị bụ di, chọọkwa ịbụ okenye, àgwà ndị ezinụlọ gị so n’ihe a ga-eji ekpebi ma ì ruru eru. N’ihi ya, i kwesịrị ‘ịna-elekọta ezinụlọ gị nke ọma.’ E kwesịrị ịma gị ka onye hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya ma na-elekọta ha. Ọ pụtara na ị ga na-eduzi ofufe ezinụlọ, na-ahụ na ndị ezinụlọ gị gara ọmụmụ ihe, na-enyekwara ha aka ka ha na-eme ike ha niile n’ozi ọma. Gịnị mere o ji dị mkpa? Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ amaghị otú ọ ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya, oleezi otú ọ ga-esi na-elekọta ọgbakọ Chineke?”​—1 Tim. 3:5.

11-12. Olee otú àgwà ndị ezinụlọ nwanna nwoke nwere ike isi eme ka o ruo eruo ma ọ bụ ghara iru eru ịbụ okenye? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ọ bụrụ na ị bụ nna, ụmụ gị ndị na-erubeghị afọ iri na asatọ gị na ha bi kwesịrị ‘ịna-akpa àgwà ọma, na-erubekwara gị isi.’ I kwesịrị iji obiọma na-akụziri ha ihe ma na-azụ ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọrọ ka ha na-enwe obi ụtọ, na-egwu egwu, na-achịkwa ọchị ka ụmụaka ibe ha. Ma, otú i si azụ ha nke ọma ga-eme ka ha na-erube isi, na-asọpụrụ mmadụ, na-akpakwa àgwà ọma. I kwesịkwara ime ike gị niile inyere ụmụ gị aka ka ha na Jehova dị ná mma, ka ha nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru, ruokwa eruo ime baptizim.

12 “Onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-anaghị ekwu na ha na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme isi ike.” Ọ bụrụ na nwatakịrị e mere baptizim, onye ka bi n’ụlọ nna ya, emee mmehie dị oké njọ, olee otú ọ ga-esi gbasa papa ya? Ọ bụrụ na papa ya anaghị elebara ya anya, ọ naghịkwa adọ ya aka ná ntị, o nwere ike ọ gaghị eru eru ịbụ okenye.​—Gụọ Ụlọ Nche October 15, 1996, peeji nke 21, paragraf nke 6 na nke 7.

Ndị nna na-azụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe dị iche iche a na-eme n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


NA-ELEKỌTA ỌGBAKỌ

13. Olee otú ị ga-esi egosi na ị ‘na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,’ nakwa na ị bụghị “ekwe ekwe”?

13 Ụmụnna nwoke ndị na-akpa àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst na-abara ọgbakọ uru. Onye “na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị” na-agbalịsi ike ka udo dịrị. Ị chọọ ka ndị mmadụ mara na ị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, na-ege ndị ọzọ ntị nke ọma, na-agbalịkwa ịghọta otú obi dị ha. Ị ghọọ okenye, ị̀ ga-ekweta ka e mee ihe ọtụtụ ndị okenye kwuru ka e mee ma ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl a dara? Na i ‘kwesịghị ịbụ ekwe ekwe’ pụtara na ị gaghị na-esi ọnwụ ka e mee ihe otú ị chọrọ. Obi ga-adị gị ụtọ ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ. (Jen. 13:8, 9; Ilu 15:22) I ‘kwesịghị ịbụ onye okwu na ụka’ ma ọ bụ “onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ.” Kama ịdị aka ike ma ọ bụ ịbụ ekwe ekwe, ị ga-adị nwayọọ ma dịrị akọ. Ebe ị bụ onye na-eme udo, ị na-agba mbọ ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo, ma mgbe ihe siri ike. (Jems 3:17, 18) Okwu ọma gị nwere ike ime ka obi jụrụ ndị mmadụ, ma ndị na-emegide anyị.​—Ikpe 8:1-3; Ilu 20:3; 25:15; Mat. 5:23, 24.

