Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

Otú Anyị Ga-esi Edi Mmegbu

Otú Anyị Ga-esi Edi Mmegbu

“Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama na-eme ihe ọma ka i wee merie ihe ọjọọ.”​—ROM 12:21.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị ga-esi edi mmegbu ka ihe ghara ịka njọ.

1-2. Olee ụzọ ndị e nwere ike isi megbuo anyị?

 JIZỌS mere ihe atụ gbasara otu nwaanyị di ya nwụrụ, onye nọ na-arịọ otu ọkàikpe ka o kpeere ya ikpe ziri ezi. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara ihe atụ ahụ n’ihi na a na-ekpe ọtụtụ ndị ikpe na-ezighị ezi n’oge ahụ. (Luk 18:1-5) Akụkọ ahụ na-abakwara anyị uru taa n’ihi na e nweela mgbe e megburu onye ọ bụla n’ime anyị.

2 Ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-akpọ ndị ọzọ asị, dị obi ọjọọ ma dị anyaukwu. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya ma e megbuo anyị. (Ekli. 5:8) Mana, e nwere ike anyị agaghị echetụ n’echiche na nwanna anyị ga-emeso anyị otú na-adịghị mma. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna anyị abụghị ndị mmegide. Ha anaghị achọ imegbu anyị ma ọ bụ kpee anyị ikpe na-ezighị ezi. Ha bụ ndị na-ezughị okè. Anyị ga-amụta ihe anyị ga-eme ma e megbuo anyị n’ihe Jizọs mere mgbe e megburu ya. Ọ bụrụ na anyị ga-enweliri ndị na-emegide anyị ndidi ma ha na-emegbu anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwere ụmụnna anyị ndidi karịa? Olee otú obi na-adị Jehova ma ndị na-anọghị n’ọgbakọ ma ọ bụ ụmụnna anyị mee anyị ihe na-adịghị mma? Ọ̀ na-ewute ya?

3. Mmegbu a na-emegbu anyị ọ̀ na-ewute Jehova? N’ihi gịnị?

3 Jehova chọrọ ka a na-emeso anyị niile ihe otú dị mma. Ọ bụrụkwa na ndị ọzọ na-emegbu anyị, ọ na-ewute ya. “Ikpe ziri ezi na-amasị Jehova.” (Ọma 37:28) Jizọs mere ka obi sie anyị ike na Jehova ‘ga-eme ka e kpee ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ’ ma oge ya ruo. (Luk 18:7, 8) N’oge na-adịghịkwa anya, ọ ga-ewepụ ahụhụ niile anyị na-ata, meekwa ka a kwụsị ụdị mmegbu niile.​—Ọma 72:1, 2.

4. Olee otú Jehova si enyere anyị aka taa?

4 Ka anyị na-eche mgbe ezi omume ga-eju ụwa, Jehova na-enyere anyị aka idi mmegbu. (2 Pita 3:13) Ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi zere ime ihe na-adịghị mma mgbe a na-emegbu anyị. Jehova si n’aka Ọkpara ya kụziere anyị otú dị mma anyị ga-esi edi mmegbu. Ọ na-esikwa na Baịbụl enye anyị ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ma e megbuwe anyị.

KPACHARA ANYA N’IHE Ị NA-EME MA E MEE GỊ IHE NA-ADỊGHỊ MMA

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe anyị na-eme ma e mee anyị ihe na-adịghị mma?

5 E mee anyị ihe na-adịghị mma, o nwere ike iwuteru anyị n’ọkpụkpụ. (Ekli. 7:7) Ọ bụkwa otú ọ dị ụfọdụ ndị ji obi ha niile fee Jehova, dị ka Job na Habakọk. (Job 6:2, 3; Hab. 1:1-3) Ọ dịghị njọ ma ọ dị anyị otú ahụ. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe anyị na-eme ka anyị ghara ime ihe na-adịghị mma.

6. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Absalọm? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 E megbuo anyị ma ọ bụ onye anyị na ya dị ná mma, anyị nwere ike ịchọ imegwara. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Legodị ihe Absalọm bụ́ nwa Eze Devid mere. Iwe juru ya obi mgbe Amnọn nwanne ya dinara nwanne ya nwaanyị bụ́ Tema n’ike. Ihe Iwu Mosis kwuru gosiri na e kwesịrị igbu Amnọn maka ihe o mere. (Lev. 20:17) Ọ bụ eziokwu na Absalọm iwe iwe maka ihe ahụ adịghị njọ, ma ogbugbu o gburu nwanne ya dị njọ.​—2 Sam. 13:20-23, 28, 29.

Absalọm ji iwe mebie ihe mgbe e dinara nwanne ya nwaanyị bụ́ Tema n’ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Olee otú ihe ọjọọ ndị ajọ omume na-eme si kpaa otu ọbụ abụ aka ọjọọ nwa oge?

7 O yie ka a taghị ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ, anyị nwere ike ịna-eche ma ọ̀ bara uru ịna-eme ihe dị mma. Otu ọbụ abụ chọpụtara na o yiri ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ajọ omume ka ha na-emegbu ndị ezi omume. Ọ sịrị: “Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha anaghị enwe nsogbu ọ bụla.” (Ọma 73:12) Iwe were ya maka ihe na-adịghị mma ndị ọjọọ na-eme, ya echeekwa na ọ bazighị uru ife Jehova. Ọ sịrị: “Mgbe m gbara mbọ ka m ghọta ya, ọ nọ na-enye m nsogbu n’obi.” (Ọma 73:14, 16) Ọ sịdịrị: “Ọ fọrọ obere ka m kpafuo. Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m mịchapụ.” (Ọma 73:2) Ụdị ihe ahụ mekwara otu nwanna anyị ga-akpọ Alberto.

8. Gịnị ka otu nwanna mere maka ihe ọjọọ e mere ya?

8 E boro Nwanna Alberto ebubo na o zuru ego ọgbakọ. Ihe a mere ka a napụ ya ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ nụrụ ya kwụsịkwara ịkwanyere ya ùgwù. Ọ sịrị: “Ọnụma juru m obi, iwe ana-ewe m.” O kwere ka otú obi dị ya kpaa adịm ná mma ya na Jehova aka ọjọọ, ya akwụsịkwa ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma ruo afọ ise. Akụkọ nwanna a na-egosi ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na ọnụma eju anyị obi n’ihi ihe ọjọọ e mere anyị.

NA-EME KA JIZỌS MA E MEGBUO GỊ

9. Olee ihe ndị e mere Jizọs? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Jizọs mere ihe magburu onwe ya anyị ga-amụta ihe na ya ma e megbuwe anyị. Chegodị otú ma ndị ezinụlọ ya ma ndị ọzọ si megbuo ya. Ndị ikwu ya na-anaghị efe Chineke kwuru na isi adịghị ya mma. Ndị isi okpukpe boro ya ebubo na ya na ndị mmụọ ọjọọ na-arụkọ ọrụ. Ndị agha Rom kwara ya emo, kụọ ya ihe, mechaakwa gbuo ya. (Mak 3:21, 22; 14:55; 15:16-20, 35-37) N’agbanyeghị ya, Jizọs diri ihe ndị a niile. O megwaraghị. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ya?

Jizọs gosiri anyị ụzọ kacha mma anyị ga-esi edi mmegbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)


10. Gịnị ka Jizọs mere mgbe e mere ya ihe na-adịghị mma? (1 Pita 2:21-23)

10 Gụọ 1 Pita 2:21-23. a Jizọs mere ihe magburu onwe ya anyị ga-eme ma e megbuwe anyị. Ọ ma mgbe ọ ga-agba nkịtị na mgbe ọ ga-ekwu okwu. (Mat. 26:62-64) Ọ bụghị ihe niile e boro ya na o mere ka ọ gọọrọ isi ya na ha. (Mat. 11:19) O kwuwekwanụ okwu, ọ naghị akparị ndị na-emegide ya ma ọ bụ yie ha egwu. Jizọs jidere onwe ya n’ihi na “ọ hapụrụ okwu niile n’aka Chineke, onye na-ekpe ikpe ziri ezi.” Jizọs ma na ihe kacha mkpa bụ otú Jehova si lee ihe ahụ anya. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-akwụsị mmegbu niile ma oge ya ruo.

11. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

11 Anyị nwere ike ime ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ana-akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu ma e mee anyị ihe na-adịghị mma. Ụfọdụ ihe ọjọọ e mere anyị nwere ike ịdị obere. N’ihi ya, anyị nwere ike ileghara ha anya ma ọ bụ gbachi nkịtị ka anyị ghara ikwu ihe ga-eme ka ihe ka njọ. (Ekli. 3:7; Jems 1:19, 20) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị kwuo okwu ma anyị hụ ka a na-emegbu mmadụ ma ọ bụ mgbe ndị mmadụ na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara ihe anyị kweere. (Ọrụ 6:1, 2) Anyị kwuwe okwu, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike meda obi kwuo okwu, kwuokwa ya otú gosiri na anyị na-akwanyere ha ùgwù.​—1 Pita 3:15. b

Ọ bụrụ na e mee anyị ihe na-adịghị mma, anyị nwere ike ime ka Jizọs ma anyị kpachara anya mara mgbe anyị ga-ekwu okwu nakwa otú anyị ga-esi ekwu ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)


12. Olee otú anyị si enyefe onwe anyị n’aka “Chineke, onye na-ekpe ikpe ziri ezi”?

12 Anyị nwekwara ike ime ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị enyefee onwe anyị n’aka “Chineke, onye na-ekpe ikpe ziri ezi.” Ọ bụrụ na ndị mmadụ echee ihe na-ezighị ezi banyere anyị ma ọ bụkwanụ megbuo anyị, obi siri anyị ike na Jehova ma nke bụ́ eziokwu. Ọ ga-enyere anyị aka idi ihe na-adịghị mma e mere anyị n’ihi na anyị ma na ọ ga-emecha dozie okwu niile. Ịhapụrụ Jehova okwu ahụ ga-eme ka anyị ghara ibu iwe n’obi ma ọ bụkwanụ kpọọ ndị mmadụ asị. Ọ bụrụ na iwe eju anyị obi, ma ọ bụkwanụ anyị akpọọ ndị mmadụ asị, o nwere ike ime ka anyị mee ihe anyị na-ekwesịghị ime, mee ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, meekwa ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma.​—Ọma 37:8.

13. Gịnị ga-enyere anyị aka idi mmegbu?

13 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị emetali ka Jizọs kpọmkwem. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ma ọ bụ kwuo ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Jems 3:2) Ihe ọjọọ ụfọdụ e mere anyị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu anyị na ya ga na-alụ ná ndụ anyị niile n’ụwa Ekwensu a. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee anyị, ka obi sie anyị ike na Jehova ma ihe anyị na-agabiga. Jizọs makwa otú ọ dị anyị n’ihi na e megburu yanwa. (Hib. 4:15, 16) E wepụ ịmụta ihe n’ihe Jizọs mere, Jehova nyekwara anyị ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ma e megbuo anyị. Ka anyị leba anya n’amaokwu abụọ dị n’akwụkwọ Ndị Rom ga-enyere anyị aka.

“NYENỤ ỌNỤMA OHERE”

14. Gịnị ka ‘inye ọnụma ohere’ pụtara? (Ndị Rom 12:19)

14 Gụọ Ndị Rom 12:19. Mgbe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ‘nye ọnụma ohere,’ ọnụma ònye ka ọ na-ekwu okwu ya? Amaokwu ndị gbara ya gburugburu gosiri na ọ bụ ọnụma Jehova. Anyị na-enye ọnụma Jehova ohere ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ka o kpee ikpe ziri ezi n’oge nke ya nakwa otú dị ya mma. Mgbe e mechara otu nwanna aha ya bụ John ihe na-adịghị mma, ọ sịrị: “M kwesịrị ijide onwe m ka iwe ghara ime ka m mee ihe m na-ekwesịghị ime. Mana, ọ dịghịrị m mfe. Ndị Rom 12:19 nyeere m aka ichere Jehova.”

