AKỤKỌ NDỤ
Jehova Nyere Anyị Ike ma n’Oge Agha ma n’Oge Udo
Paul: Obi tọgburu anyị atọgbu n’ọnwa Nọvemba afọ 1985 mgbe anyị nọ n’ụgbọelu na-aga ebe mbụ e zigara anyị ịga jewe ozi ala ọzọ, ya bụ, Laịberịa nke dị n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Mgbe ụgbọelu anyị kwụsịrị na Senigal, nwunye m sịrị: “N’ihe karịtụrụ otu awa ugbu a, anyị ga-anọ na Laịberịa.” Mana, ihe ọzọ anyị nụrụ bụ otu ọkwa a mara, sị: “Ndị na-aga Laịberịa, pụtanụ n’ụgbọelu a. E nwere ndị chọrọ iweghara ọchịchị na Laịberịa. N’ihi ya, anyị agaghịzi eru ebe ahụ.” Ruo ụbọchị iri na-eso ya, anyị na ndị ozi ala ọzọ nọ na Senigal nọ. Ma, anyị nọ na-ege akụkọ ihe na-eme na Laịberịa. Anyị nụrụ na a na-egbu ọtụtụ ndị nakwa na ndị ọchịchị anaghị ekwe ndị mmadụ pụta n’ụlọ ha. Onye ọ bụla pụtaranụ, a na-agbagbu ya ozugbo.
Anne: Anyị na-akpachapụ anya eme ihe niile. N’eziokwu, kemgbe m bụ nwata, m bụ onye ụjọ. A na-akpọ m Anne Onye Ụjọ. Ịgafedị okporo ụzọ na-atụ m ụjọ. Ma, anyị kpebiri ịga Laịberịa n’agbanyeghị na ọgba aghara dị ebe ahụ.
Paul: A mụrụ mụ na Anne n’otu ebe n’ebe ọdịda anyanwụ Ịngland. Ndị mụrụ m na nne Anne gbara anyị ume ka anyị banye ozi oge niile. N’ihi ya, mgbe anyị gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, anyị malitere ịsụ ụzọ. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, a kpọrọ m ka m jewe ozi na Betel. Anne sonyekwaara m mgbe anyị lụchara n’afọ 1982.
Anne: Ije ozi na Betel tọgburu anyị atọgbu. Mana, ọ nọ na-agụsi anyị agụụ ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọrụ anyị na ndị bụ́bu ndị ozi ala ọzọ rụkọrọ na Betel mere ka ịbụ ndị ozi ala ọzọ gụsikwuo anyị ike. Anyị tinyere ihe a n’ekpere abalị niile ruo afọ atọ. N’ihi ya, obi bụ anyị sọ aṅụrị n’afọ 1985 mgbe a kpọrọ anyị ịga klas nke iri asaa na itoolu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. E zigara anyị Laịberịa nke dị n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
OTÚ ỤMỤNNA ANYỊ SI HỤ ANYỊ N’ANYA MERE KA ANYỊ DỊ IKE
Paul: Anyị bara ụgbọelu mbụ e kwere ka ọ banye Laịberịa. Ụjọ ka jikwa ndị mmadụ, a naghịkwa ekwe ndị mmadụ pụọ n’ụlọ ha ná mgbede. N’ihi ụjọ, e nwere ụdị mkpọtụ ụgbọala na-eme, ọsọ esu. Anyị na-agụ ebe ụfọdụ n’akwụkwọ Abụ Ọma n’abalị ọ bụla ka o mee ka obi ruo anyị ala. Ma, ozi anyị na-atọ a Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ya n’ihi na o biteela aka na Laịberịa, marakwa otú ihe si dịrị ụmụnna anyị n’ebe ahụ.
