Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-amụchi Ihe Anya

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-amụchi Ihe Anya

È NWERE mgbe ọ na-esiri gị ike ịmụ ihe kwa izu? Ka è nwere mgbe ịmụ ihe na-anaghị atọ gị ụtọ? Ọ na-adị anyị niile otú ahụ mgbe ụfọdụ. Mana, chee banyere ihe ụfọdụ anyị na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịsa ahụ́. Ịsa ahụ́ na-ewe oge. A na-agbakwara ya mbọ. Mana, anyị sachaa ya, ọ na-eme ka anyị nweta onwe anyị. Ịmụ Baịbụl nwekwara ike ịdị ka ebe anyị ‘ji okwu Chineke saa’ ahụ́, anyị enweta onwe anyị. (Efe. 5:26) Lee aro ụfọdụ nwere ike inyere gị aka:

  • Wepụta oge ị ga-eji na-amụ ihe. Ịmụ Baịbụl so ‘n’ihe ndị ka mkpa’ Onye Kraịst na-ekwesịghị ileghara anya. (Fil. 1:10) Iji mee ka ọ dịrị gị mfe icheta oge i wepụtara ị ga-eji mụọ ihe, ọ ga-adị mma ka i dee ya edee, dowe ya n’ebe ị ga na-ahụ ya. O nwekwara ike ịbara gị uru ma ị pịnye ekwentị gị otú ọ ga-agwa gị ma ọ fọ obere ka oge i ji amụ ihe ruo.

  • Chee gbasara ihe ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe ị na-amụ. Ọ̀ na-adịrị gị mfe ịmụ ihe ruo ogologo oge, ka ọ̀ bụ ịmụ ya obere obere? Ị ma ihe ga-akachara gị mma. Haziekwa otú i si amụ ihe ka ọ daba n’otú ihe si dịrị gị. Ọ bụrụ na ịmụ ihe anaghị agụ gị agụụ ma oge i ji amụ ihe ruo, i nwere ike ikpebi iji naanị nkeji iri mụọ ihe. Iji obere oge há otú ahụ mụọ ihe ga-abara gị uru karịa ịhapụ ya kpamkpam. I bidokwa ịmụ ihe, i nwere ike ịchọ ịmụrụ ya gawa.​—Fil. 2:13.

  • Họrọ isiokwu ndị ị ga-amụ tupu oge i ji amụ ihe eruo. Ọ bụrụ na ọ bụ n’oge ahụ ị chọrọ ịmụ ihe ka i bidoro iche ihe ị ga-amụ, o nwere ike ị gaghị ‘na-eji oge gị eme ihe kacha mkpa.’ (Efe. 5:16) Ọ ga-adị mma ka i dee isiokwu ndị ị ga-achọ ịmụ. Mgbe ọ bụla ajụjụ batara gị n’obi, dee ya edee. Ị mụchaa ihe, i nwere ike idetu ihe ndị ọzọ ị ga-achọ ịmụ.

  • Dịrị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ. Na-agbanwe otú i si amụ ihe. I nwere ike ịgbanwe nkeji ole i ji amụ ihe ma ọ bụkwanụ isiokwu ị na-amụ. Ihe dị mkpa abụghị mgbe ị mụrụ ihe, nkeji ole ị mụrụ ihe, ma ọ bụ ihe ị mụrụ, kama ọ bụ ka ị na-amụchi ya anya.

Ịmụchi ihe anya na-abara anyị uru. Ọ na-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma, mee ka anyị mụta ịna-eme mkpebi dị mma, na-emekwa ka anyị nweta ume.​—Josh. 1:8.