15. Gịnị mere o ji ka mma ka anyị chere ka Jehova dozie okwu?

15 Ọ na-abara anyị uru ma anyị chere ka Jehova jiri aka ya dozie okwu. Anyị mee otú ahụ, anyị na-ezere nsogbu na obi ọjọọ anyị ga-enwe ma anyị gbalịwa iji aka anyị dozie nsogbu ahụ. Jehova chọrọ inyere anyị aka. O yiri ka ọ̀ na-agwa anyị, sị: ‘Hapụrụ m mmegbu ahụ e megburu gị. M ga-edozi ya.’ Ọ bụrụ na anyị ekweta nkwa Jehova kwere mgbe ọ sịrị, “M ga-akwụ ụgwọ,” anyị nwere ike ịhapụ ihe merenụ, obi esie anyị ike na Jehova ga-edozi okwu ahụ otú kacha mma. Ọ bụ ihe nyeere Nwanna John anyị kwuru okwu ya aka. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ enwee ndidi chere Jehova, ọ ga-edozi okwu ahụ karịadị otú mụnwa nwere ike ime.”

“NA-EME IHE ỌMA KA I WEE MERIE IHE ỌJỌỌ”

16-17. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ‘ịna-eme ihe ọma ka anyị wee merie ihe ọjọọ’? (Ndị Rom 12:21)

16 Gụọ Ndị Rom 12:21. Pọl gwakwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-eme ihe ọma ka ha wee merie ihe ọjọọ.’ Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe, ọ sịrị: “Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Mat. 5:44) Ọ bụkwa ihe ahụ ka yanwa mere. Ọ ga-abụ na anyị echeela gbasara ahụhụ Jizọs diri mgbe ndị agha Rom kpọgidere ya n’osisi. E mekpọrọ Jizọs ọnụ, ya ediekwa ahụ́ na-afụsi ya ụfụ ike. Anyị agaghị aghọtachali ahụhụ Jizọs tara.

17 Jizọs ka hụrụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi n’agbanyeghị na a tara ya nnukwu ahụhụ. Kama ịbụ ndị agha Rom ọnụ, o kpere ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34) Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka ndị na-emegbu anyị, o nwere ike ime ka obi dajụtụ anyị. O nwedịrị ike ịgbanwe otú anyị si ele ha anya.

18. Olee otú ekpere si nyere Nwanna Alberto na Nwanna John aka idi ihe ọjọọ e mere ha?

18 Ekpere nyeere ụmụnna abụọ ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a aka idi ihe na-adịghị mma e mere ha. Nwanna Alberto sịrị: “M kpere ekpere maka ụmụnna ndị ahụ boro m ebubo. M rịọrọ Jehova ugboro ugboro ka o nyere m aka ichefu ya.” Obi dị anyị ụtọ na Nwanna Alberto maliteghachiri ife Jehova. Nwanna John sịrị: “Ọtụtụ ugboro, m kpere ekpere ka Jehova nyere nwanna ahụ mere m ihe na-adịghị mma aka, nyekwara m aka ịgbaghara ya. Jehova nyeere m aka ka m ghara ịna-ewesa nwanna m iwe, kwụsịkwa ikpe ya ikpe. Ekpere ndị ahụ mekwara ka obi ruo m ala.”

19. Gịnị ka anyị ga-emegide ruo ọgwụgwụ ụwa ochie a? (1 Pita 3:8, 9)

19 Anyị amaghị ihe ọjọọ ndị e nwere ike ime anyị tupu e bibie ụwa ochie a. N’agbanyeghị ihe ọ bụla e mere anyị, ka anyị ghara ịkwụsị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ka anyị meekwa ihe Jizọs mere mgbe e megburu ya. Anyị kwesịkwara ịna-eme ihe Jehova kwuru n’Okwu ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị.​—Gụọ 1 Pita 3:8, 9.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

a Na Pita nke Mbụ isi nke 2 na nke 3, Pita onyeozi kwuru mgbe ụfọdụ e megburu Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Ụfọdụ bụ ndị nna ukwu dị obi ọjọọ ma ọ bụ di ha na-abụghị Ndị Kraịst megburu.​—1 Pita 2:18-20; 3:1-6, 8, 9.

b Gaa na jw.org lee vidio aha ya bụ Otú Ịhụnanya Si Eme Ka Anyị Nwee Ezigbo Udo.