anyị ezigbo ụtọ. Nwunye m na-eje ozi ọma n’ụbọchị niile, mụnwa ana-arụ ọrụ na Betel, mụ na Nwanna John Charuk.Anne: Gịnị mere ozi anyị na-eje na Laịberịa ji masị anyị ngwa ngwa? Ọ bụ n’ihi ụmụnna anyị. Ha hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, jirikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Anyị na ha bịara dị n’ezigbo mma, ha aghọọ ezigbo ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị. Ha na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ ma na-agba anyị ume. Ihe na-eme n’ozi ọma ebe a dị ịtụnanya. Iwe na-ewe ndị mmadụ ma anyị hapụ ha ngwa ngwa. Ndị mmadụ na-ekwurịta gbasara Baịbụl n’ebe niile. I nwere ike ịgakwuru ndị na-ekwurịta Baịbụl, gị na ha ekwuwe gbasara ya. Anyị nwere ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nke na o siiri anyị ike ịna-amụrụ ha niile ihe. Ihe a bụ ngọzi magburu onwe ya.
JEHOVA MERE KA ANYỊ DỊ IKE MGBE ỤJỌ NA-ATỤ ANYỊ
Paul: N’afọ 1989 mgbe afọ anọ e nwetụrụ udo gachara, ihe bịara gbanwee. Agha dara. Ndị chọrọ iweghara ọchịchị nọchiri ebe dị nso na Betel n’abalị abụọ n’ọnwa Julaị afọ 1990. Ruo ọnwa atọ, e nweghị otú anyị na ndị ọzọ si ekwurịta okwu, ma ndị ezinụlọ anyị ma isi ụlọ ọrụ anyị. A na-eme tigbuo zọgbuo ebe niile. Nri bịara dị ụkọ, a na-edinakwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị n’ike. Nsogbu a dịrị ruo afọ iri na anọ, kpaakwa obodo ahụ niile aka ọjọọ.
Anne: Ụfọdụ agbụrụ nọ na-alụso agbụrụ ndị ọzọ ọgụ ma na-egbu ha. Ndị agha juru ebe niile. Ha ji ọtụtụ ngwá ọgụ, yirikwa uwe ndị na-atụ ụjọ. Ha na-akụkakwa ụlọ ọ bụla bukọrọ ihe ha chọrọ. Ụfọdụ n’ime ha na-ewere igbu mmadụ ka igbu ọkụkọ. Ha na-anọchi ụzọ n’ọtụtụ ebe, na-egbu ndị mmadụ, na-atụsa ozu ha n’elu ibe ha. Ihe a medịrị n’ebe dị nso na Betel. E gburu ụfọdụ ụmụnna anyị ji obi ha na-efe Jehova, ma ndị ozi ala ọzọ abụọ anyị hụrụ n’anya.
Ụmụnna anyị na-ezo ndị si n’agbụrụ nke ọzọ ka ndị na-achọ igbu ha ghara igbu ha, ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka e gbuo hanwa. Ndị ozi ala ọzọ na ndị na-eje ozi na Betel mekwara otu ihe ahụ. Na Betel, anyị na ụfọdụ ụmụnna ndị gbatara ọsọ ndụ biri n’elu, e nweekwa ndị bi n’ala. Anyị na otu ezinụlọ dị mmadụ asaa biri n’otu ọnụ ụlọ.