14. E kwuo na nwanna abụghị “onye chegharịrị ọhụrụ” nakwa na o “jisiri Chineke aka ike,” gịnị ka ọ pụtara?

14 Onye ruru eru ịbụ okenye abụghị “onye chegharịrị ọhụrụ.” Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị iwu na ọ ga-eru ọtụtụ afọ i mere baptizim, ma, oge ụfọdụ kwesịrị ịga tupu gị aghọọ Onye Kraịst tozuru etozu. Tupu a họpụta gị ịbụ okenye, ị ga-egosi na ị dị umeala n’obi ka Jizọs ma chere ruo mgbe Jehova ga-enye gị ọrụ ọ bụla. (Mat. 20:23; Fil. 2:5-8) Ị ga-egosikwa na ị bụ “onye jisiri Chineke aka ike” ma ị nọsie ike n’ofufe ya, na-erubere iwu ya isi, na-esokwa ntụziaka o si ná nzukọ ya na-enye.​—1 Tim. 4:15.

15. Okenye ọ̀ ga-abụrịrị aka ochie n’ikwu okwu? Kọwaa.

15 Baịbụl kwuru hoo haa na onye nlekọta kwesịrị ịbụ “onye ruru eru ịkụzi ihe.” Ọ̀ pụtara na ị ga-abụrịrị aka ochie n’ikwu okwu n’ọgbakọ? Mba. Ọ bụghị ndị okenye niile bụ aka ochie n’ikwu okwu. Mana, n’ozi ọma nakwa ná nleta ọzụzụ atụrụ, ha kwesịrị iji Baịbụl akụzi ihe nke ọma ma na-agba ụmụnna ume. (1 Tim. 3:2; b i nwere ike ịtụle 1 Ndị Kọrịnt 12:28, 29 na Ndị Efesọs 4:11.) N’agbanyeghị ya, i kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka ị na-akụzikwu ihe nke ọma. Olee otú ị ga-esi na-amụtakwu ya?

16. Olee otú ị ga-esi na-akụzikwu ihe nke ọma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 “Onye . . . jidesiri okwu nke eziokwu aka ike.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-akụzi ihe nke ọma, na-esi na Baịbụl akụzi ihe ma na-enye mmadụ ndụmọdụ. Na-amụ Baịbụl nakwa akwụkwọ anyị nke ọma. (Ilu 15:28; 16:23; Taị. 1:9) c Ị mụwa Baịbụl, leruo anya nke ọma ka ị mata otú akwụkwọ anyị si kọwaa amaokwu Baịbụl ndị ahụ ka i nwee ike ịkọwa ha nke ọma. Ị kụziwekwa ihe, gbalịsie ike ka ihe ị na-akụzi ruo ndị mmadụ n’obi. Ị ga na-emekwu nke ọma n’ịkụzi ihe ma ọ bụrụ na ị na-agwa ndị okenye ma nke a na-akọ ka ha tụọrọ gị aro, gị ana-emekwa ihe ha gwara gị. (1 Tim. 5:17) Ndị okenye kwesịrị ‘inwe ike ịna-agba ụmụnna ume.’ Mana, ha kwesịkwara ịna-enye ha ndụmọdụ mgbe ụfọdụ ma ọ bụdị ‘na-adọ ha aka ná ntị.’ Na nke ọ bụla ha na-eme, ha kwesịrị iji obiọma na-eme ya. Ọ bụrụ na ị dịrị nwayọọ, hụ ndị mmadụ n’anya, ihe ị na-akụzi esikwa na Baịbụl, ị ga na-akụzi ihe nke ọma n’ihi na ị na-eme ka Onye Ozizi Ukwu bụ́ Jizọs Kraịst.​—Mat. 11:28-30; 2 Tim. 2:24.

Ebe ohu na-eje ozi so okenye ma nke a na-akọ gaa nleta ọzụzụ atụrụ, si otú ahụ na-amụta otú o si eji Baịbụl akụzi ihe. Ohu na-eje ozi ahụ mechara nọrọ n’ihu enyo na-amụgharị okwu ọ ga-ekwu n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


NA-AGBASI MBỌ IKE KA I RUO ERUO

17. (a) Gịnị ga-enyere ndị ohu na-eje ozi aka iru eru ịbụ okenye? (b) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị iburu n’obi mgbe ha na-ele ma nwanna ò ruru eru ka a họpụta ya ịbụ okenye? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Na-ele Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị Mgbe A Na-atụle ma Nwanna Ò Ruru Eru Ịbụ Okenye.”)

