Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45

ABỤ NKE 138 Isi Awọ́ Mara Mma

Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Ụmụ Nwoke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Kwuru

Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Ụmụ Nwoke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Kwuru

“Ọ̀ bụ na ndị agadi amaghị ihe? Ọ̀ bụ na ịdịte ndụ aka anaghị eme ka mmadụ na-aghọta ihe?”​—JOB 12:12.

IHE A GA-AMỤ

Irubere Jehova Chineke isi ga-eme ka ọ gọzie anyị ugbu a, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.

1. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị mere agadi?

 Ọ DỊ mkpa ka e nye anyị niile ndụmọdụ ka anyị nwee ike ime ezigbo mkpebi. Ndị okenye na Ndị Kraịst ndị ọzọ ma nke a na-akọ nwere ike inye anyị ụdị ndụmọdụ ahụ. Ọ bụrụ na ha ji ọtụtụ afọ tọ anyị, anyị ekwesịghị ịhapụ ihe ha kwuru sị na ndụmọdụ ndị ha na-enye bụ nke ndị mgbe ochie. Jehova chọrọ ka anyị mụta ihe n’aka ndị merela agadi. Ha amụtala ọtụtụ ihe ná ndụ, marakwa ihe karịa anyị.​—Job 12:12.

2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 N’oge a na-ede Baịbụl, Jehova ji ụmụ nwoke ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi mere agadi gbaa ndị ya ume ma duzie ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ Mosis, Devid, na Jọn onyeozi. Ha biri ndụ n’oge dị iche iche. Otú ihe sikwa dịrị ha abụghị otu. Ka oge ọnwụ ha na-eru, ha nyere ndị nke ha tọrọ ndụmọdụ bara ezigbo uru. Onye nke ọ bụla n’ime ha kwusiri okwu ike na ọ dị mkpa ka anyị na-erubere Jehova isi. Jehova mere ka e dee okwu ndị ahụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịgụ ha. Ma ànyị bụ nwata ma ànyị bụ okenye, anyị ga-erite uru ma anyị leba anya na ndụmọdụ ndị a ha nyere. (Rom 15:4; 2 Tim. 3:16) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’okwu ụmụ nwoke atọ ndị a mere agadi kwuru mgbe oge ọnwụ ha ruwere nakwa ihe anyị ga-amụta n’ihe ha kwuru.

‘UNU GA-EBITE AKA’

3. Olee ọrụ ndị Mosis rụrụ?

3 Mosis ji ndụ ya niile jeere Jehova ozi. Ọ bụ onye amụma, onyeikpe, ọchịagha, na onye na-ede ihe mere mgbe ochie. Mosis mụtara ọtụtụ ihe n’ihe ndị mere ná ndụ ya. O du ndị Izrel pụta n’Ijipt ha nọ na-agba ohu. O jikwa anya ya hụ ka Jehova rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Jehova ji ya dee akwụkwọ ise mbụ nke Baịbụl na Abụ Ọma nke 90. Ọ ga-abụkwa ya dere Abụ Ọma nke 91 na akwụkwọ Job.

4. Olee ndị Mosis gbara ume? Maka gịnị?

4 Obere oge tupu Mosis anwụọ, mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri abụọ (120), ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ka o chetara ha ihe ndị ha hụrụ Jehova meere ha. N’oge ụfọdụ n’ime ha ka na-eto eto, ha ji anya ha hụ ọtụtụ ọrụ ebube Jehova rụrụ nakwa otú o si taa ndị Ijipt ahụhụ. (Ọpụ. 7:3, 4) Ha si n’Oké Osimiri Uhie Chineke mere ka o kewaa gafee, hụkwa otú o si bibie ndị agha Fero. (Ọpụ. 14:29-31) Mgbe ha nọ n’ala ịkpa, ha hụrụ otú Jehova si chebe ha ma lekọta ha. (Diut. 8:3, 4) Ugbu a, ọ fọrọ obere ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. N’ihi ya, tupu Mosis anwụọ, ọ chọrọ ịgba ndị Izrel ume. a

