Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Chọta Ebe Dị Mma Ị Ga-anọ Mụọ Ihe

Chọta Ebe Dị Mma Ị Ga-anọ Mụọ Ihe

Ị̀ ga-achọ ịna-amụtakwu ihe ma ị mụwa ihe n’onwe gị? Lee ihe ndị i nwere ike ime ma ị chọọ ka uche gị dịrị n’ihe ị na-amụ mgbe ị na-amụ ihe:

  • Họrọ ebe dị mma. O kwe omume, gbalịa ka ị chọta ebe a haziri nke ọma nakwa ebe ìhè dị ka i nwee ike ịhụ ụzọ nke ọma. I nwere ike ịnọrọ n’oche dosa ihe ndị i ji amụ ihe na tebụl ma ọ bụ chọta ebe ọzọ dị mma n’èzí.

  • Chọta ebe ị ga-anọ naanị gị. Jizọs kpebiri ịna-ekpe ekpere “n’isi ụtụtụ . . . n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.” (Mak 1:35) Ọ bụrụ na ị gaghị achọtali ebe naanị gị ga-anọ, i nwere ike ịgwa ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị gị na ha bi oge i ji amụ ihe, gwakwa ha ka ha ghara inye gị nsogbu n’oge ahụ.

  • Tinye uche gị n’ihe ị na-amụ. Gbalịa ka a ghara inwe ihe ga-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-amụ. I jiri ekwentị ma ọ bụ tablet, pịnye ya otú ozi na-agaghị abata na ya ma ọ bụ otú mmadụ na-agaghị akpọli gị. I cheta ihe i kwesịrị ime mgbe ị na-amụ ihe, dee ya edee ka ị ghara ichefu ya. O siere gị ike ime ka uche gị dịrị n’ihe ị na-amụ, i nwere ike ịkwụsịtụ gagharịa agagharịa ma ọ bụ megatụ ahụ́.