Paul: Ụbọchị ọ bụla, ndị agha na-agbalị ịbata n’ime Betel ka ha chọpụta ma è nwere ndị anyị na-ezo. E nwere mmadụ anọ na-echere anyị nche. Mmadụ abụọ na-esi na windo elepụ anya. Mmadụ abụọ ndị nke ọzọ na-anọ n’èzí n’ọnụ ụzọ e si abata Betel ka ha na-ahụ ihe na-emenụ. Ọ bụrụ na
mmadụ abụọ ndị nke ahụ nọ n’ihu ọnụ ụzọ e si abata Betel edosa aka ha n’ihu ha, anyị na-amata na ihe niile dị mma. Ma, ha tifee aka n’azụ ha, ọ pụtara na agwọ nọ n’akịrịka. Iwe ji ndị agha ahụ. N’ihi ya, ndị ahụ na-esi na windo elepụ anya na-eji ọsọ gaa zoo ndị ahụ gbatara ọsọ ndụ.Anne: Mgbe ọtụtụ izu gachara, otu ìgwè so na-alụ agha ahụ iwe ji batara na Betel n’ike. Mụ na otu nwanna nwaanyị gbabara ebe a na-asa ahụ́, mụ akpọchie ụzọ. N’ime ebe ahụ, e nwere ebe mmadụ nwere ike izo na kọbọd anyị. Nwanna nwaanyị ahụ fabanyere onwe ya ebe ahụ. Ndị agha ahụ so m gbagote elu. Ha jikwa égbè. Ha ji iwe kụọ aka n’ụzọ, di m asị ha: “Nwunye m na-asa ahụ́.” Mgbe m mechiri ebe ahụ nwanna nwaanyị ahụ zoro, o mere mkpọtụ. M tinyeghachiri ihe niile n’ebe m si wepụta ha na kọbọd ahụ. O gbutụrụ m oge. Ama m na ndị agha ahụ ga na-eche ihe m na-eme. N’ihi ya, ụjọ bịara m nke na ahụ́ niile malitere ịma m jijiji. Oleekwanụ otú m ga-esi emepe ụzọ ugbu a? M kpere ekpere n’obi m, rịọ Jehova ka o nyere m aka. M mepeziri ụzọ, wetuo obi kelee ha. Otu n’ime ha kwapụrụ m n’akụkụ banye n’ebe kọbọd ahụ dị, mepee ya, kwaghasịa ihe niile dị na ya. Ma, e nweghị ihe ọ hụrụ, ya eju ya anya. Ya na ndị ya na ha so kwaghasịkwara ebe ndị ọzọ niile. Mana, e nweghị ihe ha hụrụ.
EZIOKWU DỊ KA ÌHÈ NA-ENWU N’ỌCHỊCHỊRỊ
Paul: Ruo ọtụtụ ọnwa, nri ka dị ụkọ. Ma, nri si n’Okwu Chineke nyere anyị ike. Ihe mmụta dịịrị ụbọchị a na-eme na Betel bụ naanị nri ụtụtụ anyị na-eri. Obi dịkwa anyị ụtọ na ọ na-agba anyị ume.
Ọ bụrụ na nri anyị na mmiri anyị agwụ, anyị na ndị ọzọ esikwa na Betel pụọ, o nwere ike ime ka e gbuo ndị zoro na Betel. Mgbe ụfọdụ, otú Jehova na-esi eme ka anyị nweta nri nakwa oge ọ na-eji eme ya na-adị anyị ka ọrụ ebube. Jehova gbooro anyị mkpa anyị ma nyere anyị aka n’ihe ndị na-atụ anyị ụjọ.
Ka ihe ndị na-eme n’ụwa na-akakwu njọ, ka eziokwu dị na Baịbụl na-enwukwu ka ìhè. Ọtụtụ ugboro, ụmụnna anyị gbara ọsọ ndụ. Ma, okwukwe ha ka siri ike. Obi rukwara ha ala n’agbanyeghị otú ihe si siere ha ike. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na agha ahụ “na-akwadebe ha maka oké mkpagbu.” Ndị okenye na ụmụnna bụ́ okorobịa katara obi gaa nyere ụmụnna ha aka n’oge ahụ ihe siri ike. Ụmụnna gbaa ọsọ ndụ, ha na ibe ha na-adị n’otu. Ọ na-emekwa ka ha nweta ebe ọhụrụ ha ga na-ekwusa ozi ọma. Ha na-enwetakwa ebe ha na-anọ amụ ihe n’ọhịa. Ọmụmụ ihe na-eme ka ha na-agba ụmụnna ha ume n’oge ahụ ihe siri ike. Ikwusa ozi ọma nyekwaara ha aka idi oge ahụ. Mgbe anyị na-ekesara ụmụnna ihe e ji gbatara ha ọsọ enyemaka, o metụrụ anyị n’ahụ́ mgbe ha na-agwa anyị na ha chọrọ akpa ozi ọma kama ikwu ka e nye ha uwe. Ọtụtụ ndị hụrụ mkpamkpa agha ahụ kpara chọrọ ịnụ ozi ọma. Obi tọgburu ha atọgbu otú Ndịàmà Jehova si nwee obi ụtọ n’agbanyeghị ihe merenụ. Ha dịkwa ka ìhè na-enwu n’ọchịchịrị. (Mat. 5:14-16) Otú ụmụnna anyị si na-ekwusasi ozi ọma ike medịrị ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-alụ agha ghọọ ụmụnna anyị.