5. Olee ihe okwu Mosis kwuru n’oge ọ chọrọ ịnwụ e dere na Diuterọnọmi 30:19, 20 mere ka obi sie ndị Izrel ike na ya?

5 Gịnị ka Mosis kwuru? (Gụọ Diuterọnọmi 30:19, 20.) O chetaara ndị Izrel na e nwere ihe ndị magburu onwe ha ha na-atụ anya ha. Ọ bụrụ na ha enweta ngọzi Jehova, ha ga-ebi ogologo ndụ n’ala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ala ahụ mara mma, na-emepụtakwa nri. Mgbe Mosis na-akọwara ha Ala Nkwa ahụ, ọ sịrị na ọ bụ ‘nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị ha rụrụ, ụlọ ndị ụdị ihe ọma dị iche iche juru bụ́ ndị ha na-arụghị ọrụ nweta, olulu mmiri ndị ọ na-abụghị ha gwuru, nakwa ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị ha kụrụ.’​—Diut. 6:10, 11.

6. Gịnị mere Chineke ji hapụ mba ndị ọzọ ka ha merie ndị Izrel?

6 Mosis dọkwara ndị Izrel aka ná ntị. Ọ bụrụ na ha chọrọ ịna-ebi n’ala ahụ mara mma, ha kwesịrị irubere iwu Jehova isi. Mosis gbara ha ume ka ha ‘họrọ ndụ,’ ya bụ, ka ha gee Jehova ntị nakwa ka ha ghara ‘ịhapụ ya.’ Ma, ọ dị mwute na ndị Izrel erubereghị Jehova isi. N’ihi ya, o nwere mgbe o ruru, Jehova ahapụ ma ndị Asiria ma ndị Babịlọn ka ha merie ha ma dọrọ ha n’agha.​—2 Eze 17:6-8, 13, 14; 2 Ihe 36:15-17, 20.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Mosis kwuru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Irube isi ga-eme ka anyị dị ndụ. Otú ahụ ọ fọrọ obere ka ndị Izrel ndị ahụ banye n’Ala Nkwa, ọ fọkwara obere ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa, ebe anyị ga-ahụ mgbe a ga-agbanwe ụwa a ya aghọọ Paradaịs. (Aịza. 35:1; Luk 23:43) A ga-ebibi Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpu. 20:2, 3) Okpukpe ụgha agaghịkwa na-eduhie ndị mmadụ ka ha ghara ife Jehova. (Mkpu. 17:16) Ọchịchị ụmụ mmadụ agaghịkwa na-emegbu ndị ha na-achị. (Mkpu. 19:19, 20) Jehova agaghị ekwe ka onye ọ bụla kpata nsogbu na Paradaịs. (Ọma 37:10, 11) Ndị mmadụ nọ n’ebe niile ga na-erubere iwu Jehova ziri ezi isi. Ọ ga-emekwa ka udo dịrị, anyị adịrịkwa n’otu. Ihe a ga-eme ka mmadụ niile hụ ibe ha n’anya ma tụkwasị ibe ha obi. (Aịza. 11:9) Anyị na-atụsi anya ike mgbe ihe ndị a ga-eme. Ọ bụrụkwa na anyị erubere Jehova isi, anyị ga-ebi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.​—Ọma 37:29; Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na anyị erubere Jehova isi, anyị ga-ebi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị ruo narị afọ ụfọdụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Olee otú nkwa Chineke kwere inye anyị ndụ ebighị ebi si nyere otu nwanna bụ́ onye ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ aka? (Jud 20, 21)

8 Ọ bụrụ na anyị eburu nkwa Chineke kwere inye anyị ndụ ebighị ebi n’obi, anyị ga-achọ ịna-erubere ya isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. (Gụọ Jud 20, 21.) Nkwa a nwekwara ike inye anyị ike anyị ga-eji na-eme nke ọma n’ihe ndị anyị na-anaghị emeta. E nwere otu nwanna bụ́ onye ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ n’Afrịka. Ọ gbasiri mbọ ike ịna-eme nke ọma n’ebe ọ na-anaghị emeta. Ọ sịrị: “Mgbe m chetara na ihe ahụ nwere ike ime ka m ghara ịdị ndụ ebighị ebi, m kpebisikwuru ike imeri ya, kpesiekwa ekpere ike ka Jehova nyere m aka. O nyekwaara m aka mụ emerie ya.”