17 Ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi chechaa ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ okenye, ha nwere ike iche na ha emekataghị ruo eruo. Ma, cheta na Jehova na nzukọ ya anaghị atụ anya ka i zuo okè. (1 Pita 2:21) Ọ bụkwa mmụọ nsọ Jehova dị ike ga-enyere gị aka ịna-akpa àgwà ndị a. (Fil. 2:13) È nwere àgwà nke ị ga-achọ imekwu nke ọma na ya? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Mee nchọnchọ gbasara isiokwu ahụ. Gwakwa otu okenye ka ọ tụọrọ gị aro otú ị ga-esi na-emekwu nke ọma.

18. Gịnị ka a na-agba ndị ohu na-eje ozi niile ume ka ha mee?

18 Ka anyị niile, ma ndị bụ́ okenye ugbu a, gbasie mbọ ike na-eme ihe ndị e kwuru n’isiokwu a. (Fil. 3:16) Ị̀ bụ ohu na-eje ozi? Na-emekwu nke ọma. Rịọ Jehova ka ọ zụọ gị ka i nwee ike ịna-ejekwuru ya ozi ma na-abakwuru ọgbakọ ya uru. (Aịza. 64:8) Ka Jehova gọzie mbọ ị na-agba iru eru ịbụ okenye.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

[Ihe Ndị E Dere n’Ala Ala Peeji]

a Onye hụrụ ihe ọma n’anya na-eji ihe niile Jehova weere ka ihe dị mma akpọrọ ihe. Ọ na-ahụ àgwà ọma ndị ọzọ nwere, jiri ya kpọrọ ihe, na-ajakwa ha mma maka ya. Imere ndị ọzọ ihe ọma na-atọ ya ụtọ. Ọ na-emedị karịa ihe a chọrọ ka o mee.​

b Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye na-akụzi ihe nke ọma, onye ga-akụziliri Ndị Kraịst ibe ya eziokwu Baịbụl na ihe ndị bụ́ omume ọma. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Taịtọs, o kwuru na onye nlekọta kwesịrị ‘isi n’otú o si akụzi ihe na-egosi na o jidesiri okwu nke eziokwu aka ike’ ka o nwee ike ịgba ndị ọzọ ume ma na-adọ ha aka ná ntị. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti, o kwukwara gbasara “onye ruru eru ịkụzi ihe.” N’ebe ahụ, o kwuru na “ohu Onyenwe anyị” kwesịrị ịna-ejide onwe ya, ‘jirikwa nwayọọ na-akụziri ndị isi ike ihe.’ (2 Tim. 2:24, 25) N’ihi ya, okenye kwesịrị inwe ike iji Baịbụl mee ka mmadụ chebara ihe echiche, na-enye mmadụ ezigbo ndụmọdụ, na-ekwukwa okwu na-eru ndị ọ na-agwa okwu n’obi. O kwesịrị ịna-amụsi Okwu Chineke ike ka o nwee ike ịna-akụziri ndị ọzọ na-amụkwa Okwu Chineke ihe.

c Okenye kwesịrị isi n’otú o si akụzi ihe na otú o si ebi ndụ gosi na ọ na-ejisi Okwu Chineke ike. Ọ kụziwe ihe n’ọgbakọ, ihe ọ na-akụzi na-esi ‘n’ozi e kwesịrị ịtụkwasị obi’ dị na Baịbụl, ọ bụghị ihe o chere, ihe ndị ọ hụrụla ná ndụ, ma ọ bụ nkà o nwere ikwu okwu. Ọ na-esi otú a eme ka ihe ọ na-akụzi na-eru ndị mmadụ n’obi, na-emekwa ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. (Hib. 4:12) Ihe ọzọ bụ na otú o si eme ihe Akwụkwọ Nsọ ọ na-akụzi kwuru na-eme ka ọ ghara ịbụ onye ihu abụọ. Ọ bụrụ na okenye na-eme ihe a, ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, bụrụkwa “ogidi na ihe na-akwado eziokwu.”