JEHOVA NYERE ANYỊ IKE MGBE Ọ DỊ MKPA KA ANYỊ HAPỤ ỤMỤNNA ANYỊ
Paul: E nwere oge ụfọdụ anyị hapụrụ obodo ahụ. Ugboro atọ, anyị pụrụ nọọ obere oge. Mana, anyị pụrụ ugboro abụọ nọọ otu afọ. Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ kwuru otú obi na-adị anyị ma anyị hapụwa obodo ahụ. Ọ sịrị: “N’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, a kụziiri anyị ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya ma jiri obi anyị niile na-eje ozi anyị. Ọ bụkwa ihe anyị mere. N’ihi ya, ịhapụ ụmụnna anyị n’ụdị oge a gbawara anyị obi.” Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ịnọ ná mba ndị dị nso na Laịberịa na-enyere ụmụnna anyị aka.
Anne: N’ọnwa Mee afọ 1996, mmadụ anọ n’ime anyị ji ụgbọala alaka ụlọ ọrụ buru ọtụtụ akwụkwọ dị mkpa gbasara ọrụ anyị na-arụ na Laịberịa. Anyị chọrọ ịga ebe dị kilomita iri na isii, bụ́ ebe nsogbu na-adịchaghị. Ozugbo ahụ, a lụsoro ebe anyị nọ ọgụ. Ndị na-alụ agha iwe ji nọ na-agbali égbè elu. Ha kwụsịrị anyị, kpọpụta mmadụ atọ n’ime anyị n’ụgbọala ahụ, buru ụgbọala ahụ di m ka nọ n’ime ya gbara gawa. Anyị nọ ebe ahụ n’amaghịzi ihe anyị ga-eme eme. Na mberede, di m sizi n’ebe ìgwè mmadụ nọ pụta, ọbara ana-agba ya n’isi. O juru anyị anya, anyị echee na a gbara ya égbè. Mana, anyị sịrị na ọ bụrụ na a gbara ya égbè, ọ ganụghị agali ije. Otu onye agha kụrụ ya ihe mgbe ọ na-akwapụ ya n’ụgbọala ahụ. Obi dị anyị ụtọ na ọ bụ obere ahụ́ ka o merụrụ.
E nwere ụgbọala ndị amị dị nso ebe ahụ. Ụjọ nọkwa na-atụ ndị juru n’ime ya. Ụgbọala ahụ chọrọ ịpụwa. Ohere adịghị n’ime ya. N’ihi ya, anyị nọ n’akụkụ ụgbọala ahụ jide ya aka. Mana, e nweghị ihe anyị ga-ejidesi aka ike. Onye na-akwọ ụgbọala ahụ gbapụrụ ya ọsọ, ya afọ obere ka anyị dapụ. Anyị rịọrọ ya ka ọ kwụsị. Mana, ụjọ ekweghị ya kwụsị. Ma, anyị jidesiri aka ike n’ụgbọala ahụ ma rute n’ebe anyị na-aga. Ike gwụrụ anyị, ahụ́ ana-amakwa anyị jijiji n’ihi ụjọ.