“IHE GA NA-AGAZIRI GỊ”

9. Olee ọnwụnwa ndị bịaara Devid?

9 Devid bụ nnukwu eze. Ọ na-akụ egwú, na-ede uri, bụrụ ọchịagha, nakwa onye amụma. Ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya. E nwere afọ ndị ọ nọ na-agbagharị na-ezo ka aka Eze Sọl na-achọ igbu ya ghara ịkpara ya. Mgbe ọ ghọchakwara eze, e nwere oge ọ gbara ọsọ ndụ maka na nwa ya bụ́ Absalọm na-achọ ịnapụ ya ọchịchị. N’agbanyeghị ihe ndị siiri Devid ike nakwa ebe ndị o mejọrọ, o ji obi ya niile na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. Jehova kwuru na ọ bụ “nwoke obi [ya] nabatara.” Anyị kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ bara uru Devid nyere.​—Ọrụ 13:22; 1 Eze 15:5.

10. Gịnị mere Devid ji nye Solomọn nwa ya, bụ́ onye ga-anọchi ya, ndụmọdụ?

10 Ka anyị lebagodị anya na ndụmọdụ Devid nyere Solomọn nwa ya, bụ́ onye ga-anọchi ya. Jehova họọrọ Solomọn ka ọ rụọ ụlọ nsọ a ga-anọ na-efe ya. (1 Ihe 22:5) Ihe niile agaghị agara Solomọn siriri werere. Gịnị ka Devid ga-agwa ya? Ka anyị chọpụta.

11. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Eze 2:2, 3, olee ndụmọdụ Devid nyere Solomọn? Oleekwa otú okwu ndị ahụ ọ gwara ya si mezuo? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Gịnị ka Devid kwuru? (Gụọ 1 Ndị Eze 2:2, 3.) Devid gwara nwa ya na ọ bụrụ na o rubere Jehova isi, ihe ga-agaziri ya. Ruokwa ọtụtụ afọ, ihe gaziiri Solomọn. (1 Ihe 29:23-25) Ọ rụrụ agadaga ụlọ nsọ, deekwa akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ. E dekwara ihe ndị o kwuru n’ebe ụfọdụ na Baịbụl. A ma ya ama n’ihi otú o si nwee amamihe ma baa ọgaranya. (1 Eze 4:34) Ma dị ka Devid kwuru, ihe ga na-agaziri Solomọn ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị irubere Jehova bụ́ Chineke ya isi. Ma, ọ dị mwute na Solomọn mechara fewe arụsị. Jehova kwụsịrị ịgọzi ya, meekwa ka ọ ghara inwe amamihe ọ ga-eji na-achị n’ezi omume nakwa n’ikpe ziri ezi.​—1 Eze 11:9, 10; 12:4.

Okwu ikpeazụ Devid gwara Solomọn nwa ya na-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụrụ na anyị erubere Jehova isi, ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji na-eme ezigbo mkpebi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12 b


12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị Devid kwuru?

12 Gịnị ka anyị ga-amụta na ya? Irubere Jehova isi ga-eme ka ihe gaziere anyị. (Ọma 1:1-3) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ekweghị nkwa inye anyị akụnụba na ebube o nyere Solomọn. Ma, ọ bụrụ na anyị erubere ya isi, ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji na-eme ezigbo mkpebi. (Ilu 2:6, 7; Jems 1:5) Ihe ndị dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl nwere ike inyere anyị aka n’ihe gbasara ụdị ọrụ anyị ga-arụ, agụmakwụkwọ, ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ, nakwa ego. Ime ihe Baịbụl kwuru ga-echebe anyị ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka ndụ ebighị ebi kwaa anyị. (Ilu 2:10, 11) Ọ ga-eme ka anyị meta ezigbo ndị enyi. Ọ ga-emekwa ka anyị na ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ.