Paul: Uwe anyị yi eruola unyi, dọkakwaa adọka. Anyị lere ibe anyị anya, ya eju anyị anya na anyị ka nọ ndụ. E nwere helikọpta dị nso ebe ahụ. E jirikwala mgbọ gbakasịa ahụ́ ya, ya eyie ihe ga-adakapụ. Ọ ga-ebu anyị aga Siera Lion echi ya. N’ihi ya, anyị hiri n’ebe ahụ. Obi dị anyị ụtọ na anyị dị ndụ. Mana, anyị nọkwa na-echegbu onwe anyị maka ụmụnna anyị.
JEHOVA NYERE ANYỊ IKE ANYỊ JI DIE NSOGBU NDỊ ỌZỌ
Anne: Anyị rutere na Betel dị na Fritaụn dị na Siera Lion n’udo. Ụmụnna lekọtakwara anyị nke ọma. Ma, e nwere ihe mere m na-atụghị anya ya. Ihe ọjọọ ndị ahụ mere na Laịberịa ekweghị apụ m apụ n’obi. Chi bọọ, ụjọ na-atụ m na e nwere ihe ọjọọ na-aga ime. Anaghịzi m eche echiche nke ọma. Ihe niile dị m gburugburu na-adịcha m ka m̀ na-arọ nrọ. N’abalị, m na-etetakarị na-ama jijiji, ụjọ ana-atụ m na e nwere ihe ọjọọ na-aga ime. Iku ume na-esiri m ike. Di m na-ejide m aka kpee ekpere. Anyị na-abụ abụ Alaeze ruo mgbe ahụ́ kwụsịrị ịma m jijiji. O yiri m ka ara ọ̀ na-aga ịgbapụ m nakwa na anyị ga-ahapụ ozi ala ọzọ anyị na-eje.
Agaghị m echefu ihe ọzọ merenụ. N’izu ahụ, anyị nwetara magazin abụọ. Otu n’ime ha bụ Teta! Bekee nke June 8, 1996. Otu isiokwu dị na ya kwuru ihe mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-atụkarị ụjọ. Mgbe m gụchara ya, m ghọtara ihe mere ụjọ ji na-atụ m. Magazin nke abụọ bụ Ụlọ Nche May 15, 1996. E nwere isiokwu gbara na ya bụ́ “Olee Ebe Ha Si Enweta Ume Ha?” N’Ụlọ Nche ahụ, e sere urukurubụba nku ya mebiri emebi. Isiokwu ahụ kọwara na urukurubụba ahụ ga-anọkwa na-eri nri ma na-efe n’agbanyeghị na nku ya mebiri emebi. N’ihi ya, mmụọ nsọ Jehova ga-eme ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ọ bụrụgodị na e nwere ihe gbawara anyị obi. Jehova ji isiokwu ndị ahụ nye m ihe dị m mkpa n’oge ahụ. (Mat. 24:45) M chọtakwuru isiokwu ndị ọzọ yiri ha, tinye ha n’otu ebe. Ihe a enyerela m aka. Ụjọ ahụ na-atụ m mechara jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị.
JEHOVA NYERE ANYỊ IKE ANYỊ JI NABATA ỌRỤ ỌHỤRỤ
Paul: Mgbe ọ bụla anyị laghachiri Laịberịa, ọ na-eme anyị obi ụtọ. Ná ngwụcha afọ 2004, anyị ejeela ozi ebe ahụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ. Agha ahụ akwụsịkwala. A na-emekwa atụmatụ ịrụ ụlọ ndị ọhụrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. Ma na mberede, a gwara anyị na a ga-eziga anyị ebe ọzọ.