13. Gịnị nyeere Carmen aka ime mkpebi kacha mma ná ndụ ya?

13 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Mozambik aha ya bụ Carmen. O chere na ịgụ oké akwụkwọ ga-eme ka ihe gaziere ya. Ọ banyere mahadum ka ọ mụọ otú e si ese ụlọ. Ọ sịrị: “Ihe m na-amụ masịrị m. Ma, ọ na-eri m nnukwu oge, na-emekwa ka ike na-agwụ m. M na-anọ n’ụlọ akwụkwọ malite n’elekere asaa na ọkara nke ụtụtụ ruo n’elekere isii nke mgbede. Ọ na-esiri m ike ịga ọmụmụ ihe. Adịm ná mma mụ na Jehova bịara nyụwakwa ka ọkụ. N’ime obi m, ama m na ihe m na-eme bụ ịgbalị ịbụ ohu nna ukwu abụọ.” (Mat. 6:24) O kpere ekpere maka otú ihe si dịrị ya, meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị. O dere, sị: “Mgbe ndị okenye na mama m nyechara m ndụmọdụ, m kpebiri na m ga-ahapụ mahadum ma jeere Jehova ozi oge niile. Ihe a mere ka m mee mkpebi ndị kacha mma m metụrụla ná ndụ m. Anaghịkwa m akwara ya mmakwaara.”

14. Olee ihe dị mkpa Mosis na Devid kwuru okwu ya?

14 Mosis na Devid hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ha makwa na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-erubere ya isi. N’okwu ha kwuru mgbe ọ fọrọ obere ka ha nwụọ, ha gbara ndị ha gwara okwu ume ka ha mee ka ha, jisie Jehova bụ́ Chineke ha aka ike. Ha abụọ dọkwara aka ná ntị na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ Jehova, ya na ya agaghị adị ná mma, Jehova akwụsịkwa ịgọzi ya otú o kwere ya ná nkwa. Ndụmọdụ ndị a na-abara anyị uru taa. Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, e nwere onye ọzọ ji obi ya fee Jehova nyere ndụmọdụ iji gosi na ọ dị mkpa ka anyị ghara ịkwụsị irubere Jehova isi.

“E NWEGHỊ IHE NA-EME M OBI ỤTỌ KARỊA”

15. Olee ihe ndị Jọn onyeozi hụrụ n’oge ọ dị ndụ?

15 Jọn bụ ezigbo enyi Jizọs Kraịst, bụrụkwa onyeozi ya. (Mat. 10:2; Jọn 19:26) Jọn so Jizọs jee ozi niile o jere n’ụwa, hụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, nọnyekwara ya n’oge ihe siiri ya ike. Ọ hụrụ ka a na-egbu Jizọs, hụkwa ya mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ hụrụ mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst mụbara. O bikwara ogologo ndụ hụ mgbe e kwusara ozi ọma “ebe niile n’ụwa.”​—Kọl. 1:23.

16. Olee ndị akwụkwọ ozi Jọn dere baara uru?

16 Mgbe oge ọnwụ Jọn ruwere, Jehova mere ka o dee akwụkwọ ụfọdụ na Baịbụl. O dere ihe ndị na-atụ n’anya “Jizọs Kraịst kpughere.” (Mkpu. 1:1) O dere ozi ọma bu aha ya. O dekwara akwụkwọ ozi atọ. Onye o degaara akwụkwọ ozi nke atọ bụ otu Onye Kraịst ji obi ya niile na-efe Chineke aha ya bụ Gayọs. Jọn hụrụ ya n’anya ma were ya ka nwa ya. (3 Jọn 1) N’oge ahụ, ọ ga-abụrịrị na e nwere ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ Jọn hụrụ n’anya ka ụmụ ya. Ihe nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi dere agbaala ndị niile na-eso ụzọ Jizọs ume ruo n’oge anyị a.

17. Dị ka e dere na 3 Jọn 4, gịnị na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ?

17 Gịnị ka Jọn dere? (Gụọ 3 Jọn 4.) Jọn dere obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ na-erubere Chineke isi. N’oge Jọn dere akwụkwọ ozi nke atọ ya, e nweela ụfọdụ ndị malitere ịgbasa nkụzi ụgha, na-eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Ma, e nwekwara ndị nọsiri ike “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” Ha na-erubere Jehova isi, ‘na-ebikwa ndụ otú o nyere n’iwu.’ (2 Jọn 4, 6) Ndị Kraịst ndị a rubeere Jehova isi mere Jọn obi ụtọ, meekwa Jehova n’onwe ya obi ụtọ.​—Ilu 27:11.

18. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jọn dere?

18 Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Irubere Jehova isi na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. (1 Jọn 5:3) Dị ka ihe atụ, obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ma na ihe anyị na-eme na-atọ Jehova ụtọ. Obi na-atọ ya ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-emeri ọnwụnwa ụwa Setan na-anwa anyị ma na-erubere iwu ya isi. (Ilu 23:15) Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-aṅụrịkwa ọṅụ. (Luk 15:10) Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị hụ ka anyị na ụmụnna anyị ji otu obi na-efe Chineke, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ma ọ bụ mkpagbu abịara anyị. (2 Tesa. 1:4) Mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a, obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ịmara na anyị nọsiri ike n’ofufe Jehova n’ụwa Ekwensu na-achị.

19. Gịnị ka otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rachel kwuru banyere ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

19 Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị kụziere ndị ọzọ gbasara Jehova. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rachel. O bi na Dọminikan Ripọblik. Ọ ma na ịkụziri mmadụ gbasara ezi Chineke anyị bụ ihe ọma ọnụ na-agaghị akọwali. O nyeere ọtụtụ ndị aka ịmalite ife Jehova. Ọ sịrị: “Ọ na-esiri m ike ịkọwacha ụdị ọṅụ m na-enwe ka m na-ele ka ndị m kụziiri ihe na-ahụkwu Jehova n’anya, na-atụkwasị ya obi ma na-agbanwe ndụ ha ka ha nwee ike ime ya obi ụtọ. Obi ụtọ ahụ m na-enwe karịrị mbọ ndị m gbara iji kụziere ha ihe.”

Anyị na-enwe ọṅụ ma anyị kụziere ndị ọzọ ịhụ Jehova n’anya na irubere ya isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)


MỤTA IHE N’IHE ỤMỤ NWOKE NDỊ RUBEERE JEHOVA ISI KWURU TUPU HA ANWỤỌ

20. Olee otú anyị na Mosis, Devid, na Jọn si yie?

20 Oge Mosis, Devid, na Jọn dịrị ndụ dị iche n’oge anyị a. Mana, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị na ha si yie. Ha fere ezi Chineke, anyịnwa na-efekwa ya. Anyịnwa na-agwa Jehova okwu n’ekpere ka ha, na-atụkwasị ya obi, na-achọkwa ka o duzie anyị. Dị ka ụmụ nwoke ndị ahụ, obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi ndị na-erubere ya isi mmaji kwuru mmaji.

21. Olee otú Jehova ga-esi agọzi anyị ma anyị gee ntị na ndụmọdụ Mosis, Devid, na Jọn nyere anyị ma fee Jehova?

21 N’ihi ya, ka anyị gee ntị n’okwu ụmụ nwoke ndị a kwuru tupu ha anwụọ ma rubere iwu Jehova isi. Anyị mee otú ahụ, ihe niile anyị na-eme ga-agaziri anyị. Anyị ga-enweta ndụ ma “bitee aka,” ya bụ, dịrị ndụ ebighị ebi. (Diut. 30:20) Obi ga-adịkwa anyị ụtọ na anyị mere ihe dị Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ụtọ, bụ́ onye na-emezu nkwa niile o kwere karịadị otú ọ bụla anyị nwere ike ịtụ anya ya.​—Efe. 3:20.

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

a Ọtụtụ ndị Izrel ndị hụrụ ọrụ ebube Jehova rụrụ n’Oké Osimiri Uhie abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:22, 23) Jehova kwuru na ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe ga-anwụ n’ala ịkpa. (Ọnụ Ọgụ. 14:29) Ma, Joshụa, Keleb, na ọtụtụ ndị na-erubeghị afọ iri abụọ, nakwa ọtụtụ ndị si n’ebo Livaị, anwụghị. Ha gafere Osimiri Jọdan banye n’ala Kenan ma hụ ka Jehova mezuru nkwa o kwere ndị Izrel.​—Diut. 1:24-40.

b NKỌWA FOTO: Aka ekpe: Ebe Devid na-enye Solomọn nwa ya ndụmọdụ ikpeazụ. Aka nri: Ebe ụmụ akwụkwọ nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ na-amụta ihe Jehova na-akụziri ha.