Ihe a siiri anyị ezigbo ike. Olee otú anyị ga-esi edi ya? Anyị na ụmụnna anyị adịrịla n’ezigbo mma. Mgbe anyị hapụrụ ndị ezinụlọ anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied, anyị hụrụ otú inyefe onwe anyị n’aka Jehova si mee ka ọ gọzie anyị. N’ihi ya, anyị kwetara ịga ebe a ga-eziga anyị. Ebe e zigara anyị bụ Gana dị nso.
Anne: Anyị bere ezigbo ákwá mgbe anyị na-ahapụ Laịberịa. O juru anyị anya mgbe Nwanna Frank, bụ́ okenye katarala ahụ́ ma ihe, gwara anyị, sị: “Gbalịanụ chefuo anyị.” Ọ kọwara ihe o kwuru. Ọ sịrị: “Anyị ma na unu agaghị echefu anyị. Ma unu kwesịrị itinye obi unu niile n’ebe ọhụrụ a na-eziga unu. O si n’aka Jehova. N’ihi ya, lekọtanụ ụmụnna nọ ebe ahụ nke ọma.” Ihe a nwanna a kwuru gbara anyị ume, nyekwara anyị aka ịdị njikere imeta ndị enyi ọhụrụ n’obodo ọtụtụ ndị na-amaghị anyị, ebe anyị na-amaghịkwa nke ọma.
Paul: Ma, o teghị aka, anyị na ụmụnna ndị nọ na Gana abụrụ nnu na mmanụ. E nwere ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’otú ụmụnna anyị si nwee okwukwe siri ike ma nọsie ike n’ofufe Jehova. Mgbe anyị jechara ozi na Gana ruo afọ iri na atọ, anyị nwetara ozi ọzọ tụrụ anyị n’anya. A gwara anyị ka anyị gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kenya. Ọ bụ eziokwu na o wutere anyị na anyị hapụrụ ụmụnna anyị nọ n’ebe ndị anyị jeburu ozi, ma o teghị aka, anyị na ụmụnna anyị ndị nọ na Kenya aghọọkwa ezigbo enyi. Dịkwa ka Gana na Laịberịa, e nwere ọtụtụ ebe anyị ga-ekwusa ozi ọma na Kenya.
IHE NDỊ ANYỊ MỤTARA
Anne: Kemgbe afọ ndị a, ahụla m ọtụtụ ihe siiri m ike ma menye m ụjọ. Ọ bụrụ na anyị ebiri n’ebe ọgba aghara dị, o nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị ma ọ bụkwanụ mee ka ụjọ na-atụ anyị. Anyị anaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube napụta anyị n’ihe ndị a. Mgbe ọ bụla m nụrụ ụda égbè, obi na-awụba m n’afọ, ya adị m ka aka m ọ̀ kpọnwụrụ akpọnwụ. Ma, amụtala m iji ihe ndị Jehova ji enye anyị ike eme ka m dị ike, dị ka aka ụmụnna anyị na-enyere anyị. Ahụkwala m na ọ bụrụ na anyị ana-emechi ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova anya, Jehova ga-enyere anyị aka n’ozi anyị na-eje.
Paul: Ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, “Ozi gị ọ̀ na-atọ gị ụtọ?” Obodo ụfọdụ nwere ike ịma ezigbo mma. Mana ọgba aghara nwere ike ịdapụta. N’ihi ya, olee ihe kacha amasị anyị n’obodo ndị anyị gara? Ọ bụ ụmụnna anyị ndị anyị na ha bụ otu ezinụlọ. N’agbanyeghị na anyị na ha esighị n’otu ebe, anyị na ha nwere otu obi. Anyị chere na a na-eziga anyị ka anyị gaa gbaa ha ume. Mana, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ hanwa na-eme ka anyị dị ike.
Ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ. Ihe a bụ ọrụ ebube si n’aka Jehova. Ọ bụrụhaala na anyị nọ n’ọgbakọ Jehova, anyị nọ ebe anyị ga-anọ obi eruo anyị ala. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Fil. 4:13.
a Gụọ akụkọ ndụ Nwanna John Charuk nke gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke March 15, 1973.